Akwụkwọ nsọ
Ozizi na Ọgbụgba-ndụ nile 38


Nkeji 38

Mpughe e nyere site n’aka Joseph Smith, onye-amụma, na Fayette, New York, 2 Jenuarị 1831 (History of the Church, 1:140–143). Ihe oge ya ruru bụ ọgbakọ nke nzukọ-nsọ.

1–6, Kraịst kere ihe nile; 7–8, ọ nọ n’etiti ndị-nsọ ya, ndị ga-ahụ ya na nso-nso a; 9–12, Anụ arụ nile mebiri-emebi n’iru ya; 13–22, O dotawo ala o kwere na-nkwa n’ihi Ndị-nsọ ya n’oge na mgbe ebighi-ebi; 23–27, Ndị-nsọ ka e nyere iwu ịbụ otu ma chee n’ụzọ dị elu maka onye ọzọ dịka otu ụmụnne; 28–29, ọtụtụ agha ka eburu amụma ya: 30–33, Ndị-nsọ nile ka-aga enye ike site n’elu ma na-ezipụ ha n’etiti mba nile; 34–42, Nzukọ-nsọ ka e nyere iwu ka o lekọta ndị ogbenye na ndị chọrọ enye m-aka ma ka ha chọọ akụ na ụba nke mgbe ebighi-ebi.

1 Otu a ka Onye-nwe Chineke gị kwuru, ọbụna Jisus Kraịst, Nnukwu A bụ M ahụ, Alfa na Omega, mmalite na ọgwụgwụ, onye ahụ na elekwasị mbara obosara nke mgbe ebighi-ebi, na usuu ndị agha na-enwu ọcha nke elu-igwe, tutu ekee ụwa;

2 Onye ahụ mazuru ihe nile, n’ihi ihe nile na-apụta ìhè n’anya m abụọ;

3 Abụ m otu onye ahụ nke kwuru, ma ụwa abụrụ ihe e kere, ma ihe nile biara site na m.

4 Abu m otu onye ahụ wereworo Zaịọn nke Inọk baa n’ime obi nke m na n’ezie, a sị m, ọbụna ka ha ra bụ ndị kwere n’aha m, n’ihi a bụ m Kraịst, ma n’aha nke m, site n’ima mma nke ọbara nke mụ kwafuworo, ka m jiworo rịọ arịrịọ n’iru Nna maka ha.

5 Kama lee, ndị fọdụrụ ndị ajọọ-mmadụ ka m dobere n’udọ-igwe nile nke ọchịchịrị ruo n’ikpe nke oke ụbọchị ahụ, nke ga-abịa n’ọgwụgwụ nke ụwa;

6 Ma ọbụna otu a ka m ga-eme ka edota ajọọ-mmadụ, ndị n’agaghị anụrụ olu m kama mesie-obi ha ike, ma ahụhụ, ahụhụ, ahụhụ, ga-abụ mbibi ha;

7 Kama lee, n’ezie, n’ezie, a sị m gị na-anya m nile nọ n’ebe ị nọ. Anọ m n’etiti unu ma unu enweghi ike ị hụ m;

8 Kama ụbọchị ahụ na-abịa ọsọ-ọsọ na ị ga-ahụ m, ma mara na m nọ n’ihi akwa mgbochi nke ọchịchịrị ka a ga-adọwa, onye a na-asachaghi a gaghị a nọ n’ụbọchị a.

9 Ya mere, kee ihe-okike n’ukwu gị ma nọrọ na njikere. Lee ala-eze ahụ bụ nke unu, ma onye-iro a gaghị emeri.

10 N’ezie a sị m unu, unu onwe-unu dị ọcha, ma ọbụghị unu nile; ma ọ-dịghị onye ọzọ m nwere ezi mmasị;

11 N’ihi na anụ arụ nile emebiwo n’iru m; ma ike nile nke ọchịchịrị na-emegide elu-ụwa nile, n’etiti ụmụ nke mmadụ, n’iru nke usuu nile nke ndị agha nke elu-igwe—

12 Nke mere ịdị-juu dịrị, ma mgbe ebighi-ebi nile nọ na mgbu, ma ndị mụọ-ozi nile nọ na-echere nnukwu iwu ahụ ka ha ghọọ mkpụrụ nke ụwa, ịchịkọta ata nile ka erechapụ ha n’ọkụ, ma lee, ndị-iro tụrụngwa.

13 Ma ugbụ a, a ga m egosị gị ihe omimi, ihe nke nọrịị n’ime ụlọ nzuzo nile, nke ga-eweta ọbụna mbibi unu mgbe oge na-aga, ma unu amaghị ya;

14 Kama ugbụ a a gwa m unu ya, ma agọziwo unu, ọbụghị n’ihi ajọọ-omume unu, ma-ọbụ obi ekweghị ekwe unu nile; n’ihi n’ezie ụfọdụ n’ime unu bụ ndị ikpe mara n’iru m, kama a ga m eme ebere nye adịgh-ike unu.

15 Ya mere, sienụ ike site ugbụ a; atụla egwu, n’ihi na ala-eze bụ nke unu.

16 Ma n’ihi nzọpụta unu a na m enye unu iwu-nsọ, n’ihi a nụwo m ekpere unu nile, ma ndị ogbenye emewo mkpesa n’iru m, ma ndị nwere akụ ka m meworo, ma anụ arụ nile bụ nke m, ma abụghị m onye na-ele mmadụ anya n’iru.

17 Ma e mewo m ka ụwa baa ụba, ma lee ọbụ ebe mgbakwasa ụkwụ m, ya mere, ọzọ a ga m eguzo n’elu ya.

18 Ma e wepụtara m ma chọọ inye akụ na ụba nile ndị karịrị, ọbụna ala ekwere na nkwa, ala na-eru na mmiri ara-ehi na mmanụ an̄u, ebe n’agaghị enwe nkọcha mgbe Onye-nwe ga-abịa.

19 Ma a ga m enye unu ya dịka ala nke nketa unu, ma unu jiri obi unu nile chọọ ya.

20 Ma nke a ga-abụ ọgbụgba-ndụ mụ na unu, unu ga-enwe ya dịka ala nke nketa unu, ma dịka ihe nketa nke ụmụ unu ruo mgbe nile, dịka ogologo oge ụwa ga-adigide, ma unu ga-enwe ya ọzọ na mgbe ebighi-ebi, na agaghị agafe.

21 Kama, n’ezie a sị m unu na-oge na-abịa unu agaghị enwe onye eze, ma-ọbu onye ọchịchị, n’ihi a ga m abụ eze unu ma lekọtakwa unu anya.

22 Ya mere, nụrụ olu m ma soro m, ma unu ga-abụ ndị nwere onwe ha, ma unu a gaghị enwe iwu nile ọzọ m’ọbụghị iwu nkem nile mgbe m bịara, n’ihi abu m onye na-enye iwu unu, ma-ọbụ gịnị ga-edebe aka m?

23 Kama, n’ezie a sị m unu kuzikọtara onwe unu dịka ọkwa ọrụ nke ahụ m nyere unu;

24 Ma ka onye ọbụla chee n’ụzọ di elu maka nwanne ya nwoke dịka onwe ya; ma na-emechi ezigbo-omume anya ma ịdị nsọ n’iru m.

25 Ma ọzọ a sị m unu, ka onye ọbụla chee n’ụzọ dị-elu maka nwanne ya nwoke dịka onwe ya.

26 N’ihi olee nwoke n’etiti unu nwere ụmụ nwoke iri na abụọ, ma ọbụghị onye n’ahụ otu n’anya karia ibe ya, ma ha nile na-erubere ya isi, ma ya asi otu: Ka eyinye gị ezigbo uwe mwụda ma ka ị nọrọ n’ebe a; ma onye nke ọzọ: Ka eyinye gị nkịkara akwa nile ma ka ị nọrọ n’ebe ahụ—ma ya elekwasị ndịkom ya anya ma sị a bụ m onye ikpe ziri ezi?

27 Lee nke a ka m nyere unu dịka ilu, ma ọ dị ọbụna dịka mụ onwe m, asị m unu, bụrụ otu, ma ọbụrụ na unu abụghị otu unu abụghịkwa nke m.

28 Ma ọzọ, a sị m unu na ndị-iro nọ n’ime ụlọ nzuzo nile na-achọ ndụ unu.

29 Unu na-anụ maka agha nile na mba nile dị anya, ma unu na-asị na a ga-enwe nnukwu agha nile na mba dị anya, kama unu amataghị obi nile nke ndị nwoke nke ala unu.

30 Ana m ekwuru unu ihe ndị a n’ihi ekpere unu nile; ya mere, tinye nụ amamihe n’obi unu, ma-ọbụ ajọọ-omume nke ụmụ mmadụ egosipụta ihe ndị a nile nye unu site n’ajọọ-omume ha, n’ụzọ nke ga-ekwu na-ntị nile n’olu dara ụda karịa nke ga-ama ụwa jijiji; ma ọbụrụ na unu nọrọ na-njikere unu agaghị atụ-egwu.

31 Ma ka unu nwe ike ịgbanarị ike nke ndị-iro, ma bụrụ ndị ezi-omume akpọkọtara nye m na-enweghi ntụpọ na ndị anapụghị ịta ụta—

32 Ya mere, n’ihi nke a e nyewo m unu iwu-nsọ ka unu gaa na Ohio; ma n’ebe ahụ ka m ga-enye unu iwu m; na n’ebe ahụ aga-enye unu onyinye dị nsọ nke ike si n’elu;

33 Ma site n’ebe ahụ, onye ọbụla m chọrọ ga-aga n’iru n’etiti mba nile, ma a ga-agwa ha ihe ha ga-eme; n’ihi e nwere m nnukwu ọrụ nke akpadoro, n’ihi Israel ga-enwe nzọpụta, ma a ga m edu ha ebe ọbụla m chọrọ ma onweghị ike ga-akwụsị aka m.

34 Ma ugbụ a, e nye m nzukọ-nsọ n’akụkụ ebe a nile iwu-nsọ, ka ahọputa ụfọdụ ndị nwoke n’etiti ha, ma a ga-ahọputa ha site n’olu nke nzukọ-nsọ;

35 Ma ha ga-elekọta ndị ogbenye na ndị chọrọ enyem aka, ma leba-anya na ịkwụsị mgbu ha ka ha ghara ịta ahụhụ; ma zipụ ha ruo ebe m nyere ha n’iwu;

36 Ma nke a ga-abụ ọru ha, ị nọ n’isi ihe gbasara ọdịnma nke ihe mnweta nke nzukọ-nsọ a.

37 Ma ha ndị nwere ala ubi nke a na-enweghi ike ire, ka ahapụ ha ma-ọbụ naa ụtụ na ha otu osi masị ha.

38 Hụkwa na echekwara ihe nile; ma mgbe e nyere ndị nwoke onyinye dị nsọ nke ike sị n’elu ma zipụ ha, ihe nile ndị a ka a ga-achịkọta na nlekọta nke nzukọ-nsọ.

39 Ma oburu na unu achọọ akụ na ụba nile nke bụ uche Nna inye unu, unu ga-abụ ndị kachasị baa ụba, n’ihi unu ga-enwe akụ na ụba nile mgbe ebighi-ebi; ma ọdị mkpa na akụ na ụba nile nke ụwa bụ nke m inye kama kpachapụ anya maka mpako ka unu ghara ịbụ ndị Nifaị mgbe ochie.

40 Ma ọzọ, a sị m unu, e nye m unu otu iwu-nsọ, ka nwoke ọbụla, ma okenye, onye nchu-aja, onye nkuzi, ma kwa onye otu, gaa site n’ume ya, site na ndọgbu-na ọrụ ya nke aka ya abuọ, ịkwado ma mezue ihe nile nke m nyeworo n’iwu.

41 Ma kwee ka nkwusa ozi-ọma unu bụrụ olu nke ịdọ-aka na-ntị, onye ọbụla nye onye agbata-obi ya, n’ịda jụrịị na ịdị nwayọ.

42 Ma si n’etiti ndị ajọọ-omume pụọ. Zọpụta nụ onwe unu. Diri nụ ọcha unu ndị n’ebu ngwa-ọrụ nke Onye-nwe. Ọbụna otua. Amen.