Akwụkwọ nsọ
Ozizi na Ọgbụgba-ndụ nile 15


Nkeji 15

Mkpughe e nyere site n’aka Joseph Smith Onye-amụma nye John Whitmer na Fayette, New York, Jun 1829 (History of the Church, 1:50). (Lee isi-ọkwu nke nkeji 14.) Ozi a dị nso arụ ma na-emetụta nani onwe n’ihi na Onye-nwe na-ekwu maka ihe ya onwe ya na John Whitmer nanị matara. John Whitmer mechara bụrụ otu n’ime ndị Aka-ebe Asatọ nye Akwụkwọ nke Mọmọn.

1–2, Ogwe-aka nke Onye-nwe na-ekpụchita ụwa nile; 3–6, I kwusa ozi-ọma ma zọpụta mkpụrụ-obi nile bụ ihe kachasị baa ụrụ.

1 N̄aa-ntị, nwa odibo m John, ma gee ntị n’okwu nile nke Jisus Kraịst, Onye-nwe gị na Onye-mgbapụta gị.

2 N’ihi na lee, a na m ekwuru gị okwu n’ịdị nkọ ma an’ike, n’ihi na ogwe-aka m na-ekpuchịta ụwa nile.

3 Ma a ga m agwa gị ihe ahụ n’onweghị onye matara ya m’ọbụghị mụ na gị nanị—

4 N’ihi na ọtụtụ mgbe ị chọworo n’aka m ịmata ihe ahụ ga-akachasị ịba uru nye gị.

5 Lee, ngozi dịịrị gị n’ihi ihe nke a, ma n’ihi ikwu okwu m nile nke m nyeworo gị dịka iwu-nsọ m nile siri dị.

6 Ma ugba a, lee, a sị m gị, na ihe ga-akachasị ịba uru nye gị ga-abụ aikwupụta nchegharị nye ndị nke a, ka i nwee ike iwetara m ọtụtụ mkpụrụ-obi, ka i nwee ike bizu-ike gị na ha cn’ala-eze nke dNna m. Amen.