Akwụkwọ nsọ
Ozizi na Ọgbụgba-ndụ nile 6


Nkeji 6

Mkpughe e nyere Joseph Smith Onye-amụma na Oliver Cowdery, na Harmony, Pennsylvania, Epril 1829 (History of the Church, 1:32–35). Oliver Cowdery bidoro ọrụ ya dịka onye ode-akwụkwọ na ntụgharị-asụsụ nke Akwụkwọ nke Mọmọn, 7 Epril 1829 O nwetaworịị aka-ebe nke mụọ maka ezi-okwu nke ọgbụgba-ama nke onye-amụma gbasara epekele ahụ ebe akanyere ndekọta nke Akwụkwọ nke Mọmọn. Onye-amụma jụrụ Onye-nwe site na Urim na Tumim ma nweta ọzịza nkea.

1–6, Ndị-ọrụ n’ime ubi nke Onye-nwe ga-enweta nzọpụta; 7–13, O nweghị onyinye karịrị onyinye nzọpụta; 14–27, Aka-ebe nke ezi-okwu na-abịa site n’ike nke Mụọ; 28–37, Lekwasị Kraịst anya, ma mee iheọma esepụghị-aka.

1 Oke ọrụ dị ịtụ n’anya na-achọ ịpụta-ìhè rute ụmụ nke mmadụ.

2 Lee, a bụ m Chineke; gee ntị n’okwu m, nke dị ndu di kwa ike, dị nkọ karịa mma-agha ọbụla nke nwere iru abụọ, ruo n’ịkewa ma njikọ ọkpụkpụ ma ụmị; ya mere gee ntị n’okwu m nile.

3 Lee, ụbị ahụ chara-acha na-echere owuwe ihe-ụbị; ya mere, onye chọrọ ịghọ, ka ọ tụba mma iwe ihe-ubi ya n’ike ya, ma ghọọ mgbe oge dị, ka ọ wee kpadokọtara mkpụrụ obi ya nzọpụta nke mgbe nile na-adigide n’ime ala-eze nke Chineke.

4 E, onye ọbụla ga-atụba mma iwe ihe-ubi ya ma ghọọ, onye ahụ ka Chineke kpọrọ.

5 Ya mere, ọ bụrụ na unu ga-arịọ m unu ga-anata; ọbụrụ na unu ga-akụ-aka a ga-emeghe-kwara unu.

6 Ugbụ a, dịka ị jụworo, lee, asị m unu, debe iwu-nsọ m nile, ma chọọ iwepụta ma hiwe ụzọ nke Zaịọn.

7 A chọla akụ na ụba kama chọọ amamihe, ma lee, ihe-omimi nile nke Chineke ka aga-egosi gị, ma mgbe ahụ ka a ga-eme ka ị baa ọgaranya. Lee, onye ahụ nke nwere ndụ ebighi-ebi bụ ọgaranya.

8 N’ezie, n’ezie, a sị m gị, ọbụna otu ahụ i si chọọ n’aka m otu ahụ ka ọ ga-adịrị gị; ma ọbụrụ na ị chọọ, ị ga-abụ ụzọ nke ime nnukwu ihe-ọma n’ọgbọ nke a.

9 Ekwụla ihe ọbụla ma ọbụghị nchegharị nye ọgbọ nke a; debe iwu-nsọ m nile, ma nyee aka iwepụta ọrụ nke m, dịka iwu-nsọ m nile siri dị, ma ị ga-abụ onye a gọzịrị-agọzị.

10 Lee ị nwere onyinye, ma ngọzi na-adịrị gị n’ihi onyinye gị. Cheta na ọ dị-nsọ ma sikwa n’elu bịa—

11 Ma ọbụrụ na ị ga-ajụ, ị ga-amata ihe-omimi nile dị nnukwu na ịtụ n’anya; ya mere ị ga-etinye onyinye gị n’ọrụ, ka i wee chọpụta ihe-omimi nile, ka i nwee ike ịkpọbata ọtụtụ na mmatazu nke ezi-okwu, e, doo ha anya bụ mmehie dị n’ụzọ ha nile.

12 Ekwela ka ndị ọzọ mata onyinye gị m’ọbụghị ndị gị na ha nọ n’otu okwukwe. Ejila ihe nile dị nsọ ka ihe efu.

13 Ọbụrụ na ị ga-eme ihe-ọma, e, ma kwesị ntụkwasị-obi ruo ọgwụgwụ, a ga-azọpụta gị n’ala-eze nke Chineke, nke bụ nke kachasị n’onyinye nile nke Chineke; n’ihi na ọdịghị onyinye karịrị onyinye nke nzọpụta.

14 N’ezie, n’ezie, a sị m gị, ngọzi ga-adịrị gị n’ihi ihe ị meworo; n’ihi na ị jụworo mụ, ma lee, dịka ọtụtu mgbe ị jụworo ị nataworo ntụzi-aka nke Mụọ m. A sị na ọbụghị otu a, ị garaghị abịaru n’ebe a ị nọ n’oge nkea.

15 Lee, ị matara na ị jụwo m ajụjụ ma e mere m ka uche gị mata; ma ugbua anam-agwa gị ihe ndị a nile ka ị wee mara na Mụọ nke ezi-okwu emewo ka ị mata;

16 E, a gwa m gị, ka ị wee mara na onweghị onye ọzọ n’abụghị nanị Chineke nke matara uche gị nile na nzube nile nke obi gị.

17 A na m agwa gị ihe ndịa dịka ihe aka-ebe nye gị—ma okwu nile ma-ọbụ ọrụ nke ị nọ na-ede bụ ezi-okwu.

18 Ya mere rusie ọrụ ike; nyere nwa odibo m Joseph aka, na-ikwesi ntụkwasị-obi, n’ụdị ọnọdụ ihe-isi-ike nile ọbụla o nwere ike ịbanye n’ihi okwu ahụ.

19 Baa mba n’iri mpe ya nile, nakwa nabatakwa ịba mba nke ya. Nwee ndidi; nwee anya udo; jisikwa onwe gị ike; nwee ndidi, okwukwe, olile-anya na afọ-ọma.

20 Lee, gị bụ Oliver, ma agwawo m gị okwu maka ọchịchọ gị nile; ya mere kpadokọta okwu ndị a n’obi gị. Kwesị ntụkwasị-obi ma na-arụsị ọrụ ike n’idebe iwu-nsọ nile nke Chineke, ma a ga m ewere aka nke ihu-n’anya m gbaa gị gburu gburu.

21 Lee, a bụ m Jisus Kraịst, Ọkpara nke Chineke. A bụ m onye ahụ bịakwutere nke m, ma nkem anabataghị m. A bu m ìhè ahụ na-amụke n’ọchịchịrị, ma ọchịchịrị ahụ aghọtaghị ya.

22 N’ezie, n’ezie, a si m gị, ọbụrụ na ị chọọ ihe aka-ebe ọzọ, kpọrọ uche gị gaa n’abalị ahụ ị kwaara mụ akwa n’ime obi gị, ka ị wee mara maka ezi-okwu dị n’ihe ndị a.

23 Ọ bụ na mụ ekwughị udo nye obi gị gbasara okwu a? Gịnị bụ aka-ebe dị nnukwu ị ga-enweta karia site n’aka Chineke?

24 Ma ugbua, lee, ị natawo ihe aka-ebe; n’ihi ọbụrụ na m agwawo gị ihe nile nke n’enweghị mmadụ ọbụla maara ya, ọ bụ na ị nwetabeghi ihe aka-ebe?

25 Ma, lee, e nyewo m gị onyinye, ọbụrụ na ị chọrọ ịnata m, ịtụgharị-asụsụ, ọbụna dịka nwa odibo m Joseph.

26 N’ezie, n’ezie, a sị m gị na e nwere akụkọ-ndekọta nile nke nwere ọtụtụ nke ozi-ọma m, nke ejichiworo n’ihi ajọọ-omume nke ụmụ mmadụ;

27 Ma ugbụ a e nye m gị iwu, na ọbụrụ na i nwee ọchịchọ nile dị mma—ọchịchọ nke ikpadokọtara onwe gị akụ nile n’elu-igwe—mgbe ahụ ka ị ga-enye aka iwepụta n’ìhè, site n’onyinye gị, akụkụ Akwụkwọ nsọ m nile ndị nke e zoro n’ihi ajọọ-omume.

28 Ma ugbụ a, lee, e nye m gị, ma kwa nwa odibo m Joseph, ọtụghe-ụzọ nile nke onyinye nke a, nke ga-ewepụta n’ìhè mgbasa-ozi nke a; ma n’ọnụ ndị-aka-ebe abụọ ma-ọbụ atọ ka a ga ehiwe mkpụrụ-okwu ọbụla.

29 N’ezie, n’ezie, a sị m unu, ọ buru na ha ajụ okwu m nile, na akụkụ nkea nke ozi-ọma m na mgbasa-ozi m, ngọzi na-adịrị unu, n’ihi na ha agaghị eme nye unu karịa nke ha mere nye m.

30 Ma ọbụrụ na ha eme nye unu ọbụna dịka ha meworo nye m, ngọzi na-adịrị unu, n’ihi na mụ na unu ga-anọ n’ebube.

31 Kama ọ bụrụ na ha ajughị okwu m nile, nke a ga-ehiwe site n’ịgba-ama nke a ga-enye, ngọzi na-adịrị ha, ma mgbe ahụ ka unu ga-enwe ọn̄ụ n’ime mkpụrụ nke ọrụ unu nile.

32 N’ezie, n’ezie, a sị m unu, dịka m gwara ndị na-eso-ụzọ m, ebe mmadụ abụọ ma-ọbụ atọ zukọworo n’aha m, dịka gbasara otu ihe, lee, n’ebe ahụ ka m ga-anọ n’etiti ha—ọbụna otu ahụ ka m nọ n’etiti unu.

33 Unu atụla egwu ime ihe-ọma, ụmụ m ndịkom, n’ihi na mkpụrụ ọbụla mmadụ na-akụ, nke ahụ ka ọ ga-aghọkwa, ya mere, ọbụrụ na i kụọ mkpụrụ ọma ị ga-aghọta ihe-ọma ka ụgwọ-ọrụ gị.

34 Ya mere, atula egwu, igwe-anụ nta; mee ihe-ọma; ka ụwa na ala-mụọ gwakọta megide gị, n’ihi na ọbụrụ na e wuru unu n’elu oke nkume m, ha agaghị emeri unu.

35 Lee, a naghị m ama unu ikpe; gaanụ n’ụzọ unu nile ma unu emehiekwala ọzọ; rụọ nụ n’anya udo ọrụ nke m nyeworo unu n’iwu.

36 Lekwasịnụ m anya n’echiche ọbụla; enwela obi-abụọ, atụla ụjọ.

37 Lee mmerụ-arụ nile nke dụpuru akụkụ m, nakwa apa ntu nile nọ n’aka m abụọ ma n’ukwu m abụọ; kwesi ntụkwasị-obi, debe iwu-nsọ m nile, ma unu ga-eketa ala-eze nke elu-igwe. Amen.