Akwụkwọ nsọ
1 Niphaị 15


Isi 15

Mkpụrụ-afọ nke Lihaị ga-enweta ozi-ọma ahụ site n’aka ndị Jentaịlụ n’ụbọchị ikpeazụ ndị a—Mkpọkọta nke Israel ka e jiri tụnyere osisi olive nke a ga-anyakodo kwa ngalaba o jiri pụta ụwa ọzọ—Nifaị wee kọwa ọ́hụ̀ ahụ gbasara osisi nke ndụ ma kwuo okwu maka ikpe zịrị ezi nke Chineke n’ikewapụ ndị ajọọ omume site na ndị ezi-omume. Ihe dịka n’afọ 600 ruo 592 tutu amụọ Kraịst.

1 Ma o wee ruo na mgbe mụ, Nifaị a kpọpụworo m n’ime mụọ, ma hụ ihe nile ndị a, a laghachịrị m n’ụlọ-ikwuu nke nna m.

2 Ma o wee ruo na a hụrụ m ụmụnne m, ma ha na-arụrịta ụka otu na ibe ya gbasara ihe ndị nke nna m gwaworo ha.

3 N’ihi na n’ezi-okwu ọ gwara ha ọtụtụ nnukwu ihe, ndị siri ike anghọta, ma ọbụghị ma mmadụ jụrụ Onye-nwe; ma e be ha bụ ndị obi ike, ya mere ha atụkwasịghị Onye-nwe obi ka o si kwesi.

4 Ma ugbua mụ, Nifaị, nwere mwuta n’ihi ịdị-ike nke obi ha, na kwa, n’ihi ihe ndị m hụworo, ma mata na ha ga-emezurịrị n’enweghị mgbochị n’ihi ajọọ-omume nke ụmụ nke mmadụ.

5 Ma o wee ruo na ume gwụrụ m n’ihi mkpagbu m nile, n’ihi na e chere m na amkpagbu m dị ukwuu karịa ihe nile, n’ihi bmbibi nke ndị m, n’ihi na a hụwo m ọdịda ha.

6 Ma o wee ruo na mgbe m nwetaworo aume, a gwara m ụmụnne m okwu, chọọ ka m mata ihe kpatara ịrụrịta ụka ha.

7 Ma ha sịrị: Lee, anyị enweghị ike ịghọta okwu ndị nke nna anyị kwuworo gbasara ngalaba e jiri pụta ụwa nke osisi olive ahụ, na kwa gbasara ndị Jentaịlụ.

8 Ma a siri m ha: aUnu ajụwo Onye-nwe?

9 Ma ha sịrị m: Anyị aka-emeghị otu ahụ; n’ihi na Onye-nwe anaghị eme ka anyị mata ihe dị otu a.

10 Lee, a sịrị m ha: Olee otu o siri bụrụ na unu anaghị edebe iwu-nsọ nile nke Onye-nwe? Olee otu o siri bụrụ na unu ga-ala-n’iyi, n’ihi aisi-ike nke obi unu?

11 Unu anaghị echeta ihe ndị ahụ Onye-nwe kwuworo?—Ọbụrụ na unu ghara imesi obi ike, ma ajụọ m n’okwukwe, kwere na unu ga-enweta, jisie ike n’idebe iwu-nsọ m nile, n’ezie ihe ndị a nile ka a ga-eme ka unu mata.

12 Lee, a sị m unu na ụlọ Israel ka e jiri tunyere osisi-olive, site n’ọnụ Mụọ nke Onye-nwe nke dị n’ime nna anyị; ma lee, anyị ewezugabeghị onwe anyị site n’ụlọ nke Israel, ma-ọbụ na anyị abụghị angalaba nke ụlọ nke Israel?

13 Ma ugbua, ihe nke nna anyị na-egosị gbasara nnyakọta nke ngalaba e jiri pụta ụwa site n’uju nke ndị Jentaịlụ, bụ, na n’oge ikpeazụ, mgbe mkpụrụ-afọ anyị aga-alawọrịị azụ n’ekweghị ekwe, e, mgbe ọtụtụ afọ gasịworo, ma ọtụtụ ọgbọ oge bMesaịa ahụ ga-egosịpụta n’ụdị mmadụ n’anya ụmụ nke mmadụ, mgbe ahụ ka uju nke cozi-ọma nke Mesaịa ahụ ga-abịa n’aka dndị Jentaịlụ, ma site n’aka ndị Jentaịlụ wee ruo mkpụrụ-afọ anyị ndị nke fọdụrụ—

14 Ma n’ụbọchị ahụ ka amkpụrụ-afọ anyị ndị nke fọdụrụ ga-amata na ha bụ nke ụlọ nke Israel, ma na ha bụ bndị ọgbụgba-ndụ nke Onye-nwe; ma mgbe ahụ ka ha ga-amata ma bịa cn’ọmụma nke nna-nna ha, na kwa na ọmụma nke ozi-ọma nke Onye-mgbapụta ha, nke a kụziri ndị nna ha site n’aka ya; ya mere, ha ga-abịa n’ọmụma nke Onye-mgbapụta ha na isi-okwu ihe nile nke ozizi ya, na ha ga-amata otu ha ga-esị bịakwute ya ma bụrụ ndị azọpụtara.

15 Ma mgbe ahụ n’ụbọchị ahụ ha-agaghị an̄ụrị ọn̄ụ ma were otuto nye Chineke ha nke mgbe nile na-adigide, ankume ha na nzọpụta ha? E, n’ụbọchị ahụ, ọ bụ na ha agaghị enweta ike na ọzụzụ ahụ site n’ezi bosisi vine? E, ọ bụ na ha agaghị abịa n’ime ezi ogige nke Chineke?

16 Lee, a sị m unu, E, a ga-echetakwa ha ọzọ n’etiti ụlọ nke Israel; a aga-anyakọta ha, ebe ha bụ ngalaba e jiri pụta ụwa nke osisi olive ahụ, n’ime ezi osisi olive ahụ.

17 Ma nke a bụ ihe nna anyị na-egosị; ma ọ na-egosị na ọ gaghị emezu ruo mgbe e kposasịrị ha site n’aka ndị Jentaịlụ; ma o gosịrị na ọ ga esị n’aka ndị Jentaịlụ bịa, na Onye-nwe ga-egosị ike ya n’ebe ndị Jentaịlụ nọ, n’ihi otu ihe mere na a aga-ajụ ịnabata ya na ndị Juu; ma-ọbụ n’ụlọ nke Israel.

18 Ya mere, nna anyị ekwughị okwu gbasara mkpụrụ-afọ anyị nanị, ma kwa nke ụlọ nke Israel nile, na-arụtụ aka na ọgbụgba-ndụ nke a ga-emezu n’ụbọchị ikpeazụ: bụ ọgbụgba-ndụ Onye-nwe meworo nye nna anyị Abraham, na-asị: N’ime amkpụrụ-afọ gị ka ebo nile nke ụwa ga-enwe ngọzi.

19 Ma o wee ruo na mụ, Nifaị, gwara ha ọtụtụ okwu gbasara ihe ndị a; e, a gwara m ha okwu gbasara amkpọghachị nke ndị Juu n’oge ikpeazụ.

20 Ma a gụgharịrị m nye ha okwu nke aAịsaịa, onye kwuru okwu gbasara mkpọghachị nke ndị Juu, ma-ọbụ nke ụlọ nke Israel; ma mgbe a kpọghachịsịrị ha, ha a gaghị enwekwa mgbagwọ-ju-anya ọzọ, ma ha agaghị-agbasasị ọzọ. Ma o wee ruo na e kwuru m ọtụtụ okwu nye ụmụnne m, nke mere na ha dajụrụ, ma mee onwe ha bumeala n’iru Onye-nwe.

21 Ma o wee ruo na ha gwara m okwu ọzọ, sị: Gịnị ka ihe a gosịrị nke nna anyị hụrụ na nrọ? Gịnị ka aosisi ahụ gosịrị bụ nke ọ hụrụ?

22 Ma a siri m ha: Ọ bụ ihe nọchịtere anya aosisi nke ndụ ahụ.

23 Ma ha siri m: Gịnị ka aokporo igwe ahụ pụtara bụ nke nna anyị hụrụ, nke dugara n’osisi ahụ.

24 Ma a siri m ha na ọ bụ aokwu Chineke; na ndị ọbụla ga an̄a ntị n’okwu Chineke, bma jisie ya ike, ha agaghị ala n’iyi; ọbụghị ma cọnwụnwa na akụ nile dna-enwu ọkụ nke eonye iro ahụ ọ ga-enwe ike karịa ha nke na ha ga ekpu isi, ka e wee dupụ ha ruo mbibi.

25 Ya mere, mụ, Nifaị, kwalitere mụọ ha ka ha an̄aa ntị n’okwu nke Onye-nwe; e, a kwalitere m mụọ ha site n’ume nile nke mkpụrụ-obi m, ma jiri ọgụgụ-isi nile nke m nwere, ka ha nwe ike gee ntị n’okwu Chineke ma cheta idebe iwu-nsọ ya nile oge nile n’ihe nile.

26 Ma ha siri m: Gịnị ka aosimiri nke mmiri ahụ gosịrị nke nna anyị hụrụ?

27 Ma a siri m ha na ammiri nke nna m hụrụ bụ biru inyi; ma ebe ọ bụ na uche obi ya ka e lomiri n’ihe ndị ọzọ nkea mere na ọ hụghị iru inyi nke mmiri ahụ.

28 Ma a siri m ha na ọ bụ aolulu dị egwụ, nke kewara ndị ajọọ-omume site n’osisi nke ndụ ahụ, na kwa site na ndị-nsọ nke Chineke.

29 Ma a siri m ha na ọ bụ ihe nnọchịte anya nke aala mụọ ahụ dị egwụ, nke mụọ-ozi ahụ gwara m na akwadoworo maka ndị ajọọ-omume.

30 Ma a siri m ha na nna anyị kwa hụrụ na aikpe zịrị ezi nke Chineke kewakwara ndị ajọọ mmadụ site na ndị ezi-omume; na ìhè ahụ dịka ìhè nke ọkụ na-enwu enwu, nke narịgo elu rue Chineke ruo mgbe nile na mgbe nile ma onweghị ọgwụgwụ.

31 Ma ha siri m: Ihe a ọ pụtara ahụhụ nke arụ n’ụbọchị nile nke amnwale, ma-ọbụ ọ pụtara ọnọdụ ikpeazụ nke mkpụrụ-obi mgbe arụ bna-anwụ anwụ nwụsịrị, ma-ọbụ ọ na-ekwu maka ihe nile nke na-anwụ anwụ?

32 Ma o wee ruo na a siri m ha na ọ bụ ihe nnọchịte anya nke ihe nile nke arụ ma nke mụọ; n’ihi na ụbọchị ga-abịa na a ga-ekpe ha ikpe an’ọrụ ha nile, e, ọbụna ọrụ nile ndị a rụrụ na arụ na-anwụ anwụ n’ụbọchị mnwale ha nile.

33 Ya mere, ọbụrụ na ha aga-anwụ n’ime ajọọ-omume ha, ha ga-abụ ndị a ga bekewapụ kwa, maka ihe nile ndị bụ nke mụọ, bụ nke gbasara ezi-omume; ya mere, a ga-eweta ha ka ha gụzoro n’iru Chineke, ka cekpe ha ikpe maka dọrụ ha nile; ma ọbụrụ na ọrụ ha na-abụrị iru inyi, ha ga-abụ ndị eruru inyi; ma ọbụrụ na ha bụ ndị ruru inyi ọ ga-abụ na ha agaghị febi n’ime ala-eze nke Chineke; ọ bụrụ na ọ dị otu a, ala-eze nke Chineke ga abụrịrị kwa ebe ruru inyi.

34 Ma lee, a sị m gị, ala-eze nke Chineke aerughị inyi, ma onweghị ihe ọbụla ruru inyi ga-aba n’ime ala eze Chineke; ya mere a ga-enwerirị ebe ruru inyi e doziri nye ihe nke ruru inyi.

35 Ma e nwere ebe e doziri, e, ọbụna ebe dị egwụ nke aala mụọ ahụ nke m kwuworo, ma bekwensu bụ onye-nkwadobe ya; ya mere ọnọdụ ikpeazụ nke mkpụrụ-obi nke ndị mmadụ ga-ebi n’ala-eze Chineke, ma-ọbụ ekewapụ ha n’ihi cikpe zịrị ezi ahụ nke m kwuworo.

36 Ya mere, ndị ajọọ-omume ka achụpụworo site na ndị ezi-omume, na kwa site an’osisi nke ndụ, nke mkpụrụ ya dịkarịrị oke mkpa na-adị kwa bmmasị karịa mkpụrụ-osisi ndị ọzọ nile; e, ọ bụ ihe ckachasị donyinye nile nke Chineke. Ma otu a ka m gwara ụmụnne m okwu. Amen.