Akwụkwọ nsọ
Ozizi na Ọgbụgba-ndụ nile 48


Nkeji 48

Mkpughe e nyere site n’aka Joseph Smith Onye-amụma, na Kirtland, Ohio, Maach 1831 (History of the Church, 1:166–167). Onye-amụma jụrụ Onye-nwe maka ụdị usoro nke inweta ala nile maka ebe-obibi nke Ndị-nsọ. Nke a bụ kwa okwu dị mkpa site n’ife-obi nke ndị-otu Nzukọ-nsọ site n’ọwụwa anyanwụ nke United States, n’irube-isi nye iwu nke Onye-nwe ka ha gbakọọ na Ohio (lee nkeji nile 37:1–3; 45–64).

1–3, Ndị-nsọ nile nọ na Ohio ga-eke ala ha nile ha na ndị ụmụnne ha; 4–6, Ndị-nsọ ga-azụ ala nile, wuo obodo-ukwu, ma soro ndụmọdụ nke ndị-ọrụ nọ n’isi.

1 Ọ Dị mkpa ka unu nọrọ n’ọge ugbua a n’ebe nile unu bi, dịka ọ ga-ekwesị ọnọdụ unu nile.

2 Ma ọbụrụraa na unu nwere ala nile, unu aga-enye ụmụnne ndịa sitere n’ọwụwa anyanwụ bịa

3 Ma ọbụrụraa na unu enweghi ala, ka ha zụta n’oge ugbụ a na mpaghara nile ahụ gbara gburu-gburu, otu o si masị ha, n’ihi na o kwesịrị na ha nwere ebe-obibi n’oge ugbu a.

4 O kwesịrị na unu dokwara ego nile unu nwere ike, ma ka unu nweta ihe nile unu nwere ike n’ezi-omume, ka n’oge na-abịa ka unu wee nwee ike aịzụta ala dịka ihe nketa, bọbụna obodo-ukwu ahụ.

5 Ebe ahụ abụbeghi ebe a ga-ekpughe; mana mgbe ụmụnne unu bịasịrị site n’ọwụwa anyanwụ o anwere ndị nwoke a ga-ahọpụta, ma ha ka a ga-enyefe bịmata ebe ahụ ma-ọbụ ha ka a ga-ekpughere ya.

6 Ma ha ka a ga-ahọpụta ịzụta ala nile ahụ, na imalite ịtọ ntọ-ala nke aobodo-ukwu ahụ; ma mgbe ahụ ka unu ga-ebido ịgbakọ unu na ezi na ụlọ unu nile, onye ọbụla dịka bezi na ụlọ ya siri dị, dịka ọnọdụ ya nile siri dị, ma dịka a họpụtara ya site n’aka otu ndị-isi nduzi na ụkọchukwu nke nzukọ-nsọ, dịka iwu nile na iwu-nsọ nile nke unu nwetaworo siri dị, na nke unu ga-enweta ma emesịa. Ọbụna otu a. Amen.