Akwụkwọ nsọ
Mosaịa 5


Isi 5

Ndị-nsọ nile ga-aghọ ụmụ nwoke na ụmụ nwanyị nke Kraịst site n’okwukwe—Mgbe ahụ ka a ga-akpọ ha n’aha nke Kraịst—Eze Benjamịn wee gbaa ha ume ịkwụsike na ịbụ akwa akwụrụ n’ọrụ ọma nile. Ihe dịka n’afọ 124 tutu amụọ Kraịst.

1 Ma ugbua, o wee ruo na mgbe eze Benjamịn kwuworo okwu otu a nye ndị ya, ọ gara ozi n’etiti ha, na-achọsike ịmata site na ndị ya ma ha kwere okwu nile ahụ nke ọ gwaworo ha.

2 Ma ha nile wee tie n’otu olu, na-asị: E, anyị kwere okwu nile ahụ nke ị gwaworo anyị; na kwa, anyị matara maka ahaghị imezu ha na ezi-okwu, n’ihi Mụọ nke Onye-nwe nke Pụrụ Ime Ihe nile, nke wetaworo nnukwu amgbanwe n’ime anyị nile, ma-ọbụ n’ime obi anyị nile, nke mere na anyị enwekwaghị ọchịchọ ime bihe ọjọọ, kama ime ihe ọma esepụghị aka.

3 Ma anyị, n’onwe anyị, kwa, site n’ịdị mma na-enweghị oke nke Chineke, na mpụta-ìhè nile nke Mụọ ya, nwere nnukwu nlekwasị-anya nke ihe ahụ nke ga-abịa; ma ọbụrụ na ọ dị mkpa, anyị nwere ịke ibu-amụma maka ihe nile.

4 Ma ọ bụ okwukwe ahụ nke anyị nweworo n’ihe ndị nke eze anyị gwaworo anyị bụ ihe wetaworo anyị na nnukwu mmata ihe nke a, nke mere anyị na-an̄ụrị nnukwu ọn̄ụ karịrị akarị.

5 Ma anyị dị na njikere ịba n’ime aọgbụgba-ndụ anyị na Chineke anyị ime uche ya, na irube-isi nye iwu-nsọ ya nile n’ihe nile nke ọ ga-enye anyị n’iwu, ụbọchị nile nke fọdụrụ anyị, ka anyị ghara iwetara onwe anyị bịta-ahụhụ agwụ-agwụ, dịka e kwuworo site n’ọnụ cmụọ-ozi ahụ, ka anyị ghara ịn̄ụ site n’iko nke ọnụma nke Chineke ahụ.

6 Ma ugbua, ndị a bụ okwu nile nke eze Benjamịn chọsịrị ike n’aka ha; ma ya mere ọ sịrị ha: Unu ekwuwo okwu nile ahụ nke m chọsịrị ike; ma ọgbụgba-ndụ ahụ nke unu meworo bụ ọgbụgba-ndụ ziri-ezi.

7 Ma ugbua, n’ihi ọgbụgba-ndụ ahụ unu meworo a ga-akpọ unu aụmụ nke Kraịst, ụmụ ya ndị nwoke, na ụmụ ya ndị nwanyị; n’ihi na lee, n’ụbọchị nke taa, ọ bmụwo unu n’ime mụọ, n’ihi na unu na-asị cn’obi unu nile ka a gbanweworo site n’okwukwe n’aha ya; ya mere, unu ka da mụworo na ya ma unu aghọwo eụmụ ya ndị nwoke na ụmụ ya ndị nwanyị.

8 Ma n’okpuru isi nke a, e mere ka unu anwere onwe unu, ma bọdịghị isi ọzọ nke unu ga-esi na ya nwere onwe unu. Ọdịghị caha ọzọ e nyere ebe nzọpụta si abịa; ya mere, ọ ga-adị m mma na unu dga-ebukwasị onwe unu aha nke Kraịst, unu nile ndị baworo n’ime ọgbụgba-ndụ unu na Chineke na unu ga-erube isi ruo ọgwụgwụ ndụ unu nile.

9 Ma ọ ga-eru na onye ọbụla na-eme nke a, a ga-achọta ya n’aka nri nke Chineke, n’ihi na ọ ga-amata aha ahụ nke a na-akpọ ya, n’ihi a ga-akpọ ya n’aha nke Kraịst.

10 Ma ugbua ọ ga-eru, na onye ọbụla nke na-ebukwasịghị onwe ya aha nke Kraịst a ga-akpọrịrị ya an’aha ọzọ; ya mere, ọ ga-achọta onwe ya bn’aka ekpe nke Chineke.

11 Ma ọ dị m ka unu cheta kwa, na nke a bụ aaha ahụ nke m sịrị na m ga-enye unu nke a na-agaghị ehichapụ ehichapụ, ma ọbụghị site na njehie, ya mere, kpachapụ anya ka unu ghara ijehie, ka aha ahụ ghara ibu ihe ehichapụrụ n’obi unu nile.

12 Asị m unu, ọ dị m ka unu cheta aidebe aha ahụ e deworo oge nile n’ime obi unu, ka aghara ịchọta unu n’aka ekpe nke Chineke, ma ka unu nụrụ ma mata olu ahụ nke a ga-eji kpọọ unu, na kwa, aha ahụ nke ọ ga-akpọ unu.

13 N’ihi na olee otu mmadụ ga-esi amata nna ya ukwu onye ọ na ejerebeghị ozi, na onye ọ na-amataghị, ma dịrị anya site n’echiche nile na nzube nile nke obi ya?

14 Ma ọzọ, mmadụ ọ ga-ewere anụ dịka ịnyịnya nke onye agbata-obi ya nwere, ma debe ya? Asị m unu, E-e; ọ gaghị ekwe ọbụna ka ọ taa nri n’etiti igwe-anụ ya, ma ọ ga-achụpụ ya, ma chụfuo ya. A sị m unu, na ọbụna otu a ka ọ ga-adị n’etiti unu ma ọbụrụ na unu amataghị aha ahụ nke a na-akpọ unu.

15 Ya mere, ọ dị m ka unu bụrụ ndị kwụsịrị ike na akwa a kwụrụ, oge nile na-ejupụta n’ọrụ ọma nile, na Kraịst, Onye-nwe Chineke nke Pụrụ Ime Ihe nile, ga aarachi unu ndị nke ya, ka e wee kpọta unu n’elu-igwe, ka unu wee nwe nzọpụta mgbe nile na-adigide na ndụ ebighi-ebi, site na amamihe, na ike, na ikpe-zịrị-ezi, na ebere nke ya onye bkere ihe nile, n’elu-igwe na n’ụwa, onye bụ Chineke kacha ihe nile elu. Amen.