Akwụkwọ nsọ
Ozizi na Ọgbụgba-ndụ nile 32


Nkeji 32

Mpughe e nyere site n’aka Joseph Smith onye-amụma nye Parley P. Pratt na Ziba Peterson, Oktoba 1830 (History of the Church, 1:118–120). Nnukwu mmasị na ọchịchọ nile ka ndị okenye nwere maka ndị Leman, ndị Nzukọ-nsọ anụwo site n’Akwụkwọ nke Mọmọn maka ngọzi nile ekwere ha na nkwa. N’ihi nke a, ekpere ekpere ka Onye-nwe mee ka uche ya puta ìhè ma a ga-eziga ndị okenye n’oge ahụ na agbụrụ India na ọdida anyanwụ. Mkpughe a sochiri.

1–3, Parley P. Pratt na Ziba Peterson ka-akpọrọ ikwusa ozi-ọma nye ndị Leman na isonyere Oliver Cowdery na Peter Whitmer, Nta.; 4–5, Ha ga-ekpe ekpere n’ihi nghọta nke akwụkwọ-nsọ nile.

1 Ma ugbụ a gbasara nwa odibo m aParley P. Pratt, lee, a sị m ya ebe m na-adị ndụ ọ bụ ọchichọ m na ọ ga-ekwusa ozi-ọma m ma bmụta maka m, ma dị nwayọ ma wedata obi ala.

2 Ma nke ahụ m họpụtawooro ya bụ na ọ aga-aga ya na ndị odibo m, Oliver Cowdery na Peter Whitmer, nta, n’ime ọzara n’etiti bndị Leman.

3 Ma aZiba Peterson kwa ga-eso ha; ma mụ onwe m ga-eso ha ma nọrọ bn’etiti ha; a bụ m conye nkwuchịta ọnụ ha n’ebe Nna nọ ma ọdịghị ihe ga-egbochi ha.

4 Ma ha aga-anụrụ nke ahụ edere, ma ha agaghị asi na enwere bmkpughe ọzọ; ma ha ga-ekpe ekpere oge nile na m ga-eme ka otu ihe ahụ cpụta ìhè na dnghọta ha.

5 Ma ha ga-anụrụ okwu-ndị a nile ma ghara iji ha mee ihe-efu, ma a ga m agọzi ha. Amen.