Akwụkwọ nsọ
Ozizi na Ọgbụgba-ndụ nile 131


Nkeji 131

Ndụmọdụ nile sitere n’aka Joseph Smith Onye-amụma, e nyere na Ramus, Illinois, 16 na 17 Mee 1843 (History of the Church, 5:392–393).

1–4, Ọlụlụ di na nwunye nke selestịal dị mkpa maka mbuli-elu n’elu-igwe nke kachasị-elu; 5–6, Otu esi arachi ndị mmadụ nye ndụ ebighi-ebi ka akọwara; 7–8, Mụọ nile bụ ihe.

1 Na ebube nke ala-eze nke aselestịal e nwere elu-igwe atọ ma-ọbụ ogo atọ;

2 Ma na usoro nke inweta nke akachasị-elu, onye ahụ ahaghị ibanye n’ime ụsoro nke ọkwa nchụ-aja [nke pụtara ọgbụgba-ndụ ọhụrụ na mgbe nile na-adigide nke bọlụlụ di na nwunye];

3 Na ọbụrụ na o meghị otu a, o nweghị ike inweta ya.

4 O nwere ike ịbanye nke ọzọ, mana nke ahụ bụ ngwụcha nke ala-eze ya; ọ gaghị enwe ammụba.

5 (Mee 17th, 1843.) Okwu aamụma ahụ nke e mere ka ọ guzosiere anyị ike pụtara onye ahụ ịmara na barachikọrọ ya nye ndụ cebighi-ebi, site na mkpughe na mụọ nke amụma, site n’ike nke Ọkwa Nchụ-aja Dị Nsọ.

6 Ọ gaghị-ekwe omume aizọpụta onye ọbụla bna-amaghị-ama.

7 O nweghị ihe dịka ihe n’enweghị ihe e ji mee ya. aMụọ nile bụ ihe, mana ọ dị mma karịa ma-ọbụ zuo-oke na bụrụ ihe a ga-aghọta site n’anya basara-asa karịa;

8 Anyị enweghị-ike ihụ ya, mana mgbe asachara arụ anyị nile anyị ga-ahụ na ọbụ nanị ihe.