Akwụkwọ nsọ
Ozizi na Ọgbụgba-ndụ nile 8


Nkeji 8

Mkpughe e nyere site n’aka Joseph Smith Onye-amụma nye Oliver Cowdery, na Harmony, Pennsylvania, Epril 1829 (History of the Church, 1:36–37). Mgbe a nọ na-atụgharị-asụsụ Akwụkwọ nke Mọmọn, Oliver, onye nọkwarịị na-arụ ọrụ dịka onye ode-akwụkwọ, na-ede mkpọpụta nke onye-amụma, chọrọ ka e nyekwasị ya onyinye nsọ nke ịtụgharị-asụsụ. Onye-nwe zaghachiri arịrịọ ya site n’inye mkpụghe nke a.

1–5, Mkpughe na-abịa site n’ike nke Mụọ Nsọ; 6–12, Mmata ihe-omimi nile nke Chineke nakwa ike nke eji atụgharị-asụsụ akụkọ-ndekọta ndị ochie nile na-abịa site n’okwukwe.

1 aOliver Cowdery, n’ezie, n’ezie, a sị m gị, dịka anyị maara na Onye-nwe na-adị ndụ, onye bụ Chineke gị na Onye-mgbapụta gị, ọbụna otu a n’ezie ka ị ga-anata bọmụma-ihe nke ihe nile ọbụla nke ị cga-arịọ n’okwukwe, ma n’obi kwụ-ọtọ, kwere na ị ga-anata ọmụma-ihe gbasara ihe nkanye nile nke dakụkọ-ndekọta ochie, nke bụ nke mgbe ochie, nke nwere akụkụ akwụkwọ-nsọ nile ndị ahụ nke e kwuworo sịte na engosipụta nke Mụọ m.

2 E, lee, a ga m aagwa gị n’ime uche gị ma n’ime bobi gị, site na cMụọ Nsọ, nke ga-adakwasị gị na nke ga-ebikwa n’ime obi gị.

3 Ugbua, lee, nke a bụ mụọ nke mkpụghe; lee, nkea bụ mụọ nke Moses ji mee ka ụmụ nke Israel gafee aOke Osimiri Uhie n’ala akọrọ.

4 Ya mere nke a bụ onyinye gị; dabere na ya, ma ngọzi ga-adịrị gị, n’ihi na ọ ga-anapụta gị site n’aka nke ndị-iro gị, mgbe, asị n’ọbụghị otu a, ha ga-egbu gị ma weta mkpụrụ-obi gị na mbibi.

5 O, cheta aokwu nile ndị a, ma debe iwu-nsọ m nile. Cheta, nke a bụ onyinye gị.

6 Ugbụ a nke a abụghị onyinye gị nile; n’ihi na ị nwere onyinye ọzọ, nke bụ onyinye nke Erọn; lee, ọ gwawo gị ọtụtụ ihe;

7 Lee, ọ dịghị ike ọzọ, m’ọbụghị ike nke Chineke, nwere ike ime ka onyinye nke a nke Erọn dịgide na gị.

8 Ya mere, enwekwala obi-abụọ; n’ihi na ọ bụ onyinye nke Chineke; ma ị ga-ejide ya n’aka gị, ma rụọ ọrụ ịtụn’anya nile; ma o nweghị ike nwere ike iwepụ ya site n’aka gị, maka na ọ bụ ọrụ nke Chineke.

9 Ma, ya mere, ihe-ọbụla ị ga-arịọ ka m gwa gị site n’ụzọ ahụ, nke ahụ ka m ga-enye gị, ma ị ga-enwe mmata gbasara ya.

10 Cheta na n’enweghi aokwukwe ị pụghị ime ihe ọbụla; ya mere rịọ n’okwukwe. Ejila ihe ndị a eme ihe-efu; barịọkwala maka ihe ị n’ekwesịghị.

11 Rịọ ka ị wee mata ihe-omimi nile nke Chineke, ma ka i wee nwee ike aịtụgharị-asụsụ ma nata ọmụma-ihe nke si n’akụkọ-ndekọta ochie ndị ahụ nile nke e zoro-ezo; nke dị nsọ; ma dịka okwukwe gị siri dị otu a ka a ga-emere gị.

12 Lee, ọ bụ m kwuru ya; ma a bụ m otu onye ahụ nke kwuuru gị okwu sịte na mmalite. Amen.