Akwụkwọ nsọ
2 Niphaị 10


Isi 10

Ndị Juu ga-akpọgide Chineke ha n’obe—A ga-ekposasị ha ruo mgbe ha ga amalite ikwere na ya—Amerika ga-abụ ala ntọhapụ ebe n’adịghị eze ga-achị ya—Ka unu na Chineke mee udo ma rite nzọpụta site n’amara ya. Ihe dịka n’afọ 559 ruo 545 tutu amụọ Kraịst.

1 Ma ugbua mụ, Jekọb, na-agwa unu ọzọ, ụmụnne m nwoke ndị m hụrụ n’anya, gbasara angalaba ezi-omume a nke m kwuworo okwu maka ya.

2 N’ihi na lee, ankwa nile ndị anyị nwetaworo bụ nkwa e kwere anyị dịka n’anụ arụ; ya mere, dịka e gosịworo m ya na ọtụtụ ụmụ anyị ga-ala-n’iyi n’anụ arụ n’ihi ekweghị ekwe, otu o sila dị, Chineke ga-emere ọtụtụ ebere; ma a ga-ewetaghachi ụmụ anyị, nke ga-eme ka ha nweta ihe ahụ nke ga-enye ha ezi ọmụma nke Onye-mgbapụta ha.

3 Ya mere, dịka m gwara unu, ọ ga-adịrịrị mkpa na Kraịst—n’ihi na n’abalị nke ikpe-azụ amụọ-ozi ahụ gwara m okwu na nke a ga-abụ aha ya—bga-abịa n’etiti ndị Juu, n’etiti akụkụ ụwa ndị kara bụrụ ndị ọjọọ; ma ha cga-akpọgide ya n’obe—n’ihi na otu a ka ọ masịworo Chineke anyị na ọ ga-adị, ma ọdịghị mba ọzọ n’ụwa dga-akpọgide eChineke ha n’obe.

4 N’ihi na ọbụrụ na oke aọrụ-ebube nile ahụ ga-eme n’etiti mba ndị ọzọ ha ga-echegharị, ma mata na ọ bụ Chineke ha.

5 Ma na n’ihi anchụ-aja aghụghọ nile na ajọọ-omume nile, ha bụ ndị nọ na Jerusalem ga-akpọ ekwe ha nkụ megide ya, ka a kpọgide ya n’obe.

6 Ya mere, n’ihi ajọọ-omume ha nile, mbibi nile, ụnwụ nile, ajọọ ọrịa nile, na nkwafu-ọbara ga-abịakwasị ha; ma ndị nke a na-agaghị ebibi ka a aga-ekposasị n’etiti mba nile.

7 Mana lee, otu a ka aOnye-nwe Chineke kwuru: bMgbe ụbọchị ruru na ha ga-ekwere na m, na m bụ Kraịst, mgbe ahụ ka mụ na nna ha gbaworo-ndụ na aga-akpọtaghachi ha n’anụ arụ, n’elu ụwa, laghachị n’ala nile nke nketa ha.

8 Ma ọ ga-eru na-aga aachịkọbata ha site n’ogologo mkposasị ha, site na bala nile mmiri gbara gburu-gburu nke osimiri, ma site n’akụkụ anọ nke ụwa, ma mba nile nke ndị Jentaịlụ ga-adị ukwuu n’anya nke m, otu a ka Chineke kwuru, cn’ibụga ha ruo n’ala nile nke nketa ha.

9 aE, ndị eze ndị Jentaịlụ nile ga-abụ ndị nna-na-azụ ụmụ nye ha, ma ndị eze-nwanyị ha nile ga-abụ ndị nne na-azụ ụmụ; ya mere, bnkwa nile nke Onye-nwe dị ukwuu n’ebe ndị Jentaịlụ nọ, n’ihi na o kwuwo ya, ma onye ga arụ ụka?

10 Mana lee, ala nke a, otu a ka Chineke kwuru, ga-abụ ala nketa unu, ma andị Jentaịlụ ka a ga-agọzi n’elu ala ahụ.

11 Ma ala nke a ga-abụ ala nke antọhapụ nye ndị Jentaịlụ, ma a gaghị enwe bndị eze n’elu ala ahụ, ndị ga-ewelite elu nye ndị Jentaịlụ.

12 Ma a ga m ewusi ala a ike megide mba nile ndị ọzọ.

13 Ma onye ọbụla ana-alụ ọgụ megide Zaịọn ga bala-n’iyi, otu a ka Chineke kwuru.

14 N’ihi na onye ọbụla welitere eze megide m ga-ala-n’iyi, n’ihi na mụ, bụ Onye-nwe, aeze nke elu-igwe, ga-abụ eze ha, ma aga m abụ bìhè nye ha ruo mgbe nile, bụ ndị na-anụ okwu m nile.

15 Ya mere, n’ihi nke a, na a ga-emezu aọgbụgba-ndụ m nile nke M meworo nye ụmụ nke mmadụ, na m ga-emere ha mgbe ha nọ n’anụ arụ, ọ dịrịrị mkpa na m ga-ebibi bọrụ nzuzo nile nke cọchịchịrị, na nke igbu mmadụ nile, na nke ihe arụ nile.

16 Ya mere, onye ọbụla n’alụ ọgụ megide aZaịọn, ma Juu ma Jentaịlụ, ma ndị bụ oru ma ndị nwe onwe ha, ma ndị nwoke ma ndị nwanyị, ga-ala-n’iyi; n’ihi na bha bụ ndị bụ akwụnakwụna nke ụwa nile; n’ihi na cndị dna-anọnyereghị m ena-emegide m, ka Chineke anyị kwuru.

17 N’ihi na a ga m aemezu nkwa m nile nke m kweworo ụmụ nke mmadụ, na a ga m emere ha mgbe ha nọ n’anụ arụ—

18 Ya mere, ụmụnne m nwoke ndị m hụrụ n’anya, otu a ka Chineke anyị kwuru: A ga m akpagbu mkpụrụ-afọ gị site n’aka nke andị Jentaịlụ, otu o sila dị, a ga m eme ka obi ndị Jentaịlụ dị nro, ka ha wee dịka nna nye ha; ya mere, ndị Jentaịlụ ga-abụ ndị bagọziri agọzi ma cgụnye n’etiti ụlọ nke Israel.

19 Ya mere, a ga m aedo ala a nsọ nye mkpụrụ-afọ unu, na ndị ahụ a ga-agụnye n’etiti mkpụrụ-afọ unu, ruo mgbe nile, n’ihi ala nke nketa ha; n’ihi na ọ bụ ala nhọrọ karịa ala ndị ọzọ, otu a ka Chineke gwara m, karịa ala nile ndị ọzọ, ya mere, a ga m achọ ka mmadụ nile na-ebi n’ala ahụ ka ha na-efe m, otu a ka Chineke kwuru.

20 Ma ugbua, ụmụnne m nwoke ndị m hụrụ n’anya, ebe anyị hụworo na Chineke nke ebere anyị enyewo anyị nnukwu mmata ihe ha otu a gbasara ihe ndị a, ka anyị na-echeta ya, ma wezuga mmehie anyị nile, ma ghara ịkwụdata isi anyị, n’ihi na a tụfughị anyị atụfu; otu o sila dị, a achụpụwo anyị site n’ala nke nketa anyị; mana e dugawo anyị bn’ala nke ka mma, n’ihi na Onye-nwe emewo osimiri okporo cụzọ anyị, ma anyị nọ dn’ala nile mmiri gbara gburu-gburu nke osimiri.

21 Ma nnukwu ka nkwa nile nke Onye-nwe di nye ha bụ ndị nọ n’elu ala ahụ mmiri gbara gburu-gburu nke osimiri; ya mere dịka o kwuru, aala mmiri gbara gburu-gburu, ọ ga-enweriri ihe ka nke a, ma ndị bi kwa na ha bụ ụmụnne anyị.

22 N’ihi na lee, Onye-nwe Chineke aakpọpụwo site n’oge ruo n’oge site n’ụlọ nke Israel, dịka ọchịchọ na mmasị ya siri dị. Ma ugbua lee, Onye-nwe na-echeta ndị nile ekewapụworo, ya mere ọ na-echeta kwa anyị.

23 Ya mere, nweenụ an̄ụrị n’obi unu, ma cheta na unu anwere onwe unu bime ihe unu chọrọ ime—cịhọrọ ụzọ nke ọnwụ mgbe nile na-adigide ma-ọbụ ụzọ nke ndụ ebighi-ebi.

24 Ya mere, ụmụnne m nwoke ndị m hụrụ n’anya, mee nụ udo na ọchịchọ nke Chineke, ma ọbụghị nye ọchịchọ nke ekwensu na anụ arụ; ma cheta, mgbe unu meworo udo unu na Chineke, na ọ bụ n’ime na site an’amara nke Chineke ka a ga bazọpụta unu.

25 Ya mere, ka Chineke kulite unu site n’ọnwụ site n’ike nke mbilite n’ọnwụ, na kwa site n’ọnwụ mgbe nile na-adigide site n’ike nke aaja mgbaghara mmehie, ka e wee nabata unu n’ime ala-eze ebighi-ebi nke Chineke, ka unu wee too ya site n’amara nsọ. Amen.