Akwụkwọ nsọ
Alma 34


Isi 34

Amiulek wee gbaa ama na okwu ahụ dị n’ime Kraịst ruo nzọpụta—Ma ọbụghị na-achụrụ aja mgbaghara mmehie, mmadụ nile ga-alarịrị n’iyi—Iwu nile nke Moses na-arụ aka nʼịchụ-aja nke Ọkpara Chineke ahụ—Atụmatụ ebighi-ebi nke mgbapụta ahụ gbakwasịrị ụkwụ n’okwukwe na nchegharị—Kpee ekpere maka ngọzi nile nke arụ na nke mụọ—Ndụ nke a bụ oge dịrị ndị mmadụ ịkwado ịgakwuru Chineke—Rụpụta nzọpụta unu jiri-egwu n’iru Chineke. Ihe dịka n’afọ 74 tutu amụọ Kraịst.

1 Ma ugbua o wee ruo na mgbe Alma kwuworo okwu ndị a nile nye ha ọ nọdụrụ ọdụ n’elu ala ahụ, ma Amiulek biliri ma malite ịkụziri ha, na-asị:

2 Ụmụnne m nwoke, echere m na ọ bụ ihe na-agaghị ekwe omume na unu nọ n’amaghị ama maka ihe nile nke e kwuworo gbasara ọbịbịa nke Kraịst, onye nke anyị na-akụzi na ọ bụ Ọkpara nke Chineke; e, amatara m na ihe ndị a nile na akụziiri unu ha n’uju tutu unu enwe nghọtahịe site n’etiti anyị.

3 Ma dịka unu chọworo n’aka nwanne m nwoke m hụrụ n’anya na ọ ga-eme ka unu mata ihe unu ga-eme, n’ihi mkpagbu unu nile; ma o kwuwo ihe ole na ole nye unu ịkwado echiche unu nile; e, ma ọ gbawo unu ume ruo inwe okwukwe na inwe ndidi—

4 E, ọbụna na unu ga-enwe nnukwu okwukwe dịka ọbụna ịkụ okwu ahụ n’ime obi unu nile, ka unu nwe ike nwalee ihe-omume eji achọpụta ezi-okwu nke ịdị mma ya.

5 Ma anyị ahụwo na nnukwu ajụjụ nke dị n’ime echiche unu nile bụ ma okwu ahụ ọ dị n’ime Ọkpara nke Chineke, ma-ọbụ ma a gaghị enwe Kraịst ọbụla.

6 Ma unu hụkwara na nwanne m nwoke emewo ka unu mata site n’ọtụtụ ihe ịma-atụ nile, na okwu ahụ dị n’ime Kraịst ruo nzọpụta.

7 Nwanne m nwoke akpọkwasịwo okwu nile nke Zinọs, na mgbapụta ga-abịa site n’Ọkpara nke Chineke ahụ, na kwa n’okwu nile nke Zinọk; na kwa o kwugharịwo okwu nke Moses, igosi na ihe ndị a nile bụ ezi-okwu.

8 Ma ugbua, lee, aga m agbara unu ama maka onwe m na ihe ndị a nile bụ ezi-okwu. Lee asị m unu, na a matara m na Kraịst ga-abịa n’etiti ụmụ nke mmadụ, ma bukwasị onwe ya njehie nile nke ndị ya, ma na ọ ga-achụ aja mgbaghara mmehie maka mmehie nile nke ụwa; n’ihi na Onye-nwe Chineke ekwuwo ya.

9 N’ihi na ọ dị mkpa na a ga-achụ aja mgbaghara mmehie; n’ihi na dịka atụmatụ nke Chineke ebighi-ebi ahụ siri dị a ga-enwerirị aja mgbaghara mmehie a chụrụ, ma ọdịghị otu a mmadụ nile ga-alarịrị n’iyi n’enweghị nzeta; e, mmadụ nile emesịwo obi ha ike; e, mmadụ nile adawo ma ha efuwo, ma ga-alarịrị n’iyi ma ọbụghị site na aja mgbaghara mmehie nke dị mkpa na a ga-achụrịrị.

10 N’ihi na ọ dị mkpa na a ga-enwe nnukwu na aja ikpe-azụ; e, ọbụghị iji mmadụ achụ-aja, ọbụghị ma-ọbụ iji anụmanụ, ọbụghị ma-ọbụ n’ụdị nnụnụ ọbụla; n’ihi na ọ gaghị abụ iji mmadụ achụ-aja; kama ọ ga-abụrịrị nke na-enweghị oke na aja ebighi-ebi.

11 Ugbua onweghị onye ọbụla nke ga-enwe ike iji ọbara ya chụọ aja nke ga-akwụ-ụgwọ mmehie nile nke onye ọzọ. Ugbua, ọbụrụ na mmadụ egbuo mmadụ, lee iwu anyị, nke zịrị ezi, ọ ga-ewere ndụ nke nwanne ya nwoke? Asị m unu, E-e.

12 Kama iwu ahụ na-achọ ndụ nke onye ahụ gbuworo mmadụ; ya mere ọdịghị ihe ọbụla nke na-erughị aja mgbaghara mmehie enweghị oke nke ga-ezu maka mmehie nile nke ndị ụwa.

13 Ya mere, ọ dị mkpa na a ga-enwe nnukwu na aja ikpe-azụ, ma mgbe ahụ a ga-enwe, ma-ọbụ ọ dị mkpa na a ga-enwe, nkwụsị nke ịkwafu ọbara; mgbe ahụ ka iwu nke Moses ga-emezu; e, ọ ga-abụ ihe emezuru ha nile, isi-okwu na mpekele ọbụla, ma ọdịghị nke ọbụla gaara-agabiga.

14 Ma lee, nke a bụ ihe iwu ahụ nile pụtara, akụkụ-ntakịrị ọbụla na-arụtụ-aka na nnukwu na aja-ikpe-azụ ahụ; ma nnukwu na aja ikpe-azụ ahụ ga-abụ Ọkpara nke Chineke, e, enweghị oke na ebighi-ebi.

15 Ma otu a ọ ga-eweta nzọpụta nye ndị nile ga-ekwere n’aha ya; nke a ebe ọ bụ nzube nke aja-ikpe-azụ a, iweta afọ nile nke ebere, nke na-aka ikpe-ziri-ezi ike, ma na-ewetara ndị mmadụ ụzọ ha ga-esi nwee okwukwe ruo na nchegharị.

16 Ma otu a ebere nwere ike metazuo ihe nile kwesịrị-ime nke ikpe zịrị ezi chọrọ, ma gbagide ha gburu-gburu n’aka nile nke nchekwa, ebe onye ahụ na-anaghị enwe okwukwe baa na nchegharị ka a gbara ọtọ nye ọchịchọ iwu dum nke ikpe-ziri-ezi; ya mere nanị nye onye ahụ nke nwere okwukwe baa na nchegharị ka a na-ewetara nnukwu na atụmatụ ebighi-ebi nke mgbapụta.

17 Ya mere ka Chineke kwenyere unu, ụmụnne m nwoke, ka unu wee malite igosi okwukwe unu baa na nchegharị, ka unu wee malite ịkpọku aha nsọ ya, ka o wee meere unu ebere;

18 E, tikuo ya maka ebere; n’ihi na ọ bụ dike na-nzọpụta.

19 E, wedatanu onwe unu ala, ma na-ekpe ekpere esepụghị aka nye ya.

20 Tikuo ya mgbe unu nọ n’ubi unu nile, e, maka igwe-atụrụ unu nile.

21 Tikuo ya n’ụlọ unu nile, e, maka ezi na ụlọ unu nile, ma n’ụtụtụ, n’etiti ehihie, ma n’anyasị.

22 E, tikuo ya megide ike nke ndị iro unu nile.

23 E, tikuo ya megide ekwensu ahụ, onye bụ onye iro nye ezi-omume nile.

24 Tikuo ya maka akụkụ nile nke ubi unu nile, ka unu wee mee nke ọma n’ime ha.

25 Tie mkpu maka igwe-atụrụ nile nke ubi unu nile, ka ha wee baa ụba.

26 Mana nke a abụghị ihe nile; unu ga-awụpụtarịri mkpụrụ-obi unu nile n’ime ụlọ-nta unu nile, na ebe nzụzọ unu nile, na n’ime ọzara unu.

27 E, ma mgbe unu na-anaghị etiku Onye-nwe, ka obi unu nile jupụta, esepụtara n’ekpere nye ya na-esepụghị-aka maka ọdịmma nke unu, na kwa maka ọdịmma nke ndị gbara unu gburu-gburu.

28 Ma ugbua lee, ụmụnne m nwoke m hụrụ n’anya, asị m unu, unu echela na nke a bụ ihe nile; n’ihi na mgbe unu mesịworo ihe ndị a nile, ọbụrụ na unu chụpụ ndị nọ na mkpa, na ndị gba-ọtọ, ma ghara ileta ndị ọrịa na ndị nọ na mkpagbu, ma na-eke site n’ihe unu nwere, ma ọbụrụ na unu nwere, nye ndị nọ na mkpa—Asị m unu, ọbụrụ na unu emeghị otu n’ime ihe ndị a nile, lee, ekpere unu bụ nke efu, ma ọdịghị uru ọbụla ọ ga-abara unu, ma unu dị ka ndị-iru-abụọ ndị na-agọnarị okwukwe ahụ.

29 Ya mere, ọbụrụ na unu anaghị echeta ịnwe afọ-ọma, unu dị ka afụrụ izuzu, nke ndị na-akpụ-ọla tufuru etufu, (ebe ọ na-adịghị uru ọ bara) ma ndị mmadụ na-azọgide ya n’okpuru ukwu.

30 Ma ugbua, ụmụnne m nwoke, Ọ ga-adị m mma ka, mgbe unu nataworo ọtụtụ aka-ebe ha otu a, ebe unu hụrụ na akwụkwọ-nsọ nile na-agba ama maka ihe ndị a nile, unu bịarute ma mịta mkpụrụ baa na nchegharị.

31 E, ọ ga-adị m mma na unu ga-abịarute ma ghara imesi kwa obi unu ike ọzọ; n’ihi na lee, ugbua bụ oge ahụ na ụbọchị nke nzọpụta unu; ma ya mere, ọbụrụ na unu ga echegharị ma ghara imesi obi unu nile ike, otu mgbe ahụ ka a ga-emezupụta nnukwu atụmatụ nke mgbapụta ahụ nye unu.

32 N’ihi na lee, ndụ nke a bụ oge ahụ dịrị ndị mmadụ ịkwadobe ijekwuru Chineke; e, lee ụbọchị nke ndụ nke a bụ ụbọchị dịrị ndị mmadụ iji rụọ ọrụ ha nile.

33 Ma ugbua, dịka m gwara unu n’oge gara aga, dịka unu nweworo ọtụtụ ndị aka-ebe, ya mere, ana m arịọ unu ka unu ghara igbu oge maka ụbọchị nchegharị unu wee ruo n’ikpe-azụ; n’ihi ụbọchị nke ndụ nke a gasịa, nke e nyere anyị ịkwadobe maka mgbe ebighi-ebi, lee ọbụrụ na anyị emeghị ka oge anyị ka mma na ndụ nke a, mgbe ahụ ka abalị nke ọchịchịrị ga-abịa n’ime nke anagaghị enwe ọrụ a ga arụ.

34 Unu enweghị ike ịsị, mgbe e wetara unu n’ihe isi-ike ahụ dị egwu, na m ga-echegharị na m ga-alaghachịkwuru Chineke m. E-e, unu enweghị ike ikwu nke a, n’ihi na otu mụọ ahụ nke nwetara arụ unu nile n’oge nke unu na-apụ site na ndụ nke a, otu mụọ ahụ ga-enwe ike inwere arụ unu nile n’ụwa ebighi-ebi ahụ.

35 N’ihi na lee, ọbụrụ na unu egbuwo oge maka ụbọchị nke nchegharị unu ọbụna wee ruo ọnwụ, lee, unu aghọwo ndị mụọ nke ekwensu ahụ na-achị, ma ọ ga-arachi unu nke ya; ya mere; Mụọ nke Onye-nwe esịwo n’ime unu pụọ, ma o nweghị kwa ọnọdụ n’ime unu, ma ekwensu ahụ nwere ike nile n’ebe unu nọ; ma nke a bụ ọnọdụ ikpe-azụ nke ndị ajọọ-omume.

36 Ma nke a ka m matara, n’ihi na Onye-nwe asịwo na ya anaghị ebi n’ime temple na-adịghị nsọ, kama n’ime obi nile nke ndị ezi-omume ka ọ na-ebi; e, ma ọ sịwo kwa na ndị ezi-omume ga-anọdụ n’ala-eze ya, ha agaghị apụ kwa ọzọ; kama uwe ha nile ka a ga-eme ka ha dị ọcha site n’ọbara nke Nwa-atụrụ ahụ.

37 Ma ugbua, ụmụnne m nwoke m hụrụ n’anya, achọrọ m ka unu na-echeta ihe ndị a nile, ma na unu ga-arụpụta nzọpụta unu jiri ịtụ-egwu n’iru Chineke, ma na unu agaghị agọnarị kwa ọbịbịa nke Kraịst ọzọ.

38 Ka unu ghara ịdọ kwa ndọrọ-ndọrọ ọzọ megide Mụọ Nsọ ahụ, kama ka unu nabata ya, ma bukwasị onwe unu aha nke Kraịst; ka unu wee wedata onwe unu ala ọbụna ruo na ntụ, ma fee Chineke, n’ebe ọbụla unu ga-anọ, n’ime mụọ na n’ezi-okwu; ma ka unu biri n’inye ekele kwa ụbọchị, maka ọtụtụ ebere nile na ngọzi nile nke ọ na-awụkwasị unu.

39 E, ma ana m arịọkwa unu, ụmụnne m nwoke, ka unu na-eche-nche baa nʼikpe-ekpere esepụghị-aka, ka a ghara idufu unu site n’ọnwụnwa nile nke ekwensu, ka ọ ghara inwe ike karịa unu, ka unu ghara ịghọ ndị nọ n’okpuru ya n’ụbọchị ikpe-azụ ahụ; n’ihi na lee, ọ gaghị akwụ unu ụgwọ ọrụ ihe ọma.

40 Ma ugbua ụmụnne m ndị m hụrụ n’anya, a ga m arịọ unu inwe ndidi, ma ka unu na-anagide ụdi mkpagbu nile dị iche iche; ka unu ghara ịkparị ndị ahụ na-achụpụ unu n’ihi ịda ogbenye unu karịrị akarị, adịghị ama-ama unu-aghọ ndị mmehie dịka ha;

41 Kama ka unu nwe ndidi, ma na-anagide mkpagbu nile ndị ahụ, n’olile-anya siri ike na otu ụbọchị unu ga-ezu ike site na mkpagbu unu nile.