Akwụkwọ nsọ
Alma 26


Isi 26

Amọn na-enwe an̄ụrị n’ime Onye-nwe—Ndị okwukwe ka Onye-nwe na-agba ume ma a na-enye ha ọmụma ihe—Site n’okwukwe ndị mmadụ nwere ike iweta ọtụtụ puku mkpụrụ-obi na nchegharị—Chineke nwere ike nile ma na-aghọta ihe nile nke ọma. Ihe dịka n’afo 90 ruo 77 tutu amụọ Kraịst.

1 Ma ugbua, ndị a bụ okwu nile nke Amọn nye ụmụnne ya nwoke, nke sịrị otu a: Ụmụnne afọ m ndị nwoke na ụmụnne m nwoke, lee asị m unu, lee nnukwu ihe mere anyị jiri kwesi in̄ụrị ọn̄ụ; n’ihi na anyị gaara eche mgbe anyị amalitere site n’ala nke Zarahemla na Chineke gara rịị enye anyị oke nnukwu ngọzi nile?

2 Ma ugbua, a na m ajụ, olee nnukwu ngọzi nile ka ọ nyeworo anyị? Unu nwere ike ịkọ?

3 Lee, a na m azachitara unu; nʼihi ụmụnne anyị ndị nwoke, ndị Leman, nọọrọ n’ọchịchịrị, e, ọbụna n’ime olulu ala mụọ gbakarịrị ọchịchịrị, ma na lee aole n’ime ha ka a kpọtara ịhụ ihe oke ịtụ-n’anya nke Chineke ahụ! Ma nke a bụ ngọzi ahụ nke a wụkwasịworo anyị, na e mewo anyị bngwa ọrụ n’aka nke Chineke iji wepụta nnukwu ọrụ a.

4 Lee, aọtụtụ puku n’ime ha na-an̄ụrị ọn̄ụ, ma ewebatawo ha n’ime otu nke Chineke.

5 Lee, aubi ahụ chara-acha, ma ngọzi ka unu dị, n’ihi na unu kwabara bmma iwe ihe ubi ahụ, ma ghọọ site n’ume unu, e, ogologo ụbọchị nile ka unu rụrụ ọrụ; ma lee ọnụ ọgụgụ nke cukwu-ọka unu nile! Ma a ga-ekpokọta ha n’ime ọba-ọka nile, ka ha ghara imebi.

6 E, ebili mmiri agaghị etịda ha n’ụbọchị ikpe-azụ ahụ; e, ọbụghị ma a ga-efopụ ha site n’ifufe gburu gburu nile, kama mgbe aebili mmiri bịara a ga-ekpokọta ha ọnụ n’ebe ndebe ha, nke mere na ebili mmiri enweghị ike ịbanyekwuru ha; e, ọbụghị ma a ga-eji ifufe dị egwu bụga ha ebe ọbụla onye iro ahụ chọrọ iburu ha gaa.

7 Mana lee, ha nọ n’aka abụọ nke Onye-nwe nke aowuwe-ihe-ubi, ma ha bụ nke ya; ma ọ bga-ekulite ha n’ụbọchị ikpe-azụ ahụ.

8 Ngọzi na-adịrị aha nke Chineke anyị; ka anyị abụọ abụ ito ya, e, ka anyị nye aha nsọ ya bekele, n’ihi na ọ na-arụ ọrụ ezi-omume ruo mgbe nile.

9 N’ihi na ọ bụrụ na anyị apụtaghị site n’ala nke Zarahemla, ụmụnne anyị nwoke a anyị hụrụ nʼanya ezie, ndị nke hụworo anyị n’anya ezie, gara anọgiderịrị anʼịkpọ-asị megide anyị, e, ma ha gakwara abụ ndị ana maghị-ama nye Chineke.

10 Ma o wee ruo na mgbe Amọn kwuworo okwu ndị a nile, nwanne ya nwoke Erọn baara ya mba, na-asị: Amọn, egwu na-atụ m na obi-ụtọ gị ebubawo gị n’itu-ọnụ.

11 Mana Amọn sịrị ya: Anaghị m aetu-ọnụ n’ike nke onwe m, ma-ọbụ na amamihe nke onwe m; kama lee, bọn̄ụ m juru eju, e, obi m jubigara-oke n’ọn̄ụ, ma a ga m an̄ụrị n’ime Chineke m.

12 E, a matara m na m bụ ihe efu; ọbụrụ ma ike m adịghị m ike; ya mere agaghị m aetu ọnụ site n’onwe m, kama a ga m etu-ọnụ site na Chineke m, n’ihi na site bn’ike ya enwere m ike ime ihe nile; e, lee, ọtụtụ ọrụ-ebube buru ibu ka anyị rụworo n’ala nke a, nke anyị ga-eji nye aha ya otuto ruo mgbe nile.

13 Lee, puku ole n’ime ụmụnne anyị nwoke ka ọ tọpụworo site n’ihe mgbu nile nke aala mụọ; ma akpọtawo ha bibụ-abụ ịhụ-n’anya nke mgbapụta, ma nke a n’ihi ike nke okwu ya nke dị n’ime anyị, ya mere anyị enweghị nnukwu ihe mere anyị ga-eji an̄ụrị ọnụ?

14 E, anyị nwere ihe mere anyị ga-eji na-eto ya ruo mgbe nile, n’ihi na o bụ Chineke kachasị elu, ma ọ tọpụwo ụmụnne anyị nwoke site an’ụdọ-igwe nile nke ala mụọ.

15 E, e jiri ọchịchịrị mgbe nile na-adigide na mbibi gbaa ha gburu-gburu; ma lee, ọ kpọbatawo ha n’ime aìhè mgbe nile na-adigide ya, e, n’ime nzọpụta mgbe nile na-adigide; ma e jiri uju nke ịhụ-n’anya ya n’enweghị atụ gbaa ha gburu-gburu; e, ma anyị abụrụwọrịị ngwa-ọrụ n’aka ya abụọ nke ịrụ nnukwu na ọrụ dị ịtụ n’anya nke a.

16 Ya mere, aka anyị n̄ụrịa, e, anyị bga-an̄ụrị ọn̄ụ n’ime Onye-nwe; e, anyị ga-an̄ụrị, n’ihi na ọn̄ụ anyị juru eju; e, anyị ga-eto Chineke anyị ruo mgbe nile. Lee, onye nwere ike inwe ọn̄ụ karịa n’ime Onye-nwe? E, onye nwere ike ikwu okwu karịa maka nnukwu ike ya, na maka cebere ya, na maka ogologo-ntachi-obi ya n’ebe ụmụ nke mmadụ nọ? Lee, asị m unu, enweghị m ike ikwu akụkụ nke kachasị ntakịrị nke otu o siri metụ m.

17 Onye gaara eche na Chineke anyị gaara enwe oke obi ebere nke ịnapụta anyị rịị site n’ọnọdụ dị egwu, nke mmehie, na nke emerụrụ emerụ?

18 Lee, anyị gagharịrị ọbụna n’iwe, jiri nnukwu mmaja nile aibibi nzukọ-nsọ ya.

19 O mgbe ahụ, gịnị mere ọ ranyeghị anyị n’aka mbibi dị egwu, e, gịnị mere o meghị ka mma agha nke ikpe zịrị ezi ya dakwasị anyị, ma ma anyị ikpe ịda mba ebighi-ebi?

20 O, mkpụrụ-obi m, dịka otu o siri dị m, na-agbafu n’echiche. Lee, ọ wụkwasịghị anyị ikpe zịrị-ezi ya, kama na nnukwu ebere ya ọ kpọfetawo anyị an’ọlụlụ mgbe nile na-adigide nke ọnwụ na nhuju-anya, ọbụna ruo na nzọpụta nke mkpụrụ-obi anyị nile.

21 Ma ugbua lee, ụmụnne m nwoke, olee mmadụ nke aụdị okike nke matara ihe ndị a nile? Asị m unu, ọdịghị onye ọbụla bmatara ihe ndị a, ma ọbụghị onye chegharịrị.

22 E, onye nke achegharịworo ma na-egosị bokwukwe, ma na-ewepụta ọrụ ọma nile, ma na-ekpe ekpere esepụghị aka, na-enweghị nkwusị—ụdị ndị a ka a na-enye ịmata cihe omimi nile nke Chineke; e, ụdị ndị a ka enyere ikpughe ihe nile nke na-adịbeghị mgbe ekpughere ha; e, ma a ga-enye ụdị ahụ iweta ọtụtụ puku mkpụrụ-obi nile na nchegharị, ọbụna dịka e nyeworo anyị iweta ụmụnne anyị nwoke ndị a na nchegharị.

23 Ugbua unu chetara, ụmụnne m nwoke, na anyị gwara ụmụnne anyị nwoke n’ala nke Zarahemla, na anyị na-agalite n’ala nke Nifaị, ikwusara ụmụnne anyị nwoke, ndị Leman ozi-ọma, ma ha chịrị anyị ọchị nlelị?

24 N’ihi na ha sịrị anyị: Unu chere na unu ga-eweta ndị Leman n’ọmụma nke ezi-okwu ahụ? Unu chere na unu ga-enwe ike mee ka ndị Leman kwenye maka abụghị ezi-okwu nke aomenala nile nke ndị nna ha, bndị na-akpo-ekwe-nkụ dịka ha bụ; ndị obi ha nile nwere mmasị n’ịkwafu ọbara; ndị jiriworo ụbọchị ha nile mee ajọọ-omume kachasị ibe ya; ndị ụzọ ha nile buwororịị ụzọ nile nke onye njehie site na mmalite? Ugbua ụmụnne m nwoke, unu chetara na nke a bụ asụsụ ha.

25 Ma nke ka nke ha sịrị: Ka anyị welite ngwa ọgụ nile megide ha, ka anyị wee bibie ha na ajọọ-omume ha site n’ala ahụ, adịghị ama-ama ha achụfee anyị ma bibie anyị.

26 Mana lee, ụmụnne m nwoke m hụrụ n’anya, anyị bịara n’ime ọzara ahụ n’ebụghị n’obi ibibi ụmụnna anyị nwoke, kama buru n’obi na eleghị anya anyị ga-azọpụta ụfọdụ ole na ole n’ime mkpụrụ-obi ha nile.

27 Ugbua mgbe obi anyị nile dara mba ma anyị chọrọ ka anyị tụgharịa azụ, lee, Onye-nwe akasiri anyị obi, ma sị: Gaa n’etiti ụmụnne unu nwoke, ndị Leman, ma jiri bndidi die cmkpagbu unu nile, ma a ga m enye unu mmeri.

28 Ma ugbua lee, anyị abịawo, ma nọdụwo n’etiti ha; ma anyị enwewọrịị ndidi n’ịta ahụhụ anyị nile, ma anyị atawo ụdi ahụhụ ịnọ n’ụkọ ọbụla; e, anyị agawo njem site n’ụlọ ruo n’ụlọ, na-adabere n’ebere nile nke ndị ụwa—ọbụghị n’ebere nile nke ndị ụwa nanị kama n’ebere nile nke Chineke.

29 Ma anyị abawo n’ime ụlọ ha nile ma kuziere ha, ma anyị akụziworo ha n’okporo-ụzọ ha nile; e, ma anyị akụziworo ha n’elu ugwu ha nile, ma anyị abawo kwa n’ime temple ha na ụlọ-nzukọ ha nile ma kuziere ha; ma achụpụwo anyị, ma kwaa anyị emu, ma bụkwasị anyị ọnụ mmiri, ma kụọ anyị aka na nti abụọ; ma atụwo anyị okwute, ma kpọrọ anyị ma kee anyị ụdọ nile siri ike, ma tụba anyị n’ime ụlọ mkpọrọ; ma site n’ike na amamihe nke Chineke azọpụtawo anyị n’ime ụlọ mkpọrọ; ma site n’ike na amamihe nke Chineke azọpụtawo anyị ọzọ.

30 Ma anyị atawo ahụhụ ụdị mkpagbu nile dị iche iche, ma ihe a nile, na eleghị anya anyị nwere ike ịbụ ụzọ a ga-esi napụta ụfọdụ mkpụrụ-obi; ma anyị chere na aọn̄ụ anyị ga-ejupụta ma ọbụrụ na eleghị anya anyị nwere ike ịbụ ụzọ a ga-esi zọpụta ụfọdụ.

31 Ugbua lee, anyị nwere ike ilegharị anya ma hụ mkpụrụ nile nke ọrụ anyị nile; ma ha dị ole na ole? Asị m unu, E-e, ha dị aọtụtụ; e, ma anyị nwere ike ịgba-ama maka ịbụ ezi-okwu ha, n’ihi ịhụ-n’anya ha n’ebe ụmụnne ha nwoke nọ na kwa n’ebe anyị nọ.

32 N’ihi na lee, ọ gaara aka mma ha iji ndụ ha achụọ aja karịa ọbụna iwere ndụ nke onye-iro ha; ma ha beliwo ngwa-ọgụ na nile nke agha n’ime ime ala, n’ihi ịhụ-n’anya ha n’ebe ụmụnne ha nwoke nọ.

33 Ma ugbua lee asị m unu, enwewo oke nnukwu ịhụ-n’anya ha otu a n’ala ahụ nile? Lee, asị m unu, E-e, enwebeghị, ọbụna n’etiti ndị Nifaị nile.

34 N’ihi na lee, ha ga-ewelite ngwa agha nile megide ụmụnne ha nwoke; ha agaghị ekwe onwe ha ka egbuo ha. Mana lee ole n’ime ndị a tọgbọworo ndụ ha nile; ma anyị matara na ha agakwuruwo Chineke ha, n’ihi ịhụ-n’anya ha na maka asị ha kpọrọ mmehie.

35 Ugbua ọ bụ na anyị enweghị ihe mere anyị ga-eji n̄urịa ọn̄ụ? E, asị m unu, ọdịghị mgbe enwere ndị mmadụ ndị nwere nnukwu ihe mere ha ga-eji n̄ụrịa-ọn̄ụ dịka anyị, site na mgbe ụwa malitere, e, ma ọn̄ụ m ebupụwo m, ọbụna ruo n’itu ọnụ n’ime Chineke m; n’ihi na o nwere ike anile, amamihe nile, na nghọta nile; ọ bna-aghọta ihe nile, ma-ọbụ cOnye ebere, ọbụna ruo nzọpụta, nye ndị ga-echegharị ma kwere n’aha ya.

36 Ugbua ọbụrụ na nke a bụ itu ọnụ, ọbụna otu ahụ ka m ga-etu ọnụ; n’ihi na nke a bụ ndụ m na ìhè m, ọn̄ụ m na nzọpụta m, na mgbapụta m site na nhuju-anya mgbe nile na-adigide. E, ngọzi dịrị aha nke Chineke m, onye na-echeta ndị a, ndị bụ angalaba nke osisi nke Israel, ma efuworịi site n’arụ ya n’ala ọzọ; e, asị m, ngọzi na-adịrị aha nke Chineke m, onye nọworọrịị na-echeta anyị, bndị na-akpagharị n’ala ọzọ.

37 Ugbua ụmụnne m nwoke, anyị hụrụ na Chineke na-echeta andị ọbụla, n’ala ọbụla ha ga-anọ n’ime ya; e, ọ na-agụ ndị ya ọnụ, ma afọ ebere ya nile zuru n’ụwa nile. Ugbua nke a bụ ọn̄ụ m, na nnukwu inye-ekele m; e, ma a ga m enye Chineke m ekele ruo mgbe nile. Amen.