Akwụkwọ nsọ
Ozizi na Ọgbụgba-ndụ nile 39


Nkeji 39

Mkpughe e nyere site n’aka Joseph Smith Onye-amụma nye James Covill, na Fayette, New York, 5 Jenuarị 1831 (History of the Church, 1:143–145). James Covill, onye n’abuwo rịị onye-ozizi ozi-ọma nke ndị baptist ihe dịka afọ iri-anọ, gbara ndụ ya na Onye-nwe na ya ga-erube isi n’iwu ọbụla nke Onye-nwe ga-enye ya site na Joseph Onye-amụma.

1–4, Ndị-nsọ nile nwere ike ịbụrụ ụmụ nke Chineke, 5–6, ị nabata ozi-ọma bụ ị nabata Kraịst; 7–14, James Covill ka enyere iwu ka o mee baptism ma rụọ ọrụ na ubi vine Onye-nwe; 15–21, Ndị odibo Onye-nwe ga-ekwusa ozi-ọma tutu Ọbịbịa nke Ugboro Abụọ; 22–24, Ndị nabatara ozi-ọma ka a ga-akpọkọta n’oge na mgbe ebighi-ebi.

1 N̄aa-ntị ma gee-ntị n’olu nke ya onye ahụ nke sitere mgbe ebighi-ebi nile ruo mgbe ebighi-ebi nile, Nnukwu A bụ M ahụ, ọbụna Jisus Kraịst—

2 Ìhè na ndụ nke ụwa, ìhè ahụ na-amụ n’ọchịchịrị ma ọchịchịrị ahụ aghọtaghị ya;

3 Nke ahụ bịakutere ndị m n’etiti oge akara-aka, ma ndị m anabataghị m;

4 Kama ka ha ra bụ ndị nabatara m, ka m nyere ike ị bụ ụmụ m ndịkom; ma ọbụna otu a ka m ga-enye ka ha ra bụ ndị ga-anabata m, ike ị bụrụ ụmụ m ndịkom.

5 Ma n’ezie, n’ezie, a sị m unu, onye nabatara ozi-ọma m nabatara m, ma onye na-anabataghị ozi-ọma m a-nabataghị m.

6 Ma nke a bụ ozi-ọma m—nchegharị na baptism nke mmiri, ma mgbe ahụ ka baptism nke ọkụ na Mụọ Nsọ ga-abịa, ọbụna Onye-nkasị-obi, nke na-egosi ihe nile, ma kuzie kwa ihe udo nile nke ala-eze.

7 Ma ugbụ a, lee, asị m gị nwa odibo m James, e lewo m ọrụ gị nile anya ma, a ma m gị.

8 Ma n’ezie, a si m gị, obi gị ziri-ezi n’irum n’oge nke a; ma lee, e nyewo m nnukwu ngọzi nile n’isi gị;

9 Otu osila dị, ị hụwo nnukwu iri-uju, n’ihi na ị jụrụ ị nabata m ọtụtụ mgbe n’ihi mpako na nchegbu maka ihe nke ụwa.

10 Kama, lee, ụbọchị nile nke nnapụta gị abịawo, ọbụrụ na ị ga-an̄a-ntị n’olu m, nke na-asị gị: Bilie ma mee baptism, ma sachapụ mmehie gị nile, na-akpọku aha m, ma ị ga-anabata Mụọ nke m, ma nnukwu ngọzi dịka nke n’ịmatabeghị.

11 Ma ọbụrụ na imee nke a, a kwadowo m gị maka ọrụ dị nnukwu karia. I ga-ekwusa ozi-ọma m n’uju ya, nke m zipụworo n’oge ikpeazụ ndịa, ọgbụgba-ndụ ahụ nke Mụ zipụworo inweta ndị nke m ọzọ, nke bụ ndị ụlọ nke Israel.

12 Ma ọ ga-eru na ike ga-anọ na gị, ị ga-enwe nnukwu okwukwe, ma mụ onwe m ga-a nọnyere gị ma na-aga n’iru gị.

13 Akpọrọ gị ka ịrụọ ọrụ na ubi vine, ma ka iwulie nzukọ-nsọ m, ma hiwekwa Zaịọn, ka ọ na-an̄ụrị n’elu ugwu ma baa ụba.

14 Lee, n’ezie, n’ezie, a sị m gị, a kpọghi gị ka i jee na mba nile nke ọwụwa anyanwụ, kama, akpọrọ gị ka ị jee Ohio.

15 Ma ebe ọbụ na ndị nke m ga-agbakọ na Ohio, a kwadowo m ngọzi nke n’enweghi onye ma ya n’etiti ụmụ nke mmadụ, ma a ga-awụsasị ya n’isi ha. Ma site n’ebe ahụ ndị mmadụ ga-apụ jee mba nile.

16 Lee, n’ezie, n’ezie, a sị m unu, na ndị mmadụ nọ na Ohio na-akpọkụ m na nnukwu okwukwe, na-eche na m ga-akwụsị aka m n’ikpe megide mba nile, kama apụghị m ịgọnarị okwu nke m.

17 Ya mere, malite ọrụ n’ike gị nile ma kpọ ndị ọrụ kwesịrị ntụkwasị-obi n’ime ubi vine m, ka i bechaa ya na-nke ikpe azụ a.

18 Ma ebe ọbụ na ha echegharịwo ma nata ozi-ọma m na uju ya, ma bụrụ ndị a sachara, a ga m akwụsị aka m n’ikpe.

19 Ya mere, ga n’iru, na-eti mkpu n’oke olu na-asị: ala-eze nke elu-igwe dịkwa nsọ; na-eti Hosanna! ngọzi na-adịrị aha nke Chineke nke Kachasị Elu.

20 Gaa n’iru na-eme baptism site na mmiri, na-edozi ụzọ n’iru m maka oge ọbịbịa nke m.

21 N’ihi n’oge ahụ adịwo nso; ụbọchị ma-ọbụ awa ahụ onweghị onye maara, kama ọ garịrị abịa.

22 Ma onye nabatara ihe ndị a nile nabatara m; ma a ga-akpọkọta ha nye m n’oge ma mgbe ebighi-ebi.

23 Ma ọzọ, ọ ga-eru mgbe ka ha ra bụ ndị ị mere baptism site na mmiri, ị ga-ebịkwasị ha aka n’isi, ma ha ga-anata onyinye nke Mụọ Nsọ, ma ga na-elepụ anya n’ihi ihe iriba-ama nke ọbibịa m, ma ha ga-ama m.

24 Lee, a na m abịa ọsọ-ọsọ. Ọbụna otua. Amen.