Akwụkwọ nsọ
2 Niphaị 9


Isi 9

Ndị Juu nile ka a ga-achịkọta n’ala ha nile nke e kwere na nkwa—Aja mgbaghara mmehie ahụ na-agbapụta mmadụ site n’Ọdịda ahụ—Arụ nile nke ndị nwụrụ-anwụ ga-apụta site n’ili, na mụọ ha nile site n’ala mụọ na site na paradaịs—A ga-ekpe ha ikpe—Aja mgbaghara mmehie ahụ na-azọpụta site n’ọnwụ, ala mụọ, ekwensu ahụ, na ahụhụ agwụgh-agwụ—Ndị ezi-omume ka a ga-azọpụta n’ala-eze Chineke—Ntaram-ahụhụ nke mmehie nile ka edoziworo—Onye-Nsọ nke Israel bụ onye-nche ọnụ ụzọ ama ahụ. Ihe dịka n’afọ 559 ruo 545 tutu amụọ Kraịst.

1 Ma ugbua, ụmụnne m ndị m hụrụ n’anya, a gụwo m ihe nile ndị a ka unu wee mata ihe gbasara aọgbụgba-ndụ nile nke Onye-nwe nke o gbaworo ya na ụlọ nile nke Israel—

2 Na ọ gwawo ndị Juu okwu, site n’ọnụ nke ndị-amụma ya nile dị nsọ, ọbụna site na mmalite gbada, site n’ọgbọ ruo n’ọgbọ, wee ruo mgbe oge ruru na a ga aeweghachi ha nye nzukọ-nsọ nke ezi-okwu ahụ na otu nke Chineke; Mgbe a bga-achịkọta ha baa n’ụlọ cn’ala nile nke nketa ha, ma a ga-ehiwe ha n’ala ha nile e kwere na nkwa.

3 Lee, ụmụnne m nwoke ndị m hụrụ n’anya, a na m agwa unu ihe ndị a ka unu wee n̄ụrịa ọn̄ụ, ma awelie isi unu ruo mgbe nile, n’ihi na ngọzi nile nke Onye-nwe Chineke ka a ga-awụkwasị ụmụ unu.

4 N’ihi na a ma m na unu achọwo nnukwu, ọtụtụ n’ime unu, ịmata maka ihe ndị ga-abịa abia; ya mere a ma m na unu matara na anụ arụ anyị ga-ala-n’iyi ma nwụọ; otu o sila dị, an’arụ anyị nile, anyị ga-ahụ Chineke.

5 E, a ma m na unu matara na n’arụ ọ ga-egosị onwe ya nye ndị nọ na Jerusalem, bụ ebe anyị siri bịa; n’ihi na ọ dị mkpa na ọ ga-abụ otu n’ime ha; n’ihi na ọ baara nnukwu aOnye-okike uru na o kwenyere n’onwe ya ka ọ ghọọ onye mmadụ ga-edu n’anụ arụ, ma nwụọ n’ihi bnmadụ nile, ka mmadụ nile wee nọrọ n’okpuru ya.

6 N’ihi na dịka ọnwụ gafetaworo mmadụ nile, i ji mejupụta aatụmatụ obi ebere nke nnukwu Onye-okike ahụ, o kwesịrị na a ga-enwe ikike nke bmbilite n’ọnwụ, ma mbilite n’ọnwụ kwesịrị ịbịakwasị mmadụ n’ihi cọdịda ahụ; ma ọdịda ahụ bịara n’ihi njehie; ma n’ihi na mmadụ aghọwo onye dara ada, debepụrụ ha site n’ebe Onye-nwe nọ.

7 Ya mere, o kwesịrị ka ọ bụrụ aaja mgbaghara mmehie bna-enweghị oke—-ma ọbụghị na ọ ga-abụ aja mgbaghara mmehie enweghị oke ire ure a enweghị ike iyịkwasị ereghị-ure. Ya mere, cikpe mbụ nke bịakwasịrị mmadụ kwesịrị ka ọ ddịgide ruo oge agwụgh-agwụ. Ma o bụrụ otu a, anụ arụ a kwesịrị idebe n’ala ka o ree ure na ka ọ tụrịsịa n’ime nne ya bụ ala, ka ọ ghara ibilite ọzọ.

8 O aamamihe nke Chineke, bobi ebere na camara ya! N’ihi na lee, ọbụrụ na danụ arụ agaghị ebilite ọzọ, mụọ anyị ga-anọzi n’okpuru mụọ-ozi ahụ onye si n’ebe Chineke ebighi-ebi ahụ nọ edapụ, ma ghọọ fekwensu, nke na-agaghị ebilite ọzọ.

9 Ma mụọ anyị nile ga-adịworịị ka ya, ma anyị aghọọ ekwensu nile, andị mụọ-ozi nke ekwensu, ndị a bga-emechibido ụzọ site n’ebe Chineke anyị nọ, na ịnọgide ha na nna nke cokwu ụgha nile, n’ọnọdụ nhujụ anya, dịka ya na onwe ya, e, onye ahụ nke dghọgburu nne na nna anyị mbụ, nke emegharịworo onwe ya ruo ịbụ fmụọ-ozi nke ìhè, ma na-akpasu ụmụ nke mmadụ n’ime gntụgwa nzuzo nile nke igbu mmadụ na ụdị ọrụ nzuzo nile nke ọchịchịrị.

10 O lee otu nnukwu ịdị mma nke Chineke anyị dị, onye-na-akwadoro anyị ụzọ maka mgbalaga site na njidesi ike nke ajọọ anụ ahụ di egwụ; e, ajọọ anụ ahụ, aọnwụ na bala mụọ, nke m na-akpọ ọnwụ nke arụ, na kwa ọnwụ nke mụọ.

11 Ma n’ihi aụzọ-nnapụta nke Chineke anyị, Onye-Nsọ nke Israel, bọnwụ a nke m kwuworo maka ya, bụ nke arụ, ga-ewepụta ndị ya nwụrụ anwụ; ọnwụ nke ahụ bụ ili.

12 Ma aọnwụ a nke m kwuworo maka ya, nke bụ ọnwụ nke mụọ, ga-ewepụta ndị ya nwụrụ anwụ; nke ọnwụ nke mụọ ya bụ ala mụọ; ya mere, ọnwụ na bala mụọ ga-ewepụtarịrị ndị ha nwụrụ anwụ, ma ala mụọ ga-ewepụtarịrị mụọ ndị ọ dọkpụụrụ n’agha, ma ili ga-ewepụtarịrị arụ ndị ọ dọkpụụrụ n’agha, ma arụ ndị a na cmụọ ndị a nke ụmụ mmadụ ka a ga deweghachi otu na ibe ya; ma ọ bụ site n’ike nke mbilite n’ọnwụ nke Onye-Nsọ nke Israel.

13 O lee ka nnukwu aatụmatụ ya ha, nke Chineke anyị! N’ihi na n’aka nke ọzọ, bparadaịs nke Chineke ga-ewepụtarịrị mụọ nile nke ndị ezi-omume, ma ili ahụ ewepụta arụ nke ndị ezi-omume; ma mụọ ahụ na arụ ahụ ka a cga-eweghachi kwara onwe ya ọzọ, ma mmadụ nile ga-aghọ ndị na-agaghị ere ure, na dagaghị-anwụ anwụ, ma ha bụ mkpụrụ-obi dị ndụ, nwere eọmụma-ihe fzuru oke dịka anyị n’ime anụ arụ, ma ọbụghị na amamihe anyị ga-ezu oke.

14 Ya mere, anyị ga-enwe aamamihe zuru oke maka bikpe-ọmụma nke anyị, na adịghị ọcha anyị, na cịgba-ọtọ anyị, ma dndị ezi-omume ga-enwe amamihe zuru oke maka inwe ọn̄ụ ha, na ezi-omume ha, ebe eeyịkwasịrị ha fenweghị ntụpọ dịka uwe, e, ọbụna i ji guwe-mwụda nke ezi-omume.

15 Ma ọ ga-eru na mgbe mmadụ nile ga-agafeworiị ọnwụ nke mbụ a baa na ndụ, ebe ọ bụ na ha a ghọwo ndị na-anaghị anwụ-anwụ, ha ga-apụta n’iru aoche-ikpe nke Onye-Nsọ nke Israel; ma mgbe ahụ ka bikpe ga-abịa, ma mgbe ahụ ka a ga-ekperịrị ha ikpe dịka usoro nke ikpe dị nsọ nke Chineke siri dị.

16 Ma dịka o siri bụrụ ezi-okwu, na Onye-nwe na-adị ndụ, n’ihi na Onye-nwe Chineke ekwuwo ya, ma ọ bụ aokwu ebighi-ebi ya, nke na-agaghị bagabiga, na ndị nile bụ ndị ezi-omume ga-abụ kwa ndị ezi-omume, ma ndị ruru inyi ga-abụ kwa ndị cruru inyi; ya mere, ndị ahụ druru inyi bụ eekwensu na ndị mụọ-ozi ya; ma ha ga-apụ baa n’ime fọkụ mgbe nile na-adigide; a kwadobere ha; na ahụhụ ha ga-adị ka gọdọ ọkụ na nkume ọkụ, nke ire ọkụ ya na-arigoro n’elu ruo mgbe nile na mgbe nile na-enweghị ọgwụgwụ.

17 O ịdị ukwuu na aikpe-zịrị-ezi nke Chineke anyị! N’ihi na o na-emezu okwu ya nile, ma ha apụtawo site n’ọnụ ya, ma iwu ya ka a ga-emezurịrị.

18 Ma, lee, ndị ezi-omume, andị-nsọ nke Onye-Nsọ nke Israel, ndị kwenyeworo n’Onye-Nsọ nke Israel, ndị nagideworo bobe nile nke ụwa, ma lelịa ihere dị ya, ha cga eketa dala-eze nke Chineke, nke a kwadobere maka ha esite na ntọ-ala nke ụwa, ma ọn̄ụ ha ga eju eju fruo mgbe nile.

19 O ịdị ukwuu nke obi ebere nke Chineke, Onye-Nsọ nke Israel! N’ihi na O na-aanapụta ndị nsọ ya site n’aka ajọọ banụ ahụ dị egwụ bụ ekwensu, na ọnwụ, cna ala mụọ, na ọdọ ọkụ ahụ na nkume ọkụ, nke bụ ahụhụ agwụgh-agwụ.

20 O lee ka nnukwu aịdị nsọ nke Chineke anyị ha! N’ihi na ọ bmazuru ihe nile, ma ọdịghị ihe ọbụla ma ọbụghị na ọ matara ya.

21 Ma ọ bịaworo n’ime ụwa ka o wee azọpụta mmadụ nile ma ọbụrụ na ha ga an̄a nti n’olu ya; n’ihi na lee, o na-ata ahụhụ bmgbu nke mmadụ nile, e, mgbu nke ihe nile ekere eke dị ndụ, ma ndị nwoke, ndị nwanyị, na ụmụ-ntakịrị, bụ ndị ezi na ụlọ cAdam.

22 Ma ọ na-ata ahụhụ a ka mbilite n’ọnwụ ruo mmadụ nile, ka ha nile wee guzoro n’iru ya na nnukwu ụbọchị ikpe ahụ.

23 Ma o nyere mmadụ nile iwu na ha garịrị aechegharị, ma bmee baptism n’aha ya, nwere okwukwe zuru-oke n’Onye-Nsọ nke Israel, ma-ọbụ agaghị azọpụta ha n’ala-eze Chineke.

24 Ma ọbụrụ na ha agaghị echegharị ma kwere an’aha ya, ma mee baptism n’aha ya, ma bnọgide ruo ọgwụgwụ, a ga cama ha ikpe; n’ihi na Onye-nwe Chineke, Onye-Nsọ nke Israel, ekwuwo ya.

25 Ya mere, o nyewo aiwu; ma ebe ana-enweghị biwu e nyere, e nweghị ntaram-ahụhụ, ma ebe ana-enweghị ntaram-ahụhụ e nweghị amam-ikpe; ma ebe ana-enweghị amam-ikpe, ebere nile nke Onye-Nsọ nke Israel na-agbapụta ha, n’ihi aja mgbaghara mmehie ahụ; n’ihi na a na-anapụta ha site n’ike nke ya.

26 N’ihi na aaja mgbaghara mmehie ahụ kwụzuru ụgwọ nke bikpe ya ziri-ezi n’arụ ndị nile cna-enweghị diwu enyere ha, na a na-anapụta ha n’aka ajọọ anụ ahụ dị egwụ, ọnwụ na ala mụọ na ekwensu na ọdọ ọkụ na nkume ọkụ, nke bụ ahụhụ agwụgh-agwụ; ma akpọghachị ha nye Chineke ahụ onye nyere ha eume-okuku, nke bụ Onye-Nsọ nke Israel.

27 Ma ahụhụ na-adịrị ya bụ onye nwere aiwu e nyere, e, nke nwere iwu-nsọ nile nke Chineke, dịka anyị, ma bụrụ onye na-ejehie ha, na onye na-ala ụbọchị nile nke mnwale ya n’iyi, n’ihi na egwu ka ọnọdụ ya dị!

28 O aatụmatụ aghụghọ nke ajọọ-onye ahụ! O babaghị uru, na esịghị-ike nile, na nzuzu nile nke ụmụ mmadụ! Mgbe ha cmụtaworo akwụkwọ ha na-eche na ha dma ihe, ma ha anaghị an̄a ntị na endụmọdụ nke Chineke, n’ihi na ha na ewezuga ya n’akụkụ, na-eche na ha ma nke onwe ha, ya mere, amamihe ha bụ nzuzu ma ọ gaghị abara ha uru. Ma ha ga-ala-n’iyi.

29 Mana ịmụta akwụkwọ dị mma ma ọbụrụ na ha an̄aa ntị na bndụmọdụ nile nke Chineke.

30 Mana ahụhụ na-adịrị aọgaranya, ndị bara ụba n’ihe nile nke ụwa. N’ihi na maka na ha bụ ọgaranya ha na-eleda bndị ogbenye anya, ma ha na-esogbu ndị dị umeala n’obi, ma obi ha nile dị n’ebe akụ ha dị; ya mere, akụ ha bụ chi ha. Ma lee, akụ ha ga-esokwa ha laa n’iyi.

31 Ma ahụhụ na-adịrị ndị ntị-ike ndị na-agaghị aanụ ihe; n’ihi na ha ga-ala-n’iyi.

32 Ahụhụ na-adịrị ndị-ìsì na-agaghị ahụ ụzọ; n’ihi na ha ga-ala kwa n’iyi.

33 Ahụhụ na-adịrị ndị na-ebịghị ụgwụ n’obi, n’ihi na mmata nke ajọọ-omume ha ga-emekpa ha arụ n’ụbọchị ikpe-azụ ahụ.

34 Ahụhụ na-adịrị aonye okwu ụgha, n’ihi na a ga-atụba ya bn’ala mụọ.

35 Ahụhụ na-adịrị onye ogbu-mmadụ nke na-akpachapụ anya ana-egbu, n’ihi na ọ bga-anwụ.

36 Ahụhụ na-adịrị ndị ana-agba akwụna, n’ihi na a ga-atụba ha n’ala mụọ.

37 E, ahụhụ na-adịrị ndị ana-efe arụsị apịrị-apị, n’ihi na ekwensu nke ekwensu nile nwere mmasị n’ebe ha nọ.

38 Ma, na nke-nke, ahụhụ na-adịrị ndị nile na-anwụ n’ime mmehie ha; n’ihi na ha aga-alaghachịkwute Chineke, ma lee iru ya, ma nọgide n’ime mmehie ha nile.

39 O, ụmụnne m nwoke ndị m hụrụ n’anya, cheta ịdị egwụ dị n’ime ijehie megide Chineke ahụ dị nsọ, na kwa ịdị egwụ nke ikwenye na ndufu nile nke aonye-aghụghọ ahụ. Cheta, na itinye-uche bn’ihe nke ụwa bụ cọnwụ, ma itinye-uche n’ihe nke mụọ bụ dndụ eebighi-ebi.

40 O, ụmụnne m nwoke m hụrụ n’anya, nye ntị n’okwu m nile. Cheta ịdị ukwuu nke Onye-Nsọ nke Israel. Unu asịkwala na mụ ekwuwo ihe siri ike megide unu; n’ihi na ọbụrụ na unu emee nke a, unu ga-emegide aezi-okwu; n’ihi na ekwuwo m okwu nke Onye meworo unu. A ma m na ezi-okwu bna-esi ike megide adịghị-ọcha nile: ma na ndị ezi-omume anaghị atụ ha egwu, n’ihi na ha hụrụ ezi-okwu n’anya ma ọ naghị atụgharị ha.

41 O mgbe ahụ, ụmụnne m nwoke ndị m hụrụ n’anya, abịakwute nụ Onye-nwe, Onye-Nsọ ahụ. Cheta na ụzọ ya nile bụ ezi-omume. Lee, bụzọ nke mmadụ dị cmkpafa, ma na ọ tọgbọrọ n’okporo ụzọ guzoro kwe m n’iru ya, ma onye nche nke dọnụ-ụzọ ama ahụ bụ Onye-Nsọ nke Israel; ma ọ naghị enye oru ọbụla ọrụ n’ebe ahụ; ma ọdịghị ụzọ ọzọ ma ọbụghị site n’ọnụ ụzọ ahụ; n’ihi na e nweghị ike ịghọgbu ya, n’ihi na Onye-nwe Chineke bụ aha Ya.

42 Ma onye-ọbụla kụrụ-aka, ọ bụ ya ka ọ ga-emeghere; ma aonye amamihe, na onye nwere mmụta, na ndị bara ọgaranya, ndị bna-afuli-elu n’ihi ọmụmụ ihe ha, na amamihe ha, na akụ na ụba ha—e, ha bụ ndị ọ na-akpọ asị; ma, ma ọbụghị na ha ga atufu ihe ndị a, ma were onwe ha ka cndị nzuzu n’iru Chineke, ma wedata onwe ha n’ime omimi nile nke dobi umeala, ọ gaghị emeghere ha ụzọ.

43 Ma na ihe nile nke ndị amamihe na ndị na-akpachapụ anya ka a aga-ezonarị ha ruo mgbe nile—e, an̄ụrị ahụ nke akwadobere ndị nsọ nile.

44 O, ụmụnne m nwoke m hụrụ n’anya, cheta okwu m nile. Lee, eyipụwo m uwe m nile, ma ahụchasịwo m ha n’iru unu; A na m ekpe ka Chineke nke nzọpụta m na ọ ga-eji aanya ịchọta ihe nile ya lee m; ya mere, unu ga amata n’ụbọchị ikpe-azụ, mgbe a ga-ekpe mmadụ nile ikpe site n’ọrụ ha nile, na Chineke nke Israel gbara aka-ebe na m bhụchapụrụ ajọọ-omume unu site na mkpụrụ-obi m, ma na m guzoro n’ịdị ọcha n’iru ya, na cewezugawo m n’ọbara unu.

45 O, ụmụnne m nwoke ndị m hụrụ n’anya, tụgharịanụ site na mmehie unu nile; hụchapụ aụdọ-igwe nke onye ahụ ga-eke unu agbụ ọsọ-ọsọ; bịakwute Chineke ahụ nke bụ bnkume nke nzọpụta unu.

46 Kwadobe mkpụrụ-obi unu maka ụbọchị otuto ahụ mgbe a ga-ekpe ndị ezi-omume aikpe zịrị ezi, ọbụna ụbọchị bikpe, ka unu ghara ịmịpụ site n’ụjọ dị egwụ; ka unu ghara icheta cikpe-ọmụma ahụ dị egwụ n’izu-oke ya, ma bụrụ ndị a ga-akwagide iti-mkpu: Nsọ, nsọ ka ikpe gị nile dị, O Onye-nwe Chineke dPụrụ Ime Ihe nile—ma na a ma m ikpe-ọmụma m; E jehiere m iwu gị, ma njehie m nile bụ nke m; ma ekwensu enwetawo m, nke na a bụ m anụ ịkpa-nri nye nhuju anya dị egwụ nke ya.

47 Ma lee, ụmụnne m nwoke, ọ dị mkpa na m ga-emete unu ka unu hụ ezi-okwu dị egwu si n’ihe ndị a nile? A ga m ata mkpụrụ-obi unu ahụhụ ma ọbụrụ na obi unu dị ọcha? A ga m ekwupụtara unu ezi-okwu dịka nkwupụta ezi-okwu ma ọbụrụ na agbapụtara unu na mmehie?

48 Lee, ọbụrụ na unu dị nsọ a ga m agwa unu okwu maka ịdị nsọ; mana ebe ọbụ na unu a dịghị nsọ, ma unu na-elekwasị m anya dịka onye-nkuzi, ọ ga-adịrịrị mkpa na m aga-akụziri unu ihe bmmehie na-eweta.

49 Lee, mkpụrụ-obi m na-akpọ mmehie asị, ma obi m na-enwe an̄ụrị n’ime ezi-omume; ma a ga m aeto aha nsọ nke Chineke m.

50 Bịanụ, ụmụnne m nwoke, onye ọbụla nke akpịrị kpọrọ nkụ, bịanụ na ammiri nile ahụ; ma onye nke na-enweghị bego, bịa zụrụ ma rie; e, bịa zụrụ mmanya na mmiri-ara na-ejighi ego na na-enweghị ọnụ ahịa.

51 Ya mere, akwụla ego n’ihe nke na-enweghị ọnụ ahịa, ma-ọbụ aọrụ aka unu maka ihe na-enweghị ike inye afọ-ojuju. N̄aa m ntị nke ọma, ma cheta okwu nile nke m kwuworo; ma bịakwute Onye-Nsọ nke Israel, ma brie oriri n’elu ihe na-anaghị ala-n’iyi, na-abụghị ma ọ ga ere ure, ma ka mkpụrụ-obi unu nwe an̄ụrị n’ibu ibu.

52 Lee, ụmụnne m nwoke ndị m hụrụ n’anya, cheta okwu nile nke Chineke unu; na-ekpere ya mgbe nile n’ehihie, ma nye aha nsọ ya aekele n’abalị. Ka obi unu n̄ụrịa ọnụ.

53 Ma lee, ka ịdị ukwuu aọgbụgba-ndụ nile nke Onye-nwe ha, ma lee ka ịdị ukwuu mwedata-onwe-ala ya nile ha n’ebe ụmụ nke mmadụ nọ; ma n’ihi ịdị ukwuu ya, ma amara na bobi ebere ya, o kwewo anyị nkwa na mkpụrụ-afọ anyị agaghị abụ ihe ebibiri kpam kpam, dịka n’anụ arụ, mana, ya ga-edokwa ha; ma n’ọgbọ dị n’iru ha ga-aghọ cngalaba ezi-omume nye ụlọ nke Israel.

54 Ma ugbua, ụmụnne m nwoke, a ga m agwa unu okwu karịa; mana echi a ga m ekwupụtara unu okwu m nile fọdụrụ. Amen.