Akwụkwọ nsọ
Ozizi na Ọgbụgba-ndụ nile 110


Nkeji 110

Ọ́hụ̀ nile e gosipụtara nye Joseph Smith Onye-amụma na Oliver Cowdery n’ime Temple nọ na Kirtland, Ohio, 3 Epril 1836 (History of the Church, 2:435–436). Oge ahụ bụ nke nzukọ ụbọchị izu ike. Onye-amụma n’okwu nkọwa ndekọta nke ngosipụta nile a jiri okwu ndị a: “Na ehihie, e nyeere m Ndị-isi Nduzi ndị ọzọ a aka n’ikesasị oriri-nsọ nye nzukọ-nsọ, na-anata ya site n’aka Iri na Abụọ ahụ, ndị ọbụ ohere ha iduzi n’oche-nsọ n’ụbọchị nke a. Mgbe m rụsịrị ọrụ nke a nye ụmụnna m, a laghachiri m na pulpit, ebe emechikwara, akwa-mgbochi na hudata isi m, mụ na Oliver Cowdery, na ekpere ịda jụụ na nke ime-obi. Mgbe anyị bilitere n’ekpere, ọhụ nke a na-eso ka emeghere nye anyị abụọ” (History of the Church, 2:435).

1–10, Onye-nwe Jehova pụtara n’ebube na nabata Temple Kirtland dịka ụlọ nke ya; 11–12, Moses na Elaias n’onwe ha pụtara ma nyefee ọtụghe-ụzọ nile ha na ọkwa-ọrụ nile; 13–16, Elaịja lọghachịrị na nyefee ọtụghe-ụzọ nile nke ọkwa-ọrụ ya dịka Malakaị kwere na-nkwa.

1 aAkwa mgbochi ahụ ka ewepụrụ site n’uche anyị, na banya nile nke nghọta anyị ka emeghere.

2 Anyị hụrụ Onye-nwe ebe o guzo n’elu ihe mkpuchi nke pulpit, n’iru anyị; na n’okpuru-ukwu ya abụọ ka enwere ihe aruru n’ọrụ-aka nke ezigbo ọla-edo, na-acha edo-edo.

3 aAnya ya abụọ dịka ire nke ọkụ; agịrị nke isi ya dị ọcha dịka ezi snow; bmbara iru ya na-enwu karịa mmụke nke anyanwụ; na colu ya dịka ụda ọtụtụ nnukwu mmiri nile na-asọ-asọ, ọbụna olu ahụ nke dJehova, na-asị:

4 A bụ m aonye mbụ ahụ na onye ikpe azụ ahụ; a bụ m onye ahụ bna-adị ndụ, a bụ m ya onye ahụ egburu egbu; a bụ m onye cnkwuchita ọnụ unu n’ebe Nna nọ.

5 Lee, aagbagharawo unu mmehie nile unu; unu dị ọcha n’iru m; ya mere, welite nụ isi unu na n̄ụrịa ọn̄ụ.

6 Ka obi nile nke ụmụnna unu n̄ụrịa ọn̄ụ, na kwe ka obi ndị nke m nile n̄ụrịa ọn̄ụ, ndị, jiri ume ha, awuo ụlọ nke a n’aha nke m.

7 N’ihi lee, a anabatawo m bụlọ nke a, na aha nke m ga-anọ ebe a; na a ga m egosi onwe m nye ndị nke m n’ebere n’ụlọ nke a.

8 E, a ga m aegosi onwem nye ndị odibo m, na kwuoro ha okwu n’olu nke m, ọ bụrụ na ndị nke m ga-edebe iwu-nsọ m nile, na ghara bịmerụ ụlọ nkea cdị nsọ.

9 E obi nile nke puku nile na iri puku nile ga-an̄ụrị oke ọn̄ụ n’ihi angọzi nile nke a ga-awụpụta, na bonyinye dị-nsọ nke e jirila doo ụmụ odibọ m nsọ n’ụlọ nke a.

10 Ma ezi aha nke ụlọ nke a ga-agbasa ruo ala ndị-ọzọ nile; na nke a bụ mmalite nke ngọzi nke a aga-awụpụ n’elu n’isi ndị nke m. Ọbụna otu a. Amen.

11 Mgbe aọhụ nke a mechiri, elu-igwe nile ka emeghere ọzọ nye anyị, na bMoses pụtara n’iru anyị, na nyefee anyị cọtụghe-uzo nile nke dmkpọkọta nke ndị Israel site na akụkụ anọ nile nke ụwa, na nke odudu nke ebo iri site n’ala nke eelu elu.

12 Mgbe nke a gasịrị, aElaias pụtara, na nyefee bọkwa-ọrụ ahụ nke cozi-ọma nke Abraham, na-asị na n’ime anyị na na mkpụrụ anyị, ọgbọ nile ga-esochi anyị ga-adị ngọzi.

13 Mgbe emechiri ọhụ nke a, nnukwu ọhụ ọzọ dị ebube kpughepuru n’iru anyị; n’ihi na aElaịja onye-amụma ahụ, nke bewelara n’elu-igwe n’edetugh ọnwụ ire, guzoro n’iru anyị, na-asi:

14 Lee, oge ahụ abịawo n’uju ya, nke e kwuru maka ya site n’ọnụ nke Malakaị—n’agba-ama na ya (Elaịja) ka a ga-ezipụta, tutu ụbọchị ahụ dị ukwuu na dị egwu nke Onye-nwe abịa—

15 aỊtụgharị obi nile nke ndị bụ nna nye ụmụ ha, na ndị ụmụ nye nna ha, ka ụwa nile ghara ibu ihe e jiri ọbụbụ-ọnụ gburie—

16 Ya mere, ọtụghe-ụzọ nile nke ọgbọ nke a ka e nyefere n’aka unu abụọ; na site na nkea unu ga-ama na aụbọchị ukwu ahụ dị-egwu nke Onye-nwe dịkwa nso, ọbuna n’ọnụ ụzọ nile.