Akwụkwọ nsọ
Moses 4


Isi 4

(Jun–Oktoba 1830)

Otu Setan si bịa bụrụ ekwensu—Ọ nwaa Iv ọnwụnwa—Adam na Iv adaa, ma ọnwụ abata n’ụwa.

1 Na mụ, Onye-nwe Chineke, wee kwuo okwu nye Moses, na-asị: Na aSetan, onye i nyeworo iwu n’aha Onye nke m Mụrụ Nanị ya, bụkwa onye ahụ nke dị site na bmmalite, ma ọ wee bịa n’iru m, na-asị—Lee, ebe a ka m nọ, ziga m, aga m abụ ọkpara gị, ma aga m agbapụta mmadụ nile, nke na otu mkpụrụ obi agaghị efu, ma n’ezie aga cm eme ya; ya mere nye m nnukwu ùgwù gị.

2 Mana, lee, aỌkpara m nke m Hụrụ n’Anya, nke m Hụworo n’Anya ma bHọrọwo site na mmalite, wee sị m—cNna, ka e mee duche gị, ma ka eotuto ahụ bụrụ nke gị ruo mgbe nile.

3 Ya mere, n’ihi na Setan anupuru isi megide m, ma chọọ ka o bibie bohere nhọrọ nke mmadụ, nke mụ, Onye-nwe Chineke, nyeworo ya, nakwa, ka m nye ya ike nke m; site n’ike Onye nke M Mụrụ Nanị ya, m wee mee ka a cchụda ya;

4 Ma o wee ghọọ Setan, e, ọbụna ekwensu ahụ, nna nke aokwu ụgha nile, na-iduhie na ime ka ndị mmadụ kpuo isi, na-ịdọkpụrụ ha n’agha n’ọchịchọ obi ya, ọbụna ka ha ra bụ ndị na-agaghị an̄a ntị n’olu okwu m.

5 Na ugbụ a agwọ ahụ dị aaghụghọ karịa anụ ọhịa ọbụla nke mụ, Onye-nwe Chineke, meworo.

6 Ma Setan wee tinye ya n’ime obi agwọ ahụ, (n’ihi na-ọ dọ kpụrụwo ọtụtụ iso ya,) ma o wee chọọkwa ka ọ ghọgbuo aIv, n’ihi na ọ mataghị uche Chineke, ya mere, o wee chọọ ka o bibie ụwa.

7 O wee sị kwa nwanyị ahụ: E, ọ ga-abụ ezie na Chineke sịrị—Unu erila site n’osisi nile nke aubi ahụ a gbara ogige? (ma ọ na-ekwu site n’ọnụ nke agwọ ahụ.)

8 Na nwanyị ahụ wee sị agwọ ahụ: Anyị nwere ike iri site na mkpụrụ nke osisi nile nke ubi ahụ a gbara ogige;

9 Mana site na mkpụrụ nke osisi ahụ nke ị na-ahụ n’etiti ubi a gbara ogige, ka Chineke sịrị: Unu erila site na ya, unu emetụkwala ya aka, ka unu wee ghara inwụ anwụ.

10 Ma agwọ ahụ wee sị nwanyị ahụ: Unu agaghị anwụ anwụ n’ezie;

11 N’ihi na Chineke matara n’ụbọchị ahụ unu ga-eri site na ya, mgbe ahụ ka aanya nile unu ga-emeghe, na unu ga-adị ka chi nile bna-amata ezi ihe na ihe ọjọọ.

12 Na mgbe nwanyị ahụ hụrụ na osisi ahụ dị mma ihe oriri, na-agụ kwa agụụ ile anya, na bụrụ osisi a ana-achọsi ike ime ka o nwee amamihe, o wee were ụfọdụ mkpụrụ si na ya, na o wee brie, ma nyekwa di ya tinyere onwe ya, o wee rie kwa.

13 Ma e meghere anya nile nke ha abụọ, ma ha wee mara na ha agbaworị ọtọ. Ha wee dụkọta kwa akwụkwọ nile nke osisi fig wee meekwara onwe ha ihe okike.

14 Ma ha wee nụ olu-okwu nke Onye-nwe Chineke mgbe ha ana-ejegharị n’ime ubi ahụ a gbara ogige, n’ime ida jụụ nke ehihie ahụ; ma Adam na nwunye ya wee gaa izopụ onwe ha site n’iru nke Onye-nwe Chineke n’etiti osisi nile nke ubi ahụ a gbara ogige.

15 Na mụ, Onye-nwe Chineke, wee kpọọ Adam oku, ma sị ya: O lee ebe ị ana-aga?

16 Na o wee sị anụrụ m olu okwu gị n’ubi a gbara ogige, ma m wee tụọ egwu, n’ihi na ahụwo m na-agba m ọtọ, m wee zookwa onwe m.

17 Na mụ, Onye-nwe Chineke, wee sị Adam: Onye gwara gị na ị bụ onye gba ọtọ? I riwo site n’osisi ahụ nke m nyeworo gị iwu sị gị erila? Ọbụrụ otu a i aga-anwụ anwụ n’ezie?

18 Ma nwoke ahụ wee sị: Nwanyị ahụ nke i nyeworo m, nyekwa m iwu ka mụ na ya biri, ọbụ ya nyere m ụfọdụ mkpụrụ sitere n’osisi ahụ ma m wee rie ya.

19 Na mụ, Onye-nwe Chineke, wee sị nwanyị ahụ: Gịnị bụ ihe nke a nke i meworo? Ma nwanyị ahụ wee sị: Agwọ ahụ aghọgburu m, ma m wee rie.

20 Ma mụ, Onye-nwe Chineke, wee sị agwọ ahụ: N’ihi na i mewo nke a, i ga-abụ onye aabụrụ ọnụ karịa anụ ụlọ nile, na karịa anụ ọhịa ọbụla; n’elu afọ gị ka ị ga-eje ije, ma uzuzu ka ị ga-eri ụbọchị nile nke ndụ gị;

21 Ma aga m etinye iro n’etiti gị na nwanyị ahụ, n’etiti mkpụrụ gị na mkpụrụ ya; na mkpụrụ ya ga-etirụ gị arụ n’isi, ma ị ga etirụ ya arụ na ikiri ụkwụ.

22 Nye nwanyị ahụ, mụ, Onye-nwe Chineke, wee sị: Aga m eme ka ihe mgbu gị na-itụ ime gị baa ụba nke ukwu. N’ime aihe mgbu ka ị ga-amụ ụmụ, ma ọchịchọ gị ga-adị n’ebe di gị nọ, ya onwe ya gakwa achị gị.

23 Ma nye Adam, mụ, Onye-nwe Chineke, sịrị: N’ihi na I n̄awo ntị n’olu okwu nke nwunye gị, i riwokwa site na mkpụrụ nke osisi ahụ nke m nyeworo gị iwu, na-asị—Gị erila site na ya, ihe abụrụ ọnụ ka ala ga-abụ n’ihi gị; n’ihe mgbu ka i ga-eri ihe sitere na ya ụbọchị nile nke ndụ gị.

24 Ogwu nile na osisi ogwu ogwu nile ka o ga-ewepụtara gị, ma ị ga-eri ihe ọkụkụ nke ala ubi.

25 Site an’ọsụsọ nke iru gị ka ị ga-eri achịcha, tutu ruo mgbe ị ga-alaghachi n’ala—n’ihi na ị ga-anwụ anwụ n’ezie—n’ihi na site na ya ka e wepụtara gị: n’ihi na buzuzu ka ị bụ, ma n’uzuzu ka ị ga-alaghachi.

26 Ma Adam wee kpọọ aha nwunye ya Iv, n’ihi na ọbụ nne nke ndị nile dị ndụ; n’ihi otu a ka mụ, Onye-nwe Chineke, kpọwọrọ onye mbụ n’ime ndị nwanyị nile, ndị dị aọtụtụ.

27 Nye Adam nakwa nye nwunye ya, ka mụ, Onye-nwe Chineke, meere uwe mkpuchi nile site na akpụkpọ anụ, wee ayiwekwa ha uwe.

28 Na mụ, Onye-nwe Chineke, wee sị Onye m Mụrụ Nanị Ya: Lee, anwoke ahụ adịwo ka otu n’ime anyị bịmara ezi ihe na ihe ọjọọ: na ugbua ka ọ ghara isetịpụ aka ya ma were kwa site cn’osisi ahụ nke ndụ, driekwa ma dị ndụ ruo mgbe nile.

29 Ya mere, mụ, Onye-nwe Chineke, ga-ezipụ ya site na Ogige Ubi aIden, ị ga-akọ ala ahụ ebe e siri wepụta ya.

30 N’ihi dịka mụ, Onye-nwe Chineke, na-adị ndụ, ọbụna otu ahụ ka aokwu m nile enweghi ike iloghachi na-emezughị, n’ihi ka ha na-apụ site n’ọnụ m ha ga emezurịrị.

31 N’ihi ya m wee chụpụ mmadụ ahụ, ma m wee mee ka acherubim na ire-ọkụ nke mma agha nke na-echigharị ụzọ nile na-anọdụ n’akụkụ ọwụwa anyanwụ nke Ogige Ubi Iden idebe ụzọ nke osisi nke ndụ ahụ.

32 (Ma ndị a bụ okwu nile nke m kwuworo nye nwa odibo m Moses, ma ha bụ ezi-okwu obụna ka m chọrọ; ma ekwuwo m ha nye gị. Hụrụ na i gosịghị ha onye ọbụla, ruo mgbe m ga-enye gị iwu, e wezuga nye ndị ahụ nke kwere ekwe. Amen.)