Akwụkwọ nsọ
Ozizi na Ọgbụgba-ndụ nile 130


Nkeji 130

Okwu nile nke ndụmọdụ sitere n’aka Joseph Smith Onye-amụma, na Ramus, Illinois, 2 Epril 1843 (History of the Church, 5:323–325).

1–3, Nna ahụ na Ọkpara ahụ nwere-ike igosi onwe ha nye ndị mmadụ; 4–7, Mụọ ozi nile bi na ala-eze selestịal; 8–9, Ụwa ahụ nke selestịal ga-abụ nnukwu Urim na Tumim; 10–11, Okwute ọcha ka a ga-enye ndị nile ga-aba na ụwa nke selestịal; 12–17, Oge ahụ nke Ọbibịa nke Ugboro Abụọ ka e zonarịrị Onye-amụma; 18–19, Akọn’uche nke e nwetara na-ndụ nke a ga-esoro anyi bilie na mbilite n’ọnwụ; 20–21, Ngọzị nile n’abia site na nrube-isi nye iwu; 22–23, Nna na Ọkpara ahụ nwere arụ nile nke anụ arụ na ọkpụkpụ nile.

1 Mgbe Onye-nzọpụta ahụ aga-apụta ìhè anyị ga-ahụ ya otu odị. Anyị ga-ahụ na ọ bụ bnwoke dịka anyị onwe anyị.

2 Na ụfọdụ mmekọrịta nke nọ n’etiti anyị ebe a, ga-anọ n’etiti anyị ebe ahụ, nanị a ga-ejikọ ya na aebube ebighi-ebi, ebube nke anyị n’enweghị ugbụ a.

3 Jọn 14:23—Mbịakwute nke aNna na bỌkpara ahụ, na ama okwu ahụ, bụ cịpụta-ihe na mmadụ; na nghọta nke Nna na Ọkpara dịno n’ime obi mmadụ bụ nghọta okpukpe-chi nke ochie, na bụrụ ụgha.

4 Na aziza nye ajuju ahụ ọbụghị ezie na ngukọta aoge nke Chineke, oge nke mụọ-ozi, oge nke onye-amụma, na oge nke mmadụ, dịka ụwa nke ha bi na ya siri dị?

5 A zara m, E. Mana e nweghị andị mụọ-ozi ndị n’eje-ozi n’ụwa m’ọbụghị ndị bụ nke ma-ọbụ bụrụwo nke ya.

6 Ndị mụọ-ozi a dịghị ebi n’urukpu elu-igwe dịka ụwa nke a;

7 Mana ha na-ebi n’iru nke Chineke, n’elu ihe gburu gburu dịka aoke osimiri nke enyo na bọkụ, ebe ihe nile maka ebube ha pụtara-ìhè, oge gara-aga, oge ugbua, na ọdị n’iru, ma nọ mgbe nile n’iru Onye-nwe.

8 Ebe ahụ nke Chineke bị bụ nnukwu aUrim na Tumim.

9 aỤwa nke a, n’ọnọdụ ya nke edoro-nsọ na anwụghị-anwụ, ka a ga-eme ka ọ dika crystal na ga-abụ Urim na Tumim nye ndị nile bi na ya, site na ya ihe nile gbasara ala-eze na-abụghị ezigbo ya, ma-ọbụ ala-eze nile dị-ala; ka a ga-egọsipụta nye ndị bi na ya, ma ụwa nke a ga-abụ nke Kraịst.

10 Mgbe ahụ nkume ọcha ahụ akpọrọ aha na Mkpughe 2:17, ga-abụ Urim na Tumim nye onye ọbụla nke nwetara otu, nke site na ya ihe nile gbasara usoro ala-eze nile dị-elu karịa ka a ga-eme ka-a mara;

11 Na otu nkume aocha ka a ga-enye onye ọbụla na ndị ahụ biara n’ime ala-eze selestịal, ebe edere baha ọhụrụ, nke n’onweghị madụ matara ya m’ọbụghị onye ahụ natara ya. Aha ọhụrụ bụ isi-ọkwu ahụ.

12 E buo m amụma, n’aha nke Onye-nwe Chineke, na mmalite nke ansogbu nile nke ga-eweta oke ịkwafu-ọbara tutu ọbịbịa ahụ nke Ọkpara nke Mmadụ ga-abụ na bSouth Carolina.

13 O nwere-ike n’eleghị-anya malite site okwu ịgba oru ahụ. Nke a otu olu mara ọkwa nye m, mgbe m ji ekpere kpọrọ ihe n’isi okwu ahụ, Disemba 25th, 1832.

14 A nọ m n’ekpesi-ekpere ike otu mgbe ị mara oge nke aọbịbịa Ọkpara nke Mmadụ ahụ, mgbe m nụrụ olu n’ekwugharị nke n’eso.

15 Joseph, nwa m nwoke, ọ bụrụ na ị di-ndụ ruo mgbe ịgbara iri afọ asatọ na ise, ị ga-ahụ iru nke Ọkpara nke Mmadụ; ya mere ka nke a jụ gị afọ, ma e nyela m nsọgbu ọzọ n’okwu nkea.

16 A hapụrụ m otu a, n’enweghị ike ikpebi na ọbịbịa nke a ọ na-ekwu mmalite nke oge Jisus ga-abịa n’uwa chịa ota puku afọ ma-ọbụ ọbịbịa ndị ochie, na ọbụ ka m wee nwụọ na site otu a hụ iru ya.

17 Ekwere m na ọbịbịa Ọkpara nke Mmadụ agaghị a dị nso karịa oge ahụ.

18 Ihe ọbụla bụ ụkpụrụ aakọ na uche anyị toruru na ndụ nke a, ọ ga-esoro anyị bilie na bmbilite n’ọnwụ.

19 Na ọbụrụ na onye ọbụla e nwee ammụta karịa na akọn’uche na ndụ nke a site na bịrụsi ọrụ ike ya na cirube-isi karịa onye ọzọ, ọ ga-enwe nnukwu duru n’ụwa na-abịa.

20 E nwere otu aiwu, n’anaghị-akwụsị-akwụsị enyere n’elu-igwe btutu ntọ-ala nile nke uwa nkea, n’elu nke cngọzi nile gbadoro-ụkwụ—

21 Na mgbe anyị nwetara ngọzi ọbụla site n’aka Chineke, ọ bụ site na nrube-isi nye iwu ahụ nke ọ gbadoro-ụkwụ.

22 aNna ahụ nwere barụ nke anụ arụ na ọkpụkpụ nile nwere ojiji-aka dịka nke mmadụ; Ọkpara ahụ kwa, mana cMụọ Nsọ enweghị arụ nke anụ arụ na ọkpụkpụ nile, mana ọ bụ onye nke Mụọ. Asị na-ọbụghị otu a, Mụọ Nsọ ahụ a gaghị ebi n’ime anyị.

23 Madụ nwere-ike nata aMụọ Nsọ ahụ, na ọ nwere ike ịrịdata n’elu ya na ọ gaghị anọgide na ya.