Akwụkwọ nsọ
2 Niphaị 10


Isi 10

Ndị Juu ga-akpọgide Chineke ha n’obe—A ga-ekposasị ha ruo mgbe ha ga amalite ikwere na ya—Amerika ga-abụ ala ntọhapụ ebe n’adịghị eze ga-achị ya—Ka unu na Chineke mee udo ma rite nzọpụta site n’amara ya. Ihe dịka n’afọ 559 ruo 545 tutu amụọ Kraịst.

1 Ma ugbua mụ, Jekọb, na-agwa unu ọzọ, ụmụnne m nwoke ndị m hụrụ n’anya, gbasara ngalaba ezi-omume a nke m kwuworo okwu maka ya.

2 N’ihi na lee, nkwa nile ndị anyị nwetaworo bụ nkwa e kwere anyị dịka n’anụ arụ; ya mere, dịka e gosịworo m ya na ọtụtụ ụmụ anyị ga-ala-n’iyi n’anụ arụ n’ihi ekweghị ekwe, otu o sila dị, Chineke ga-emere ọtụtụ ebere; ma a ga-ewetaghachi ụmụ anyị, nke ga-eme ka ha nweta ihe ahụ nke ga-enye ha ezi ọmụma nke Onye-mgbapụta ha.

3 Ya mere, dịka m gwara unu, ọ ga-adịrịrị mkpa na Kraịst—n’ihi na n’abalị nke ikpe-azụ mụọ-ozi ahụ gwara m okwu na nke a ga-abụ aha ya—ga-abịa n’etiti ndị Juu, n’etiti akụkụ ụwa ndị kara bụrụ ndị ọjọọ; ma ha ga-akpọgide ya n’obe—n’ihi na otu a ka ọ masịworo Chineke anyị na ọ ga-adị, ma ọdịghị mba ọzọ n’ụwa ga-akpọgide Chineke ha n’obe.

4 N’ihi na ọbụrụ na oke ọrụ-ebube nile ahụ ga-eme n’etiti mba ndị ọzọ ha ga-echegharị, ma mata na ọ bụ Chineke ha.

5 Ma na n’ihi nchụ-aja aghụghọ nile na ajọọ-omume nile, ha bụ ndị nọ na Jerusalem ga-akpọ ekwe ha nkụ megide ya, ka a kpọgide ya n’obe.

6 Ya mere, n’ihi ajọọ-omume ha nile, mbibi nile, ụnwụ nile, ajọọ ọrịa nile, na nkwafu-ọbara ga-abịakwasị ha; ma ndị nke a na-agaghị ebibi ka a ga-ekposasị n’etiti mba nile.

7 Mana lee, otu a ka Onye-nwe Chineke kwuru: Mgbe ụbọchị ruru na ha ga-ekwere na m, na m bụ Kraịst, mgbe ahụ ka mụ na nna ha gbaworo-ndụ na aga-akpọtaghachi ha n’anụ arụ, n’elu ụwa, laghachị n’ala nile nke nketa ha.

8 Ma ọ ga-eru na-aga achịkọbata ha site n’ogologo mkposasị ha, site na ala nile mmiri gbara gburu-gburu nke osimiri, ma site n’akụkụ anọ nke ụwa, ma mba nile nke ndị Jentaịlụ ga-adị ukwuu n’anya nke m, otu a ka Chineke kwuru, n’ibụga ha ruo n’ala nile nke nketa ha.

9 E, ndị eze ndị Jentaịlụ nile ga-abụ ndị nna-na-azụ ụmụ nye ha, ma ndị eze-nwanyị ha nile ga-abụ ndị nne na-azụ ụmụ; ya mere, nkwa nile nke Onye-nwe dị ukwuu n’ebe ndị Jentaịlụ nọ, n’ihi na o kwuwo ya, ma onye ga arụ ụka?

10 Mana lee, ala nke a, otu a ka Chineke kwuru, ga-abụ ala nketa unu, ma ndị Jentaịlụ ka a ga-agọzi n’elu ala ahụ.

11 Ma ala nke a ga-abụ ala nke ntọhapụ nye ndị Jentaịlụ, ma a gaghị enwe ndị eze n’elu ala ahụ, ndị ga-ewelite elu nye ndị Jentaịlụ.

12 Ma a ga m ewusi ala a ike megide mba nile ndị ọzọ.

13 Ma onye ọbụla na-alụ ọgụ megide Zaịọn ga ala-n’iyi, otu a ka Chineke kwuru.

14 N’ihi na onye ọbụla welitere eze megide m ga-ala-n’iyi, n’ihi na mụ, bụ Onye-nwe, eze nke elu-igwe, ga-abụ eze ha, ma aga m abụ ìhè nye ha ruo mgbe nile, bụ ndị na-anụ okwu m nile.

15 Ya mere, n’ihi nke a, na a ga-emezu ọgbụgba-ndụ m nile nke M meworo nye ụmụ nke mmadụ, na m ga-emere ha mgbe ha nọ n’anụ arụ, ọ dịrịrị mkpa na m ga-ebibi ọrụ nzuzo nile nke ọchịchịrị, na nke igbu mmadụ nile, na nke ihe arụ nile.

16 Ya mere, onye ọbụla n’alụ ọgụ megide Zaịọn, ma Juu ma Jentaịlụ, ma ndị bụ oru ma ndị nwe onwe ha, ma ndị nwoke ma ndị nwanyị, ga-ala-n’iyi; n’ihi na ha bụ ndị bụ akwụnakwụna nke ụwa nile; n’ihi na ndị na-anọnyereghị m na-emegide m, ka Chineke anyị kwuru.

17 N’ihi na a ga m emezu nkwa m nile nke m kweworo ụmụ nke mmadụ, na a ga m emere ha mgbe ha nọ n’anụ arụ—

18 Ya mere, ụmụnne m nwoke ndị m hụrụ n’anya, otu a ka Chineke anyị kwuru: A ga m akpagbu mkpụrụ-afọ gị site n’aka nke ndị Jentaịlụ, otu o sila dị, a ga m eme ka obi ndị Jentaịlụ dị nro, ka ha wee dịka nna nye ha; ya mere, ndị Jentaịlụ ga-abụ ndị agọziri agọzi ma gụnye n’etiti ụlọ nke Israel.

19 Ya mere, a ga m edo ala a nsọ nye mkpụrụ-afọ unu, na ndị ahụ a ga-agụnye n’etiti mkpụrụ-afọ unu, ruo mgbe nile, n’ihi ala nke nketa ha; n’ihi na ọ bụ ala nhọrọ karịa ala ndị ọzọ, otu a ka Chineke gwara m, karịa ala nile ndị ọzọ, ya mere, a ga m achọ ka mmadụ nile na-ebi n’ala ahụ ka ha na-efe m, otu a ka Chineke kwuru.

20 Ma ugbua, ụmụnne m nwoke ndị m hụrụ n’anya, ebe anyị hụworo na Chineke nke ebere anyị enyewo anyị nnukwu mmata ihe ha otu a gbasara ihe ndị a, ka anyị na-echeta ya, ma wezuga mmehie anyị nile, ma ghara ịkwụdata isi anyị, n’ihi na a tụfughị anyị atụfu; otu o sila dị, a chụpụwo anyị site n’ala nke nketa anyị; mana e dugawo anyị n’ala nke ka mma, n’ihi na Onye-nwe emewo osimiri okporo ụzọ anyị, ma anyị nọ n’ala nile mmiri gbara gburu-gburu nke osimiri.

21 Ma nnukwu ka nkwa nile nke Onye-nwe di nye ha bụ ndị nọ n’elu ala ahụ mmiri gbara gburu-gburu nke osimiri; ya mere dịka o kwuru, ala mmiri gbara gburu-gburu, ọ ga-enweriri ihe ka nke a, ma ndị bi kwa na ha bụ ụmụnne anyị.

22 N’ihi na lee, Onye-nwe Chineke akpọpụwo site n’oge ruo n’oge site n’ụlọ nke Israel, dịka ọchịchọ na mmasị ya siri dị. Ma ugbua lee, Onye-nwe na-echeta ndị nile ekewapụworo, ya mere ọ na-echeta kwa anyị.

23 Ya mere, nweenụ an̄ụrị n’obi unu, ma cheta na unu nwere onwe unu ime ihe unu chọrọ ime—ịhọrọ ụzọ nke ọnwụ mgbe nile na-adigide ma-ọbụ ụzọ nke ndụ ebighi-ebi.

24 Ya mere, ụmụnne m nwoke ndị m hụrụ n’anya, mee nụ udo na ọchịchọ nke Chineke, ma ọbụghị nye ọchịchọ nke ekwensu na anụ arụ; ma cheta, mgbe unu meworo udo unu na Chineke, na ọ bụ n’ime na site n’amara nke Chineke ka a ga azọpụta unu.

25 Ya mere, ka Chineke kulite unu site n’ọnwụ site n’ike nke mbilite n’ọnwụ, na kwa site n’ọnwụ mgbe nile na-adigide site n’ike nke aja mgbaghara mmehie, ka e wee nabata unu n’ime ala-eze ebighi-ebi nke Chineke, ka unu wee too ya site n’amara nsọ. Amen.