Akwụkwọ nsọ
Alma 17


Nkọwasị nke ụmụ nwoke nile nke Mosaịa, ndị jụrụ ihe nile ruuru ha n’ala-eze ahụ maka okwu Chineke ahụ, ma galite ruo ala nke Nifaị ikwusa ozi-ọma nye ndị Leman; ahụhụ ha nile na nnapụta ha—dịka akụkọ-ndekọta nke Alma siri dị.

Mejupụtara isi 17 ruo isi 27 e tinyekọtara.

Isi 17

Ụmụ Mosaịa ndị nwoke nwere mụọ nke ibu-amụma na nke mkpughe—Ha gara ụzọ dị iche iche nke onwe ha ikwupụta okwu ahụ nye ndị Leman—Amọn wee gaa ala nke Ịshmel ma ghọọ nwa-oru nke Eze Lamonaị—Amọn wee zọpụta igwe-atụrụ nile nke eze ahụ ma wee gbuo ndị iro ya nile na mmiri nke Sibọs. Ama-okwu nile nke 1 ruo 3, ihe dịka n’afọ 77 tutu amụọ Kraịst; ama-okwu nke 4, ihe dịka n’afọ 91 ruo 77 tutu amụọ Kraịst; na ama-okwu nile nke 5 ruo 39, ihe dịka n’afọ 91 tutu amụọ Kraịst.

1 Ma ugbua o wee ruo na dịka Alma na-aga njem site n’ala nke Gịdiọn ndịda-ndịda, pụọ gaba n’ala nke Mantaị, lee, n’ịtụ-n’anya ya, o zutere ụmụ nwoke nke Mosaịa na-aga njem chee iru n’ala nke Zarahemla.

2 Ugbua ụmụ nwoke nke Mosaịa a nọ, ha na Alma n’oge mụọ-ozi ahụ pụtakwutere ya mbụ; ya mere Alma n̄ụrịrị ọn̄ụ karịa n’ịhụ ụmụnne ya nwoke; ma ihe tinyere karịa n’ọn̄ụ ya, ha ka bụ kwa ụmụnne ya ndị nwoke n’ime Onye-nwe; e, ma ha agbasịwo ike na mmata nke ezi-okwu; n’ihi ha bụ ndị nwoke nwere nghọta siri ike ma ha enyochasịwọrịị akwụkwọ-nsọ ike, ka ha wee mata okwu nke Chineke.

3 Mana nke a abụghị ihe nile; ha enyewọrịị onwe ha na ikpe nnukwu ekpere, na ibu ọn̄ụ; ya mere ha nwere mụọ nke ibu-amụma, na mụọ nke mkpughe, ma mgbe ha kuziri nkuzi, ha kuziri jiri ike na ikike nke Chineke.

4 Ma ha anọworịị na-akụzi okwu nke Chineke ruo afọ iri na anọ n’etiti ndị Leman, ebe ha nweworo nnukwu inweta ihe ha na-achọ n’iweta ọtụtụ na mmata nke ezi-okwu ahụ; e, site n’ike nke okwu ha nile ọtụtụ ka a kpọtara n’iru ebe nchụ-aja nke Chineke, ịkpọku aha ya ma kwupụta mmehie ha nile n’iru ya.

5 Ugbua ndị a bụ ọnọdụ nile ndị bịakwutere ha n’ịga njem ha nile, n’ihi na ha nwere ọtụtụ mkpagbu; ha tara nnukwu ahụhụ, ma n’arụ ma n’echiche, dịka agụụ, akpịrị ịkpọ-nkụ na ịda mba, na kwa nnukwu ịrụ ọrụ n’ime mụọ.

6 Ugbua ndị a bụ ịga njem ha nile: Ebe ha hapụworo nna ha, Mosaịa, n’afọ nke mbụ nke ndị-ikpe; ebe ha jụworo ala-eze ahụ nke nna ha chọsịrị ike inyekwasị ha, na kwa nke a bụ obi nile nke ndị ahụ;

7 Otu o sila dị ha pụrụ site n’ala nke Zarahemla, ma were mma-agha ha nile, na arọ ha nile, na ụta ha nile, na akụ ha nile, na ébè ha nile; ma nke a ka ha mere ka ha nwe ike chọtara onwe ha ihe-oriri oge ha ga-anọ n’ime ọzara ahụ.

8 Ma otu a ha pụrụ baa n’ime ọzara ahụ ha na ndị ọzọ ndị ha họrọworo, ịgalite ruo ala nke Nifaị ahụ, ikwusa okwu nke Chineke nye ndị Leman.

9 Ma o wee ruo na ha gara njem ọtụtụ ụbọchị n’ime ọzara ahụ, ma ha buru nnukwu ọn̄ụ ma kpee nnukwu ekpere ka Onye-nwe wee nye ha oke nke Mụọ ya ka o soro ha gaa, ma nọnyere ha, ka ha wee bụrụ ngwa-ọrụ n’aka nile nke Chineke iweta, ma ọbụrụ na o kwere mee, ụmụnne ha ndịkom, ndị Leman, n’ọmụma nke ezi-okwu ahụ, n’ọmụma nke ajọọ-omume nke omenala ahụ nile nke ndị nna ha, ndị na-adịghị mma.

10 Ma o wee ruo na Onye-nwe letara ha jiri Mụọ ya, ma sị ha: Nwee nụ nkasi-obi. Ma ha nwere nkasi-obi.

11 Ma Onye-nwe sịkwara ha: Gagharịa n’etiti ndị Leman, ụmụnne unu nwoke, ma hiwe okwu m; ma unu ga-enwe ndidi n’ime ogologo ntachi-obi na mkpagbu nile, ka unu wee gosipụta ezigbo ihe ịma-atụ nile nye ha n’ime m, ma a ga m eji unu mee ngwa-ọrụ n’aka m abụọ ruo n’ịgbapụta ọtụtụ mkpụrụ-obi.

12 Ma o wee ruo na obi nile nke ụmụ-nwoke Mosaịa, na kwa ndị ahụ nke ha na ha nọ, jiri agbam-ume ịga n’iru ruo ndị Leman ikwupụtara ha okwu Chineke ahụ.

13 Ma o wee ruo mgbe ha ruteworo n’oke-ala nile nke ala ndị Leman, na ha kewara onwe ha ma pụọ otu site n’ebe ibe ya nọ, na-atụkwasị-obi n’ime Onye-nwe na ha ga-ezukọ ọzọ na mmechi nke owuwe-ihe-ubi ha; n’ihi na ha chere na nnukwu ka ọrụ ahụ dị nke ha nakwereworo.

14 Ma n’ezie ọ dị ukwuu, n’ihi na ha anakwerewo ikwusa okwu nke Chineke nye ndị a na-azụghị-azụ na ndị mesịrị obi ha ike na ndị dị egwụ; ndị nwere mmasị n’igbu ndị Nifaị, na izu-ori na ịpụnara ha ihe; ma obi ha nile ka ha tinyere n’elu akụ na ụba nile, ma-ọbụ n’elu ọla-edo na ọla ọcha, na okwute nile dị oke ọn̄ụ ahịa; ma na ha chọrọ inweta ihe ndị a nile site n’igbu mmadụ na ịpụnara ihe, ka ha ghara ịrụ ọrụ maka ha jiri aka nke onwe ha.

15 Otu a ha bụụrụ ndị ume-ngwụ, ọtụtụ n’ime ha ndị na-efe arụsị, ma ọbụbụ-ọnụ nke Chineke adakwasịwo ha n’ihi omenala nile nke ndị nna ha; na-agbanyeghị nkwa nile nke Onye-nwe ka esetịrị ka o ruo ha n’ọnọdụ nke nchegharị.

16 Ya mere, nke a bụ ihe kpatara ụmụ nwoke nke Mosaịa nakwereworo ọrụ ahụ, na eleghị-anya ha nwere ike ịkpọta ha na nchegharị; na eleghị-anya ha nwere ike ịkpọta ha n’ịmata maka atụmatụ nke mgbapụta.

17 Ya mere ha kewara onwe ha otu site n’ebe ibe ya nọ, ma gagharịa n’etiti ha, nwoke ọbụla nanị ya, dịka okwu ahụ na ike nke Chineke nke e nyere ya siri dị.

18 Ugbua Amọn ebe ọ bụ onye-isi n’etiti ha, ma-ọbụ n’ụzọ ọzọ ọ na-elekọta ha, ma ọ pụrụ site n’ebe ha nọ, mgbe ọ gọzisịworo ha dịka otu ọnọdụ ha nile siri dị, ebe ọ gwaworo ha okwu Chineke, ma-ọbụ gọziwo ha tutu ọpụpụ ya; ma otu a ha weere njem ha dị iche iche n’akụkụ ala ahụ nile.

19 Ma Amọn gara n’ala nke Ịshmel, ala ahụ ebe a na-akpọ ya aha ụmụ nwoke nke Ịshmel, ndị nke ghọkwara ndị Leman.

20 Ma dịka Amọn banyere ala nke Ịshmel, ndị Leman kpọọrọ ya ma kee ya agbụ, dịka o siri buru omenala ha ike ndị Nifaị nile dabatara n’aka ha agbụ, ma bụga ha n’iru eze; ma otu a a hapụrụ ya na mmasị nke eze ahụ igbu ha, ma-ọbụ idebe ha na ndọkpụ n’agha, ma-ọbụ ịtụba ha n’ime ụlọ mkpọrọ, ma-ọbụ ịchụpụ ha site n’ala ya, dịka ọchịchọ na mmasị ya siri dị.

21 Ma otu a Amọn ka e bụgara n’iru eze ahụ onye na-achị ala nke Ịshmel; ma aha ya bụ Lamonaị; ma-ọbụ onye agbụrụ nke Ịshmel.

22 Ma eze ahụ jụrụ Amọn ma-ọbụ ọchịchọ ya ibi n’ala ahụ n’etiti ndị Leman, ma-ọbụ n’etiti ndị ya.

23 Ma Amọn sịrị ya: E, achọrọ m ibi n’etiti ndị a na nwa oge; e, ma eleghị-anya wee ruo ụbọchị m nwụrụ.

24 Ma o wee ruo na eze Lamonaị nwere nnukwu mmasị n’ebe Amọn nọ, ma mee ka atọpụ agbụ ya nile; ma o wee chọọ ka Amọn kpọrọ otu nwa-ada ya ka nwunye.

25 Mana Amọn sịrị ya: E-e, kama a ga m abụ nwa-oru gị. Ya mere Amọn ghọrọ nwa-oru nye eze Lamonaị. Ma o wee ruo na edunyere ya n’etiti ụmụ-oru ndị ọzọ iche igwe-atụrụ nile nke Lamonaị, dịka omenala nke ndị Leman siri dị.

26 Ma mgbe ọ nọworo n’ozi nke eze ahụ ụbọchị atọ, dịka ọ nọ ya na ụmụ-oru ndị Leman ahụ na-agagharị ha na igwe-atụrụ ha gaa n’ebe mmiri dị, nke a na-akpọ mmiri nke Sibọs, ma ndị Leman nile na-eduta igwe-atụrụ ha nile n’ebe a, ka ha wee nweta mmiri—

27 Ya mere, dịka Amọn na ụmụ-oru nile nke eze ahụ na-eduga igwe-atụrụ ha nile n’ebe a mmiri dị, lee, otu ọnụ-ọgụgụ nke ndị Leman, ndị nọworọrịị ha na igwe-atụrụ ha na mmiri, guzoro ma gbasasịa igwe-atụrụ nile nke Amọn na ụmụ-oru nile nke eze ahụ, ma ha gbasasịrị ha oke nnukwu nke mere na ha gbafuru ọtụtụ ebe nile.

28 Ugbua ụmụ-oru nile nke eze ahụ malitere ịtamu, na-asị: Ugbua eze ahụ ga-egbu anyị, dịka ọ meworo ụmụnne anyị nwoke n’ihi na igwe-atụrụ ha ka agbasasịrị site n’ajọọ-omume nke ndịkom a. Ma ha malitere ịkwa akwa karịa, na-asị: Lee, igwe-atụrụ anyị nile ka agbasasịworọrịị.

29 Ugbua ha kwara akwa n’ihi egwu na aga-egbu ha. Ugbua mgbe Amọn hụrụ nke a obi ya wee zaa n’ime ya site n’ọn̄ụ; n’ihi na, o kwuru, A ga m egosịpụta ike m nye ụmụ-oru ibem ndị a, ma-ọbụ ike ahụ nke dị n’ime m, n’ịkpọghachị igwe-atụrụ nile ndị a nye eze ahụ, ka m wee nweta obi nile nke ndị oru ibe m nile ndị a, ka m wee dụba ha n’ikwere n’okwu m nile.

30 Ma ugbua, ndị a bụ echiche nile nke Amọn, mgbe ọ hụrụ mkpagbu nile nke ndị ahụ ọ kpọrọ ụmụnne ya nwoke.

31 Ma o wee ruo na o kwagidere ha site n’okwu ya nile, na-asị: Ụmụnne m nwoke, nwee nụ obi-ụtọ ma ka anyị gaa chọọ igwe-atụrụ ndị ahụ, ma anyị ga-achịkọta ha ọnụ ma weghachi ha azụ n’ebe ahụ mmiri dị, ma otu a anyị ga-echekwa igwe-atụrụ nile ahụ nye eze ahụ ma ọ gaghị egbu anyị.

32 Ma o wee ruo na ha gara ịchọ igwe-atụrụ ahụ, ma ha soro Amọn, ma ha gara ọsọ-ọsọ jiri nnukwu ime ngwa-ngwa na gafe igwe-atụrụ nke eze ahụ n’iru, ma kpọkọta ha ọnụ ọzọ n’ebe ahụ mmiri dị.

33 Ma ndịkom ahụ guzoro ọzọ ịchụsasị igwe-atụrụ ha nile; mana Amọn sịrị ụmụnne ya nwoke: Gbaanụ igwe-atụrụ ahụ gburu-gburu ka ha ghara ịgbafu; ma ka m gaa ma lụọ ọgụ mụ na ndịkom a na-achụsasị igwe-atụrụ anyị nile.

34 Ya mere, ha mere dịka Amọn nyere ha n’iwu, ma ọ garuru ma guzoro ịlụ ọgụ ya na ndị ahụ guzoro n’akụkụ mmiri nile nke Sibọs; ma ha dị n’ọnụ-ọgụgụ ọbụghị ole na ole.

35 Ya mere ha atụghị Amọn egwu, n’ihi na ha chere na otu n’ime ndịkom ha nwere ike igbu ya dịka o siri masị ha, n’ihi na ha amataghị na Onye-nwe ekwewo Mosaịa nkwa na ọ ga-anapụta ụmụ ya nwoke site n’aka ha nile; ọbụghị ma ha matara ihe ọbụla gbasara Onye-nwe; ya mere ha nwere mmasị na mbibi nke ụmụnne ha nwoke; ma n’ihi nke a ha guzoro ịchụsasị igwe-atụrụ nile nke eze ahụ.

36 Mana Amọn guzogidere ma malite ịtụ ha okwute jiri ébè ya; e, jiri nnukwu ike ọ gbara okwute n’etiti ha; ma otu a o gburu ụfọdụ ọnụ-ọgụgụ n’ime nke mere na ha malitere inwe ịtụ-n’anya n’ike ya; otu o sila dị ha were iwe n’ihi ọgbụgbu nke ụmụnne ha nwoke, ma ha emewo mkpebi na ọ ga-ada; ya mere, ebe ha hụrụ na ha enweghị ike ịtụta ya okwute ha nile, ha bịaruru jiri okpiri nile igbu ya.

37 Mana lee, nwoke ọbụla nke welitere okpiri ya ịkụ Amọn, o jiri mma-agha ya gbubipụ aka ha; n’ihi na ọ nagidere ọkụkụ ha nile site n’iji iru mma agha ya kụọ aka ha nile, nke mere na ha malitere inwe ịtụ-n’anya, ma malite ịgbafu n’iru ya; e, ma ha adịghị ole na ole n’ọnụ-ọgụgụ; ma o mere ka ha gbafuo site n’ume nke aka ya.

38 Ugbua isii n’ime ha adawọrịị site n’ébè ahụ, mana o gbughị onye ọbụla ma ọbụghị nanị onye-ndu ha jiri mma agha ya; ma o gbubipụrụ ka ha ra bụ aka ha nile nke ewelitere megide ya, ma ha adịghị ole na ole.

39 Ma mgbe ọ chụmiworo ha ébè dị anya, ọ laghachiri ma ha nyere igwe-anụ ha nile mmiri ma kpọghachị ha ebe ịta-ahihịa nke eze ahụ, ma mgbe ahụ gabakwuru eze ahụ, buru aka nile ahụ nke ebepụworo site na mma-agha nke Amọn, nke ndị ahụ chọrọ igbu ya; ma ebubagaruru ha eze ahụ dịka ihe mgba-ama nke ihe nile ndị ha meworo.