Enyemaka niile nke Ọmụmụ ihe
NAJS, Abụ Ọma 14


NAJS, Abụọma 14:1–7 (tụlee ihe dị iche na Abụọma 14:1–7)

(Onye bụrụ-abụọma wee nurịa ọn̄ụ maka ụbọchị nke mweghachi.)

1 Onye-nzuzu asịwo n’ime obi ya, Ọ dịghị onye ọbụla nke hụworo Chineke. N’ihi na ọ dịghị egosi anyị onwe ya, ya mere ọdịghị Chineke dị. Lee, ha rere ure; ha arụwo ọrụ nile nke ihe-arụ, ọdịghị kwa onye ọbụla n’ìme ha na-eme ezi-ihe.

2 N’ihi na Onye-nwe sitere n’elu-igwe ledata anya n’arụ ụmụ mmadụ, site kwa n’olu-okwu ya sị nwa odibo ya, Chọọ n’etiti ụmụ mmadụ, ịhụ ma o nwere ndị na-aghọta Chineke dị. Na o wee meghee ọnụ ya nye Onye-nwe, sịkwa, Lee, ndị a nile bụ ndị na-asị na ha bụ nke gị.

3 Onye-nwe wee zaa sị, Ha nile ewezugawo onwe ha, ha nile aghọwo otu n’iru-inyi, ị pụghị ịhụ otu onye n’ime ha nke na-eme ezi ihe, ọdịghị, ọbụna otu onye.

4 Ndị nile bụ ndị ha nwere maka ndị ozizi ha bụ ndị na-arụ ọrụ oke ajọọ omume, ọ dịghị kwa mmata-ihe dị n’ime ha. Ha bụ ndị na-eripịa ndị m. Ha na-eri achịcha na-akpọkughị kwa Onye-nwe.

5 Ha nọ n’oke égwù, n’ihi na Chineke na-ebi n’ọgbọ nke ndị ezi-omume. Ọ bụ onye-ndụmọdụ nke ndị-ogbenye, n’ihi na ihere ndị ajọọ mmadụ na-eme ha, ha na-agbakwuru kwa Onye-nwe maka ebe mgbaba ha.

6 Ha na-eme ihere maka ndụmọdụ nke ndị ogbenye n’ihi na Onye-nwe bụ ebe mgbaba ya.

7 O asị na-ehiwere Zaịọn site n’ime elu-igwe, nzọpụta nke Israel. O Onye-nwe, olee mgbe ị ga-ehiwe Zaịọn? Mgbe Onye-nwe weghachiri azụ ndọkpụ n’agha nke ndị ya, Jekọb ga-enwe an̄ụrị, Israel ga-enwe obi-ụtọ.