Akwụkwọ nsọ
Ozizi na Ọgbụgba-ndụ nile 80


Nkeji 80

Mkpughe e nyere site n’aka Joseph Smith Onye-amụma, na Hiram, Ohio, Maach 1832 (History of the Church 1:257).

1–5, Stephen Burnett na Eden Smith ka a kpọrọ ikwusa ozi-ọma ebe ọbụla ha họpụtara.

1 N’ezie, otu a ka Onye-nwe kwuru nye gị nwa obidbo m Stephen Burnett: Gaa nụ, gawa nụ n’ime ụwa ma akwusaa ozi-ọma nye ihe nile e kere eke nke ga-abịa n’okpuru ụda olu gị.

2 Ma ọbụrụraa na ị chọrọ onye-nsom-eje, a ga m enye gị nwa odibo m Eden Smith.

3 Ya mere, gawa nụ ma kwusaa ozi-ọma m, ma-ọbụ n’ugwụ ma-ọbụ na ndịda, n’ọwụwa anyanwụ ma-ọbụ n’ọdịda anyanwụ, onweghị ihe ọ mere, n’ihi na unu agaghị agahie ụzọ.

4 Ya mere, maa nụ ọkwa ihe nile nke unu nụworo, ma kwere n’ezie, ma amata na ọ bụ ezi-okwu.

5 Lee nke a bụ echiche ya onye akpọwọrọ unu, Onye-mgbapụta unu, ọbụna Jisus Kraịst. Amen.