Akwụkwọ nsọ
1 Niphaị 2


Isi 2

Lihaị wee kpọrọ ezi na ụlọ ya baa n’ime ọzara n’akụkụ Oke Osimiri Uhie—Ha wee hapụ arịa ha—Lihaị wee chụọ aja nye Onye-nwe ma kuziekwara ụmụ ya ndị nwoke idebe iwu-nsọ nile—Leman na Lemuel tamuru megide nna ha—Nifaị rubere isi na-ekpekwa ekpere n’okwukwe; Onye-nwe gwara ya okwu, e wee họpụta ya ka ọ chịwa ụmụnne ya. Ihe dịka n’afọ 600 tutu amụọ Kraịst.

1 Ma lee, o wee ruo ka Onye-nwe gwara nna m okwu, e, ọbụla na nrọ, wee sị ya: Ngọzi na-adịrị gị Lihaị, n’ihi ihe ndị i meworo; na n’ihi na i kwesịrị ntụkwasị-obi ma gwa kwa ndị a ihe m nyere gị n’iwu, lee, ha chọrọ aiwepụ ndụ gị.

2 Ma o wee ruo ka Onye-nwe nyere nna m aiwu, ọbụna na bnrọ, ka ọ ckpọrọ ezi na ụlọ ya pụọ baa n’ime ọzara.

3 Ma o wee ruo na o arubere isi n’okwu nke Onye-nwe, ya mere, o mere dịka Onye-nwe nyere ya n’iwu.

4 Ma o wee ruo na ọ pụkwara baa n’ime ọzara. Ma ọ hapụkwara ụlọ ya, na ala nke nketa ya, na ọla-edo ya, na ọla-ọcha ya, na ihe oke-ọnụ-ahịa ya, ma ọ dịghịkwa ihe ọbụla o ji pụọ, ma ọbụghị nanị ezi na ụlọ ya, na ihe oriri, na ụlọ-ikwuu, ma abaa n’ime ọzara.

5 Ma o wee gbadata site n’oke ala dị nso n’ikpere mmiri nke aOke Osimiri Uhie; o wee gaa njem n’ime ọzara, n’òkè-ala ahụ dị nso karịa n’Oke Osimiri Uhie; ọ gara nọọ njem n’ọzara, ya na ezi na ụlọ ya, nke ndị so n’ime ya bụ, nne m Saraịa, na ụmụnne m ndị nwoke ndị tọrọm bụ, bLeman, Lemuel na Sam.

6 Ma o wee ruo ka ọ garala njem mkpụrụ ụbọchị atọ n’ime ọzara, o wee manye ụlọ-ikwuu ya na andagwụrụgwụ n’akụkụ osimiri nke mmiri.

7 Ma o wee ruo na o jiri aokwute wuo bebe ịchụ aja, wee chụọrọ Onye-nwe aja, ma nyekwa Onye-nwe Chineke anyị cekele.

8 Ma o wee ruo na ọ kpọrọ aha osimiri ahụ, Leman, ma o kwobakwara n’ime Oke Osimiri Uhie; na ndagwụrụgwụ ahụ dị nime òkè-ala nile ahụ dị nso n’ọnụ mmiri ahụ.

9 Ma mgbe nna m hụrụ na mmiri nile nke osimiri ahụ kwobara n’isi mmiri Oke Osimiri Uhie, o wee gwa Leman okwu, na-asị: O ọ dị m ka asị na ị ga-adị ka osimiri a, wee na-aga n’iru na-erụba n’isi mmiri nke ezi-omume nile!

10 Ma o wee gwa kwa Lemuel okwu: O ọ dị m ka asị na ịga-adị ka ndagwụrụgwụ a, guzosie ịke, na-agbanweghị agbanwe, na akwaa-akwụrụ n’idebe iwu-nsọ nke Onye-nwe.

11 Ugbua ihe a ka o kwuru n’ihi ịkpọ-ekwe-nkụ nke Leman na Lemuel; n’ihi na lee, ha tamuru antamu n’ọtụtụ ihe megide bnna ha, n’ihi na ọ bụ conye-na-ahụ ọ́hụ̀, tinyere na ọ kpọpụtara ha site n’obodo Jerusalem, ị hapụ ala nke nketa ha, na ọla-edo, na ọla-ọcha, na ihe oke-ọnụ-ahịa ha, ka ha bịa laa n’iyi n’ime ọzara. Ma nke a ka ha kwuru na o meworo n’ihi echiche nzuzu nke obi ya.

12 Ma otu a Leman na Lemuel, bụ ndị kacha bụrụ okenye, tamuru megide nna ha. Ma ha tamuru n’ihi na ha aaghọtaghị mmekọ nke Chineke ahụ onye kere ha.

13 Ọ bụghịkwa na ha kwetara na Jerusalem, bụ nnukwu obodo-ukwu ahụ, na-enwere ike aibibi ya dịka ndị-amụma siri buo ya n’amụma. Ha dịkwa ka ndị Juu ndị nke nọ na Jerusalem, ndị chọrọ iwepụ ndụ nna m.

14 Ma o wee ruo, nna m jiri aike gwa ha okwu na ndagwurugwu Lemuel, ebe o jupụtara na Mụọ, ruo mgbe arụ ha nile mara bjijiji n’iru ya. O wee kpuchie ha ọnụ, na ha enweghịkwa ike ikwu ihe ọbụla megide ya; ya mere, ha wee mee ka ọ gwara ha.

15 Ma nna m wee biri n’ime ụlọ ikwuu.

16 Ma o wee ruo na mụ, Nifaị, ebe m ka bụ nwata, nke ukwuu, otu o sila dị ebe m buru ibu, gbasie kwa ike, ma nwe kwa ọchịchọ ịmata aihe omimi nile nke Chineke, ya mere, ebekuru m Onye-nwe; ma lee ọ bịara bleta m, mee kwa ka cobi m dị nro na m dkwenyere okwu nile nke enna m kwusịworo; ya mere, e nupụghị m isi megide ya dịka ụmụnne m nwoke ndị ọzọ.

17 Ma wee gwa Sam okwu, ime ka ọ mata ihe ndị nke Onye-nwe gosịrị m site na Mụọ Nsọ ya. O wee ruo na o kwenyere ihe m kwuru.

18 Ma lee, Leman na Lemuel ekwetaghị n’okwu nke m; ebe ọ bụ na o awutere m n’ihi isi-ike nke obi ha, ebekuru m Onye-nwe n’ihi ha.

19 Ma o wee ruo ka Onye-nwe gwara m okwu, si: Ngọzi na-adịrị gị, Nifaị, n’ihi aokwukwe gị, n’ihi na ịchọsịwo m ike, n’obi umeala.

20 Ma ọ bụrụra na unu ga-edebe iwu-nsọ m nile unu aga-eme nke ọma, a ga-edugakwa unu bn’ala e kwere na nkwa; e, ọbụna ala nke m kwadooro unu; e, ala a họrọrọ karịa ala ndị ọzọ.

21 Ma ọ bụrụra na ụmụnne gị ga-enupu isi megide gị, a aga-ebepụ ha site n’ebe Onye-nwe nọ.

22 Ma ọ bụrụra na ị ga-edebe iwu-nsọ m, a ga-eme gị aonye-ọchịchị na onye-nkuzi n’ebe ụmụnne gị nọ.

23 Ma lee, n’ụbọchị ahụ ha ga-enupu isi megide m, M aga-abụ ha ọnụ ọbụna ọbụbụ-ọnụ iwe, ha agaghị kwa enwe ike ebe mkpụrụ-afọ nke gị nọ ma ọbụghị na ha ga-enupu isi megidekwa mụ n’onwe m.

24 Ma ọ bụrụ na ha enupu isi megide m, ha ga-abụ aihe otiti nye mkpụrụ-afọ nke gị, bịkwalite ha n’ụzọ nile nke ncheta.