Akwụkwọ nsọ
Alma 22


Isi 22

Erọn wee kụziere nna Lamonaị maka Okike ụwa, ọdịda nke Adam, na atụmatụ nke mgbapụta site na Kraịst—Eze ahụ na ndị ezi na ụlọ ya nile ka a gbanwere—Okike ala n’etiti ndị Nifaị na ndị Leman ka a kọwara. Ihe dịka n’afọ 90 ruo 77 tutu amụọ Kraịst.

1 Ugbua, dịka Amọn ka ji otu a na-akụziri ndị nke Lamonaị na-esepụghị aka, anyị ga-alaghachị na nkọwasị nke Erọn na ụmụnne ya nwoke; n’ihi na mgbe o sịworo n’ala nke Mịdonaị pụọ e duru ya site na Mụọ gaa n’ala nke Nifaị, ọbụna gaa n’ụlọ nke eze ahụ nke na-achị ala ahụ nile ma ewezuga-ala nke Ịshmel; ma ọ bụụrụ nna nke Lamonaị.

2 Ma o wee ruo na ọ ba-kwuuru ya n’ime obi-eze, ya na ụmụnne ya nwoke, ma kpọọ isi ala n’iru eze ahụ, ma sị ya: Lee, O eze, anyị bụ ụmụnne nwoke nke Amọn, ndị nke Ị napụtaworo site n’ụlọ-mkpọrọ.

3 Ma ugbua, O eze, ọbụrụ na Ị ga-edebe ndụ anyị, anyị ga-abụ ụmụ-oru gị. Ma eze ahụ siri ha: Bilie, n’ihi na aga m ekwe unu nkwa ndụ unu, ma agaghị m ekwe na unu ga-abụ ụmụ-oru m; kama aga m ekwusi ike na unu ga-akụziri m; n’ihi na enwewo m nsogbu n’echiche m n’ihi adịghị-aka-ntagide na ịdị ukwuu nke okwu nile nke nwanne unu nwoke Amọn; ma achọrọ m ịmata ihe kpatara na ọ bịalitebeghị site na Mịdonaị soro unu.

4 Ma Erọn sịrị eze ahụ: Lee, Mụọ nke Onye-nwe akpọwo ya n’ụzọ ọzọ; ọ gawo n’ala nke Ịshmel, ịkụziri ndị nke Lamonaị.

5 Ugbua eze ahụ sịrị ha: Gịnị bụ nke a nke unu kwuworo gbasara Mụọ nke Onye-nwe? Lee, nke a bụ ihe ahụ nke na-enye m nsogbu.

6 Na kwa, gịnị bụ nke a nke Amọn kwuru—Ọbụrụ na unu ga-echegharị a ga-azọpụta unu, ma ọbụrụ na unu agaghị echegharị a ga-achụpụ unu n’ụbọchị ikpeazụ ahụ?

7 Ma Erọn zara ya ma sị ya: I kwere na e nwere otu Chineke dị? Ma eze ahụ sịrị: A matara m na ndị Amalek na-asị na enwere otu Chineke dị, ma ekwewo m ha ka ha wuo ebe mgbaba dị nsọ nile, ka ha nwe ike kpọkọta onwe ha ọnụ ikpere ya. Ma ọbụrụ na ugbua i kwuru na e nwere otu Chineke dị, lee aga m ekwere.

8 Ma ugbua mgbe Erọn nụrụ nke a, obi ya malitere in̄ụrị ọn̄ụ, ma ọ sịrị: Lee, dịka o siri buru ezi-okwu na i na-adị ndụ, O eze, e nwere otu Chineke dị.

9 Ma eze ahụ sịrị: Chineke ọ bụ Nnukwu Mụọ ahụ nke kpọpụtara nna anyị ha site n’ala nke Jerusalem?

10 Ma Erọn sịrị ya: E, ọ bụ Nnukwu Mụọ ahụ, ma o kere ihe nile ma n’elu-igwe ma n’ụwa. I kwere nke a?

11 Ma ọ sịrị: E, e kwere m na Nnukwu Mụọ ahụ kere ihe nile, ma achọrọ m ka ị gwa m gbasara ihe ndị a nile, ma aga m e kwere okwu gị nile.

12 Ma o wee ruo na mgbe Erọn hụrụ na eze ahụ ga-ekwere okwu ya nile, ọ malitere site n’okike nke Adam, na-agụ akwụkwọ-nsọ nile nye eze ahụ—otu Chineke siri kee mmadụ n’ụdị oyiyi onwe ya, ma na Chineke nyere ya iwu-nsọ nile, ma na n’ihi njehie, mmadụ adawọrịị.

13 Ma Erọn kọwadaruru akwụkwọ-nsọ nile ala nye ya site na okike nke Adam, na-edebe ọdịda nke mmadụ n’iru ya, na ọnọdụ anụ-arụ ha na kwa atụmatụ nke mgbapụta, nke a kwadoro site na ntọ-ala nke ụwa, site na Kraịst, n’ihi ndị nile bụ ndị ga-ekwere n’aha ya.

14 Ma ebe ọ bụ na mmadụ adawo o nweghị ike ikwesị ịnata ụgwọ-ọrụ ọbụla n’onwe ya; kama ahụhụ nile na ọnwụ nke Kraịst kwụrụ-ụgwọ maka mmehie ha nile, site n’okwukwe na nchegharị, na ihe ndị ọzọ; ma na ọ na-etibi agbụ nile nke ọnwụ, na ili agaghị enwe mmeri, ma na ihe ọgbụgba nke ọnwụ ka a ga elomi n’ime olile-anya nile nke otuto; ma Erọn kọwadaruru ihe nile ndị a ala nye eze ahụ.

15 Ma o wee ruo na mgbe Erọn kọwadarusịrị ihe ndị a nile ala nye ya, eze ahụ sịrị: Gịnị ka m ga-eme ka m wee nwe ndụ-ebighi-ebi a nke Ị kwuworo maka ya? E, gịnị ka m ga-eme ka e wee mụọ m na Chineke, i ji fopụta ajọọ mụọ a site n’obi m, ma nabata Mụọ ya, ka e wee mejupụta m na ọn̄ụ, nke ga-eme ka a ghara ịchụpụ m n’ụbọchị ikpe-azụ? Lee, ka o kwuru, aga m enyepụ ihe nile nke m nwere, e, aga m ahapụ ala-eze m, ka m wee nweta nnukwu ọn̄ụ nke a.

16 Ma na Erọn sịrị ya: Ọbụrụ na ị chọrọ ihe nke a, ọbụrụ na Ị ga-akpọ isi-ala n’iru Chineke, e, ọbụrụ na Ị ga-echegharị site na mmehie gị nile, ma ga-akpọ isi-ala n’iru Chineke, ma kpọkụo aha ya n’okwukwe, na-ekwere na Ị ga-anata, mgbe ahụ ka Ị ga- anata olile-anya ahụ nke Ị na-achọ.

17 Ma o wee ruo na mgbe Erọn kwuworo okwu ndị a nile, eze ahụ kpọrọ isi ala n’iru Onye-nwe, n’ikpere ya abụọ; e, ọbụna ọ makpuuru onwe ya n’ala, ma tisie ike, na-asị:

18 O Chineke, Erọn agwawo m na e nwere Chineke dị; ma ọbụrụ na enwere Chineke dị, ma ọbụrụ na Ị bụ Chineke, Ị ga-eme onwe Gị ka m mmata gị, ma aga m enyepụ mmehie m nile iji mata Gị, ma ka e wee kulite m site na ndị nwụrụ anwụ, ma ka a zọpụta m n’ụbọchị ikpe-azụ. Ma ugbua mgbe eze ahụ kwuworo okwu ndị a nile, e tiri ya ihe dịka ọ nwụrụ anwụ.

19 Ma o wee ruo na ụmụ-oru ya nile gbara ọsọ ma gwa nwunye eze ihe nile nke meworo nye eze ahụ. Ma ọ batakwuru eze ahụ; ma mgbe ọ hụrụ ya ka odịna dịka ọ nwụrụ anwụ, na kwa Erọn na ụmụnne ya ndị nwoke guzoro dịka a ga-asị na ha bụrịị ihe kpatara ọdịda ya, o wesoro ha iwe, ma nye iwu na ụmụ-oru ya nile, ma-ọbụ ụmụ-oru nile nke eze, ga-akpọrọ ha ma gbuo ha.

20 Ugbua ụmụ-oru nile ahụ ahụwọrịị ihe kpatara ọdịda nke eze ahụ, ya mere ha anwaghị anwa ibịkwasị aka ha n’arụ Erọn na ụmụnne ya nwoke; ma ha rịọrọ nwunye-eze ahụ arịrịọ na-asị: Gịnị mere I jiri nye anyị iwu ka anyị gbuo ndịkom a, mgbe lee otu n’ime ha dị ike karịa anyị nile? Ya mere anyị ga-ada n’iru ha.

21 Ugbua mgbe nwunye-eze ahụ hụrụ egwu nke ụmụ-oru nile ahụ ọ malitekwara ịtụ egwu karịa, ka aghara inwe ụfọdụ ihe ọjọọ ga-abịakwasị ya. Ma o nyere ụmụ-oru ya nile iwu ka ha gaa ma kpọọ ndị ahụ, ka ha wee gbuo Erọn na ụmụnne ya nwoke.

22 Ugbua mgbe Erọn hụrụ mkpebi nke nwunye-eze ahụ, ya, kwa ebe ọ matara isi-ike nke obi ha nile nke ndị ahụ, tụrụ egwu eleghị-anya na igwe-mmadụ ga-akpọkọta onwe ha ọnụ, ma e wee nwe nnukwu ndọrọ-ndọrọ na nsogbu n’etiti ha; ya mere o setịpụrụ aka ya ma kulite eze ahụ site n’ala ahụ, ma sị ya: Guzoro. Ma o guzoro n’ụkwụ ya abụọ, na-enweta ike ya.

23 Ugbua nke a ka e mere n’iru nwunye-eze ahụ na ọtụtụ ụmụ-oru ahụ. Ma mgbe ha hụrụ ya ha nwere oke ịtụ-n’anya, ma malite ịtụ-egwu. Ma eze ahụ wee guzogide, ma malite ikwusara ha okwu. Ma o wee kwusaara ha okwu, nke mere na ezi na ụlọ ya nile ka agbanwere nye Onye-nwe.

24 Ugbua e nwere igwe-mmadụ gbakọtara ọnụ n’ihi iwu nwunye-eze nyere, ma a malitere inwe nnukwu ntamu n’etiti ha n’ihi Erọn na ụmụnne ya nwoke.

25 Mana eze ahụ guzogidere n’etiti ha ma gwa ha okwu. Ma e mere ka obi ha dajụrụ n’ebe Erọn nọ na ndị nke ha na ya nọ.

26 Ma o wee ruo na mgbe eze ahụ hụrụ na o mewo ka ndị ahụ dajụrụ, o mere ka Erọn na ụmụnne ya nwoke guzoro n’etiti igwe-mmadụ ahụ, ma na ha ga-ekwusa okwu ahụ nye ha.

27 Ma o wee ruo na eze ahụ zipụrụ ịma-ọkwa nʼakụkụ ala ahụ nile, n’etiti ndị ya nile ndị nọ n’ime ala ya nile, ndị nọ na mpaghara nile gbara gburu-gburu, nke nwere oke-ala ọbụna ruo n’oke osimiri ahụ, n’ọwụwa-anyanwụ na n’ọdịda-anyanwụ, ma nke ekewapụtara site n’ala nke Zarahemla site na wara-wara ụzọ nke ọzara, nke gara site n’oke osimiri nke ọwụwa-anyanwụ ahụ ọbụna ruo oke osimiri nke ọdịda-anyanwụ ahụ, ma gbaa gburu-gburu n’oke-ala nile nke ikpere mmiri ahụ, na oke-ala nile nke ọzara ahụ nke dị n’elu-elu n’akụkụ ala nke Zarahemla ahụ, gafee oke-ala nke Mantaị, site n’isi nke osimiri Saịdọn, na-ekwo site n’ọwụwa-anyanwụ chee iru n’ọdịda-anyanwụ—ma otu a ka e siri kewa ndị Leman na ndị Nifaị.

28 Ugbua, ndị nke ka bụrụ ndị ume-ngwụ na ndị Leman biri n’ọzara, ma biri n’ime ụlọ ikwuu nile; ma a gbasasịrị ha nʼakụkụ nke ọzara ahụ nile n’ọdịda-anyanwụ n’ala nke Nifaị; e, na kwa n’ọdịda-anyanwụ nke ala Zarahemla, n’oke-ala dị n’akụkụ ikpere-mmiri, na n’ọdịda anyanwụ n’ala nke Nifaị, n’ebe nke nketa mbụ ndị nna ha, ma otu a n’ogologo oke-ala n’akụkụ ikpere-mmiri.

29 Na kwa e nwere ọtụtụ ndị Leman n’ọwụwa-anyanwụ n’akụkụ ikpere-mmiri ahụ, n’ebe ndị Nifaị chụbara ha. Ma otu a ndị Nifaị fọdụrụ ntakịrị ka ndị Leman gbaa ha gburu-gburu; otu o sila dị ndị Nifaị e werewo onwunwe nke akụkụ ala nile dị n’elu elu nke ala ahụ nwere oke-ala n’ọzara ahụ, n’isi nke osimiri Saịdọn, site n’ọwụwa-anyanwụ ruo n’ọdịda-anyanwụ, gbaa gburu-gburu n’akụkụ ọzara ahụ; n’elu-elu, ọbụna wee ruo mgbe ha bịaruru ala ahụ nke ha kpọrọ Uju.

30 Ma o nwere oke n’ala ahụ nke ha kpọrọ ọ Tọgbọrọ n’efu, ebe ọ dị oke elu-elu nke mere na ọ bịara n’ime ala ahụ nke e nweworo ndị biworo na ya ma e bibiwo ya, maka ndị ọkpụkpụ ha anyị kwuworo, nke ndị nke Zarahemla chọpụtara, ebe ọ bụ ebe mbụ nke ha zọbara ụkwụ.

31 Ma ha bịara site n’ebe ahụ gbago n’ime ọzara ndịda-ndịda. Otu a ala ahụ dị n’elu elu ka a kpọrọ ọ Tọgbọrọ n’efu, ma ala ahụ dị na ndịda-ndịda ka a kpọrọ Uju, ebe ọ bụ ọzara ahụ nke jupụtara na ụdị anụ-ọhịa nile n’ụdị ọbụla dị iche iche, nke akụkụ ya siteworo n’ala elu-elu bịa maka nri.

32 Ma ugbua, ọ bụụrụ nanị ụzọ njem otu ụbọchị na mkpirisi maka onye Nifaị, n’ahịrị Uju na ala nke Ọ tọgbọrọ n’efu, site n’ọwụwa-anyanwụ ruo n’oke osimiri ọdịda-anyanwụ; ma otu a ala nke Nifaị na ala nke Zarahemla ka ọ fọdụrụ ntakịrị ka mmiri gbaa ha gburu-gburu, ebe e nwere otu ntakịrị olu-ala n’etiti ala nke dị n’elu-elu na ala nke dị na ndịda-ndịda.

33 Ma o wee ruo na ndị Nifaị ebiriwo n’ala nke Ụju, ọbụna site n’ọwụwa-anyanwụ ruo n’oke osimiri nke ọdịda-anyanwụ, ma otu a ndị Nifaị na amamihe ha, jiri ndị nche ha nile na ndị-agha ha nile, gbachibidoworịị ndị Leman na ndịda-ndịda, na site n’ebe ahụ ha agaghị enwe kwa onwunwe nke ala n’elu-elu ahụ, ka ha ghara iwere ala ahụ dị n’elu-elu.

34 Ya mere ndị Leman enweghị kwa ike inwe oke nanị n’ala nke ndị Nifaị, na ọzara ahụ gbara gburu-gburu ebe ahụ. Ugbua nke a bụ amamihe n’ime ndị nke Nifaị—ebe ndị Leman bụ ndị-iro nye ha, ha enweghị ike ikwe mkpagbu ha nile n’aka nile, na kwa ka ha wee nwe mba ebe ha nwere ike ịgbaga, dịka ọchịchọ ha nile siri dị.

35 Ma ugbua mụ, mgbe m kwusịworo nke a, na-alaghachịkwa ọzọ na nkọwasị nke Amọn na Erọn, Ọmna na Hịmnaị, na ụmụnne ha nwoke.