Akwụkwọ nsọ
Ozizi na Ọgbụgba-ndụ nile 49


Nkeji 49

Mkpughe e nyere site n’aka Joseph Smith Onye-amụma nye Sidney Rigdon, Parley P. Pratt na Leman Copley, na Kirtland, Ohio, Maach 1831 (History of the Church, 1:167–169). (Ụfọdụ ebe-nnweta akụkọ na-enye oge mkpughe nke a dịka Mee 1831). Leman Copley anabataworịị ozi-ọma mana kwesịe ike n’ụfọdụ nkuzi nke ndị Shaker (Otu Njikọ nke ndị Kwere na Mpụta nke Kraịst nke Ugboro Abụọ), nke ọ banyere na mbụ. Ụfọdụ okwukwe nke, ndị Shaker bụ na ọbịbịa nke ugboro abụọ nke Kraịst emezuworị ma na ọ bịara n’ụdị nke nwanyị, Ann Lee; baptism site na mmiri esoghi n’ihe agụnyere dị mkpa; iri anụ ezi bụ kwa ihe asị emela, ma ọtụtụ erikwaghị anụ ọbụla; ma ndụ alụghị nwanyị ma-ọbụ di bụ nke a sị na ọ dị elu karịa ọlụlụ di na nwunye. Mgbe ọ na-ede okwu mmalite mkpughe nke a, Onye-amụma dere, “N’ihi inwe nghọta zuru-oke karịa n’okwu nke a, a jụrụ m Onye-nwe, ma nata nke a na-eso (History of the Church, 1:167). Mkpughe ahụ gosịrị ụgha nke echiche ntọ-ala nile nke ndị otu Shaker. Ndị ụmụnne ndị ahụ a kpọrọ aha na mbụ weere otu kọpi nke mkpughe a ga-nye ndị ogbe ndị Shaker (na nso Cleveland, Ohio) ma gụọ ihe nile dị na ya nye ha, mana ha jụrụ ya.

1–7, Ụbọchị ahụ na awa nke Kraịst ji-abịa ga-anọrọ n’enweghi onye ma ya ruo mgbe ọ bịara; 8–14, Ndị mmadụ aghaghị ichegharị, kwere n’ozi-ọma, ma rube isi n’emume-nso nile maka inweta nzọpụta; 15–16, Ọlụlụ di na nwunye bụ ihe Chineke hiwere; 17–21, Iri anụ bụ ihe a kwadoro; 22–28, Zaịọn ga-aba ụba ma ndị Leman ga-agbawa dịka okoko-rose tutu Ọbịbịa nke Ugboro Abụọ.

1 N̄aa-ntị n’okwu m, ụmụ odibo m Sidney, na Parley, na Leman; n’ihi na lee, n’ezie a sị m unu, na e nye m unu iwu-nsọ na unu ga-aga ma kwusaa ozi-ọma m nke unu nataworo, ọbụna otu unu si nata ya nye ndị Shaker.

2 Lee, a sị m unu, na ha chọrọ, ịma akụkụ ezi-okwu, mana ọbụghị ha nile, n’ihi na ha ezighị-ezi n’iru m ma kwesịrị ichegharị.

3 Ya mere, a na m eziga unu ndị odibo m Sidney na Parley, ikwusa ozi-ọma ahụ nye ha.

4 Na nwa odibo m Leman ka a ga-echi echichi nye ọrụ nke a, ka ọ wee nwee ike ịtụgharị kọta uche ya na ha, ọbụghị dịka nke ahụ nke ọ natara ha, mana dịka nke ahụ nke a ga-akụziri ya site n’aka unu ndị odibọ m; ma site n’ime otu a, a ga m agọzi ya, ma ọbụghị otu a ọ gaghị enwe ọgan’iru.

5 Otu a ka Onye-nwe kwuru; n’ihi na a bụ m Chineke, ma zipụwo kwa Ọkpara nke M Mụrụ Nanị ya n’ime ụwa maka mgbapụta nke ụwa, ma e nyewo m iwu-ọkụ na onye ahụ nke nabatara ya ka a ga-azọpụta, ma onye ahụ nke n’anabataghị ya ka a ga-ama ikpe–

6 Na ha emewo nye Ọkpara nke Mmadụ ọbụna dịka ha chọrọ rịị ma o werewo ike ya n’aka nri nke ebube ya, ma ugbụ a ọ na-achị n’elu-igwe nile ma ga-achịgide ruo mgbe ọ ga-arịdata n’ụwa ịdebe ndị-iro nile n’okpuru ụkwụ ya, nke oge ya dịkwa nso n’ọba aka—

7 Mụ, Onye-nwe Chineke, ekwuwo ya; mana awa na ụbọchị ahụ ọdịghị onye matara, ọbụladị ndị mụọ-ozi bi n’elu-igwe, ọbụghị ma ha ga-amata ruo mgbe ọ ga-abịa.

8 Ya mere, a chọrọ m ka mmadụ nile chegharịa, n’ihi na mmadụ nile nọ n’okpuru mmehie, ewezuga ndị ahụ m dọtara nye onwe m, ndị mmadụ dị-nsọ nke unu n’amataghị gbasara ha.

9 Ya mere, a sị m unu na e zipụwo m nye unu ọgbụgba-ndụ mgbe nile na-adigide m, ọbụna nke ahụ sitere na mmalite.

10 Ma nke ahụ nke m kweworo na nkwa e mezuwo m ya, ma mba nile nke ụwa ga-akpọ isi-ala nye ya; ma, ma ọ bụghị ha n’onwe ha, ha ga-alọda-ala, n’ihi na nke ahụ nke buliri onwe ya elu ugbu a ka a ga-eweda ike ya ala.

11 Ya mere, e nye m unu iwu-nsọ ka unu gaa n’etiti ndị a, ma sị ha dịka onye-ozi m mgbe ochie, nke aha ya bụ Peter:

12 Kwere n’aha nke Onye-nwe Jisus, onye nọọro n’ụwa, ma ga-abịa, mmalite na ọgwụgwụ;

13 Chegharịa ma mee baptism n’aha nke Jisus Kraịst dịka iwu-nsọ dị nsọ siri dị, maka nsachapụ nke mmehie nile;

14 Ma onye ọbụla mere nke a ga-anata onyinye nke Mụọ Nsọ, site n’ibịkwasị aka n’isi nke ndị okenye nke nzukọ-nsọ.

15 Ma ọzọ, n’ezie a sị m unu na onye ọbụla na-egbochi ịlụ di ma-ọbụ nwunye abụghị nke Chineke chiri echichi, n’ihi na ọlụlụ di na nwunye bụ ihe Chineke chiri echichi nye mmadụ.

16 Ya mere, iwu kwadoro na nwoke ga-enwe otu nwunye, ma ha abụọ ga-abụ otu anụ arụ, na ihe ndị a nile ka ụwa wee mezuo ihe eji kee ya.

17 Ma ka o wee ju n’ọnụ-ọgụgụ mmadụ, dịka okike ha tutu ụwa amalite.

18 Ma onye ọbụla na-egbochi iri anụ nile, na mmadụ ekwesikwaghị iri ya, e chighi ya site nke Chineke;

19 N’ihi na, lee, anụ ọhịa nile na anụ ufe nile nke ikuku, na nke ahụ na-esite n’ala pụta, ka e chiri maka mmadụ iri ha dịka nri na maka uwe, ma ka o wee nwee n’uju.

20 Mana enyeghi ya ka otu onye nwee karịa onye ọzọ, ya mere ụwa jupụtara na mmehie.

21 Ma ahụhụ ga-adịrị onye ọbụla nke kwafụrụ ọbara ma-ọbụ nke ji anụ arụ laa n’iyi ma o nweghị mkpa.

22 Ma ọzọ, n’ezie a sị m unu, na Ọkpara nke Mmadụ a gaghị abịa n’ụdị nke nwanyị, ma-ọbụ na nke nwoke na-eje njem n’ụwa.

23 Ya mere, ekwela ka e duhie unu, mana nọgide n’ịkwụsike na-elepụ-anya mgbe elu-igwe nile ga-eme mkpọtụ, ma ụwa ịma jijiji na ịma ririri gaa n’iru ma n’azụ dika onye n̄ụbigara mmanya oke, na mgbe a ga-ebuli ndagwurugwụ nile elu, na mgbe a ga-ewedata ugwụ nile ala, na mgbe ebe nkume nile ga-aghọ kwa ebe dị larịị—na ihe nile a mgbe mụọ-ozi ga-afụ opi ya.

24 Mana tutu nnukwu ụbọchị nke Onye-nwe ga-abịa, Jekọb ga-aba ụba n’ime ọzara, ma ndị Leman ga-agbawa dịka okoko-rose.

25 Zaịọn ga-aba ụba n’elu ugwu nta nile ma ga-an̄ụrị n’elu ugwu nile, ma a ga-agbakọta ọnụ n’ebe nke ahụ m họpụtaworo.

26 Lee, a sị m unu, gaanụ dịka m nyeworo unu n’iwu; chegharịa nụ site na mmehie nile nke unu; rịọnụ ma unu ga-arịọta; kụọ nụ aka ma a ga-emeghe ya nye unu.

27 Lee, a ga m aga n’iru unu ma bụrụ kwa onye na-aga n’azụ unu; ma a ga m anọ n’etiti unu, ma unu agaghị enwe mgbagwọ-ju-anya.

28 Lee, a bụ m Jisus Kraịst, ma a na m abịa ọsọ-ọsọ. Ọbụna otu a. Amen.