Akwụkwọ nsọ
Alma 24


Isi 24

Ndị Leman bịara imegide ndị nke Chineke—Ndị Antai-Nifaị-Lihaị wee n̄ụrịa ọn̄ụ n’ime Kraịst ma ndị mụọ-ozi letara ha—Ha họọrọ ịta-ahụhụ ọnwụ karịa ichekwa onwe ha—Ọtụtụ ndị Leman ọzọ ka a gbanwere. Ihe dịka n’afọ 90 ruo 77 tutu amụọ Kraịst.

1 Ma o wee ruo na ndị Amalek na ndị Amiulọn na ndị Leman ndị nọ n’ala nke Amiulọn, na kwa n’ala nke Hilam, na ndị nọ n’ala nke aJerusalem, ma na mkpirisi, n’ala nile gburu-gburu, ndị a na-agbanwebeghị ma ha ebukwasịbeghị onwe ha aha nke bndị Antai-Nifaị-Lihaị, a kpalitere ha site na ndị Amalek na site na ndị Amiulọn ka ha wee iwe megide ụmụnne ha nwoke.

2 Ma ịkpọ-asị ha wee sie ike karịa megide ha, ọbụna nke mere na ha malitere inupu- isi megide eze ha, nke mere na ha-achọghị ka ọ bụrụ eze ha; ya mere, ha bulitere ngwa-agha nile megide ndị nke Antai-Nifaị-Lihaị.

3 Ugbua eze ahụ nyefere ala-eze ya n’aka nwa ya nwoke, ma ọ kpọrọ aha ya Antai-Nifaị-Lihaị.

4 Ma eze ahụ nwụrụ n’ime otu afọ ahụ nke ndị Leman malitere ime nkwadobe nile maka agha imegide ndị nke Chineke.

5 Ugbua mgbe Amọn na ụmụnne ya nwoke na ndị nile ahụ so ya gbagota hụrụ nkwadobe nile nke ndị Leman ibibi ụmụnne ha nwoke, ha bịaruru n’ala nke Midian, ma n’ebe ahụ Amọn zutere ụmụnne ya nwoke nile; ma site n’ebe ahụ ha bịaruru n’ala nke Ịshmel ka ha wee nwee anzukọ ha na Lamonaị na kwa ya na nwanne ya nwoke Antai-Nifaị-Lihaị, ihe ha ga-eme iji chekwa onwe ha megide ndị Leman.

6 Ugbua enweghị otu onye n’etiti ndị ahụ nile ndị agbanweworo nye Onye-nwe nke ga-ebuli ngwa agha nile megide ụmụnne ha nwoke; e-e, ha achọghị ọbụna ime nkwadobe ọbụla maka agha; e, na kwa eze ha nyere ha iwu ka ha ghara ime.

7 Ugbua, ndị a bụ okwu ndị nke ọ gwara ndị ahụ gbasara ihe ahụ: E kelere m Chineke m, ndị m m hụrụ n’anya, na nnukwu Chineke anyị esitewo n’ịdị mma ya zite ụmụnne anyị ndị a, ndị Nifaị, nye anyị ikwusara anyị ozi-ọma, na ime ka anyị kwere maka aomenala nile nke ndị ajọọ nna anyị ha.

8 Ma lee, a na m ekele nnukwu Chineke m na o nyewo anyị oke site na Mụọ ya ime ka obi anyị dị nro, nke mere na anyị emeghewo mmekọrịta anyị na ụmụnne anyị nwoke ndị a, ndị Nifaị.

9 Ma lee, a na kwa m ekele Chineke m, na site n’imeghe mmekọrita nke a e mewo ka anyị kwenye maka ammehie anyị nile, na maka ọtụtụ igbu-mmadụ nke anyị meworo.

10 Ma a na kwa m ekele Chineke m, e, nnukwu Chineke m, na o nyewo anyị ohere ka anyị wee chegharịa maka ihe ndị a nile, na kwa ọ agbagharawo anyị maka ọtụtụ mmehie anyị ndị ahụ na igbu-mmadụ nile nke anyị meworo, ma wepụ bịta-ụta ahụ site n’obi anyị nile, site n’ịdị mma nile nke Ọkpara ya.

11 Ma ugbua lee, ụmụnne m nwoke, ebe ọ bụworo ihe nile nke anyị nwere ike ime (dịka anyị bụụrụ ndị kachasịrị fuo n’ụmụ-mmadụ nile) ichegharị site na mmehie nile anyị na ọtụtụ igbu-mmadụ nile nke anyị meworo, na ịrịọ Chineke ka o awepụ ha site n’obi anyị nile, n’ihi na o bụụrụ ihe nile anyị nwere ike ime ichegharị nke zuru-oke n’iru Chineke ka o wee bupụrụ anyị ntụpọ anyị—

12 Ugbua, ụmụnne m ndị m kachasịrị hụ n’anya, ebe Chineke bupụworo ntụpọ anyị nile, na mma agha anyị nile adịwo ọcha, mgbe ahụ ka anyị ghara imetọ mma agha anyị ọzọ site n’ọbara nke ụmụnne anyị nwoke.

13 Lee, asị m unu, E-e, ka anyị debe mma agha anyị nile ka a ghara imetọ ha site n’ọbara nke ụmụnne anyị nwoke; n’ihi na eleghị-anya, ọbụrụ na anyị ga-emetọ mma agha anyị ọzọ agaghị aasachapụ ha ọcha ọzọ site n’ọbara nke Ọkpara nke nnukwu Chineke anyị, nke a ga awụsa maka aja mgbaghara mmehie nke mmehie anyị nile.

14 Ma nnukwu Chineke ahụ emeworo anyị ebere, ma mee ka anyị mata ihe ndị a nile ka anyị wee ghara ịla n’iyi; e, ma o mewo ka anyị mata ihe ndị a nile tutu ha emee, n’ihi na ọ hụrụ amkpụrụ-obi anyị nile n’anya dịka o siri hụ ụmụ anyị n’anya; ya mere, n’obi ebere ya ọ na-eleta anyị site na ndị mụọ-ozi ya nile, ka e wee mee ka anyị mata batụmatụ nke nzọpụta ahụ nye anyị na kwa nye ọgbọ nile ndị dị n’iru.

15 O, lee ka obi ebere Chineke anyị dị! Ma ugbua lee, ebe ọ bụworo dịka anyị nwere ike ime ka ewepụ ntụpọ anyị nile site n’arụ anyị, ma mma-agha anyị nile ka e mere ka ha nʼegbuke egbuke, ka anyị zofuo ha ka e wee debe ha igbuke egbeke, dịka ihe mgba-ama nye Chineke anyị n’ụbọchị ikpe-azụ, ma-ọbụ n’ụbọchị nke a ga-akpọta anyị ka anyị guzoro n’iru ya ka ekpe anyị ikpe, na anyị emetọbeghị mma-agha anyị n’ọbara nke ụmụnne anyị nwoke site n’oge ọ kuziri okwu ya nye anyị ma mewo ka anyị dị ọcha site na ya.

16 Ma ugbua, ụmụnne m nwoke, ọbụrụ na ụmụnne anyị nwoke chọọ ibibi anyị, lee, anyị ga-ezofusị mma-agha anyị nile, e, ọbụna anyị ga-eli ha n’ime ala, ka e wee debe ha nʼigbuke egbuke, dịka ihe mgba-ama na anyị ejitubeghị ha rụọ ọrụ, n’ụbọchị ikpe-azụ; ma ọbụrụ na ụmụnne anyị nwoke e bibie anyị, lee, aanyị ga-agakwuru Chineke anyị ma a ga-azọpụta anyị.

17 Ma ugbua o wee ruo mgbe eze ahụ bịaruru na ngwụcha nke okwu ndị a nile, ma ndị ahụ nile nọkọtara ọnụ, ha weere mma agha ha nile, na ngwa-ọgụ nile nke e jiri kwafuo ọbara mmadụ, ma ha alibara ha n’ime ime ala.

18 Ma nke a ka ha mere, ebe ọ bụ n’echiche ha ihe mgba-ama nye Chineke, na kwa nye ndị mmadụ, na ọ adịghị mgbe ọbụla ọzọ ha ga-eji ngwa-ọgụ nile maka ịkwafu ọbara mmadụ; ma nke a ka ha mere, n’ikwe nkwa na bn’ịgba-ndụ ha na Chineke, na karịa ịkwafu ọbara nke ụmụnne ha nwoke ha cga-enyepụ ndụ nke ha n’onwe ha; ma karịa iwepụnara otu nwanne nwoke ha ga-enye ya; ma karịa ibi ndụ ha nile n’ịno nkịtị ha ga-eji aka ha abụọ rusie ọrụ ike.

19 Ma otu a anyị hụrụ na, mgbe e wetara ndị Leman a ikwere na ịmata ezi-okwu ahụ, ha akwụsịrị ike, ma ga-ata ahụhụ ọbụna rụọ ọnwụ karịa ime mmehie; ma otu a anyị hụrụ na ha liri ngwa-ọgụ ha nile nke udo, ma-ọbụ ha liri ngwa-ọgụ nile nke agha, maka udo.

20 Ma o wee ruo na ụmụnne ha nwoke, ndị Leman, mere nkwadobe nile maka agha, ma bịalite ruo n’ala nke Nifaị n’ihi ebum-n’obi ibibi eze ahụ, na itinye onye ọzọ n’ọnọdụ ya, na kwa nke ibibi ndị nke Antai-Nifaị-Lihaị site n’ala ahụ.

21 Ugbua mgbe ndị ahụ hụrụ na ha na-abịa imegide ha ha pụtara izute ha, ma adìnaa larịị n’iru ha, ma malite ịkpọku aha nke Onye-nwe; ma otu a ha nọ n’ime omume a mgbe ndị Leman malitere ịdakwasị ha, ma malite jiri mma agha na-egbu ha.

22 Ma otu a n’ezuteghị nguzogide ọbụla, ha gburu otu puku na ise n’ime ha; ma anyị matara na a gọziri ha, n’ihi na ha agawo ibinyere Chineke ha.

23 Ugbua mgbe ndị Leman hụrụ na ụmụnne ha achọghị ịgbalaga site na mma agha ahụ, ọbụghị ma ha ga-atụgharị nʼaka nri ma-ọbụ n’aka ekpe; ma ha ga-edịna ala wee alaa n’iyi, ma too Chineke ọbụna n’ime ihe omume nke ila n’iyi na mma agha ahụ—

24 Ugbua mgbe ndị Leman hụrụ nke a ha akwụsịrị site n’igbu ha; ma ha dị ọtụtụ ndị obi ha nile bkoworo-eko n’ime ha n’ihi ụmụnne ha ndị ahụ ndị daworo n’okpuru mma agha ahụ, n’ihi na ha chegharịrị n’ihe ndị ahụ nke ha meworo.

25 Ma o wee ruo na ha tụdara ngwa-ọgụ ha nile nke agha, ma ha achọghị iwere ha ọzọ, n’ihi na a tara ha ahụhụ nke uche n’ihi igbu mmadụ nile nke ha meworo; ma ha gbadatara ọbụna dịka ụmụnne ha nwoke, na-adabere n’ebere nke ndị ahụ nke welitaworo aka ha igbu ha.

26 Ma o wee ruo na ndị nke Chineke ndị sonyere ha n’ụbọchị ahụ karịrị ọnụ-ọgụgụ ndị ahụ e gbuworo; ma ndị ahụ e gbuworọrịị bụụrụ ndị ezi-omume, ya mere anyị enweghị ihe mere anyị ga-eji nwe obi abụọ na aazọpụtara ha.

27 Ma enweghị onye ajọọ-mmadụ e gburu n’etiti ha; kama e nwere ihe karịrị otu puku ewetara n’ọmụma nke ezi-okwu ahụ; otu a anyị na-ahụ na Onye-nwe na-arụ ọrụ an’ọtụtụ ụzọ inweta nzọpụta nke ndị ya.

28 Ugbua ọnụ-ọgụgụ karịrị n’ime ndị nke ndị Leman ahụ nke gburu ọtụtụ n’ime ụmụnne ha nwoke bụụrụ ndị Amalek na Amiulọn, nke ọnụ-ọgụgụ nke karịrị n’ime ha bụụrụ dịka ausoro nke bndị Niho.

29 Ugbua n’etiti ndị ahụ sonyere ndị nke Onye-nwe, enweghị andị ọbụla bụ ndị Amiulek ma-ọbụ ndị Amiulọn, ma-ọbụ ndị bụ nke usoro nke Niho, kama ha bụrịị ndị sitere n’agbụrụ nile nke Leman na Lemuel.

30 Ma otu a anyị nwere ike ịghọta n’ụdị dị mfe, na mgbe ndị mmadụ nwetaworo aịgba-ama site na Mụọ nke Chineke, ma enwewọrịị nnukwu bọmụma nke ihe ndị gbasara ezi-omume, ma mgbe ahụ ha cadapụwo banye n’ime mmehie na njehie, ha wee nwe obi-ike karịa, ma otu a ọnọdụ ha ga-adị dnjọ karịa ka a ga-asị na ha amatabeghị ihe ndị a nile mbụ.