Akwụkwọ nsọ
Ozizi na Ọgbụgba-ndụ nile 4


Nkeji 4

Mkpughe e nyere site n’aka Joseph Smith Onye-amụma nye nna ya, Joseph Smith, Ukwụ, na Harmony, Pennsylvania, Februarị 1829 (History of the Church, 1: 28).

1–4, Ọrụ pụtara ìhè na-azọpụta ndị-ozizi-ozi-ọma nke Onye-nwe; 5–6, Omume iyi-Chineke nile na-eme ka ha tozuo oke maka ije-ozị; 7, Ihe nile nke Chineke ga-abụrịrị ihe a na-achụso.

1 Ugbualee, ọrụ dị ịtụ n’anya na-aga ịpụta ìhè n’etiti ụmụ nke mmadụ.

2 Ya mere, O unu ndị na-esonye n’ije-ozị nke Chineke, hụ na unu jeere ya ozi jiri obi unu nile, ike, uche na ume, ka unu nwee-ike iguzo na-enweghi ụta n’iru Chineke n’ụbọchị ikpeazụ.

3 Ya mere, o bụrụ na unu enwee ọchịchọ ijere Chineke ozi a kpọrọ unu n’ọrụ ahụ;

4 N’ihi na lee ụbị ahụ chara-acha na-echere owuwe-ihe-ụbị; ma hụrụ, onye tụbara mma iwe ihe-ụbị n’ike ya, onye ahụ na-akpadokọta ka ọ ghara ịla-n’iyi, mana weta nzọpụta nye mkpụrụ-obi ya;

5 Ma okwukwe, olile-anya, afọ-ọma na ịhụnanya, jiri anya lekwasị nanị n’otuto nke Chineke, na-eme ka o tozuo ịrụ ọrụ ahụ.

6 Cheta okwukwe, ezigbo-omume, mmata-ihe, n’ijisi-onwe-unu-ike, ndidi, obi nwanne, ndụ iyi Chineke, afọ-ọma, ịdị-umeala, ịrụsi-ọrụ-ike.

7 Rịọ, ma unu ga-anata; kụọ aka, ma a ga-emeghere unu. Amen.