Akwụkwọ nsọ
Ozizi na Ọgbụgba-ndụ nile 98


Nkeji 98

Mkpughe e nyere site n’aka Joseph Smith Onye-amụma, na Kirtland, Ohio, 6 Ọugọst 1833 (History of the Church, 1:403–406). Mkpughe nke a bịara na nsochi nke mkpagbu nke Ndị-nsọ nọ na Missouri. Ọ bụ usoro ụdị okike na Ndị-nsọ nọ na Missouri, ebe ha tasịworo ahụhụ nke anụ arụ ma tufuo kwa arịa-ụlọ ha, ga-enwe mmetụta nke imegwara na ịbọ-ọbọ. Ya mere, Onye-nwe nyere mkpughe nke a. N’agbanyeghị na ụfọdụ akụkọ nke nsogbu nile dị na Missouri n’ezie erutawo Onye-amụma na Kirtland (ebe ruru-mailụ narị itolu), ịdị ọjọọ nke ọnọdụ ahụ bụ ihe ọ gaara amata n’oge a nanị site na mkpughe.

1–3, Mkpagbu nile nke Ndị-nsọ ga-abụ maka ọdị-mma ha; 4–8, Ndị-nsọ nile ga-enwe mmasị n’iwu nile nke obodo kwadoro; 9–10, Ndị nwoke, na-akwụwa aka ọtọ, maara ihe, ma bụrụ ndị ezi mmadụ kwesịrị ka akwado ha ịchị-ọchịchị nke ụwa; 11–15, Ndị ahụ tọgbọrọ ndụ ha n’ala maka ụzọ nke Onye-nwe ga-enweta ndụ ebighi-ebi; 16–18, Katọọ agha ma maa ọkwa udo; 19–22, Ndị-nsọ nile na Kirtland ka a dọrọ aka na ntị ma nye ha iwu ịchegharị; 23–32, Onye-nwe na-ekpughe iwu ya nile na-achị mkpagbu nile na ntaram ahụhụ nile nke a manyere ndị ya; 33–38, Agha bụ ihe ziri-ezi nanị mgbe Onye-nwe nyere ya n’iwu; 39–48, Ndị-nsọ nile ga-agbaghara ndị-iro ha nile, ndị, ọbụrụ na ha echegharịa ga kwa agbanarị ịbọ ọbọ nke Onye-nwe.

1 N’ezie a sị m unu ndị enyi m, aatụla ụjọ, ka a kasie unu obi; e, na an̄ụrị-ọn̄ụ mgbe nile, ma n’ihe ọbụla nye bekele;

2 aNa-echere Onye-nwe na ndidi, n’ihi na ekpere nile nke unu erutawo ntị abụọ nke Onye-nwe nke Sabaot, ma nke ededara jiri nrachi nke a na ọgbụgba-ama—Onye-nwe an̄ụwo iyi ma nye iwu-oku na aga-eme ha.

3 Ya mere, o nyewo unu nkwa nke a, jiri ọgbụgba-ndụ nke n’enweghi mgbanwe na aghaghị imezu ha; na ihe nile nke eji ana-esogbu unu na-arụkọ-ọrụ ọnụ maka ọdịmma unu, ma n’otuto nke aha m, ka Onye-nwe kwuru.

4 Ma ugbụ a, n’ezie a sị m unu gbasara iwu nile nke ala ahụ, ọ bụ ọchịchọ nke m na ndị nke m ga-ahụ na ha mere ihe nile ọbụla nke m nyere ha n’iwu.

5 Ma an’iwu ahụ nke ala nke bọha-akwadoro, nke na-akwado ụkpụrụ nke inwere onwe n’ijide ihe nile ruru ha na ohere nile, bụ nke mmadụ nile, ma bụrụ ihe ziri ezi n’iru m.

6 Ya mere, mụ, Onye-nwe, kwadoro izi-ezi unu, ma ụmụnne unu ndị nwoke nke nzukọ-nsọ nke m, n’inwe mmasị n’iwu ahụ nke bụ iwu nke obodo ọha-kwadoro;

7 Ma dịka ọ gbasara iwu nke mmadụ, ihe ọbụla karịrị ma-ọbụ dị nta karịa nke a, sitere n’ihe ọjọọ.

8 Mụ, Onye-nwe Chineke, na-eme ka unu anwere onwe unu, ya mere unu nwere onwe unu n’ezie; ma iwu ahụ kwa mere ka unu nwere onwe unu.

9 Otu o sila dị, mgbe andị ajọọ mmadụ na-achị ndị mmadụ na-eru uju.

10 Ya mere, ndị mmadụ ana-akwụwa aka ọtọ na ndị mmadụ maara ihe kwesịrị ka ejiri ịrụsi ọrụ ike chọpụta ha, ma ndị ezi mmadụ na ndị mmadụ maara ihe ka unu ga-eleru anya ịkwado; ma ọdịghị otu a ihe ọbụla dị ala karịa ndị a sitere n’ihe ọjọọ abịa.

11 Ma enye m unu iwu-nsọ, na unu ga-ahapụ ihe ọjọọ nile ma rapara n’ihe ọma nile, na unu ga-adị ndụ site an’ọkwu ọbụla nke na-esi n’ọnụ nke Chineke apụta.

12 N’ihi na ọ aga-enye ndị kwesịrị ntụkwasị-obi ahịrị n’elu ahịrị, ozizi n’elu ozizi; ma a ga m banwale unu ma nwapụta unu site na nke a.

13 Ma onye ọbụla nke atọgbọrọ ndụ ya maka ụzọ nke m, n’ihi aha m, ga-achọta ya ọzọ, ọbụna ndụ ebighi-ebi.

14 Ya mere, aụjọ ndị-iro unu atụla unu, n’ihi na e nyewo m iwu-oku n’obi m, ka Onye-nwe kwuru, na a ga m banwale unu n’ihe nile, ma unu ga-edebe ọgbụgba-ndụ m, ọbụna, ruo cn’ọnwụ ka e wee hụ unu ka ndị tozuru-oke.

15 N’ihi na ọbụrụ na unu erubeghị-isi n’ọgbụgba-ndụ nke m unu e tozughi-oke ị bụ nke m.

16 Ya mere, akatọọ bagha ma maa-ọkwa cudo, ma chọọ n’ịrụsi ọrụ ike dịtụgharị obi nile nke ụmụ nye ndị nna ha nile, na obi nile nke ndị nna nye ụmụ ha;

17 Ma ọzọ, obi nile nke andị Juu nye ndị-amụma, ma ndị-amụma nye ndị Juu; ka m wee ghara ịbịa ma jiri ọbụbụ ọnụ tie ụwa nile ihe-otiti, ma anụ arụ nile erepịa n’iru m.

18 Ka obi unu ghara ịlọ mmiri; n’ihi na n’ime ụlọ nna m aọtụtụ ebe-obibi dị, ma e doziwo m otu ebe maka unu; ma ebe Nna m na mụ nọ, ebe ahụ ka unu ga-anọ kwa.

19 Lee, mụ, Onye-nwe, e nweghị m mmasị dị mma n’ebe ọtụtụ nọ ndị nọ n’ime nzukọ-nsọ na Kirtland;

20 N’ihi na ha adịghị ahapụ mmehie ha nile, na ajọọ ụzọ ha nile, mpako nke obi ha nile, na anya-ukwu ha nile, na ihe ha nile jọgburu onwe ha, ma debe okwu nile nke amamihe na ndụ ebighi-ebi nke m nyeworo ha.

21 N’ezie a sị m unu, na mụ, Onye-nwe aga-ata ha ahụhụ, ma ga-eme ha ihe ọbụla m chọrọ, ma ọbụrụ na ha echegharịghị ma debe ihe nile ọbụla nke m kwuworo nye ha.

22 Ma ọzọ a sị m unu, ọbụrụ na unu elezie anya ma amee ihe ọbụla m nyere unu n’iwu mụ, Onye-nwe, ga-ewezuga oke-iwe nile na iwe-ọkụ site n’arụ unu, ma bọnụ-ụzọ-ama nile nke ala-mụọ agaghị aka kwa unu ike.

23 Ugbụ a, a na m ekwuru unu gbasara ezi na ụlọ unu nile—ọbụrụ na ndị mmadụ aga-eti-unu-ihe, ma-ọbụ ezi na ụlọ unu nile, ọtụ ugboro, ma unu ejiri ndidi so ha n’ekwughị okwu ọjọọ megide ha, ọbụghị ma-ọbụ chọọ ịbọ-ọbọ, unu ga-enweta ụgwọ-ọrụ;

24 Mana ọbụrụ na unu ejighi ndidi so ya, a ga-agụ ya ka ihe ziri-ezi e amere nye unu.

25 Ma ọzọ, ọbụrụ na onye-iro unu ga-eti unu ihe nke ugboro abụọ, ma unu ekwughị okwu ọjọọ megide onye-ịrọ unu, ma jiri ndidi so ha, ụgwọ ọrụ unu ga-adị ụzọ otu narị.

26 Ma ọzọ, ọbụrụ na ọ ga-eti unu ihe nke ugboro atọ, ma unu ejiri andidi so ha, a ga-atụkwasịrị unu ụgwọ-ọrụ unu ugboro anọ;

27 Ma ọgbụgba-ama atọ ndia ga-eguzo megide onye-iro unu ọbụrụ na o chegharịghị, ma a agaghị echichapụ ya.

28 Ma ugbụ a, n’ezie a sị m unu, ọ bụrụ na onye-ịrọ ahụ ga-agbanarị ịbọ ọbọ nke m, na e wee ghara ịkpọbata ya n’ikpe n’iru m, mgbe ahụ unu ga-ahụ na a adọrọ ya aka na ntị n’aha nke m, ka ọ ghara ị bịa ọzọ megide unu, ọbụghị ma-ọbụ megide ezi na ụlọ unu, ọbụna megide ụmụ ụmụ unu ruo n’ọgbọ nke atọ na nke anọ.

29 Ma mgbe ahụ, ọbụrụ na ọ ga-abịa megide unu ma-ọbụ ụmụ unu, ma-ọbụ ụmụ ụmụ unu ruo n’ọgbọ nke atọ na nke anọ, e nyewo m onye-iro unu n’aka unu nile;

30 Ma mgbe ahụ ọ bụrụ na ị ga-ahapụ ya, ị ga-anata ụgwọ-ọrụ maka ezi-omume gị; na kwa ụmụ gị na ụmụụmụ nke gị ruo n’ọgbọ nke atọ na nke anọ.

31 Otu ọ sila dị, onye-iro gị nọ n’aka gị abụọ; ma ọ bụrụ na ị kwụghachi ya dịka ọrụ ya nile siri dị ị bụ onye ikpe n’amaghị; ọbụrụ na ọ chọwo ndụ gị, ma na ndụ gị abaa n’ize ndụ site n’aka ya, onye-iro gị nọ n’aka gị abụọ ma ị bụ onye ikpe n’amaghị.

32 Lee, nke a bụ iwu ahụ nke m nyere nwa odibo m Nifaị, na andị nna unu, Josef, na Jekọb, na Aịsak, na Abraham, na ndị amụma ochie nile na ndị-ozi nile.

33 Ma ọzọ, nke a bụ aiwu ahụ nke m nyere ndị ichie m, ka ha ghara ị pụ n’agha megide mba ọbụla, ebo, ire, ma-ọbụ ndị mmadụ, ewezuga ma mụ, Onye-nwe nyere ha iwu.

34 Ma ọbụrụ na mba ọbula, ire ma-ọbụ ndị mmadụ ga-ekwupụta agha megide ha, ha ga-ebuzọ welite ọkọlọtọ nke audo nye ndị mmadụ ahụ, mba, ma-ọbụ ire;

35 Ma ọbụrụ na ndị mmadụ ahụ anabataghị onyinye nke udo ahụ, ọbụghị ma-ọbụ nke ugboro abụọ ma-ọbụ nke ugboro atọ ya, ha ga-eweta ọgbụgba-ama ndịa nile n’iru Onye-nwe;

36 Mgbe ahụ mụ, Onye-nwe, ga-enye ha iwu-nsọ, ma kpee ha ikpe ziri-ezi maka ị ga-lụọ agha megide mba ahụ, ire, ma-ọbụ ndị mmadụ ahụ.

37 Ma mụ, Onye-nwe aga-alụ agha ha nile, ma agha nile nke ụmụ ha, ma nke ụmụụmụ ha, ruo mgbe ha nwetaworo ịbọ-ọbọ n’ebe ndị-iro ahụ nọ, ha nile, ruo n’ọgbọ nke atọ na nke anọ.

38 Lee, nke a bụ ihe nlere-anya nye ndị mmadụ nile, ka Onye-nwe Chineke unu kwuru maka ikpe ziri ezi n’iru m.

39 Ma ọzọ, n’ezie a sị m unu, ọ bụrụ na mgbe onye-ịrọ bịakwasiworo megide gị nke mbụ, ya echegharịa ma bịakute gị na-arịọ mgbaghara nke gị, ị ga-agbaghara ya, ma ghara kwa ịgụ ya dịka ihe ịgba-ama megide onye-iro gị—

40 Ma otu a ruo na nke ugboro abụọ na nke atọ; ma ugboro ole ọbụla onye-iro gị chegharịrị site na njehie nke o jehieworo megide gị, ị aga-agbaghara ya, ruo ugboro iri asaa ụzọ asaa.

41 Ma ọbụrụ na o jehie megide gị ma o chegharịghị nke mbụ, otu ọ sila dị ị ga-agbaghara ya.

42 Ma ọ bụrụ na o jehie megide gị nke ugboro abụọ, ma o chegharịghị, otu o sila dị ị ga-agbaghara ya.

43 Ma ọ bụrụ na o jehie megide gị nke ugboro atọ, ma o chegharịghị, ị ga-agbaghara kwa ya.

44 Mana ọ bụrụ na o jehie megide gị nke ugboro anọ ị gaghị agbaghara ya, mana ị ga-eweta ọgbụgba-ama ndịa n’iru Onye-nwe; ma a gaghị ehichapụ ha ruo mgbe ọ ga echegharị ma kwụghachi gị ugboro anọ n’ihe nile o jehiere megide gị.

45 Ma ọ bụrụ na o mee nke a, ị ga-ejiri obi gị nile gbaghara ya; ma ọbụrụ na o meghị nke a, mụ, Onye-nwe, aga-abọ-ọbọ megide onye-iro gị ụzọ otu narị.

46 Ma n’isi ụmụ ya, ma n’isi ụmụụmụ nke ha nke ndị nile kpọrọ m asị, ruo n’ọgbọ anke atọ na nke anọ.

47 Mana ọ bụrụ na ụmụ ha ga-echegharị ma-ọbụ ụmụ ụmụ ha, ma atụgharịa soro Onye-nwe Chineke ha, jiri obi ha nile, na ike ha nile, echiche, na ume, ma wetaghachi ugboro anọ maka njehie ha nile nke ha jehieworo, ma-ọbụ nke ndị nna ha jehieworo ma-ọbụ ndị nna-nna ha, mgbe ahụ iwe-ọkụ gị ga-atụgharịpụ;

48 Ma aịbọ-ọbọ agaghị kwa adakwasị ha ọzọ, ka Onye-nwe Chineke gị kwuru, ma njehie ha nile enweghi kwa mgbe a ga-echeta kwa ha ọzọ dịka ọgbụgba-ama n’iru Onye-nwe megide ha. Amen.