Akwụkwọ nsọ
Ozizi na Ọgbụgba-ndụ nile 115


Nkeji 115

Mkpughe e nyere site n’aka Joseph Smith Onye-amụma na Far West, Missouri, 26 Epril 1838, n’eme ka-amara uche nke Chineke gbasara iwulite ebe ahụ na kwa ulọ nke Onye-nwe (History of the Church, 3:23–25). Mkpughe nke a ka e nyere ndị-ọrụ nduzi nile nke Nzukọ-nsọ.

1–4, Onye-nwe kpọrọ nzukọ-nsọ ya Nzụkọ nke Jisus Kraịst nke Ndị-nsọ Ụbọchị-Ikpeazụ a; 5–6, Zaịọn na stek ya nile bụ ebe mgbochi na ebe mgbaba maka ndị nsọ nile; 7–16, Ndị nsọ nile ka e nyere iwu, iwu otu ụlọ nke Onye-nwe na Far West; 17–19, Joseph Smith ji ọtụghe ụzọ nile nke ala-eze Chineke n’elu ụwa.

1 N’ezie otu a ka Onye-nwe kwuru nye gị, nwa odibo m aJoseph Smith, Nta, na nye kwa nwa odibo m bSidney Rigdon, na kwa nwa odibo m cHyrum Smith, na ndị-ndụmọdụ unu ndị akpọrọ na ndị a ga-akpọ ma emesịa;

2 Na kwa nye gị, nwa odibo m aEdward Partridge, na ndị ndụmọdụ ya;

3 Na kwa nye ụmụ odibọ m ndị kwesịrị ntụkwasị-obi ndị bụ ndị kansụl dị elu nke nzukọ-nsọ m na Zaịọn, n’ihi otu a ka-a ga-akpọ ya, na nye ndị okenye nile na ndị mmadụ nke Nzụkọ m nke Jisus Kraịst nke Ndị-nsọ Ụbọchị-Ikpeazụ a, ekposasịrị na mba ndị-ọzọ n’ime ụwa nile.

4 N’ihi otua ka a ga-akpọ anzukọ-nsọ m n’ụbọchị ndị ikpeazụ, ọbụna bNzụkọ nke Jisus Kraịst nke Ndị-nsọ Ụbọchị-Ikpeazụ a.

5 N’ezie a sị m unu nile: aBilite na gbukepụta, ka ìhè gị bụrụ bihe nlere-anya nye mba nile;

6 Na ka amkpọkọta ahụ n’ọtụ ebe n’ala nke bZaịọn, na kwa na cstek ya nile, ga-abụ maka mgbochi, na maka debe mgbaba pụọ na ebili mmiri, na kwa n’oke-iwe mgbe a ga-eawụpụ ya n’enweghi ngwagbu n’elu ụwa nile.

7 Kwee ka mba, Far West, bụrụ ebe dị nsọ na ebe e doro-nsọ nye m; na a ga-akpọ ya ebe kachasị nsọ, n’ihi ala ahụ nke iguzo na ya dị ansọ.

8 Ya mere, e nye m gị iwu ka i awuo otu ụlọ nye m, n’ihi mgbakọta nke ndị nsọ m, ka ha wee bfee m ofufe.

9 Na ka e nwee mmalite nke ọrụ nke a, na itọ ntọ-ala, na ọrụ njikere, na summer nkea na-eso;

10 Na ka a malite na abali anọ nke ọnwa Julaị na-abịa; na site n’oge ahụ gawa ka ndị m rụsie ọrụ ike iji wuo otu ụlọ n’aha nke m;

11 Na nime aotu afọ site n’ụbọchị taa ka ha malite gharịa ịtọ ntọ-ala nke bụlọ m.

12 Si otu a, ka ha site n’ọge ahụ gawa rụsie ọrụ ike ruo mgbe ọ ga-agwụ, site na nkume njikọ ruo n’elu ya nile, ruo mgbe n’ọdịghị ihe fọdụrụ nke n’arụchabeghị.

13 N’ezie a sị m unu, ekwela ka nwa odibo m Joseph, ọbụghị ma-ọbụ nwa odibo m Sidney, b’ụghị nwa odibo m Hyrum, banye n’ụgwọ ọzọ maka ịwụ ụlọ nye aha nke m.

14 Mana ka e wuo otu ụlọ nye aha m dịka an’ụdị nke m ga-egosi ha.

15 Na ọ bụrụ na ndị m ewughi ya dịka n’ụdị nke m ga-egosi ndị-isi nduzi ha, a gaghị m anabata ya n’aka ha nile.

16 Mana ọ bụrụ na ndị m ewuo ya dịka n’ụdị nke m ga-egosi ndị-isi nduzi ha, ọbụna nwa odibo m Joseph na ndị ndụmọdụ ya, mgbe ahụ a ga m anabata ya n’aka nile nke ndị m.

17 Ma ọzọ, n’ezie a sị m unu, ọ bụ uche m na obodo ukwu nke Far West ga-abu ebe ewuchapụrụ ọsọ-ọsọ site na ọgbakọ nke ndị nsọ m;

18 Na kwa ka a họpụta ebe ndị ọzọ maka astek, na mpaghara nile gbaa gburu-gburu, dịka a ga-egosi ya nye nwa odibo m Joseph, site n’oge ruo n’oge.

19 N’ihi lee, a ga m anọnyere ya, na a ga m edo ya nsọ n’iru ndị mmadụ; n’ihi ọ bụ ya ka m nyeworo aọtụghe ụzọ nile nke ala-eze nke a na ije ozi ya. Ọbụna otu a. Amen.