Akwụkwọ nsọ
Ozizi na Ọgbụgba-ndụ nile 56


Nkeji 56

Mkpughe e nyere site n’aka Joseph Smith Onye-amụma na Kirtland, Ọhịo, Jun 1831 (History of the Church, 1:86–188). Ezra Thayre, onye a họpụtaworo ka ọ gaa njem ruo na Missouri ya na Thomas B. Marsh (lee nkeji 52:22), enweghị ike ịmalite n’ozi mgbasa ozi-ọma ya mgbe onye nke ikpe azụ dị na njikere. Okenye Thayre adịghị na njikere, ịgawa njem site na nsonye ya n’ime nsogbu nile dị na Thompson, Ohio, (lee isi-ọkwu nkeji 54). Onye-nwe zaghachiri ajụjụ Onye-amụma n’okwu a site n’inye mkpughe nke a.

1–2, Ndị-nsọ nile aghaghị ibuli obe ha ma soro Onye-nwe anyị inweta nzọpụta; 3–13, Onye-nwe na enye iwu ma n’akwusị kwa iwu, ma ndị na-enupu-isi ka a ga-achụpụ; 14–17, Ahụhụ ga-adịrị ndị ọgaranya n’agaghị enyere ndị ogbenye aka, ma ahụhụ ga-adịrị ndị ogbenye ndị n’enweghi obi tiwara-etiwa; 18–20, Ngọzi na-adịrị ndị ogbenye ndị dị ọcha n’ime obi, n’ihi na ndị ahụ ga-eketa ụwa.

1 N̄aa-ntị, O unu ndị ana-ekwupụta aha m, ka Onye-nwe Chineke unu kwuru; n’ihi na; lee iwe m dị ọkụ megide ndị nnupụ-isi, ma ha ga-amata ogwe aka m na iwe ọkụ m, n’ụbọchị bnleta na iwe ọkụ nye mba nile.

2 Ma onye ahụ nke n’agaghị ewelite aobe ya ma bsoro m, ma debe iwu-nsọ m nile, otu onye ahụ agaghị enweta nzọpụta.

3 Lee, mụ, Onye-nwe, na-enye iwu; na onye ahụ n’agaghị aerube-isi ka a bga-ebepụ mgbe oge nke m zuru, mgbe m nyechaworo iwu ma e debeghị iwu-nsọ ahụ.

4 Ya mere mụ, Onye-nwe na-enye iwu ma ana-akagbu, dịka o siri dị m mma; ma ihe ndị a nile ka a ga-aza n’isi bndị nnupụ-isi nile, ka Onye-nwe kwuru.

5 Ya mere, a kagbuwo m iwu-nsọ nke e nyeworo ụmụ odibo m aThomas B. Marsh na Ezra Thayre, ma na-enye iwu-nsọ ọhụrụ nye nwa odibo m Thomas, na ọ ga-ewere njem ya ọsọ-ọsọ ruo n’ala nke Missouri, ma nwa odibo m Selah J. Griffin ga-esokwa ya gaa.

6 N’ihi na lee, a kagbuwo m iwu-nsọ nke e nyere ụmụ odibo m Selah J. Griffin na Newel Knight, n’ihi ịkpọ-ekwe-nkụ nke ndị m ndị nọ na Thompson, na nnupụ-isi ha nile.

7 Ya mere, ka nwa odibo m Newel Knight nọrọ ya na ha; ma ka ha ra bụ ndị chọrọ i ga nwere ike gaa, bụ ndị nwere mụọ nke nchegharị n’iru m, ma ka o duru ha ruo n’ala nke m họpụtaworo.

8 Ma ọzọ, n’ezie a sị m unu, na nwa odibo m Ezra Thayre aghaghị ichegharị na ampako ya, ma n’iche nke nani onwe ya, ma rube-isi n’iwu-nsọ nke mbụ nke m nyeworo gbasara ebe-obibi ya.

9 Ma ọ bụrụ na ọ ga-eme nke a, n’ihi na a gaghị enwe nkewa ọbụla a ga-eme n’ala ahụ, a ga-ahọpụta kwa ya ịga ruo n’ala nke Missouri;

10 Ma ọbughị otu a ọ ga-anata ego nke ọ kwụworo, ma ga-ahapụ ebe ahụ, ma a aga-ebepụ ya site na nzukọ-nsọ m, ka Onye-nwe Chineke nke usuu nile nke ndị agha kwuru;

11 Ma asịkwarịị na elu-igwe na ụwa agabiga, okwu ndị a agaghị aagabiga, mana a ga-emezurịrị ha.

12 Ma ọ bụrụ na nwa odibo m Joseph Smith, Nta, na ọ dịrịrị mkpa na ọ ga-akwụ ego ahụ, lee, Mu, Onye-nwe ga-akwụghachị ya nye ya ọzọ n’ala nke Missouri, ka ndị ahụ nke ọ ga-anabata ga-abụ ndị a ga-akwụghachi ọzọ dịka nke ahụ ha na-eme siri dị.

13 N’ihi na dịka nke ahụ ha na-eme siri dị ha ga-anata, ọbụna n’ala nile dika ihe-nketa ha.

14 Lee, otu a ka Onye-nwe kwuru nye ndị nke m—unu nwere ọtụtụ ihe ime na ịchegharị maka, n’ihi na lee, mmehie unu nile abịarutewo m, ma a gbagharabeghị ha, n’ihi na unu na-achọ aịdụ-onwe unu ọdụ n’ụzọ nile nke onwe unu.

15 Ma obi unu enwetabeghi afọ ojuju. Ma unu anaghị erubere ezi-okwu isi, mana unu na-enwe ammasị n’ime enweghi ezi-omume.

16 Ahụhụ na-adịrị unu andị ọgaranya, ndị n’agaghị benye ihe-onwunwe ha maka cndị ogbenye, n’ihi na dakụ na ụba unu ga-ericha mkpụrụ-obi unu nile; ma nke a ga-abụ akwa-arịrị unu n’ụbọchị nke nleta, na nke ikpe, na nke iwe ọkụ: eOwuwe-ihe-ubi agafewo, ọkọchị agwụsịwo, ma mkpụrụ-obi m anataghị nzọpụta!

17 Ahụhụ na-adịrị unu andị ogbenye, ndị obi ha n’etiwaghị etiwa, ndị mụọ ha na-enweghị nchegharị, ndị afọ ha nile n’ejughị eju, na ndị aka ha nile n’akwụsịghị akwusị iwere arịa ndị ọzọ, ndị anya ha nile juputara n’oke banya ukwu, na ndị n’agaghị arụ ọrụ jiri aka unu nile!

18 Mana ngọzi na-adịrị andị ogbenye ndị dị ọcha n’ime obi, ndị obi ha btiwara-etiwa na ndị mụọ ha nwere nchegharị, n’ihi na ha ga-ahụ cala-eze nke Chineke ka ọ na-abịa n’ike na nnukwu ebube ịnapụta ha n’ihi na ebe dị uru nke dụwa ga-abụ nke ha.

19 N’ihi na lee, Onye-nwe ga-abịa, ma aụgwọ ọrụ ya ga-eso kwa ya, ma ọ ga-akwụghachi onye ọbụla, ma ndị ogbenye ga-enwe an̄ụrị;

20 Ma ọgbọ ha nile aga-eketa ụwa site n’ọgbọ ruo n’ọgbọ, ruo mgbe nile na mgbe nile. Ma ugbụ a a ga m akwusị ịgwa unu okwu. Ọ bụna otu a. Amen.