Akwụkwọ nsọ
Ozizi na Ọgbụgba-ndụ nile 3


Nkeji 3

Mkpughe e nyere Joseph Smith Onye-amụma, na Harmony, Pennsylvania Julaị 1828, maka ibe-akwụkwọ dị 116 atụgharịrị asụsụ ha furu efu sitere n’akụkụ nke mbụ nke Akwụkwọ nke Mọmọn, nke a kpọrọ akwụkwọ nke Lihaị. Onye-amụma ahụ jiiri ntamu kwere ka ibe akwụkwọ ndịa site na nchekwa ya fee n’aka Martin Harris, onye rụworo ọrụ nwoge-nta dịka onye ode-akwụkwọ na ntụgharị-asụsụ nke Akwụkwọ nke Mọmọn. E nyere mkpughe a site na Urim na Tumim (History of the Church, 1:21–23.) (Lee kwa nkeji 10.)

1–4, Ụzọ nke Onye-nwe bụ otu gburu-gburu ebighi-ebi; 5–15, Joseph Smith ahaghị ichegharị ma-ọbụ a napụ ya onyinye nke ntụgharị-asụsụ; 16–20, Akwụkwọ nke Mọmọn ahụ na-apụta iji gbapụta mkpụrụ-afọ nke Lihaị.

1 Ọrụ nile, na atụmatụ nile, na ebum-n’obi nile nke Chineke agaghị enwe ihe ga-akwụsị ya, ma-ọbụ ihe ga-enwe ike ime ka ọ bụrụ ihe efu.

2 N’ihi Chineke anaghị eje-ije n’ụzọ gbagọrọ agbagọ, ọbụghị ma ọ na-atụgharị chee iru n’aka nri ma-ọbụ n’aka ekpe, ọ bụghị ma ọ na-agbanwe site n’ihe o kwuworo, ya mere ụzọ ya guzoro kwem, ma ụzọ ya bụ otu gburu-gburu ebighi-ebi.

3 Cheta, cheta na ọ bụghị ọrụ nke Chineke ka a na-akwụsị, kama ọrụ nke mmadụ;

4 N’ihi na ọbụladị na mmadụ nwere ike inwe ọtụtụ mkpụghe, ma nwee ike ịrụ ọtụtụ oke ọrụ, ma na ọbụrụ na ọ na-anya isi n’ihi ike ya, ma kpọọ ya ihe efu bụ ndụmọdụ nile nke Chineke, ma soro mmasị nile nke uche nke onwe ya na oke ọchichọ nile nke anụ arụ, ọ ghaghị ịda ma nweta ịbọ-ọbọ nke Chineke ziri-ezi n’arụ ya.

5 Lee, a ranyewo ihe ndị a n’aka gị, mana lee otu iwu-nsọ gị nile siri sie ike; ma chetakwa nkwa nile nke e kwere gị, ma ọbụrụ na i jehieghị na ha.

6 Ma lee, ọtụtụ mgbe i jehieworo iwu-nsọ nile na iwu nile nke Chineke, ma gawo n’iru na nkwagide nile nke ndị mmadụ.

7 N’ihi na, lee, ị kwesịghịrị ịtu-egwu mmadụ karịa Chineke. Ọbụnadị na mmadụ kpọrọ ndụmọdụ nile nke Chineke ihe efu, ma na-eleda okwu ya nile anya—

8 Ma na i kwesịrịriị ikwesị ntụkwasị obi; ma ọ gaararịị esetịpụwo aka ya ma kwadoworị gị megịde ụta-ọkụ nile na-enwu enwu nke onye-iro; ma ọ gaararịị anọgide gị n’oge nile nke nsogbu.

9 Lee, ị bụ Joseph, ma a họọrọ gị ịrụ ọrụ nke Onye-nwe, mana n’ihi njehie, ma ọ bụrụ na ị kpachapụghị anya, ị ga-ada.

10 Mana cheta, Chineke bụ onye ebere; ya mere, chegharịa n’ihe ahụ ị mere nke megidere ịwụ-nsọ m nyere gị, ma ị ka bụkwa onye a họọrọworo bụrụkwa onye a kpọrọ ịrụ ọrụ ahụ ọzọ;

11 M’ọbụghị ma ị mere nke a, ị ga-abụ onye araara nye ma dịkwa ka ndị nwoke ndị-ọzọ, ma na-enwekwaghị onyinye ọzọ.

12 Ma mgbe ị nyefeworo ihe ahụ nke Chineke nyere gị ịhụ-ụzọ na ike ịtụgharị-asụsụ ya, ị nyefewo ihe ahụ dịịrị nsọ n’ọba-aka nke ajọọ mmadụ.

13 Onye kpọworo ndụmọdụ nile nke Chineke ihe-efu, ma mebiwo ikwe nkwa nile kachasị ịdị nsọ ndị e mere n’iru Chineke, ma daberewo na mkpebi nke onwe ya ma nyawo-isi n’amamihe ya.

14 Ma nke a bụ ihe mere i ji tufue ohere gị nwa mgbe nta—

15 N’ihi na ị kweere ka ndụmọdụ onye-ntuzi-aka gị bụrụ ihe a zọgidere n’okpuru ukwu site na mmalite.

16 Otu o sila dị, ọrụ nke m ga-aga n’iru, n’ihi na ọbụrụraa na ọmụma-ihe nke Onye-nzọpụta abịakwutawo ụwa, site n’ọgbụgba-ama nke ndị Juu, ọbụna otu a ka ọmụma-ihe nke otu Onye-nzọpụta ga-abịakwute ndị nke m—

17 Ma ruo ndị Nifaị, ma ndị Jekọb, ma ndị Josef na ndị Zorọm, site n’ọgbụgba-ama nke ndị nna ha—

18 Ma ọgbụgba-ama a ga-abịa na mmata-ihe nke ndị Leman, ndị Lemuel, na ndị Ishmael ndị lara-azu site n’ekweghị-ekwe n’ihi ajọọ-omume nke ndị nna ha, ndị Onye-nwe kweere ka ha bibie ụmụnne ha ndị Nifaị, n’ihi ajọọ-omume ha nile na ihe arụ ha nile.

19 Ma n’ihi nzube nke a ka e chekwara epekele ndị a, nke nwere akụkọ-ndekọta nile ndia—ka nkwa nile nke Onye-nwe bụrụ ihe e mezuru, nke o mere nye ndị ya;

20 Ma ha ndị Leman nwee ike ịbịa na mmata nke ndị nna ha, na ka ha wee mata nkwa nile nke Onye-nwe, ma ka ha wee kwere n’ozi-ọma ma dabere n’uru nile nke Jisus Kraịst, ma bụrụ ndị ebuliri-elu site n’okwukwe n’aha ya, ma site na nchegharị ha e nwere ike zọpụta ha. Amen.