Akwụkwọ nsọ
Ozizi na Ọgbụgba-ndụ nile 82


Nkeji 82

Mkpughe e nyere Joseph Smith Onye-amụma, na Ógbè Jackson, Missouri, 26 Epril 1832 (History of the Church, 1: 267–269). Oge ahụ bụ kansụl ọha nke Nzukọ-nsọ ebe a nọ họpụta Joseph Smith Onye-amụma dịka Onye-isi nduzi nke Ọkwa Nchụ-aja dị Elu, n’ọkwa-ọrụ nke e chiworo ya rịị echichi ya n’oge gara-aga, n’ọgbakọ nke ndị-isi-nchụ-aja, okenye, na ndị-otu, na Amherst, Ohio, 25 Jenuarị 1832 (lee isi-ọkwu nke nkeji 75). N’oge mbụ, aha n’abụghị nke eji mara mmadụ ka eji na mbipụta nke mkpughe nke a iji zoo ejiri-mara nke ndị mmadụ a kpọrọ aha (lee isi-ọkwu nke nkeji 78).

1–4, Ebe e nyere nnukwu ihe, n’ebe ahụ ka a ga-achọ kwa nnukwu ihe; 5–7, Ọchịchịrị na-achị n’ụwa; 8–13, Onye-nwe ka a na-amanye mgbe anyị na-eme ihe O kwuru; 14–18, Zaịọn aghaghị ịbawanye n’ịma mma ma n’ịdị nsọ; 19–24, Onye ọbụla kwesịrị ịchọ ọdị mma nke onye agbata obi ya.

1 N’ezie, n’ezie, a sị m unu, ụmụ odibo m, na ọbụrụraa na unu aagbagharawo onwe unu mmehie nile, ọbụna otu a mụ, Onye-nwe, ga-agbaghara unu.

2 Otu ọsila dị, o nwere ndị nọ n’etiti unu ndị mehieworo karịa; e, ọbụna aunu nile emehiewo; mana n’ezie a sị m unu, lezie nụ anya site ugbụ a gawa, ma gbanarị mmehie, ma ọbụghị ya nnukwu, ikpe ga-adakwasị n’isi nile nke unu.

3 N’ihi na onye ahụ e nyere annukwu ihe ka bachọ-kwara nnukwu ihe n’aka; ma onye ahụ nke cga-eme mmehie megide díhè ahụ dị ukwuu karịa, ga-anata amamikpe ahụ dị ukwuu karịa.

4 Unu na-akpọku aha m maka amkpughe nile, ma a na m enye unu ha; ma ọbụrụraa na unu edebeghị ihe nile m kwuru, nke m na-enye unu, unu na-abụzi ndị mmehie; ma bikpe ziri-ezi na ikpe bụ ntaram ahụhụ nke anyapadoro nye iwu m.

5 Ya mere, ihe m kwuru nye otu mmadụ e ekwuru m ya nye mmadụ nile: aNa-eche nụ nche n’ihi na bonye-irọ na-agbasa ebe-ọchịchị ya nile, ma cọchịchịrị na-achị;

6 Ma iwe nke Chineke dị ọkụ megide ndị nile bi n’ụwa; ma o nweghị onye nke na-eme ihe ọma, n’ihi na mmadụ nile apụwo site an’ụzọ.

7 Ma ugbụ a, n’ezie a sị m unu, mụ, Onye-nwe, a gaghị agụ ammehie ọbụla n’isi unu; gawa nụ n’ụzọ unu nile ma unu emehiekwala ọzọ; mana nye mkpuru-obi ọbụla nke mehiere ka mmehie nile bndị mbụ ga-alaghachikwute, ka Onye-nwe Chineke unu kwuru.

8 Ma ọzọ, a sị m unu, e nye m unu aiwu-nsọ ọhụrụ, ka unu wee ghọta echiche m gbasara unu;

9 Ma-ọbụ, n’okwu ndị ọzọ, e nye m unu ntụzi-aka nile ka unu ga-esi ana-eme n’iru m, ka ọ wee tụgharịa bụrụ nzọpụta unu.

10 Mụ, Onye-nwe, ka a ana-amanye mgbe unu mere ihe m kwuru mana mgbe unu na-emeghị ihe m kwuru, unu enweghị nkwa.

11 Ya mere, n’ezie a sị m unu, na ọ dị mkpa ka ụmụ odibo m Edward Partridge na Newel K. Whitney, A. Sidney Gilbert na Sidney Rigdon, na nwa odibo m Joseph Smith, na John Whitmer na Oliver Cowdery, na W.W. Phelps na Martin Harris bụrụ ndị ekekọrọ aọnụ site na nkwekọrịta na ọgbụgba-ndụ nke n’agaghị enwe ntiwa site na mmehie, ewezuga na ikpe ga-esochi ngwa ngwa n’ọkwa ọrụ unu nile—

12 Ihazi ihe-omume nile nke ndị ogbenye, na ihe nile metụtara otu-ndị ụkọchukwu ma n’ala nke Zaịọn ma n’ala nke Kirtland;

13 N’ihi na e dowo m ala nke Kirtland nsọ mgbe oge nke m zuru n’ihi nrite uru nke ndị-nsọ nke Onye Kachasị Elu, ma n’ihi nke otu astek nye Zaịọn.

14 N’ihi na Zaịọn aghaghị ịmụba na ịma mma, ma n’ịdị nsọ; oke-ala ya nile aghaghị ibuwanye ibu; stek ya nile aghaghị isi-ike; e, n’ezie a sị m unu, aZaịọn aghaghị iteta ma yiri uwe mwụda ya nile bmara mma.

15 Ya mere, e nye m unu iwu-nsọ nke a, na unu ga-ejikọ onwe unu site n’ọgbụgba-ndụ nke a, ma a ga-eme ya dịka iwu nile nke Onye-nwe siri dị.

16 Lee, nke a bụkwa amamihe n’ime m maka ọdịmma nke unu.

17 Ma unu aga-aha otu, ma-ọbụ n’okwu ndị ọzọ, unu ga-enwe oke ruru unu ahata-aha n’arịa nile, maka nrite-uru nke ihazi ihe gbasara ọkwa ọrụ unu nile, onye ọbụla dịka ọchịchọ ya na mkpa ya nile siri dị, ọbụrụraa na ọchịchọ ya nile ziri-ezi—

18 Ma ihe a nile maka nrite-uru nke nzukọ-nsọ nke Chineke dị ndụ, na onye ọbụla ga-enwe ike ime nke ọma karịa an’onyinye-chi ya, na onye ọbụla, ga-enwe ike irite onyinye-chi ndị ọzọ, e, ọbụna ruo ụzọ otu narị, nke a ga-etinye n’ime bụlọ-akụ nke Onye-nwe, ka ọ bụrụ arịa ọha nke nzukọ-nsọ dum—

19 Onye ọbụla na-achọ ọdịmma nke onye agbata-obi ya, ma na-eme ihe nile jiri aanya lekwasị nani n’otuto nke Chineke.

20 aUsoro nke a ka m họpụtaworo ka ọ bụrụ usoro nke mgbe nile na-adigide nye unu, ma nye ndị na-esota unu, ma ọbụrụraa na unu emehieghị.

21 Ma mkpụrụ-obi ahụ nke mehiere megide ọgbụgba-ndụ nke a, na mesie obi ya ike megide ya, ka a ga-emeso dịka iwu nile nke nzukọ-nsọ m siri dị, ma a ga-enyefe ya nye ansogbu nile nke Setan ruo ụbọchị nke mgbapụta.

22 Ma ugbụ a, n’ezie a sị m unu, ma nke a bụ amamihe, mere nụ onwe unu enyi unu na akụ nke ajọọ-omume, ma ha agaghị ebibi unu.

23 Hapụrụ nụ nanị m ikpe, n’ihi na ọ bụ nke m ma a ga m aakwụghachị ụgwọ. Udo dịrị unu; ngọzi m nile nọnyegidere unu.

24 N’ihi ọbụna ugbua aala-eze ahụ ka bụ nke unu, ma ga-abụ ruo mgbe nile, ma ọ bụrụ na unu adaghị site n’ịkwụsi ike unu. Ọbụna otu a. Amen.