Akwụkwọ nsọ
Ozizi na Ọgbụgba-ndụ nile 87


Nkeji 87

Mkpughe na ibu amụma banyere agha, e nyere site n’aka Joseph Smith Onye-amụma, 25 Disemba 1832 (History of the Church, 1:301–302). Nkeji nke a ka a natara n’oge mgbe ụmụnne nwoke nọ na-eche echiche ma na-atụgharị uche gbasara ịgba oru nke ndị Afrika na kọntinent Amerika na ịgba oru nke ụmụ nke mmadụ n’elu ụwa nile.

1–4, Agha ka e buru amụma ya n’etiti ndị Steti Ugwu na ndị Steti Ndịda; 5–8, Nnukwu ọdachi nile ga-adakwasị ndị nile bi n’ụwa.

1 N’ezie, otu a ka Onye-nwe kwuru gbasara agha nile nke na-abịa na-mmezu nso nso a, malite na nnupụ-isi nke ndị aSouth Carolina, nke ga-emecha kwusị n’ọnwụ ma n’ọnọdụ nke nhụju-anya nke ọtụtụ mkpụrụ-obi;

2 Ma oge ahụ ga-eru mgbe a ga-awụpụta aagha n’elu mba nile, malite n’ebe nke a.

3 N’ihi na lee, ndị Steti Ndịda nile ga-ekewasị megide ndị Steti Ugwu nile, ma ndị Steti Ndịda ga-akpọku mba ndị ọzọ, ọbụna mba Great Britain, dịka a na-akpọ ya, ma ha ga kwa akpọku mba ndị ọzọ, n’ọnọdụ ichekwa onwe ha megide mba ndị ọzọ; ma mgbe ahụ a ga-awụpụta aagha n’elu mba nile.

4 Ma ọ ga-eru, mgbe ọtụtụ ụbọchị gasịrị, andị oru ga-ebilite megide ndị nna-ha ukwu, ndị a ga-ahazi ma nye kwa ọzụzụ maka agha.

5 Ma ọ ga-eru kwa na ndị fọdụrụ ndị a ga-ahapụ n’ala ga-ahazi onwe ha, ma ga-ewe iwe karịa, ma ga-akpasu ndị Jentaịlụ iwe jiri oke mkpasu iwe.

6 Ma otu a, site na mma agha ma n’ikwafu ọbara ndị nile bi n’ụwa ga aeru-uju; ma jiri bụnwụ, na ajọọ-ahụhụ na ala-ọma jijij, na egbe nke elu-igwe, na amụma-igwe ahụ dị egwu ma pụtakwa ìhè, ka a ga-eji eme ka ndị bi n’ụwa nwee mmetụta iwe-ọkụ ahụ, na ọnụma, na aka cna-enye ntaram-ahụhụ nke Chineke Pụrụ Ime Ihe nile, ruo mgbe mkpochapụ e nyere n’iwu-ọkụ dga-agwụ mba nile n’uju;

7 Ka akwa nke ndị-nsọ, na aọbara nke ndị-nsọ, ga-akwụsị ịbịaru na nti nke Onye-nwe nke bSabaot, site n’ụwa, ka a bọọrọ ha ọbọ site n’aka ndị-iro ha nile.

8 Ya mere, aguzo nụ n’ebe nsọ nile, ma unu apụkwala, ruo mgbe ụbọchị Onye-nwe ga-abịa; n’ihi na lee, ọ na-abịa bọsọ ọsọ, ka Onye-nwe kwụrụ. Amen.