Akwụkwọ nsọ
Ozizi na Ọgbụgba-ndụ nile 94


Nkeji 94

Mkpughe e nyere site n’aka Joseph Smith Onye-amụma, na Kirtland, Ohio, 6 Mee 1833 (History of the Church, 1:346–347). Hyrum Smith, Reynolds Cahoon na Jared Carter ka a họpụtara dịka kọmiti na-ewu ụlọ nzukọ-nsọ.

1–9, Onye-nwe enye iwu-nsọ gbasara iwu ụlọ maka nke Otu Ndị-isi nduzi; 10–12, Ụlọ maka mbipụta akwụkwọ ka a ga-ewu; 13–17, Ụfọdụ ihe-nketa ka e nyere ndị nwe ha.

1 Ma ọzọ, n’ezie a sị m unu andị enyị m, iwu-nsọ ka m na-enye unu, ka unu malite ọrụ nke atụmatụ na njikere mmalite na ntọ-ala nke obodo-ukwu nke bstek nke Zaịọn, n’ebe a n’ala nke Kirtland, malite n’ụlọ nke m.

2 Ma lee, ahaghị ịme ya dịka aihe-nlere anya nke m nyeworo unu.

3 Ma ka mpaghara mbụ n’ebe ndịda bụrụ nke enyefechasịrị m maka iwu ụlọ maka otu ndị-isi nduzi, maka ọrụ nke otu ndị-isi nduzi n’ịnata mkpughe nile; na maka ọrụ nke ije-ozị nke aotu ndị-isi nduzi, n’ihe nile gbasara nzukọ-nsọ na ala-eze.

4 N’ezie a sị m unu, na a ga-ewu ya ntụ iri-ise na ise baa na iri-isii na ise na mbara ya ma n’ogologo ya, n’ogige ime-ime.

5 Ma a ga-enwe ogige nke dị ala na nke dị elu, dịka ihe nlere-anya nke a ga-enye unu ma emesịa.

6 Ma ọ ga-abụ ihe e doro nsọ nye Onye-nwe site na ntọ-ala nke ya, dịka usoro nke ọkwa nchụ-aja, dịka ihe nlere-anya nke a ga-enye unu ma emesịa.

7 Ma ọ ga-abụ ihe e dochasịrị-nsọ nye Onye-nwe maka ọrụ nke otu ndị-isi nduzi.

8 Ma unu agaghị ekwe ka ihe ọbụla an’adịghị ọcha bịaru na ya; ma bebube nke m ga-adị ebe ahụ, ma iru nke m ga-adị kwa ebe ahụ.

9 Mana ọbụrụ na ihe ọbụla an’adịghị ọcha abịa na ya, ebube nke m agaghị a nọ ebe ahụ; ma iru nke m agaghị abịa na ya.

10 Ma ọzọ, n’ezie a sị m unu, mpaghara nke abụọ na ndịda ka a ga-edo nsọ nye m maka iwu ụlọ nye m, maka ọrụ nke ambipụta nke bntụgharị asụsụ nke akwụkwọ-nsọ m nile, na kwa ihe nile nke ọbụla m ga-enye unu n’iwu.

11 Ma ọ ga-adị ntụ iri-ise na ise baa na iri isii na ise na mbara ya ma n’ogologo ya, n’ogige ime-ime; ma ọ ga-enwe ogige dị-ala na ogige nke dị-elu.

12 Ma ụlọ nke a ga-abụ ihe e dochasịrị-nsọ nye Onye-nwe site na ntọ-ala nke ya, maka ọrụ nke mbịpụta akwụkwọ, n’ihe nile nke ọbụla m ga-enye unu n’iwu, ka ọ dị nsọ, n’enweghi mmerụ, dịka ihe nlere anya n’ihe nile dịka a ga-enye unu ya.

13 Ma na mpaghara nke atọ ka nwa odibo m Hyrum Smith ga-anata ihe-nketa nke ya.

14 Ma na nke mbụ ma na nke abụọ dị n’elu elu ka ụmụ odibo m Reynolds Cahoon na Jared Carter ga-anata ihe-nketa nke ha nile—

15 Ka ha wee nwee ike ịrụ ọrụ nke m họpụtara nye ha, ị bụ kọmiti iwu ụlọ nke m nile, dịka iwu-nsọ nke m ahụ siri dị, nke mụ, Onye-nwe Chineke, nyeworo unu.

16 Ụlọ abụọ ndị a agaghị abụ ihe a ga-ewu ruo mgbe m nyere unu iwu-nsọ gbasara ha.

17 Ma ugbụ a, agaghị m enye unu ọzọ n’oge nke a. Amen.