Akwụkwọ nsọ
Ozizi na Ọgbụgba-ndụ nile 74


Nkeji 74

Mkpughe e nyere Joseph Smith Onye-amụma, na Hiram, Ohio, Jenuarị 1832 (History of the Church, 1:242). Onye-amụma na-ede: “N’ịnata okwu Onye-nwe a natasịworo (OznỌd. 73), a malitere m ọzọ ịtụgharị asụsụ nke Akwụkwọ-nsọ nile, ma rụsie ọrụ ike rue mgbe ọgbakọ bịaruru nso, bụ nke a gaara-agbakọ na 25 nke Jenuarị. N’oge nkea a natakwara m ihe ndia na-eso, dịka Akwụkwọ-ozi nke Mbụ e degaara ndị Kọrịnt, isi asaa, ama okwu iri na anọ” (History of the Church, 1:242).

1–5, Pọl na-enye ndị Nzukọ-nsọ nke oge ya ndụmọdụ ka ha ghara idebe iwu nke Moses; 6–7, Ụmụ-ntakịrị dị nsọ ma e dokwara ha nsọ site na Aja Mgbaghara Mmehie.

1 N’ihi na di nke an’ekweghị ekwe ka e doro nsọ site na nwunye ya, ma nwunye nke n’ekweghị ekwe ka e dowokwara nsọ site na di ya, n’ihi na ma ọdighị otua ụmụ unu ga-abụ ụmụ n’adịghị ọcha, mana ugbụ a ha dị nsọ.

2 Ugbụ a, n’ime ụbọchị nile nke ndị-ozi m iwu nke ibi-ugwu ka e nwere n’etiti ndị Juu nile n’ekweghị n’ozi ọma nke Jisus Kraịst.

3 Ma o wee ruo na e nwere nnukwu andọrọ-ndọrọ n’etiti ndị mmadụ gbasara iwu nke bibi-ugwu n’ihi na di ahụ n’ekweghị ekwe chọrọ ka ụmụ ya bụrụ ndị e biri ugwụ ma bụrụ ndị nọ n’okpuru ciwu nke Moses, bụ iwu nke mezuworo.

4 Ma o wee ruo na ụmụ ha, n’ihi na ha toro n’okpuru iwu nke Moses, sonyere aomenala nile nke ndị nna ha ma na-ekweghị n’ozi-ọma nke Kraịst, nke mere ha adịghịkwa nsọ.

5 Ya mere, n’ihi nke a, onye-ozi degaara nzukọ-nsọ, na-enye ha iwu-nsọ, ọbụghị site na Onye-nwe kama site n’onwe ya, ka onye kwere ekwe ghara aịlụkọta ya na onye n’ekweghị ekwe; ma ọbụghị otu a biwu nke Moses ga-abụ ihe etufuru site n’etiti ha,

6 Ka ụmụ ha nwe ike ịnọrọ n’ebighi ugwụ; ma ka omenala ahụ bụrụ ihe e tufuru, nke na-asi na ụmụ-ntakịrị adịghị ọcha; n’ihi na e nwere ya n’etiti ndị Juu;

7 Mana aụmụ-ntakịrị dị bọcha, bụrụ kwa ndị cedoro-nsọ site na daja mgbaghara mmehie nke Jisus Kraịst; ma nke a bụ ihe akwụkwọ-nsọ nile pụtara.