Isi 42
Ịnwụ anwụ bụ oge mnwale inyere mmadụ aka ichegharị ma jeere Chineke ozi—Ọdịda ahụ wetara ọnwụ nke arụ na nke mụọ nye mmadụ nile—Mgbapụta na-abịa site na nchegharị—Chineke n’onwe ya na-achụ aja mgbaghara mmehie nile nke ụwa—Ebere bụ maka ndị chegharịrị—Ndị ọzọ nile nọ n’okpuru ikpe zịrị-ezi nke Chineke—Ebere na-abịa n’ihi Aja mgbaghara mmehie ahụ—Nanị ndị nwere ezigbo nchegharị ka a ga-azọpụta. Ihe dịka n’afọ 74 tutu amụọ Kraịst.
1 Ma ugbua, nwa m nwoke, a hụrụ m na enwere ihe ole na ole ọzọ nke na-esogbu echiche gị, nke ị na-enweghị ike ịghọta—Nke bụ gbasara ikpe ziri-ezi nke Chineke na ntaram-ahụhụ nke onye-mmehie ahụ; n’ihi na ị na-anwa n’iche na ọ bụ ihe n’ezighị-ezi na a ga-enyefe onye-mmehie n’ọnọdụ nke nhuju-anya.
2 Ugbua lee, nwa m nwoke, a ga m akọwara gị ihe nke a. N’ihi na lee, mgbe Onye-nwe Chineke zipụchara ndị nne na nna mbụ anyị site n’ogige nke Iden, ịkọ ala, site n’ebe nke ewetara ha—E, o sepụtara nwoke ahụ, ma o debere na nsọtụ ọwụwa-anyanwụ nke ogige nke Iden ahụ, cherubim, na mma agha nke ire-ọkụ nke na-atụgharị uzọ nile, ichekwa osisi nke ndụ ahụ—
3 Ugbua, anyị hụrụ na mmadụ ahụ adịworị ka Chineke, na-amata ihe ọma na ihe ọjọọ; ma ka ọ ghara iwepụta aka ya, ma were kwa site n’osisi nke ndụ ahụ, ma rie ma dị ndụ ruo mgbe nile, Onye-nwe Chineke debere cherubim na mma-agha nke ire-ọkụ, ka ọ ghara iketa-oke site na mkpụrụ-osisi ahụ—
4 Ma otu a anyị hụrụ, na enwere oge enyere mmadụ ichegharị, e, oge-mnwale, oge ichegharị ma jeere Chineke ozi.
5 N’ihi na lee, ọbụrụ na Adam wepụtararịị aka ya otu mgbe ahụ, ma rachatụworịị site na osisi nke ndụ ahụ, ọ gaara adị-ndụ ruo mgbe nile, dịka okwu Chineke siri dị, na-enweghị oghere maka nchegharị; e, na kwa okwu Chineke gaara abụ ihe efu, ma nnukwu atụmatụ nke nzọpụta ahụ gaara abụ ihe akwụsịrị akwụsị.
6 Mana lee, akara ya aka nye mmadụ ịnwụ—ya mere, ebe ebepụrụ ha site n’osisi nke ndụ ahụ a ga-ebepụkwa ha site n’elu iru nke ụwa—ma mmadụ ghọrọ onye furu-efu ruo mgbe nile, e, ha ghọrọ mmadụ dara ada.
7 Ma ugbua, ị hụwo site na nke a na nne na nna anyị mbụ ebepụrụ ha ma n’arụ ma na mụọ site n’iru nke Onye-nwe; ma otu a anyị hụrụ na ha ghọrọ ndị nọ n’okpuru iso ihe ha n’onwe ha chọrọ.
8 Ugbua lee, ọdịghị mkpa na a ga-akpọtaghachị mmadụ site n’ọnwụ nke arụ nke a, n’ihi na nke ahụ ga-ebibi nnukwu atụmatụ nke inwe an̄ụrị.
9 Ya mere, ebe ọbụ na mkpụrụ-obi enweghị-ike ịnwụ anwụ, ma ọdịda ahụ ewetaworo mmadụ nile ọnwụ nke mụọ na kwa nke arụ, nke ahụ bụ, ebepụrụ ha site n’iru nke Onye-nwe, ọ dịrịị mkpa na aga-akpọtaghachị mmadụ site n’ọnwụ nke mụọ nke a.
10 Ya mere, ebe ha ghọworo nke anụ-arụ, nke mmetụta, na-eso ekwensu, site n’okike, ọnọdụ-mnwale nke a ghọrọ ọnọdụ maka ha ịkwado; ọ ghọrọ ọnọdụ njikere.
11 Ma ugbua cheta, nwa m nwoke, ọbụrụ na ọbụghị maka atụmatụ nke mgbapụta, (idebe ya n’akụkụ) ngwa-ngwa ha nwụrụ mkpụrụ-obi ha nile ga-anọ na nhuju-anya, ebe ebepụrụ ha site n’ebe Onye-nwe nọ.
12 Ma ugbua, enweghị ụzọ a ga-esi kpọtaghachị ndị mmadụ site n’ọnọdụ ọdịda nke a, nke mmadụ wetaworo nye onwe ya n’ihi erubeghị-isi nke onwe ya;
13 Ya mere, dịka ikpe ziri-ezi siri dị, agaraghị ewebata atụmatụ nke mgbapụta ahụ, nanị n’ọnọdụ nile nke nchegharị nke ndị mmadụ n’ọnọdụ mnwale nke a, e, ọnọdụ nkwadobe nke a; n’ihi na ma ọbụghị n’ihi ọnọdụ ndị a, ebere enweghị ike imalite ma ọbụghị na ọ ga-ebibi ọrụ nke ikpe-ziri-ezi. Ugbua ọrụ nke ikpe ziri-ezi ahụ agaraghị enwe ike ibibi ya; ọbụrụ otu ahụ, Chineke ga-akwụsị ịbụ Chineke.
14 Ma otu a anyị hụrụ na mmadụ nile adawo, ma ha nọọrọ n’ime njidesike nke ikpe-ziri-ezi; e, ikpe ziri-ezi nke Chineke, nke nyefere ha ruo mgbe nile ka ebepụ ha site n’ebe ọ nọ.
15 Ma ugbua, agaraghị ewebata atụmatụ nke ebere ma ọbụghị na aga achụ aja-nzọpụta; ya mere Chineke n’onwe ya na-achụ maka aja mgbaghara mmehie nile nke ụwa, iwebata atụmatụ nke ebere, imeju ọchịchọ nile nke ikpe ziri-ezi, ka Chineke wee bụrụ onye zuru-oke, Chineke ikpe ziri-ezi, na kwa Chineke nke ebere.
16 Ugbua, nchegharị enweghị ike ịbịakwute ndị mmadụ ma ọbụghị na enwere ntaram-ahụhụ, nke dị kwa ebighi-ebi dịka ndụ nke mkpụrụ-obi ahụ ga-adị, anyapadoro chee-iru megide atụmatụ nke an̄ụrị, nke dị kwa ebighi-ebi ka ndụ nke mkpụrụ-obi ahụ.
17 Ugbua, olee otu mmadụ ga-esi chegharịa ma ọbụghị na o mehiere? Olee otu ọ ga-esi mee mmehie ma ọbụrụ na enweghị iwu? Olee otu a ga-esi nwee iwu ma ọbụghị na enwere ntaram-ahụhụ?
18 Ugbua, enwere ntaram-ahụhụ a nyapadoro, na iwu ziri-ezi e nyere, nke na-eweta mwute nke mụọ nye mmadụ.
19 Ugbua, ọbụrụ na enweghị iwu e nyere—ọbụrụ na mmadụ gburu mmadụ ọ ga-anwụ—ọ ga-atụ egwu na ya ga-anwụ ma ọbụrụ na ya gbuo mmadụ?
20 Na kwa, ọbụrụ na enweghị iwu e nyere megide mmehie ndị mmadụ agaghị atụ-egwu ime mmehie.
21 Ma ọbụrụ na enweghị iwu e nyere, ọbụrụ na ndị mmadụ mehiere gịnị ka ikpe ziri-ezi ga-eme, ma-ọbụ ebere n’onwe ya, n’ihi na ha agaghị enwe ihe njide aka n’arụ ihe ahụ e kere-eke?
22 Mana enwere iwu enyere, na ntaram-ahụhụ anyapadoro, na nchegharị e nyere; bụ nchegharị, nke ebere na-ejide aka; ma ọdịghị otu a, ikpe ziri-ezi ga-ejide ihe ahụ e kere eke aka ma mee ihe e kpebiri n’iwu ahụ, ma iwu ahụ na-akwagide ntaram-ahụhụ ahụ; ọbụrụ na ọdịghị otu ahụ, ọrụ nile nke ikpe ziri-ezi a ga-ebibi ha, ma Chineke ga-akwụsị ịbụ Chineke.
23 Mana Chineke akwụsịghị ịbụ Chineke, ma ebere na-anabata onye chegharịrị, ma ebere na-abịa n’ihi aja mgbaghara mmehie ahụ; ma aja mgbaghara mmehie ahụ na-eweta na mmezu mbilite n’ọnwụ nke ndị nwụrụ anwụ; ma mbilite n’ọnwụ nke ndị nwụrụ anwụ na-eweghachi ndị mmadụ n’iru nke Chineke; ma otu a ana-eweghachi ha n’ebe ọ nọ, ka e kpee ha ikpe dịka ọrụ ha nile siri dị, dịka iwu ahụ na ikpe ziri-ezi siri dị.
24 N’ihi na lee, ikpe ziri-ezi ga-eji ihe nile kwesịrị-ime rụọ ọrụ, na kwa ebere na-ejide ihe nile bụ nke ya aka; ma otu a, ọdịghị onye ọzọ ma-ọbụghị ndị chegharịrị n’ezie ka a ga-azọpụta.
25 Gịnị, i chere na ebere nwere ike izu ikpe ziri-ezi ori? Asị m gị, E-e; ọbụghị ma otu nke ntakịrị. Ọbụrụ otu a, Chineke ga-akwụsị ịbụ Chineke.
26 Ma otu a Chineke na-ewebata nnukwu na ebum-n’obi ebighi-ebi ya, nke a kwadoro site na ntọ-ala nke ụwa. Ma otu a ka nzọpụta si na-abịa na mgbapụta nke ndị mmadụ, na kwa mbibi ha na nhuju-anya ha.
27 Ya mere, O nwa m nwoke, onye ọbụla nke chọrọ ịbịa nwere ike ịbịa ma keta-oke site na mmiri nile nke ndụ na akwụghị ụgwọ; ma onye ọbụla na-achọghị ịbịa anaghị amanye onye ahụ ịbịa; mana n’ụbọchị ikpe-azụ ahụ a ga-akwụghachi ya dịka ọrụ ya nile siri dị.
28 Ọbụrụ na ọ chọwo ime ihe ọjọọ, ma o chegharịghị n’ụbọchị ya nile, lee, ihe ọjọọ ka a ga-emeso ya, dịka nkwụghachị-ụgwọ nke Chineke siri dị.
29 Ma ugbua, nwa m nwoke, achọrọ m ka ị mee ka ihe ndị a ghara isogbu gị ọzọ, ma nanị mee ka mmehie gị nile na-esogbu gị, na nsogbu ahụ nke ga ewedata gị ruo nchegharị.
30 O nwa m nwoke, a chọrọ m ka ị ghara ịgọnarị ikpe ziri-ezi nke Chineke ọzọ. Achọkwala ka iwepụ onwe gị n’ụta n’ihe kachasị ntakịrị n’ihi mmehie gị nile, site n’ịgọnarị ikpe ziri-ezi nke Chineke; kama kwee ka ikpe ziri-ezi nke Chineke, na ebere ya, na ogologo-ntachi-obi ya nwee ọchịchị n’uju n’ime obi gị; ma kwee ka o wedata gị n’uzuzu n’umeala.
31 Ma ugbua, O nwa m nwoke, akpọrọ gị site na Chineke ikwusa okwu ahụ nye ndị a. Ma ugbua, nwa m nwoke, gaara onwe gị, kwupụta okwu ahụ n’ezi-okwu na anya-udo, ka i wee nwe ike ịkpọta mkpụrụ-obi nile na nchegharị, ka nnukwu atụmatụ nke ebere wee nwee ihe njide aka n’arụ ha. Ma ka Chineke kwenyere gị ọbụna dịka okwu m nile siri dị. Amen.