Akwụkwọ nsọ
Ozizi na Ọgbụgba-ndụ nile 95


Nkeji 95

Mkpughe e nyere site n’aka Joseph Smith Onye-amụma, na Kirtland, Ohio, 1 Jun 1833 (History of the Church, 1:350–352). Mkpughe nke bụ ịga-n’iru nke ntụzi-aka dị nsọ dịka iwu ụlọ nile maka ofufe na ndụmọdụ, nke ka nke ụlọ nke Onye-nwe (lee nkeji 88:119–136 na nkeji 94)

1–6, Ndị-nsọ ka a tara ahụhụ n’ihi ha enweghi ike iwu ụlọ nke Onye-nwe; 7–10, Onye-nwe chọrọ iwere ụlọ ya nye ndị ya onyinye dị-nsọ ya jiri ike sitere n’elu; 11–17, Ụlọ ahụ ka a ga-edo nsọ dịka ebe a na-efe ofufe na maka ụlọ akwụkwọ nke Ndị-ozi nile.

1 N’ezie, otu a ka Onye-nwe kwuru nye unu ndị m hụrụ n’anya, ma ndị m hụrụ n’anya ka m na kwa aata ahụhụ ka e wee nwee ike bịgbaghara mmehie ha, n’ihi na site n’ijiri ntaram ahụhụ a na m akwado ụzọ maka cnnapụta ha n’ihe nile site dn’ọnwụnwa, ma a hụwo m unu n’anya—

2 Ya mere, unu nwere mkpa ka a taa unu ahụhụ ma guzoro nara ịba mba n’iru m;

3 N’ihi na unu e mewo mmehie dị njọ megide m, n’ihi na unu atụgharịghị uche maka nnukwu iwu-nsọ ahụ n’ihe nile, nke m nyeworo unu gbasara iwu aụlọ nke m;

4 N’ihi na njikere nke m mere atụmatụ ya iji jikere ndị-ozi m aibecha ubi-vine m nke ikpe azụ, ka m wee weta na mmezu ọrụ bdị iche m, ka m wee cwụpụta Mụọ m n’elu anụ arụ nile—

5 Mana lee, n’ezie a sị m unu, na ha dị ọtụtụ ndị e chiworo echichi n’etiti unu, ndị m kpọworo mana ole na ole ka a ahọpụtaworo.

6 Ha ndị a n’ahọpụtaghị e mewo mmehie dị njọ, n’ihi na ha na eje-ije an’ọchịchịrị n’ehihie.

7 Ma n’ihi nke a e nyere m unu iwu-nsọ ka unu kpọọ ọgbakọ aofufe ime mụọ unu, ka bibu ọnụ nile nke unu na iri-uju unu bịarute na ntị abụọ nke Onye-nwe nke cSabaot, nke bụ na nsụgharị-asụsụ ya, donye okike nke ụbọchị mbụ, mmalite na ọgwụgwụ.

8 E, n’ezie a sị m unu, e nyere m unu iwu-nsọ na unu kwesịrị iwu ụlọ, n’ụlọ nke m mere atụmatụ ịnọ nye aonyinye dị-nsọ nye ndị nke m họpụtaworo jiri ike sitere n’elu;

9 N’ihi na nke a bụ ankwa nke Nna nye unu; ya mere e nye m unu iwu ka unu nọdụ, ọbụna dịka ndị-ozi m na Jerusalem.

10 Otu o sila dị, ụmụ odibo m mere mmehie dị oke njọ; ma andọrọ ndọrọ malitere bn’ụlọ akwụkwọ nke ndị-amụma; nke bụ ihe dị oke njọ nye m, ka Onye-nwe unu kwuru; ya mere e zipuru m ha ka ataa ha ahụhụ.

11 N’ezie a sị m unu, ọ bụ uche m ka unu wuo ụlọ. Ọ bụrụ na unu edebe iwu-nsọ m nile unu ga-enwe ike iwu ya.

12 Ọ bụrụ na unu aedebeghị iwu-nsọ m nile, bịhụnanya nke Nna agaghị anọgide n’etiti unu, ya mere unu ga-aga ije n’ọchịchịrị.

13 Ugbụ a nke a bụ amamihe, na uche nke Onye-nwe—ka e wuo ụlọ ahụ, ọ bụghị dịka ihe nlere-anya nke ndị ụwa, n’ihi na e nyeghị m unu na unu ga-ebi ndụ dịka n’ụdị nke ndị ụwa;

14 Ya mere, ka e wuo ya dịka n’ụdị nke m ga-egosi mmadụ atọ n’ime unu, ndị unu ga-ahọpụta ma chie ha echichi nye ike nke a.

15 Ma atụ ya ga-abụ ntụ iri-ise na ise na mbara, ma ka ọ dị ntụ iri isii na ise n’ogologo, n’ogige nke ime-ime ya.

16 Ma ka ebe dị ala n’akụkụ ogige nke ime-ime bụrụ ebe e doro nsọ nye m maka onyinye nke oriri-nsọ unu, na maka ikwu okwu chukwu, na ibu-ọnụ unu, na ikpe ekpere unu, na annyefesị nke ọchịchọ kachasị nsọ nke unu nye m, ka Onye-nwe unu kwuru.

17 Ma ka ebe dị elu nke akụkụ ogige ime-ime bụrụ ebe e doro nsọ nye m maka ụlọ akwụkwọ nke ndị-ozi nke m, ka Ọkpara nke aAhman kwụrụ; ma-ọbụ n’okwu ndị ọzọ, Alfus; ma-ọbụ, n’okwu ndị ọzọ, Omegus; ọbụna Jisus Kraịst bOnye-nwe unu. Amen.