Akwụkwọ nsọ
Ozizi na Ọgbụgba-ndụ nile 113


Nkeji 113

Aziza nile nye ụfọdụ ajụjụ na edemede nile nke Aịsaịa, nke Joseph Smith Onye-amụma, nyere, Maach 1838 (History of the Church, 3:9–10).

1–6, Ogwe nke Jesi ahụ, alaka sitere na ya, na mgbọrọgwụ nke Jesi ka achọpụtara; 7–10, Ndị nile fọdụrụ na ndị ekposasịrị n’ụlọ nke Zaịọn nwere ike inweta ọkwa nchụ-aja na a kpọrọ ha ịlọghachikwute Onye-nwe.

1 Onye bụ ogwe nke Jesi ekwuru maka ya na amaokwu nke mbụ, abụọ, atọ, anọ na nke ise n’ịsị nke iri na otu nke Aịsaịa?

2 N’ezie otu a ka Onye-nwe kwuru: Ọ bụ Kraịst.

3 Gịnị bụ alaka ekwuru maka ya na amaokwu nke mbụ na’isi nke iri na otu nke Aịsaịa, nke ga-esi na ogwe nke Jesi pụta?

4 Lee, otu a ka Onye-nwe kwuru: Ọ bụ otu-odibo n’aka abụọ nke Kraịst, onye bụ n’otu akụkụ onye agbụrụ nke Jesi bụrụ kwa nke Ifrem, ma-ọbụ nke ụlọ nke Josef, n’elu onye enyefere ike dị-ukwuu.

5 Gịnị bụ mgbọrọgwu nke Jesi e kwuru maka ya n’amaokwu nke iri, nke isi iri na otu?

6 Lee, otu a ka Onye-nwe kwuru, ọ bụ onye si na agbụrụ nke Jesi, na kwa nke Josef, bụ onye nke ọkwa nchụ-aja ahụ bụ nke ya, na ọtụghe-ụzọ nile nke ala-eze, ịbụ ọkọlọtọ, na maka nchikọta nke ndị nke m n’ụbọchị ndị ikpeazu.

7 Ajụjụ nile sitere n’aka Elias Hibee: Gịnị ka iwu a nọ na Aịsaịa, isi nke iri-ise na abụọ, n’amaokwu nke mbụ, nke sịrị: Yiri uwe gị, O Zaịọn—na olee ndị mmadụ Aịsaịa na-ekwu?

8 Ọ naara ekwu maka ndị ahụ Chineke ga-akpọ oku n’ụbọchị ndị ikpeazụ, ndị ga-eji ike nke ọkwa nchụ-aja iweghachi Zaịọn ọzọ na mgbapụta ahụ nke Israel; na kwa i yiri uwe ya bụ iyikwasị ikike nke ọkwa nchụ-aja, nke ya, Zaịọn, nwere ike na ya site n’agbụrụ; na kwa ilọghachi n’ike ahụ nke funarịrị ya.

9 Gịnị ka anyị ga-aghọta site na Zaịọn ịtọpụ onwe ya site n’agbụ nile nke olu ya; amaokwu nke abụọ?

10 Anyị ga-aghọta na ndị fọdụrụ na ndị ekposasịrị ka a gbara-ume ịlọghachikwuta Onye-nwe site n’ebe ha daworo; nke ọbụrụ na ha emee otua, nkwa nke Onye-nwe bụ na ya ga-ekwuru ha okwu, ma-ọbụ nye ha mkpughe. Lee amaokwu nke isii, nke asaa, na nke asatọ. Agbụ nile nke olu ya bụ ịbụ-ọnụ nile nke Chineke n’isi ya, ma-ọbụ ndị fọdụrụ ahụ nke Israel n’ọnọdụ mkposasị ha n’etiti ndị Jentaịlụ.