Enyemaka niile nke Ọmụmụ ihe
NAJS, Abụ Ọma 24


NAJS, Abụọma 24:7–10 (tụlee ihe dị iche na Abụọma 24)

(Abụọma a na-eme mmemme ọbịbịa Kraịst nke ugboro abụọ)

7 Bulie nụ isi unu elu, O unu ọgbọ nile nke Jekọb, ka unu bụrụ kwa ndị e buliri elu, na Onye-nwe onye bụ dike na dimkpa; Onye-nwe nke bụ dimkpa n’agha, onye bụ eze ebube, ga-ehiwe unu ruo mgbe nile.

8 Ọ ga-afụkọpụ kwa elu-igwe nile, ga-agbadata kwa ịgbapụta ndị ya; imere unu aha nke mgbe nile na-adigide; ihiwe unu n’elu oke nkume mgbe nile na-adịgide nke ya.

9 Bulie nụ isi unu elu, O unu ọgbọ nile nke Jekọb, bulie nụ isi unu elu, unu ọgbọ mgbe nile na-adigide, na Onye-nwe nke usuu nile nke ndị agha, eze nke ndị eze;

10 Ọbụna eze ebube ga-abịakwute unu; ọ ga-agbapụtakwa ndị ya, ga-ehiwekwa ha n’ezi-omume. Selah.