Akwụkwọ nsọ
Ozizi na Ọgbụgba-ndụ nile 9


Nkeji 9

Mkpughe e nyere site n’aka Joseph Smith Onye-amụma nye Oliver Cowdery, na Harmony, Pennsylvania, Epril 1829 (History of the Church, 1:37–38). A dọrọ Oliver aka-na-ntị ka o nwee ndidi ma gbaa ya ume ka o nwee afọ-ojuju n’ide akwụkwọ, n’oge ugbụ a, mgbe onye ntụgharị-asụsụ na-akpọpụta, kama ịnwa ịtụgharị-asụsụ.

1–6, Akụkọ-ndekọta ochie ndị ọzọ dịkwa a ga-atụgharị; 7–14, A na-atụgharị asụsụ Akwụkwọ nke Mọmọn site n’ọmụmụ-ihe ma na nkwesi-ike nke mụọ.

1 Lee, a sị m gị, nwa m nwoke, ma n’ihi na ị atụgharịghị-asụsụ dịka ihe ị chọrọ n’aka m siri dị, ma wee malite ọzọ bidere nwa odibo m Joseph Smith, Nta, ihe, ọbụna otu a a chọrọ m ka ị gaa-n’iru tutu ruo mgbe ị mesịworo ndekọta akụkọ nke a, nke m nyefeworo ya.

2 Ma mgbe ahụ, lee, aakụkọ-ndekọta bndị-ọzọ ka m nwere, ndị m ga-enye gị ike ka i nye-aka tụgharịa-asụsụ ya.

3 Nwere ndidi, nwa m nwoke, n’ihi na ọ bụ amamihe n’ime m, na o kwesịghị ekwesị na ị ga-atụgharị-asụsụ okwu n’oge nke ugbụ a.

4 Lee, ọrụ nke a kpọrọ gị ịrụ bụ idere nwa odibo m Joseph ịhe.

5 Ma, lee, ọ bụ n’ihi na ị gaghị n’irụ dịka i siri malite, mgbe ị bidoro ịtụgharị-asụsụ, mere m ji were ohere ahụ site n’aka gị.

6 Atamula antamu, nwa m nwoke, n’ihi na ọ bụ amamihe n’ime m ka m jiri meso gị otu a.

7 Lee, ị ghọtabeghị; ị cheworo na m gaara enye gị ya, mgbe ị na-echeghị echiche ma ọbụghịrị ịrịọ m.

8 Mana, lee, a sị m gị, na ị aga-echepụta echiche n’ime uche gị; mgbe ahụ ị bga-arịọ m ma o ziri-ezi, ma ọbụrụ na o ziri-ezi a ga m eme ka cobi gị dkpọọ ọkụ n’ime gị; ya mere, ị ga-enwe emmetụta na ọ bụ ihe ziri-ezi.

9 Mana ọbụrụ na ọ bụghị ihe ziri-ezi ị gaghị enwe ụdị mmetụta nile a, ma ị ga-enwe aịda mba nke echiche nke ga-eme ka i chefuo ihe nke n’ezighị-ezi, ya mere, ị gaghị enwe ike ide ihe ahụ nke dị nsọ m’obụghị ma e nyere gị ya site n’aka m.

10 Ugbụ a, ọbụrụ na ị mataworo nke a ị gaara enwe ike aịtụgharị-asụsụ; n’agbanyeghị, ọ kwesịghị na ị ga-atụgharị-asụsụ ugbụ a.

11 Lee, o kwesịrị mgbe ị malitere; mana ị atụrụ egwu, ma oge ahụ agasiwo, ma o kwesighị kwa ugbụ a;

12 N’ihi na, ị naghị ahụ, na e nyewo m nwa odibo m aJoseph ume zuru oke, ebe e sitere mezue ya? Ma o nweghị onye n’ime unu m maworo ikpe.

13 Mee ihe nke a m nyere gị n’iwu, ma ị ga-eme nke-ọma. Kwesị ntụkwasị-obi, ma ka ị ghara ị danye an’onwunwa.

14 Guzosie ike an’ọrụ nke m bkpọwọrọ gị, ma otu agịrị-ịsị nke ịsị gị agaghị efu, ma a cga-ebuli gị elu n’ụbọchị ikpeazụ. Amen.