Akwụkwọ nsọ
Ozizi na Ọgbụgba-ndụ nile 25


Nkeji 25

Mkpughe e nyere Joseph Smith Onye-amụma, na Harmony, Pennsylvania, Julaị 1830 (History of the Church, 1:103–104). (Lee isi-okwu nke Nkeji 24.) Mkpughe nke a gosipụtara uche nke Onye-nwe nye Emma Smith, nwunye Onye-amụma.

1–6, Emma Smith, agbọghọbịa ahọpụtara, ka akpọrọ, ka onye aka ma kasie di ya obi; 7–11, A kpọkwara ya ide, ịkọwadaru akwụkwọ-nsọ nile ala; ma ị họpụta abụ nile; 12–14, Abụ nke onye ezi-omume bụ ekpere nye Onye-nwe; 15–16, Ụkpụrụ ọma nile nke irube isi dị na mkpughe nke a bu ihe a ga-atụnyere mmadụ nile.

1 N̄aa-ntị n’olu nke Onye-nwe Chineke gị, mgbe m na-ekwuru gị okwu, Emma Smith, nwa m nwanyị, n’ihi n’ezie a sị m gị, ndị nile ahụ anatara ozi-ọma m bụ ụmụ m nwoke na ụmụ m nwanyị bn’ala eze m.

2 Mkpughe ka m n’enye gị gbasara uche m; ma ọbụrụ na ikwesị ntụkwasị-obi ma ajee-ije n’ụzọ bezigbo-omume n’iru m, a ga m echekwa ndụ gị, ma ị ga-anata cihe nketa na Zaịọn.

3 Lee, a gbagharawo gị ammehie gị nile, ma ị bụ nwagbọghọ ahọpụtara, onye m bkpọworo.

4 Atamula n’ihi ihe nile na ị hụbeghị, maka ha ka ejichiri site na gị nakwa site n’ụwa, nke bụ amamihe n’ime m n’oge na-abịa.

5 Ma ọkwa-ọrụ nke ọkpụkpọ gị ga-abụ nke ankasi-obi nye odibo m, Joseph Smith, nta di gị, na mkpagbu ya nile, jiri ọkwụ nkasi-obi na mụọ nke ịdị-nwayọ.

6 Ma ị ga-eje gị na ya n’oge ọ na-aga, ma dịrịkwa ya dịka onye ode-akwụkwọ, mgbe n’onweghị onye ga-abụ onye ode-akwụkwọ nye ya, ka m ziga nwa ọdịbọ m, Oliver Cowdery, ebe ọbụla m chọrọ.

7 Ma a aga-echi gị echichi n’aka ya ka ịkọwadaruo akwụkwọ nsọ nile ala ma ka ị gbaa Nzukọ-nsọ ume, dịka a ga-esi enye gị ya site na Mụọ m.

8 N’ihi ọ ga-ebịkwasị gị aaka n’isi, ma ị ga-anata Mụọ Nsọ, ma oge gị ka a ga-enye ihe odide, na ị mụta nnukwu ihe.

9 Ma ikwesịghị ịtụ ụjọ n’ihi na di gị ga-akwado gị nime Nzukọ-nsọ; n’ihi aọkpụkpọ ya bụ nye ha, ka ihe nile bụrụ ihe bekpụghere nye ha, ihe ọbụla m chọrọ dịka okwukwe ha siri dị.

10 Ma n’ezie a sị m gị na ị ga-atọgbọ iche aihe nile nke bụwa nke a, ma cchọọ ihe nile nke ka mma.

11 Ma a ga-enye gị, kwa, ịhọpụta aabụ-nsọ nile, dịka a ga-enye gị ha, nke mara mma nye m nke a ga-enwe na Nzukọ-nsọ m.

12 N’ihi na mkpuru-obi m na-enwe mmasị an’abụ nke bobi, e abụ nke onye ezi-omume bụ ekpere nye m, ma a ga-eji ngọzi a wụsara n’isi ha aza ya.

13 Ya mere bulite obi gị elu ma n̄ụrịa, ma rapara na ọgbụgba ndụ nile nke i meworo.

14 Gaa n’iru na mụọ nke aịdị nwayọ ma kpachara anya maka bmpako. Ka obi gị n̄ụrịa na di gị, na ebube nke ga-abịakwasị ya.

15 Debe iwu-nsọ m nile esepụghị-aka, ma aokpu nke bezi-omume ka ị ga-anata. Ma m’ọbụghị ma i mere nke a, ị cgaghị abịa ebe m nọ.

16 Ma n’ezie, n’ezie, a si m gị, na nke a bụ aolu m nye mmadụ nile. Amen.