Akwụkwọ nsọ
Ozizi na Ọgbụgba-ndụ nile 27


Nkeji 27

Mkpughe e nyere Joseph Smith onye-amụma, na Harmony, Pennsylvania, Ọugọst 1830 (History of the Church, 1:106–108). Na njikere maka ofufe-nro okpukpere chi ebe oriri-nsọ nke achịcha na mmanya bụ ihe a ga-eri, Joseph gara iweta mmanya. Onye ozi nke elu-igwe zutere ya, ma ọ natara mkpughe nke a, otu akụkụ ya ka e dere mgbe ahụ ma nke fọdụrụ n’ọnwa Septemba n’eso. Mmiri bụ ihe a na-eji ugbu a n’ọnọdụ mmanya na ofufe nro oriri-nsọ nile nke ndị Nzukọ-nsọ.

1–4, Ihe nnọchị anya nile nke a ga-na-eji a nata oriri nsọ ka akọwara; 5–14, Kraịst na ndị odibo ya nile n’ọgbọ nile ga-eketa-oke na oriri-nsọ; 15–18, Yikwasịnụ ihe agha nile nke Chineke.

1 Gee nụ nti n’olu Jisus Kraịst, Onye-nwe unu, Chineke unu na Onye-mgbapụta unu, onye okwu ya di ndụ na ike.

2 N’ihi lee, a sị m unu, na ọ dịghị mkpa bụ ihe ị ga-eri ma-ọbụ ihe ị ga-an̄ụ mgbe ị na eketa oke na oriri-nsọ ma ọbụrụ na unu e mee ya jiri anya lekwasị nanị n’otuto nke m—n’echetara Nna arụ m nke atọgbọrọ n’ihi unu, na ọbara m nke akwafuru n’ihi nsacha nmehie unu nile.

3 Ya mere, iwu-nsọ ka m na-enye unu, ka unu ghara ịzụ mmanya ma-ọbụ ihe ọn̄ụn̄ụ ike nke ndị iro unu;

4 Ya mere, unu a gaghị an̄ụ nke ọbụla m’ọbụghị nke e mere ọhụrụ n’etiti unu; e, n’ime ala-eze Nna m nke a nke a ga-ewulite n’ụwa.

5 Lee, nke a bụ amamihe n’ime m; ya mere, ya atụla gị n’anya, n’ihi na oge na-abia mgbe m ga-an̄ụ site na mkpụrụ nke vine mụ na gị n’ụwa, na kwa Moronaị, onye m ziteere gị ka o kpụghe Akwụkwọ nke Mọmọn, nwere uju nke ozi-ọma mgbe nile na-adigide m, onye m nyefeworo otughe-ụzọ nile nke akụkọ ndekọta nke osisi nke Ifrem;

6 Ma kwa ya na Elaias onye m nyefeworo ọtụghe ụzọ nke ga-eweta na nmezu mwetaghachi nke ihe nile e kwuru site n’ọnụ ndị amuma nsọ nile site mgbe ụwa bidoro, maka ụbọchị ndị ikpe azụ;

7 Ma kwa Jọn nwa nwoke Zakaraịa, Zakaraịa nke ya (Elaias) gara leta ma kwe-nkwa na Ọ ga-amụta nwa nwoke, na aha ya ga-abu Jọn na ọ ga-ejupụta na Mụọ nke Elaias.

8 Jọn nke m zitaworo unu ndị odibo m, Joseph Smith, Nta, na Oliver Cowdery, ka ochie unu echichi nke mbụ na ọkwa nchụ-aja nke unu nataworo ka enwe ike ịkpọ unu ma chie unu echichi ọbụna dịka Erọn;

9 Ma kwa Elaija, onye m nyefeworo ọtụghe ụzọ nke ike nke ga-eme ka obi nke ndị bụ nna chigharikute ụmụ ha, ka obi ụmụ chigharikwute ndị bụ nna ha, ka ụwa nile ghara ịbụ ihe eji nkọcha tie ihe otiti;

10 Ma kwa ya na Josef na Jekọb, na Aịsak, na Abraham ndị nna unu, ndị esitere na ha nkwa nile ekwere adigide;

11 Ma kwa ya na Maikel, ma-ọbụ Adam, nna nke mmadụ nile, ọkpara-eze mmadụ nile, ichie nke ụbọchị nile;

12 Ma kwa ya na Pịta, na Jemes, na Jọn, ndị m ziteere unu, ndị m sitere na ha chie unu, echichi ma mee unu ndị otu ndị ozi, na ndị aka-ebe pụrụ iche nke aha m, ma jiri ọtụghe-uzo nile nke mgbasa ozi-ọma unu na nke ihe ndị ahụ m mkpụghere nye ha;

13 Onye m nyeworo ọtụghe-ụzọ nile nke ala-eze nke m, ma na n’oge nke ozi-ọma nke ikpeazụ nile; na n’ihi ozuzu oge nile akara aka, mgbe m ga-achikọ n’ọtụ ihe nile, ma ndị nọ n’elu-igwe ma ndị nọ n’ụwa;

14 Ma kwa ya na ndị nile ndị Nna m nyeworo m site n’ụwa.

15 Ya mere, welite nụ obi unu elu ma n̄ụrịa, ma kee ihe-okike n’ụkwụ-unu, chilienụ ihe agha m nile, ka unu wee nwe ike ị nagide ajọọ ụbọchị ahụ, mgbe unu mesiworo ha nile, ka unu nwe ike iguzo.

16 Ya mere, guzonụ, mgbe unu weresiri ezi-okwu kee ukwu unu, yirikwa epekele nchekwa-obi nke ezi-omume, ma kpuchịta ụkwụ unu na njikere nke ozi-ọma nke udo, nke m nyeworo ndị mụọ ozi m ka ha nyefee unu;

17 Were ihe mgbochi nke okwukwe nke unu ga-eji enwe-ike ị kụnyụ akụ-ọkụ nile na-enwu enwu nke ajọọ mmadụ;

18 Ma nara-kwa-nụ okpu agha nke nzọpụta, ya na mma-agha nke Mụọ m nke m ga-awụsa unu na okwu m nke m kpughere nye unu, ma unu kwekọrịta gbasara ihe nile nke unu n’arịọ m, ma kwesi ntụkwasị-obi ruo mgbe m ga-abịa, ma a ga ewelikọ unu, ka ebe m nọ unu ga-anọ kwa. Amen.