Akwụkwọ nsọ
Ozizi na Ọgbụgba-ndụ nile 52


Nkeji 52

Mkpughe e nyere site n’aka Joseph Smith Onye-amụma nye ndị-okenye nke Nzukọ-nsọ, na Kirtland, Ohio, 7th Jun 1831 (History of the Church, 1:175–179). E mewororịị ọgbakọ na Kirtland, nke malitere n’abalị atọ ma mechie n’abalị isii nke Jun. N’ọgbakọ nke a e mere ichi echichi nke mbụ pụtara-ìhè baa n’ọkwa-ọrụ nke onye isi nchụ-aja, na ụfọdụ ngosipụta nile nke mụọ ụgha na nke nduhie ka a matara ma baakwara mba.

1–2, Ọgbakọ nke ọzọ ka a mara ọkwa na a ga-eme na Missouri; 3–8, Nhọpụta nile nke ụfọdụ ndị okenye ịgakọta njem ọnụ ka e mere; 9–11, Ndị okenye ga-akuzi ihe ndị-ozi nile na ndị-amụma nile deworo; 12–21, Ndị ahụ natara ozizi nke mụọ na-amịta mkpụrụ nke otuto na amamihe; 22–44, Ọtụtụ ndị okenye ka a họpụtara ịga n’iru na-ikwusa ozi-ọma mgbe ha na-aga Missouri maka ọgbakọ ahụ.

1 Lee, otu a ka Onye-nwe kwuru nye ndị okenye ndị ọ akpọrọ ma họrọ n’ụbọchị ndị ikpe azụ a, site n’olu nke Mụọ ya—

2 Na-asị: Mụ, Onye-nwe, ga-eme ka unu mata ihe m chọrọ ka unu mee site n’oge nke a ruo n’ọgbakọ nke ọzọ, nke a ga-enwe na Missouri, n’elu aala nke m bga-edo nsọ nye ndị m, nke bụ ndị cfọdụrụ na ndị nke Jekọb; na ndị ahụ bụ ndị nketa dịka dọgbụgba-ndụ ahụ siri dị.

3 Ya mere, n’ezie a sị m unu, ka ndị odibo m Joseph Smith Nta, na Sidney Rigdon gaa njem ha ngwa-ngwa e mesịrị njike nile ịhapụ ụlọ ha nile, ma jee n’ala nke Missouri.

4 Ma ọbụrụraa na ha kwesịrị ntụkwasị-obi n’ebe m nọ, aga-eme ka ha mata ihe ha ga-eme.

5 Ma a ga-kwa, ọbụrụraa na ha kwesịrị ntụkwasị-obi, eme ka ha mata aala nke nketa unu.

6 Ma ọbụrụraa na ha ekwesịghị ntụkwasị-obi, a ga-ebepụ ha, ọbụna dịka m chọrọ, dịka o si dị m mma.

7 Ma ọzọ, n’ezie a sị m unu, ka nwa odibo m Lyman Wight na nwa odibo m John Corrill gaa njem ha ọsọ-ọsọ;

8 Na kwa nwa odibo m John Murdock, na nwa odibo m Hyrum Smith, gaa njem ha ruo otu ebe ahụ site n’ụzọ Detroit.

9 Ma ka ha gaa site n’ebe ahụ na-ekwụsa okwu ahụ n’okporo ụzọ ahụ, n’ekwughị aihe ọzọ karịa nke ahụ bndị-amụma nile na ndị-ozi nile deworo, na nke ahụ cOnye-nkasị-obi kụziri ha site n’ekpere nke okwukwe.

10 Ka ha gaa aabụọ abụọ, ma otu a ka ha kwusaa n’okporo ụzọ n’ọgbakọ ọbụla, na-eme baptism site na bmmiri, na ibikwasị caka n’isi n’akụkụ mmiri.

11 N’ihi na otu a ka Onye-nwe kwuru, a ga m egbubi ọru m mkpụmkpụ an’ezi-omume n’ihi na ụbọchị ndị ahụ na-abịa mgbe m ga-ezipụ ikpe ruo na mmeri.

12 Ma ka nwa odibo m Lyman Wight kpachara anya, n’ihi na Setan chọrọ aịyọcha ya dịka afụrụ.

13 Ma lee, onye ahụ nke kwesịrị antụkwasị-obi ka aga-eme onye ọchịchị nye ọtụtụ ihe.

14 Ma ọzọ, a ga m enye unu ihe-nlere-anya n’ihe nile, ka e wee ghara iduhie unu; n’ihi na Setan nọ n’elu ala nile, ma na-aga n’iru na-eduhie ọtụtụ mba—

15 Ya mere onye ahụ nke na-ekpe ekpere, onye mụọ ya atiwara etiwa, otu onye ahụ ka m bga-anabata ma o rube-isi cn’emume-nsọ m nile.

16 Onye ahụ nke na-ekwu okwu, onye mụọ ya nwere nchegharị, onye asụsụ ya dị nwayọ ma na-ebuli mụọ elu, otu onye ahụ bụ kwa onye nke Chineke ma ọbụrụ na ọ na-erube isi n’emume-nsọ m nile.

17 Ma ọzọ onye ahụ nke na-ama jijiji n’okpuru ike m ka a ga-eme ka o sie aike, ma ọ ga-amịpụta mkpụrụ nile nke otuto na bamamihe, dịka mkpụghe nile na-ezi-okwu nile nke m nyeworo unu siri dị.

18 Ma ọzọ, onye ahụ nke e meriri-emeri ma ana-amịtaghị mkpụrụ nile, ọbụna dịka ihe-nlere-anya nke a siri dị, abụghị onye nke m.

19 Ya mere, site n’ihe-nlere-anya nke a unu aga-amata mụọ nile n’ụdị nile n’okpuru elu-igwe nile.

20 Ma ụbọchị nile ndị ahụ abịawo; dịka okwukwe ndị mmadụ siri dị ka a aga-emere ha ya.

21 Lee, iwu-nsọ nke a ka e nyere ndị okenye nile ndị m họpụtaworo.

22 Ma ọzọ, n’ezie a sị m unu, ka nwa odibo m aThomas B. Marsh na nwa odibo m Ezra Thayre gaa njem ha kwa, na-ekwusa okwu ahụ n’okporo-ụzọ, rụte otu ala nke a.

23 Ma ọzọ, ka nwa odibo m Isaac Morley na nwa odibo m Ezra Booth gaa njem ha, ma na-ekwusa kwa n’okporo-ụzọ nye otu ala nke a.

24 Ma ọzọ, ka ụmụ odibo m aEdward Partridge na Martin Harris gaa njem ha, ha na ụmụ odibo m Sidney Rigdon na Joseph Smith, Nta.

25 Ka ụmụ odibo m David Whitmer na Harvey Whitlock gaa kwa njem ha, ma kwusaa okwu n’okporo-ụzọ nye otu ala nke a.

26 Ma ka ụmụ odibo m aParley P. Pratt na bOrson Pratt gaa njem ha, ma kwusaa okwu n’okporo-ụzọ ọbụna nye otu ala nke a.

27 Ma ka ụmụ odibo m Solomon Hancock na Simeon Carter gaa kwa njem ha rute n’otu ala nke a, ma kwusaa okwu n’okporo-ụzọ.

28 Ka ụmụ odibo m Edson Fuller na Jacob Scott gaa kwa njem ha.

29 Ka ụmụ odibo m Levi W. Hancock na Zebedee Coltrin gaa kwa njem ha.

30 Ka ụmụ odibo m Reynolds Cahoon na Samuel H. Smith gaa kwa njem ha.

31 Ka ụmụ odibo m Wheeler Baldwin na William Carter gaa kwa njem ha.

32 Ma ka e chie ụmụ odibo m aNewel Knight na Selah J. Griffin echichi, na kwa ka ha gaa njem ha.

33 E, n’ezie a sị m, ka ndia nile gaa njem ha rute n’otu ebe, site n’ụzọ ha nile, ma otu onye agaghị ewu n’elu antọ-ala nke onye ọzọ, ma-ọbụ gaa njem n’ụzọ nke onye ọzọ.

34 Onye nke kwesịrị ntụkwasị-obi, otu onye ahụ ka a ga-echebe ma gọzie jiri ọtụtụ amkpụrụ.

35 Ma ọzọ, a sị m unu, ka nwa odibo m Joseph Wakefield na Solomon Humphrey gaa njem ha baa n’ala ọwụwa anyanwụ nile.

36 Ka ha na ezi na ụlọ ha nile rụọ ọrụ, ana-ama ọkwa n’ekwughị ihe ọzọ karịa ndị amụma na ndị-ozi, nke ahụ ha bhụworo ma nụ ma n’ezie ckwere, ka e wee mezuo amụma nile.

37 N’ihi njehie, ka nke ahụ e nyere Heman Basset bụrụ ihe a anapụrụ ya, ma debe n’isi Simonds Ryder.

38 Ma ọzọ, n’ezie a sị m unu, ka Jared Carter bụrụ onye e achiri echichi onye nchụ-aja, na kwa ka George James bụrụ onye e chiri echichi bonye nchụ-aja.

39 Ka ndị fọdụrụ n’ime ndị okenye alekọta nzukọ-nsọ nile anya, ma kwupụta okwu ahụ na mpaghara nile gbara ha gburu-gburu; ma ka ha jiri aka ha rụọ ọrụ ka aghara inwe bife arụsị ma-ọbụ ime ajọọ-omume.

40 Ma cheta n’ime ihe nile andị-ogbenye na bndị nọ na mkpa, ndị ọrịa na ndị nwere mkpagbu, n’ihi na onye n’emeghị ihe ndị a nile, otu onye ahụ abụghị onye na-eso-ụzọ m.

41 Ma ọzọ, ka ụmụ odibo m Joseph Smith, Nta, na Sidney Rigdon na Edward Partridge jiri aakwụkwọ-nkwado sitere na nzukọ-nsọ. Ma ka anata kwa otu maka nwa odibo m Oliver Cowdery.

42 Ma otu a, ọbụna dịka m kwuru, ọbụrụ na unu ekwesị ntụkwasị-obi unu ga-akpọkọta onwe unu ọnụ iji n̄ụrịa ọn̄ụ n’elu ala nke aMissouri, nke bụ ala nke bihe-nketa unu, nke bụ ugbụ a ala nke ndị iro unu nile.

43 Mana, lee, Mu Onye-nwe ga-eme ka obodo-ukwu ahụ bịa ọsọ-ọsọ n’oge nke ya, ma ga-ekpuwe onye kwesịrị ntụkwasị-obi okpu aọn̄ụ ma jiri kwa ịn̄ụrị ọn̄ụ.

44 Lee, a bụ m Jisus Kraịst, Ọkpara nke Chineke, na a ga m aebuli ha elu n’ụbọchị ikpeazụ. Ọbụna otu a. Amen.