Akwụkwọ nsọ
Alma 30


Isi 30

Kọrịhọ, onye-mmegide Kraịst, jiri Kraịst mee ihe ọchị, Aja mgbaghara mmehie ahụ, na mụọ nke ibu-amụma—Ọ na-akụzi na ọdịghị Chineke dị, ọdịghị ọdịda nke mmadụ dị, ọdighị ntaram-ahụhụ maka mmehie dị, na ọdịghị Kraịst dị—Alma gbara ama na Kraịst ga-abịa ma na ihe nile na-egosị na e nwere otu Chineke dị—Kọrịhọ rịọrọ ịhụ ihe iriba-ama ma e mere ka ọ daa ogbu—Ekwensu apụtakwuruworịị Kọrịhọ dịka mụọ-ozi ma kuziere ya ihe ọ ga-ekwu—Kọrịhọ ka azọdara ma ọ nwụrụ. Ihe dịka n’afọ 76 ruo 74 tutu amụọ Kraịst.

1 Lee, ugbua o wee ruo na mgbe e hiwesịworo andị nke Amọn n’ala nke Jeshọn, e, na kwa mgbe bachụpụsịworo ndị Leman site n’ala ahụ, ma ndị ha nwụrụ anwụ ka ndị ala ahụ liri—

2 Ugbua ndị ha nwụrụ anwụ agụghị ha ọnụ n’ihi ịdị ukwu nke ọnụ-ọgụgụ ha nile; ọbụghị ma ndị nwụrụ anwụ nke ndị Nifaị agụrụ ha ọnụ—ma na o wee ruo mgbe ha lichaworo ndị ha nwụrụ anwụ, na kwa mgbe ụbọchị nile nke ibu ọnụ, na iru uju, na ekpere gasịworo, (ma-ọbụ n’afọ nke iri na isii nke ọchịchị nke ndị-ikpe na-achị ndị nke Nifaị) a malitere inwe udo esepụghị-aka nʼakụkụ nile nke ala ahụ nile.

3 E, ma ndị ahụ gbalịrị idebe iwu-nsọ nile nke Onye-nwe; ma ha siri ike n’idobe aemume-nso nile nke Chineke, dịka iwu nke Moses siri dị; n’ihi na akụziri ha bidebe iwu nke Moses ruo mgbe a ga-emezu ya.

4 Ma otu a ndị ahụ enweghị nsogbu n’ime afọ iri na isii nile nke ọchịchị nke ndị-ikpe na-achị ndị nke Nifaị.

5 Ma o wee ruo na n’ime mmalite nke afọ nke iri na asaa nke ọchịchị nke ndị-ikpe, enwere udo esepụghị aka.

6 Mana o wee ruo na ngwụcha nke afọ nke iri na asaa, e nwere otu nwoke bịara n’ime ala nke Zarahemla, ma-ọbụ aOnye Mmegide-Kraịst, n’ihi na ọ malitere ikwusara ndị ahụ ozi-ọma megide amụma nile nke ndị-amụma nile kwuworo, gbasara ọbịbịa nke Kraịst.

7 Ugbua enweghị iwu megidere aokwukwe mmadụ; n’ihi na o megidesịrị iwu-nsọ nile nke Chineke ike na a ga-enwe iwu nke ga-eweta ndị mmadụ na-ahaghị otu.

8 N’ihi na otu a ka akwụkwọ-nsọ kwuru: aHọrọ nụ n’ụbọchị a, onye unu ga-efe.

9 Ugbua ọbụrụ na mmadụ achọ ife Chineke, ọ bụ ohere dịrị ya; ma-ọbụ n’ụzọ ọzọ, ọbụrụ na o kwere na Chineke ọ bụ ohere dịrị ya ife ya; kama ọbụrụ na o kweghị na ya enweghị iwu ịta ya ahụhụ.

10 Mana ọbụrụ na o gburu mmadụ a ga-ata ya ahụhụ ruo an’ọnwụ; ma ọbụrụ na ọ pụnara mmadụ ihe a ga-ata kwa ya ahụhụ; ma ọburu na o zuru ohi a ga-ata kwa ya ahụhu; ma ọbụrụ na ọ kwara iko a ga-ata kwa ya ahụhụ; e, maka ajọọ-omume a nile a tara ha ahụhụ.

11 N’ihi na e nwere iwu na ndị mmadụ a ga-ekpe ha ikpe dịka mmebi iwu ha siri dị. Otu o sila dị, enweghị iwu megidere okwukwe mmadụ; ya mere, a tara mmadụ ahụhụ nanị maka mmebi-iwu nile nke o meworo; ya mere mmadụ nile aha ahata-aha.

12 Ma onye Mmegide-Kraịst a, nke aha ya bụ Kọrịhọ, (ma iwu ahụ enweghị ijide ya) malitere ikwusara ndị ahụ okwu na agaghị enwe Kraịst. Ma n’ụdị dị otu a ka o kwusara okwu, na-asị:

13 O unu ndị e kedara n’okpuru olile-anya nzuzu na nke efu, gịnị mere unu ji na-ebo onwe unu ibu arọ jiri ụdị ihe nzuzu nile ahụ? Gịnị mere unu ji na-ele anya Kraịst? N’ihi na ọdịghị onye nwere ike ịmata maka ihe ọbụla nke na-abịa abịa.

14 Lee, ihe ndị a nile nke unu na-akpọ amụma, nke unu kwuru na enyedatara ya site na ndị-amụma nile dị nsọ, lee, ha bụ omenala nzuzu nile nke ndị nna unu ha.

15 O lee otu unu siri mata maka ibu ezi-okwu ha? Lee, unu enweghị ike ịmata maka ihe nile nke unu ana-ahụghị anya; ya mere unu enweghị ike ịmata na a ga-enwe otu Kraịst.

16 Unu lepụrụ anya ma sị na unu hụrụ nsachapụ nke mmehie unu nile. Mana lee, ọ bụ ihe na-eso echiche ara; ma mkpasasị nke echiche unu nile bịara n’ihi omenala nile nke ndị nna unu, nke dupụrụ unu baa n’ime okwukwe nke ihe nile nke n’abụghị otu ha dị.

17 Ma ọtụtụ ihe ndị karịrị n’ihe ndị dị otu a ka ọ gwara ha, na-agwa ha na-enweghị ike inwe aja mgbaghara mmehie a ga-eme maka mmehie nile nke ndị mmadụ, mana onye ọbụla na-aga n’iru na ndụ nke a dịka njịkwa nke onye ahụ ekere eke siri dị; ya mere onye ọbụla na-eme nke-ọma dịka nghọta ya siri dị, ma na onye ọbụla na-emeri dịka ike ya ha; ma ihe ọbụla mmadụ mere abụghị mmebi iwu.

18 Ma otu a ka o kwusaara ha okwu, na-edufu obi nile nke ọtụtụ, na-eme ha ka ha welite isi ha nile n’ajọọ-omume ha, e, na-edufu ọtụtụ ndịnyom, na kwa ndịkom, ịgba akwụnakwụna—na-agwa ha na mgbe mmadụ nwụrụ, nke ahụ bụ nsọtụ ya.

19 Ugbua nwoke a gafere n’ala nke Jeshọn kwa, ikwusa ihe ndị a nile n’etiti ndị nke Amọn, ndị bụụrụ ndị nke Leman otu mgbe.

20 Mana lee ha ma ihe karịa ọtụtụ ndị nke Nifaị; n’ihi na ha kpọrọ ya, ma kee ya agbụ, ma bụga ya n’iru Amọn, onye bụ ọnye isi nchụ-aja nye ndị ahụ.

21 Ma o wee ruo na o mere ka e bupụ ya site n’ala ahụ. Ma ọ bịafetara n’ime ala nke Gịdiọn, ma malite ikwusakwara ha okwu; ma n’ebe a o nweghị nnukwu mmeri, n’ihi na a kpọrọ ya ma kee ya agbụ ma buruo ya n’iru onye isi nchụ-aja, na kwa onye-isi-ikpe n’ala ahụ.

22 Ma o wee ruo na onye isi nchụ-aja ahụ sịrị ya: Gịnị mere i jiri na-agagharị na-eduhie ụzọ nile nke Onye-nwe? Gịnị mere i jiri na-akụziri ndị a na a gaghị enwe Kraịst ọbụla, ka Ị napụ ha ịn̄ụrị-ọn̄ụ ha nile? Gịnị mere i jiri na-ekwugide amụma nile nke ndị-amụma nile dị nsọ?

23 Ugbua aha onye isi nchụ-aja ahụ bụ Gịdọna. Ma Kọrịhọ sịrị ya: N’ihi na anaghị m akụzi omenala nzuzu nile nke ndị nna unu, ma n’ihi na anaghị m akụziri ndị a ka ha kedagide onwe ha n’okpuru emume nsọ nzuzu nile na ihe-omume nile ndị ededaworo site na ndị nchụ-aja mgbe ochie nile, ịpụrụ ike na ikike n’aka ha, idebe ha n’amaghị ama, ka ha ghara iwelite isi ha nile elu, kama ka ewedata ha dịka okwu gị nile siri dị.

24 I kwuru na ndị a bụ ndị nwere onwe ha. Lee, asị m na ha nọ n’ịbụ-oru. I sị na amụma mgbe ochie ahụ nile bụ ezi ọkwụ. Lee, asị m na ị mataghị na ha bụ ezi-okwu.

25 I sị na ndị a bụ ndị-ikpe mara na ndị dara ada, n’ihi njehie nke otu onye mụrụ ha. Lee, asị m na ikpe anaghị ama nwata n’ihi ndị mụrụ ya.

26 Ma unu sịkwara na Kraịst ga-abịa. Mana lee, asị m na unu amaghị na a ga-enwe otu Kraịst. Ma unu sị kwa na a ga-egbu ya n’ihi ammehie nile nke ụwa—

27 Ma otu a unu na-edufu ndị a n’iso omenala nzuzu nile nke ndị nna unu, ma dịka ọchịchọ nile nke onwe unu; ma unu debere ha n’ala, ọbụna dịka ọ bụ ị nọ n’ịbụ-oru, ka unu wee tinye akpịrị unu nile n’ime ọrụ nile nke aka ha nile, na ha anwaghị anwa ilelite anya elu na-atụghị egwu, ma na ha anwaghị anwa inwe ọn̄ụ n’ihe nile ruuru ha na ohere nile dịịrị ha.

28 E, ha anwaghị anwa iji ihe bụ nke ha eme ihe eleghị anya ka ha ghara imejọ ndị nchụ-aja ha nile ndị na-ebo ha ibu arọ dịka ọchịchọ ha nile siri dị, ma ewetawo ha n’ikwere, site n’omenala ha nile na nrọ ha nile na ihe nile gbatara ha n’uche na ọ́hụ̀ ha nile na ihe omimi aghụghọ ha nile, na ha ga, ma ọbụrụ na ha emeghị dịka okwu ha nile siri dị, emejọ onye anamaghị-ama, onye ha sị na ọ bụ Chineke—onye nke anahụtụbeghị anya ma-ọbụ mata mbụ, onye na-anọtubeghị ma-ọbụ o nwere mgbe ọ ga-anọ.

29 Ugbua mgbe onye isi nchụ-aja ahụ na onye-isi-ikpe ahụ hụrụ obi ike ya, e, mgbe ha hụrụ na ọ ga-ekwutọ ọbụna megide Chineke, ha enyeghị ọsịsa ọbụla n’okwu ya nile; mana ha mere ka e kee ya agbụ; ma ha nyefelitere ya n’aka nile nke ndị-ọrụ, ma ziga ya n’ala nke Zarahemla, ka e wee kpọta ya n’iru Alma, na onye-isi-ikpe nke bụ onye-ọchịchị na-achị ala ahụ nile.

30 Ma o wee ruo na mgbe a kpọtara ya n’iru Alma na onye-isi-ikpe, ọ gara n’iru n’otu ụdị ahụ dịka o mere n’ala nke Gịdiọn; e, ọ gara n’iru aikwuhie Chineke.

31 Ma o bilitere na nnukwu okwu nile ana-eko eko n’iru Alma, ma kwutọọ ndị nchụ-aja nile na ndị nkuzi nile, na-ebo ha ebubo nke idufu ndị ahụ n’ụdị omenala nzuzu nile nke ndị nna ha, n’ihi itinye akpịrị na mgbalị nile nke ndị ahụ.

32 Ugbua Alma sịrị ya: I matara na anyị anaghị etinye akpịrị anyị na ọrụ nile nke ndị a; n’ihi na lee arụwo m ọbụna site na mmalite nke ọchịchị nke ndị-isi-ikpe nile ruo ugbua, jiri aka abụọ nke m maka nkwado onwe m, na-agbanyeghị ọtụtụ njem mụ nile gburu-gburu ala ahụ ikwusa okwu nke Chineke nye ndị m.

33 Ma na-agbanyeghị ọtụtụ mgbalị nile ahụ nke m meworo n’ụlọ nzukọ-nsọ ahụ, anatatụbeghị m nke ha ka ọbụna otu asịnaịn maka ọrụ m; ọbụghị ma o nwere onye ọbụla n’ime ụmụnne m nwoke, ma ọbụghị ma-ọbụ n’oche-ikpe ahụ; ma mgbe ahụ anyị anatawo nanị dịka iwu siri dị maka oge anyị.

34 Ma ugbua, ọbụrụ na anyị anataghị ihe ọbụla maka ọrụ anyị nile n’ụlọ nzukọ-nsọ ahụ, uru gịnị ka ọ baara anyị ịrụ ọrụ n’ụlọ nzukọ-nsọ ahụ ma ọbụghị ikwusa ezi-okwu ahụ, ka anyị wee nwee ọn̄ụ nile n’ime aọn̄ụ nke ụmụnne anyị nwoke?

35 Mgbe ahụ gịnị ka ị na-asị na anyị na-ekwusara ndị a ozi-ọma inweta uru, mgbe gị, n’onwe gị, matara na anyị anaghị anata uru? Ma ugbua, ị kwere na anyị na-eduhie ndị a eduhie, nke kpatara ụdị ọn̄ụ a n’obi ha nile?

36 Ma Kọrịhọ zara ya, E.

37 Ma mgbe ahụ Alma sịrị ya: Ị kwere na e nwere Chineke dị?

38 Ma ọ zara, E-e.

39 Ugbua Alma sịrị ya: Ị ga-agọnarị ọzọ na enweghị Chineke dị, ma kwa gọnarị Kraịst ahụ? N’ihi na lee, asị m gị, a matara m na enwere Chineke dị, na kwa na Kraịst ga-abịa.

40 Ma ugbua gịnị bụ ihe aka-ebe ị nwere na o nweghị aChineke dị, ma-ọbụ na Kraịst anaghị abịa? Asị m gị na ọdighị nke ị nwere, ma ọbụghị nanị okwu gị.

41 Mana, lee, enwere ihe nile dịka ihe amgba-ama na ihe ndị a nile bụ ezi-okwu; ma gị kwa nwere ihe nile dịka ihe mgba-ama nye gị na ha bụ ezi-okwu; ma ị ga-agọnarị ha? I kwere na ihe ndị a nile bụ ezi-okwu?

42 Lee, a matara m na i kwere, mana a na-edu gị site na mụọ nke okwu ụgha, ma ijuwo Mụọ nke Chineke ahụ nke mere na o nweghị ike inwe ọnọdụ n’ime gị; kama ekwensu ahụ nwere ike n’ebe ị nọ, ma ọ na-ebugharị gị, na-aghọ aghụghọ nile ka o wee bibie ụmụ nke Chineke.

43 Ma ugbua Kọrịhọ sịrị Alma: O bụrụ na i ga-egosị m aihe ịrịba ama, ka m wee kwenye na e nwere Chineke dị, e, gosị m na o nwere ike, ma mgbe ahụ ka m ga-ekwenye n’ezi-okwu nke okwu gị nile.

44 Mana Alma sịrị ya: I nwetawọrị ihe iriba-ama zuuru gị; ị ga-anwa Chineke gị ọnwụnwa? Ị ga-asị, Gosị m ihe ịrịba-ama, mgbe i nwere mgba-ama aụmụnne gị nwoke ndị a nile, na kwa ndị-amụma nile dị nsọ? Akwụkwọ-nsọ nile ka a tọgbọrọ n’iru gị, e, ma bihe nile gosịrị na o nwere Chineke dị; e, ọbụna cụwa, na ihe nile nke dị n’elu nke iru ya, e, na dmgbagharị ya, e, na eụwa ndị ọzọ nile nke na-agbagharị n’ụdị usoro nke ha na-agba ama na o nwere Onye Okike Kachasị-elu.

45 Ma na ị na-agagharị, na-edufu obi nile nke ndị a, na-agba ama nye ha na enweghị Chineke dị? Ma emesịa ị ga agọnarị aka-ebe nile ndị a? Ma ọ sịrị: E, aga m agọnarị, ma ọbụghị na Ị ga-egosị m ihe iriba-ama:

46 Ma ugbua o wee ruo na Alma sịrị ya: Lee, A na m enwe mwute n’ihi isi ike nke obi gị, e, na ị ka ga-eguzogide mụọ nke ezi-okwu ahụ, ka e wee bibie mkpụrụ-obi gị.

47 Mana lee, ọ aka mma na mkpụrụ-obi gị ga efu karịa na ị ga-abụ ụzọ nke iwedata ọtụtụ mkpụrụ-obi na mbibi, site ikwu okwu ụgha gị nile na site n’okwu otuto nile nke na-esighị n’obi; ya mere ọbụrụ na ị ga-agọnarị ọzọ, lee Chineke ga-eti gị otiti ihe, na i ga-ada ogbu, na ị gaghị emeghee kwa ọnụ gị ọzọ, na ị gaghị aghọgbu ndị a ọzọ.

48 Ugbua Kọrịhọ sịrị ya: Anaghị m agọnarị ọdịdị nke otu Chineke, kama ekweghị m na enwere otu Chineke dị; ma asịkwa m, na ị mataghị na enwere otu Chineke dị; ma ma-ọbụghị na ị gosịrị m otu ihe iriba-ama, agaghị m ekwe.

49 Ugbua Alma sịrị ya: Nke a ka m ga-enye gị maka ihe iriba-ama, na a ga aakụ gị ogbu, dịka okwu m nile siri dị; ma asị m, na n’aha nke Chineke, a ga-akụ gị ogbu, na i gaghị enwe kwa ikwupụta okwu.

50 Ugbua mgbe Alma kwuworo okwu nile ndị a, Kọrịhọ ka a kụrụ ogbu, nke mere na onweghị ike ikwupụta okwu, dịka okwu nile nke Alma siri dị.

51 Ma ugbua mgbe onye-isi-ikpe ahụ hụrụ nke a, o setịpụrụ aka ya ma degara Kọrịhọ, na-asị: E mewo ka ikwenye n’ike nke Chineke? N’ime onye ka ị chọrọ na Alma ga-egosịpụta ihe iriba-ama ya? Ị chọrọ na ọ ga-esogbu ndị ọzọ, igosị gị otu ihe ịrịba- ama? Lee, o gosịwo gị otu ihe ịrịba-ama; ma ugbua ị ga-arụ ụka ọzọ?

52 Ma Kọrịhọ wepụtara aka ya ma dee, na-asị: A matara m na a dara m ogbu, n’ihi na enweghị m ike ikwu okwu; ma a matara m na ọdịghị ihe ọzọ ma ọbụghị ike nke Chineke nwere ike iwekwasị m nke a; e, ma a amatara m mgbe ọbụla na e nwere otu Chineke dị.

53 Mana lee, ekwensu aaghọgbuwo m; n’ihi na o bbia-kwutere m n’ụdị nke otu mụọ-ozi, ma sị m: Gaa ma kpọtaghachị ndị a, n’ihi na ha nile akpafuwo soro Chineke ana-amaghị ama. Ma ọ sịrị m: cOnweghị Chineke dị; e, ma ọ kuziri m ihe nke m ga na-ekwu. Ma akụziwo m okwu ya nile; ma akụziri m ha n’ihi na ha masịrị dechiche nke anụ-arụ; ma akụziri m ha ọbụna ruo mgbe m nwere nnukwu mmeri, nke mere na n’ezie e kwere m na ha bụ ezi-okwu; ma n’ihi nke a eguzogidere ezi-okwu ahụ, ọbụna wee ruo mgbe m wetaworo nnukwu ọbụbụ-ọnụ a nye onwe m.

54 Ugbua mgbe o kwuworo nke a, ọ rịọrọ ka Alma kpee ekpere nye Chineke, ka e wee wepụrụ ya ọbụbụ-ọnụ ahụ.

55 Mana Alma sịrị ya: Ọbụrụ na e wepụrụ gị ọbụbụ-ọnụ a ị ga-edufu kwa obi nile nke ndị a ọzọ; ya mere, ọ ga-adịrị gị ọbụna dịka Onye-nwe siri chọọ.

56 Ma o wee ruo na ọbụbụ-ọnụ ahụ ewepụrụghị ya Kọrịhọ; mana a chụpụrụ ya, ma ọ gagharịrị site n’ụlọ ruo n’ụlọ na-arịọ ihe-oriri ya.

57 Ugbua ọmụma nke ihe meworo Kọrịhọ ka agbasara otu mgbe ahụ nʼakụkụ ala ahụ nile; e, nkwupụta ahụ ka onye-isi-ikpe ahụ zipụrụ nye ndị nile bi n’ala ahụ, na-ekwupụtara ndị nile nke kwereworo n’okwu nile nke Kọrịhọ na ha ga-eme ọsọ-ọsọ chegharịa, ma-ọdịghị otu a otu ikpe nile ahụ ga-abịakwute ha.

58 Ma o wee ruo na ha nile kwenyere maka ajọọ-omume nke Kọrịhọ; ya mere ha nile ka agbanwere ọzọ nye Onye-nwe; ma nke a tinyere nkwusị n’ajọọ-omume n’ụdị nke Kọrịhọ ahụ. Ma Kọrịhọ gagharịrị site n’ụlọ ruo n’ụlọ, na-ariọ ihe-oriri maka nkwado onwe ya.

59 Ma o wee ruo na dịka ọ na-agagharị n’etiti ndị ahụ, e, n’etiti ndị nke kewapụworo onwe ha site na ndị Nifaị ma kpọọ onwe ha ndị Zorọm, ndị ana-edu site na otu nwoke nke aha ya bụ Zorọm—na dịka ọ na-agagharị n’etiti ha, lee, a gbadara ya ma zọda ya nʼala, ọbụna ruo mgbe ọ nwụrụ.

60 Ma otu a anyị hụrụ nsọtụ nke ya onye na-eduhie ụzọ nile nke Onye-nwe; ma otu a anyị hụrụ na aekwensu agaghị bakwado ụmụ ya n’ụbọchị ikpe-azụ, kama ọ na-eme ọsọ-ọsọ dọkpụrụ ha gbada cala-mụọ.