Akwụkwọ nsọ
2 Niphaị 9


Isi 9

Ndị Juu nile ka a ga-achịkọta n’ala ha nile nke e kwere na nkwa—Aja mgbaghara mmehie ahụ na-agbapụta mmadụ site n’Ọdịda ahụ—Arụ nile nke ndị nwụrụ-anwụ ga-apụta site n’ili, na mụọ ha nile site n’ala mụọ na site na paradaịs—A ga-ekpe ha ikpe—Aja mgbaghara mmehie ahụ na-azọpụta site n’ọnwụ, ala mụọ, ekwensu ahụ, na ahụhụ agwụgh-agwụ—Ndị ezi-omume ka a ga-azọpụta n’ala-eze Chineke—Ntaram-ahụhụ nke mmehie nile ka edoziworo—Onye-Nsọ nke Israel bụ onye-nche ọnụ ụzọ ama ahụ. Ihe dịka n’afọ 559 ruo 545 tutu amụọ Kraịst.

1 Ma ugbua, ụmụnne m ndị m hụrụ n’anya, a gụwo m ihe nile ndị a ka unu wee mata ihe gbasara ọgbụgba-ndụ nile nke Onye-nwe nke o gbaworo ya na ụlọ nile nke Israel—

2 Na ọ gwawo ndị Juu okwu, site n’ọnụ nke ndị-amụma ya nile dị nsọ, ọbụna site na mmalite gbada, site n’ọgbọ ruo n’ọgbọ, wee ruo mgbe oge ruru na a ga eweghachi ha nye nzukọ-nsọ nke ezi-okwu ahụ na otu nke Chineke; Mgbe a ga-achịkọta ha baa n’ụlọ n’ala nile nke nketa ha, ma a ga-ehiwe ha n’ala ha nile e kwere na nkwa.

3 Lee, ụmụnne m nwoke ndị m hụrụ n’anya, a na m agwa unu ihe ndị a ka unu wee n̄ụrịa ọn̄ụ, ma welie isi unu ruo mgbe nile, n’ihi na ngọzi nile nke Onye-nwe Chineke ka a ga-awụkwasị ụmụ unu.

4 N’ihi na a ma m na unu achọwo nnukwu, ọtụtụ n’ime unu, ịmata maka ihe ndị ga-abịa abia; ya mere a ma m na unu matara na anụ arụ anyị ga-ala-n’iyi ma nwụọ; otu o sila dị, n’arụ anyị nile, anyị ga-ahụ Chineke.

5 E, a ma m na unu matara na n’arụ ọ ga-egosị onwe ya nye ndị nọ na Jerusalem, bụ ebe anyị siri bịa; n’ihi na ọ dị mkpa na ọ ga-abụ otu n’ime ha; n’ihi na ọ baara nnukwu Onye-okike uru na o kwenyere n’onwe ya ka ọ ghọọ onye mmadụ ga-edu n’anụ arụ, ma nwụọ n’ihi nmadụ nile, ka mmadụ nile wee nọrọ n’okpuru ya.

6 N’ihi na dịka ọnwụ gafetaworo mmadụ nile, i ji mejupụta atụmatụ obi ebere nke nnukwu Onye-okike ahụ, o kwesịrị na a ga-enwe ikike nke mbilite n’ọnwụ, ma mbilite n’ọnwụ kwesịrị ịbịakwasị mmadụ n’ihi ọdịda ahụ; ma ọdịda ahụ bịara n’ihi njehie; ma n’ihi na mmadụ aghọwo onye dara ada, ebepụrụ ha site n’ebe Onye-nwe nọ.

7 Ya mere, o kwesịrị ka ọ bụrụ aja mgbaghara mmehie na-enweghị oke—-ma ọbụghị na ọ ga-abụ aja mgbaghara mmehie enweghị oke ire ure a enweghị ike iyịkwasị ereghị-ure. Ya mere, ikpe mbụ nke bịakwasịrị mmadụ kwesịrị ka ọ dịgide ruo oge agwụgh-agwụ. Ma o bụrụ otu a, anụ arụ a kwesịrị idebe n’ala ka o ree ure na ka ọ tụrịsịa n’ime nne ya bụ ala, ka ọ ghara ibilite ọzọ.

8 O amamihe nke Chineke, obi ebere na amara ya! N’ihi na lee, ọbụrụ na anụ arụ agaghị ebilite ọzọ, mụọ anyị ga-anọzi n’okpuru mụọ-ozi ahụ onye si n’ebe Chineke ebighi-ebi ahụ nọ dapụ, ma ghọọ ekwensu, nke na-agaghị ebilite ọzọ.

9 Ma mụọ anyị nile ga-adịworịị ka ya, ma anyị aghọọ ekwensu nile, ndị mụọ-ozi nke ekwensu, ndị a ga-emechibido ụzọ site n’ebe Chineke anyị nọ, na ịnọgide ha na nna nke okwu ụgha nile, n’ọnọdụ nhujụ anya, dịka ya na onwe ya, e, onye ahụ nke ghọgburu nne na nna anyị mbụ, nke megharịworo onwe ya ruo ịbụ mụọ-ozi nke ìhè, ma na-akpasu ụmụ nke mmadụ n’ime ntụgwa nzuzo nile nke igbu mmadụ na ụdị ọrụ nzuzo nile nke ọchịchịrị.

10 O lee otu nnukwu ịdị mma nke Chineke anyị dị, onye-na-akwadoro anyị ụzọ maka mgbalaga site na njidesi ike nke ajọọ anụ ahụ di egwụ; e, ajọọ anụ ahụ, ọnwụ na ala mụọ, nke m na-akpọ ọnwụ nke arụ, na kwa ọnwụ nke mụọ.

11 Ma n’ihi ụzọ-nnapụta nke Chineke anyị, Onye-Nsọ nke Israel, ọnwụ a nke m kwuworo maka ya, bụ nke arụ, ga-ewepụta ndị ya nwụrụ anwụ; ọnwụ nke ahụ bụ ili.

12 Ma ọnwụ a nke m kwuworo maka ya, nke bụ ọnwụ nke mụọ, ga-ewepụta ndị ya nwụrụ anwụ; nke ọnwụ nke mụọ ya bụ ala mụọ; ya mere, ọnwụ na ala mụọ ga-ewepụtarịrị ndị ha nwụrụ anwụ, ma ala mụọ ga-ewepụtarịrị mụọ ndị ọ dọkpụụrụ n’agha, ma ili ga-ewepụtarịrị arụ ndị ọ dọkpụụrụ n’agha, ma arụ ndị a na mụọ ndị a nke ụmụ mmadụ ka a ga eweghachi otu na ibe ya; ma ọ bụ site n’ike nke mbilite n’ọnwụ nke Onye-Nsọ nke Israel.

13 O lee ka nnukwu atụmatụ ya ha, nke Chineke anyị! N’ihi na n’aka nke ọzọ, paradaịs nke Chineke ga-ewepụtarịrị mụọ nile nke ndị ezi-omume, ma ili ahụ ewepụta arụ nke ndị ezi-omume; ma mụọ ahụ na arụ ahụ ka a ga-eweghachi kwara onwe ya ọzọ, ma mmadụ nile ga-aghọ ndị na-agaghị ere ure, na agaghị-anwụ anwụ, ma ha bụ mkpụrụ-obi dị ndụ, nwere ọmụma-ihe zuru oke dịka anyị n’ime anụ arụ, ma ọbụghị na amamihe anyị ga-ezu oke.

14 Ya mere, anyị ga-enwe amamihe zuru oke maka ikpe-ọmụma nke anyị, na adịghị ọcha anyị, na ịgba-ọtọ anyị, ma ndị ezi-omume ga-enwe amamihe zuru oke maka inwe ọn̄ụ ha, na ezi-omume ha, ebe eyịkwasịrị ha enweghị ntụpọ dịka uwe, e, ọbụna i ji uwe-mwụda nke ezi-omume.

15 Ma ọ ga-eru na mgbe mmadụ nile ga-agafeworiị ọnwụ nke mbụ a baa na ndụ, ebe ọ bụ na ha a ghọwo ndị na-anaghị anwụ-anwụ, ha ga-apụta n’iru oche-ikpe nke Onye-Nsọ nke Israel; ma mgbe ahụ ka ikpe ga-abịa, ma mgbe ahụ ka a ga-ekperịrị ha ikpe dịka usoro nke ikpe dị nsọ nke Chineke siri dị.

16 Ma dịka o siri bụrụ ezi-okwu, na Onye-nwe na-adị ndụ, n’ihi na Onye-nwe Chineke ekwuwo ya, ma ọ bụ okwu ebighi-ebi ya, nke na-agaghị agabiga, na ndị nile bụ ndị ezi-omume ga-abụ kwa ndị ezi-omume, ma ndị ruru inyi ga-abụ kwa ndị ruru inyi; ya mere, ndị ahụ ruru inyi bụ ekwensu na ndị mụọ-ozi ya; ma ha ga-apụ baa n’ime ọkụ mgbe nile na-adigide; a kwadobere ha; na ahụhụ ha ga-adị ka ọdọ ọkụ na nkume ọkụ, nke ire ọkụ ya na-arigoro n’elu ruo mgbe nile na mgbe nile na-enweghị ọgwụgwụ.

17 O ịdị ukwuu na ikpe-zịrị-ezi nke Chineke anyị! N’ihi na o na-emezu okwu ya nile, ma ha apụtawo site n’ọnụ ya, ma iwu ya ka a ga-emezurịrị.

18 Ma, lee, ndị ezi-omume, ndị-nsọ nke Onye-Nsọ nke Israel, ndị kwenyeworo n’Onye-Nsọ nke Israel, ndị nagideworo obe nile nke ụwa, ma lelịa ihere dị ya, ha ga eketa ala-eze nke Chineke, nke a kwadobere maka ha site na ntọ-ala nke ụwa, ma ọn̄ụ ha ga eju eju ruo mgbe nile.

19 O ịdị ukwuu nke obi ebere nke Chineke, Onye-Nsọ nke Israel! N’ihi na O na-anapụta ndị nsọ ya site n’aka ajọọ anụ ahụ dị egwụ bụ ekwensu, na ọnwụ, na ala mụọ, na ọdọ ọkụ ahụ na nkume ọkụ, nke bụ ahụhụ agwụgh-agwụ.

20 O lee ka nnukwu ịdị nsọ nke Chineke anyị ha! N’ihi na ọ mazuru ihe nile, ma ọdịghị ihe ọbụla ma ọbụghị na ọ matara ya.

21 Ma ọ bịaworo n’ime ụwa ka o wee zọpụta mmadụ nile ma ọbụrụ na ha ga an̄a nti n’olu ya; n’ihi na lee, o na-ata ahụhụ mgbu nke mmadụ nile, e, mgbu nke ihe nile ekere eke dị ndụ, ma ndị nwoke, ndị nwanyị, na ụmụ-ntakịrị, bụ ndị ezi na ụlọ Adam.

22 Ma ọ na-ata ahụhụ a ka mbilite n’ọnwụ ruo mmadụ nile, ka ha nile wee guzoro n’iru ya na nnukwu ụbọchị ikpe ahụ.

23 Ma o nyere mmadụ nile iwu na ha garịrị echegharị, ma mee baptism n’aha ya, nwere okwukwe zuru-oke n’Onye-Nsọ nke Israel, ma-ọbụ agaghị azọpụta ha n’ala-eze Chineke.

24 Ma ọbụrụ na ha agaghị echegharị ma kwere n’aha ya, ma mee baptism n’aha ya, ma nọgide ruo ọgwụgwụ, a ga ama ha ikpe; n’ihi na Onye-nwe Chineke, Onye-Nsọ nke Israel, ekwuwo ya.

25 Ya mere, o nyewo iwu; ma ebe ana-enweghị iwu e nyere, e nweghị ntaram-ahụhụ, ma ebe ana-enweghị ntaram-ahụhụ e nweghị amam-ikpe; ma ebe ana-enweghị amam-ikpe, ebere nile nke Onye-Nsọ nke Israel na-agbapụta ha, n’ihi aja mgbaghara mmehie ahụ; n’ihi na a na-anapụta ha site n’ike nke ya.

26 N’ihi na aja mgbaghara mmehie ahụ kwụzuru ụgwọ nke ikpe ya ziri-ezi n’arụ ndị nile na-enweghị iwu enyere ha, na a na-anapụta ha n’aka ajọọ anụ ahụ dị egwụ, ọnwụ na ala mụọ na ekwensu na ọdọ ọkụ na nkume ọkụ, nke bụ ahụhụ agwụgh-agwụ; ma akpọghachị ha nye Chineke ahụ onye nyere ha ume-okuku, nke bụ Onye-Nsọ nke Israel.

27 Ma ahụhụ na-adịrị ya bụ onye nwere iwu e nyere, e, nke nwere iwu-nsọ nile nke Chineke, dịka anyị, ma bụrụ onye na-ejehie ha, na onye na-ala ụbọchị nile nke mnwale ya n’iyi, n’ihi na egwu ka ọnọdụ ya dị!

28 O atụmatụ aghụghọ nke ajọọ-onye ahụ! O abaghị uru, na esịghị-ike nile, na nzuzu nile nke ụmụ mmadụ! Mgbe ha mụtaworo akwụkwọ ha na-eche na ha ma ihe, ma ha anaghị an̄a ntị na ndụmọdụ nke Chineke, n’ihi na ha na ewezuga ya n’akụkụ, na-eche na ha ma nke onwe ha, ya mere, amamihe ha bụ nzuzu ma ọ gaghị abara ha uru. Ma ha ga-ala-n’iyi.

29 Mana ịmụta akwụkwọ dị mma ma ọbụrụ na ha n̄aa ntị na ndụmọdụ nile nke Chineke.

30 Mana ahụhụ na-adịrị ọgaranya, ndị bara ụba n’ihe nile nke ụwa. N’ihi na maka na ha bụ ọgaranya ha na-eleda ndị ogbenye anya, ma ha na-esogbu ndị dị umeala n’obi, ma obi ha nile dị n’ebe akụ ha dị; ya mere, akụ ha bụ chi ha. Ma lee, akụ ha ga-esokwa ha laa n’iyi.

31 Ma ahụhụ na-adịrị ndị ntị-ike ndị na-agaghị anụ ihe; n’ihi na ha ga-ala-n’iyi.

32 Ahụhụ na-adịrị ndị-ìsì na-agaghị ahụ ụzọ; n’ihi na ha ga-ala kwa n’iyi.

33 Ahụhụ na-adịrị ndị na-ebịghị ụgwụ n’obi, n’ihi na mmata nke ajọọ-omume ha ga-emekpa ha arụ n’ụbọchị ikpe-azụ ahụ.

34 Ahụhụ na-adịrị onye okwu ụgha, n’ihi na a ga-atụba ya n’ala mụọ.

35 Ahụhụ na-adịrị onye ogbu-mmadụ nke na-akpachapụ anya na-egbu, n’ihi na ọ ga-anwụ.

36 Ahụhụ na-adịrị ndị na-agba akwụna, n’ihi na a ga-atụba ha n’ala mụọ.

37 E, ahụhụ na-adịrị ndị na-efe arụsị apịrị-apị, n’ihi na ekwensu nke ekwensu nile nwere mmasị n’ebe ha nọ.

38 Ma, na nke-nke, ahụhụ na-adịrị ndị nile na-anwụ n’ime mmehie ha; n’ihi na ha ga-alaghachịkwute Chineke, ma lee iru ya, ma nọgide n’ime mmehie ha nile.

39 O, ụmụnne m nwoke ndị m hụrụ n’anya, cheta ịdị egwụ dị n’ime ijehie megide Chineke ahụ dị nsọ, na kwa ịdị egwụ nke ikwenye na ndufu nile nke onye-aghụghọ ahụ. Cheta, na itinye-uche n’ihe nke ụwa bụ ọnwụ, ma itinye-uche n’ihe nke mụọ bụ ndụ ebighi-ebi.

40 O, ụmụnne m nwoke m hụrụ n’anya, nye ntị n’okwu m nile. Cheta ịdị ukwuu nke Onye-Nsọ nke Israel. Unu asịkwala na mụ ekwuwo ihe siri ike megide unu; n’ihi na ọbụrụ na unu emee nke a, unu ga-emegide ezi-okwu; n’ihi na ekwuwo m okwu nke Onye meworo unu. A ma m na ezi-okwu na-esi ike megide adịghị-ọcha nile: ma na ndị ezi-omume anaghị atụ ha egwu, n’ihi na ha hụrụ ezi-okwu n’anya ma ọ naghị atụgharị ha.

41 O mgbe ahụ, ụmụnne m nwoke ndị m hụrụ n’anya, bịakwute nụ Onye-nwe, Onye-Nsọ ahụ. Cheta na ụzọ ya nile bụ ezi-omume. Lee, ụzọ nke mmadụ dị mkpafa, ma na ọ tọgbọrọ n’okporo ụzọ guzoro kwe m n’iru ya, ma onye nche nke ọnụ-ụzọ ama ahụ bụ Onye-Nsọ nke Israel; ma ọ naghị enye oru ọbụla ọrụ n’ebe ahụ; ma ọdịghị ụzọ ọzọ ma ọbụghị site n’ọnụ ụzọ ahụ; n’ihi na e nweghị ike ịghọgbu ya, n’ihi na Onye-nwe Chineke bụ aha Ya.

42 Ma onye-ọbụla kụrụ-aka, ọ bụ ya ka ọ ga-emeghere; ma onye amamihe, na onye nwere mmụta, na ndị bara ọgaranya, ndị na-afuli-elu n’ihi ọmụmụ ihe ha, na amamihe ha, na akụ na ụba ha—e, ha bụ ndị ọ na-akpọ asị; ma, ma ọbụghị na ha ga atufu ihe ndị a, ma were onwe ha ka ndị nzuzu n’iru Chineke, ma wedata onwe ha n’ime omimi nile nke obi umeala, ọ gaghị emeghere ha ụzọ.

43 Ma na ihe nile nke ndị amamihe na ndị na-akpachapụ anya ka a ga-ezonarị ha ruo mgbe nile—e, an̄ụrị ahụ nke akwadobere ndị nsọ nile.

44 O, ụmụnne m nwoke m hụrụ n’anya, cheta okwu m nile. Lee, eyipụwo m uwe m nile, ma ahụchasịwo m ha n’iru unu; A na m ekpe ka Chineke nke nzọpụta m na ọ ga-eji anya ịchọta ihe nile ya lee m; ya mere, unu ga amata n’ụbọchị ikpe-azụ, mgbe a ga-ekpe mmadụ nile ikpe site n’ọrụ ha nile, na Chineke nke Israel gbara aka-ebe na m hụchapụrụ ajọọ-omume unu site na mkpụrụ-obi m, ma na m guzoro n’ịdị ọcha n’iru ya, na ewezugawo m n’ọbara unu.

45 O, ụmụnne m nwoke ndị m hụrụ n’anya, tụgharịanụ site na mmehie unu nile; hụchapụ ụdọ-igwe nke onye ahụ ga-eke unu agbụ ọsọ-ọsọ; bịakwute Chineke ahụ nke bụ nkume nke nzọpụta unu.

46 Kwadobe mkpụrụ-obi unu maka ụbọchị otuto ahụ mgbe a ga-ekpe ndị ezi-omume ikpe zịrị ezi, ọbụna ụbọchị ikpe, ka unu ghara ịmịpụ site n’ụjọ dị egwụ; ka unu ghara icheta ikpe-ọmụma ahụ dị egwụ n’izu-oke ya, ma bụrụ ndị a ga-akwagide iti-mkpu: Nsọ, nsọ ka ikpe gị nile dị, O Onye-nwe Chineke Pụrụ Ime Ihe nile—ma na a ma m ikpe-ọmụma m; E jehiere m iwu gị, ma njehie m nile bụ nke m; ma ekwensu enwetawo m, nke na a bụ m anụ ịkpa-nri nye nhuju anya dị egwụ nke ya.

47 Ma lee, ụmụnne m nwoke, ọ dị mkpa na m ga-emete unu ka unu hụ ezi-okwu dị egwu si n’ihe ndị a nile? A ga m ata mkpụrụ-obi unu ahụhụ ma ọbụrụ na obi unu dị ọcha? A ga m ekwupụtara unu ezi-okwu dịka nkwupụta ezi-okwu ma ọbụrụ na agbapụtara unu na mmehie?

48 Lee, ọbụrụ na unu dị nsọ a ga m agwa unu okwu maka ịdị nsọ; mana ebe ọbụ na unu a dịghị nsọ, ma unu na-elekwasị m anya dịka onye-nkuzi, ọ ga-adịrịrị mkpa na m ga-akụziri unu ihe mmehie na-eweta.

49 Lee, mkpụrụ-obi m na-akpọ mmehie asị, ma obi m na-enwe an̄ụrị n’ime ezi-omume; ma a ga m eto aha nsọ nke Chineke m.

50 Bịanụ, ụmụnne m nwoke, onye ọbụla nke akpịrị kpọrọ nkụ, bịanụ na mmiri nile ahụ; ma onye nke na-enweghị ego, bịa zụrụ ma rie; e, bịa zụrụ mmanya na mmiri-ara na-ejighi ego na na-enweghị ọnụ ahịa.

51 Ya mere, akwụla ego n’ihe nke na-enweghị ọnụ ahịa, ma-ọbụ ọrụ aka unu maka ihe na-enweghị ike inye afọ-ojuju. N̄aa m ntị nke ọma, ma cheta okwu nile nke m kwuworo; ma bịakwute Onye-Nsọ nke Israel, ma rie oriri n’elu ihe na-anaghị ala-n’iyi, na-abụghị ma ọ ga ere ure, ma ka mkpụrụ-obi unu nwe an̄ụrị n’ibu ibu.

52 Lee, ụmụnne m nwoke ndị m hụrụ n’anya, cheta okwu nile nke Chineke unu; na-ekpere ya mgbe nile n’ehihie, ma nye aha nsọ ya ekele n’abalị. Ka obi unu n̄ụrịa ọnụ.

53 Ma lee, ka ịdị ukwuu ọgbụgba-ndụ nile nke Onye-nwe ha, ma lee ka ịdị ukwuu mwedata-onwe-ala ya nile ha n’ebe ụmụ nke mmadụ nọ; ma n’ihi ịdị ukwuu ya, ma amara na obi ebere ya, o kwewo anyị nkwa na mkpụrụ-afọ anyị agaghị abụ ihe ebibiri kpam kpam, dịka n’anụ arụ, mana, ya ga-edokwa ha; ma n’ọgbọ dị n’iru ha ga-aghọ ngalaba ezi-omume nye ụlọ nke Israel.

54 Ma ugbua, ụmụnne m nwoke, a ga m agwa unu okwu karịa; mana echi a ga m ekwupụtara unu okwu m nile fọdụrụ. Amen.