Akwụkwọ nsọ
Mosaịa 27


Isi 27

Mosaịa jụrụ mkpagbu ma nye iwu ịha n’otu—Alma nke nta na ụmụ nwoke anọ nke Mosaịa wee chọọ ibibi Nzukọ-nsọ ahụ—Mụọ-ozi wee pụta ma nye ha iwu ịkwụsị ajọọ-ụzọ ha—Alma ka a kụrụ ogbu—Mmadụ nile ka a ga-amụrịrị ọzọ iji nweta nzọpụta—Alma na ụmụ nwoke nke Mosaịa kwupụtara ozi ọma. Ihe dịka n’afọ 100 ruo 92 tutu amụọ Kraịst.

1 Ma ugbua o wee ruo na inye-nsogbu nile nke e mere megide nzukọ-nsọ ahụ site na ndị na-ekweghị ekwe bịara dị ukwuu nke mere na nzukọ ahụ malitere ịtamụ, ma kpesara ndị ndu ha gbasara ihe ahụ; ma ha kpesaara Alma. Ma Alma tọgbọrọ esem-okwu ahụ n’iru eze ha, Mosaịa. Ma Mosaịa chọrọ ndụmọdụ n’aka ndị nchụ-aja ya.

2 Ma o wee ruo na eze Mosaịa zịpụrụ ima-ọkwa gburu-gburu ala ahụ nile na ọ gaghị enwe onye na-ekweghị ekwe aga-esogbu onye ọbụla bụ onye nke nzukọ-nsọ nke Chineke ahụ.

3 Ma e nwere iwu siri ike na nzukọ nsọ ahụ nile na a gaghị enwe inye nsogbu n’etiti ha, na a ga-enwe aịha n’otu n’etiti mmadụ nile.

4 Na ha agaghị ekwe ka mpako ma-ọbụ nganga nye audo ha nsogbu; ka onye ọbụla bwere onye agbata obi ya dịka onwe ya, na-arụ ọrụ n’aka nke ha n’onwe ha maka nkwado nke onwe ha.

5 E, ma ndị nchụ-aja ha nile na ndị nkuzi nile aga-arụ ọrụ n’aka nke ha n’onwe ha maka nkwado nke onwe ha, n’ihe nile ma ọbụghị ma-ọbụ n’ọrịa, ma-ọbụ na nnukwu mkpa; ma n’ime ihe ndị a nile, ha jupụtara na bamara nke Chineke.

6 Ma nnukwu udo malitere ịdị ọzọ n’ala ahụ; ma ndị ahụ malitere ịdị imerime n’ọnụ ọgụgụ, ma malite ịgbasa n’obodo ndị ọzọ n’elu iru nke ụwa ahụ, e, n’elu elu ma na ndịda ndịda, n’ọwụwa anyanwụ na n’ọdịda anyanwụ, na-ewu nnukwu obodo-ukwu nile na ọnụmara nile na n’akụkụ nile nke ala ahụ.

7 Ma Onye-nwe letara ha ma mee ka ha mee nke ọma, ma ha ghọrọ ndị dị ukwuu na ndị nwere akụ na ụba.

8 Ugbua ụmụ nwoke nke Mosaịa ka a gụnyere n’etiti ndị n’ekweghị-ekwe; na kwa otu n’ime aụmụ Alma ka agụnyere n’etiti ha, ebe a kpọrọ ya Alma, n’iso aha nna ya; otu o sila dị, ọ ghọrọ nnukwu ajọọ-mmadụ na bonye-na-efe arụsị. Ma ọ bụ nwoke nke ọtụtụ okwu, ma na-agwa ndị mmadụ okwu otuto na-erughị n’obi; ya mere o dubara ọtụtụ mmadụ ime ụdị ajọọ-omume ya nile.

9 Ma ọ ghọrọ nnukwu ọdachị nye ime nke ọma nke nzukọ-nsọ nke Chineke ahụ; ana-ezupụ obi nile nke ndị mmadụ; na-ebute nnukwu nghọtahịe n’etiti ndị ahụ; na-enye onye-iro nke Chineke ohere ime ike ya n’arụ ha.

10 Ma ugbua o wee ruo na mgbe ọ na-agagharị ibibi nzukọ-nsọ nke Chineke, n’ihi na ọ na-agagharị na nzuzo ya na ụmụ nwoke nke Mosaịa na-achọ ibibi nzukọ-nsọ ahụ, na iduhie ndị nke Onye-nwe ahụ, megide iwu-nsọ nile nke Chineke, ma-ọbụ ọbụna nke eze ahụ—

11 Ma dịka m gwara unu, dịka ha na-agagharị ana-enupu-isi megide Chineke, lee, bmụọ-ozi nke Onye-nwe cpụtara, gosị ha onwe ya; ma ọ rịdatara n’ụdị dịka n’ime igwe oji; ma o kwuru okwu n’ụdị dịka ijiri olu nke egbe-elu-igwe, nke mere ka ala ahụ nke ha guzoro n’elu ya maa jijiji;

12 Ma ịtụ-n’anya ha dị oke ukwuu, nke mere na ha dara n’ala, ma ha aghọtaghị okwu nile nke ọ gwara ha.

13 Otu o sila dị o tiri mkpu ọzọ na-asị: Alma, bilie ma guzoro ọtọ, n’ihi gịnị mere ị na-esogbu nzukọ-nsọ nke Chineke? N’ihi na Onye-nwe asịwo: aNke a bụ nzukọ-nsọ m, ma a ga m ewulite ya; ma ọdịghị ihe ga-akwatụ ya, ma ọbụghị njehie nke ndị m.

14 Ma ọzọ, mụọ-ozi ahụ sịrị: Lee, Onye-nwe anụwo aekpere nile nke ndị ya, na kwa ekpere nile nke nwa-oru ya, Alma, onye bụ nna gị; n’ihi na o kpewo ekpere jiri nnukwu okwukwe gbasara gị ka a kpọbata gị n’ọmụma nke ezi-okwu ahụ; ya mere, n’ihi nke a ka m bịaworo ime ka ikwenye maka ike na ikike nke Chineke, na bekpere nile nke ụmụ-oru ya ga-enwe ọsịsa dịka okwukwe ha siri dị.

15 Ma ugbua lee, ị nwere ike ịrụ ike nke Chineke ụka? N’ihi na lee, olu m ọ maghị ala jijiji? Ma ị nweghịkwa ike ịhụ m n’iru gị? Ma e zitara m site na Chineke.

16 Ugbua a sị m gị: Gaa, ma cheta ndọkpụ n’agha nke ndị nna gị n’ala nke Hilam, na n’ala nke Nifaị; ma cheta ụdị nnukwu ihe nile o mewooro ha; n’ihi na ha nọrọ n’ịbụ-oru, ma ọ anapụtawo ha. Ma ugbua a sị m gị, Alma, gaa n’ụzọ gị, ma achọkwala ibibi nzukọ-nsọ ahụ ọzọ, ka e wee zaa ekpere nile ha, ma nke a ọbụna ma ọbụrụ na ị ga-achọ n’onwe gị ka a chụpụ gị.

17 Ma ugbua o wee ruo na ndị a bụ okwu ndị ikpe-azụ nke mụọ-ozi ahụ gwara Alma, ma o wee pụọ.

18 Ma ugbua Alma na ndị ahụ ya na ha nọ dara ọzọ n’ala, n’ihi na ịtụ-n’anya ha dị ukwuu na site n’anya nke ha, ha ahụwo mụọ-ozi nke Onye-nwe; ma olu ya dị ka egbe-elu-igwe, nke mere ka ala maa jijiji; ma ha matara na o nweghị ihe ọzọ ma ọbụghị ike nke Chineke nke nwere ike ime ka ala maa jijiji ma mee ka ọ maa jijiji dịka ọ ga ekewasi ekewasị.

19 Ma ugbua ịtụ-n’anya nke Alma dịịrị oke egwu nke mere na ọ dara ogbu, na o nweghị ike ịsaghee ọnụ ya; e, ma ọ dịghịkwa ike, ọbụna nke mere na o nweghị ike imegharị aka ya abụọ; ya mere ndị ha na ya nọ kpọrọ ya, ma buru ya na-ẹnweghị enye m aka, ọbụna ruo mgbe a tọgbọrọ ya n’iru nna ya.

20 Ma ha kwugharịrị nye nna ya ihe nile nke meworo ha; ma nna ya n̄ụrịrị ọn̄ụ, n’ihi na ọ matara na ọ bụ ike nke Chineke.

21 Ma o mere ka igwe-mmadụ gbakọta ọnụ ka ha wee hụrụ ihe Onye-nwe meworo nwa ya nwoke, na kwa maka ndị ha na ya nọ.

22 Ma o mere ka ndị nchụ-aja kpọkọta onwe ha ọnụ; ma ha malitere ibu ọnụ, na ikpe ekpere nye Onye-nwe Chineke ha ka o meghee ọnụ Alma, ka o wee kwuo okwu, na kwa na ụkwụ na aka ya nile ga-anata ume ha—ka anya ndị ahụ wee meghee ịhụ ma mata maka ịma mma na ebube nke Chineke.

23 Ma o wee ruo mgbe ha buworo ọnụ ma kpee ekpere mkpụrụ ụbọchị abụọ na abalị abụọ, ụkwụ na aka nile nke Alma natara ume ha, ma o bilitere ọtọ ma malite ịgwa ha okwu, na-arịọ ka ha nọdụ n’ezigbo nkasi-obi.

24 N’ihi na, o kwuru, E chegharịwo m site na mmehie m nile, ma a agbapụtawo m site n’Onye-nwe; lee a mụwo m site na Mụọ ahụ.

25 Ma Onye-nwe sịrị m: Ya atụla gị n’anya na mmadụ nile, e, ndị nwoke na ndị nwanyị, mba nile, ebo nile, asụsụ nile na ndị mmadụ, a ga aamụrịrị ha ọzọ; e, mụọ ha na Chineke, bgbanwee ha site cn’anụ arụ ha na ọnọdụ ọdịda ha, baa n’ọnọdụ nke ezi-omume, ebe Chineke gbapụtaworo ha, ịghọ ụmụ ya ndị nwoke na ndị nwanyị;

26 Ma otu a ha ghọọ ndị e kere ọhụrụ; ma ma-ọbụghị na ha mere nke a, aha agaghị enwe ike n’ụzọ ọbụla iketa ala-eze Chineke ahụ.

27 A sị m unu, ma-ọbụghị na nke a bụ ihe mere, a ga atufu ha; ma nke a ka m matara, n’ihi na a dị m ka a ga atufu m.

28 Otu o sila dị, mgbe m wagharịsịworo gafee oke mkpagbu, na-echegharị ruo nso ọnwụ, Onye-nwe n’obi ebere ahụwo n’okwesịrị ịpụnarịpụta m site an’ire ọkụ mgbe nile na-adigide, ma a mụwo m site na Chineke.

29 Mkpụrụ-obi m ka a gbapụtaworo site n’ime olulu ilu na agbu nile nke ajọọ-omume. A nọrọ m n’ime olulu kachasị gbaa ọchịchịrị; ma ugbua a na m ahụ oke ihe ịtụ-n’anya nke Chineke. Mkpụrụ-obi m anwere ntaram-ahụhụ nke ahụhụ ebighi-ebi; mana a pụnarịrị m, ma mkpụrụ-obi m e nweghị mgbu ọzọ.

30 A jụrụ m Onye-mgbapụta m, ma gọnarị ihe nke e kwuworọrịị maka ya site na nna anyị ha; ma na ugbua ka ha wee buru-ụzọ hụ na ọ ga-abịa, ma na ọ na-echeta ihe nile e kere eke nke okike ya, ọ ga-egosịpụta onwe ya nye mmadụ nile.

31 E, aikpere nile ga-egbu n’ala, ma ire nile ga-ekwupụta n’iru ya. E, ọbụna n’ụbọchị ikpeazụ, mgbe mmadụ nile ga-eguzoro ka o bkpee ha ikpe, mgbe ahụ ka ha ga-ekwupụta na ọ bụ Chineke; mgbe ahụ ka ha ga-ekwupụta, ndị na-ebi cn’enweghị Chineke n’ụwa, na ikpe nke ntaram-ahụhụ mgbe nile na-adigide zịrị ezi n’arụ ha; ma ha ga-ama jijiji, ma maa ririri ma rịbaghachị azụ n’okpuru dile-anya nke anya ịchọta ihe nile ya.

32 Ma ugbua o wee ruo na Alma malitere site n’oge a gaa n’iru ikuziri ndị ahụ, na ndị ahụ ha na Alma nọ n’oge mụọ-ozi ahụ pụtakwutere ha, na-agagharị gburu-gburu gafee ala nile, na-ekwupụtara ndị mmadụ nile ihe ndị nke ha nụworo ma hụwo, ma na-ekwusa okwu nke Chineke n’ime nnukwu mkpagbu, ebe a na-enye ha nnukwu nsogbu site na ndị bụ ndị n’ekweghị-ekwe, na-enwe otiti ihe site n’aka ọtụtụ n’ime ha.

33 Ma na na-agbanyeghị ihe nile ndịa, ha nyere nzukọ-nsọ ahụ nnukwu nkasi obi, na-emesi okwukwe ha ike, ma na-agba ha ume n’ogologo-ahụhụ na nnukwu irusi ọrụ ike idebe iwu-nsọ nile nke Chineke.

34 Ma anọ n’ime ha bụ aụmụ nke Mosaịa; ma aha ha bụ Amọn, na Erọn na Ọmna, na Hịmnaị; ndị a bụ aha nile nke ụmụ nwoke nke Mosaịa.

35 Ma ha gara njem n’ala nile nke Zarahemla, na n’etiti ndị nile nọ n’okpuru ọchịchị nke eze Mosaịa, jiri ọnụnụ-ọkụ n’obi na arụsị ọrụ ike na-achọ idozigharị mmebi ihe nile nke ha meworo nzukọ-nsọ ahụ, na-ekwupụta mmehie ha nile, ma na-ekwupụta ihe nile nke ha hụworo, ma na-akọwa ibu-amụma nile na akwụkwọ-nsọ nile nye ndị nile chọrọ ige ha ntị.

36 Ma otu a ha wee bụrụ ngwa-ọrụ n’aka nke Chineke n’iweta ọtụtụ n’ọmụma nke ezi-okwu, e, n’ọmụma nke Onye-mgbapụta ha.

37 Ma lee ka ịdị ngọzi ha dị! N’ihi na ha akwusara udo; ha kwusara bozi nile nke ihe ọma; ma ha kwusara nye ndị ahụ na Onye-nwe na-achị.