Akwụkwọ nsọ
Akụkọ—Joseph Smith 1


Akụkọ—Joseph Smith

Nhọta nile sitere n’Akụkọ nke Joseph Smith, Onye-amụma

History of the Church, Ibu 1, Isi 1 garu nke 5

Isi 1

Joseph Smith na-akọ maka agbụrụ ya, ndị ezi na ụlọ ya nile, na ebe obibi ha gboo—Otu mkpalite uche banyere okpukpe-chi nke na-abawanye na mpaghara ọdịda anyanwụ New York—O nwere mkpebi ịchọ amamihe dịka Jemes nyere ntụzi-aka—Nna na Ọkpara ahụ apụta ìhè, e wee kpọọ Joseph nye ije-ozị nke ibu-amụma ya (ama-okwu 1–20).

1 N’ihi ọtụtụ mkpesa ndị nke ndị ajọọ omume na ndị aghụghọ gbasaworo, n’ihe metụtara ito-eto na ọgan’iru nke Nzukọ nke Jisus Kraịst nke Ndị-nsọ Ụbọchị-ikpeazụ a, ha nile nke bụ nke ndị na-ebipụta akwụkwọ ndị ahụ chepụtara ka o megide agwa ya dịka Nzukọ-nsọ na ọgan’iru ya n’ime ụwa—Enwere m nkwagide ide akụkọ a, iji mee ka uche ndị ọha rụọ ọrụ ziri ezi, na ime ka ndị na-achọso ezi-okwu nweta ezi-okwu nile, dịka ha siri mee, n’ebe o metụtara mụ onwe m na Nzukọ-nsọ, rute n’ebe m nwere mmata ihe ndị a n’aka m.

2 N’akụkọ a aga m ewepụta ihe nile dị iche iche mere eme gbasara Nzukọ-nsọ nke a, n’ezi-okwu na ezi-omume, dịka ha siri mee, ma-ọbụ dịka ha dị ugbụ a, nke bụ ugbua (1838) nke bụ afọ nke asatọ ke mgbe a haziri Nzukọ-nsọ ahụ.

3 A mụrụ m n’afọ nke Onye-nwe anyị otu puku, narị asatọ na ise, n’ụbọchị nke iri abụọ na atọ nke Disemba, n’obodo nke Sharon, ógbè Windsor, Steeti nke Vermont… Nna m, Joseph Smith Ukwu, hapụrụ Steeti nke Vermont, wee gaa na Palmyra, ógbè Ontario (ugbua Wayne), n’ime Steeti nke New York, mgbe m nọọrọ n’afọ nke iri m, ma-ọbụ gburu gburu ya. Ihe dịka afọ anọ mgbe nna m rutesịrị Palmyra, ọ gawara ya na ezi na ụlọ ya baa n’ime Manchester dị n’ime otu ógbè ahụ nke Ontario—

4 Ezi na ụlọ ya nke ihe mejupụtara ya bụ mkpụrụ-obi iri na otu, ịkpọ ha aha, nna m, Joseph Smith; nne m, Lucy Smith (onye aha ya tutu ruo alụlụ ya, bụụrụ Mack, nwa-nwanyị nke Solomon Mack); ụmụnne m ndị nwoke, Alvin (onye nwụrụ ọnwụ na Novemba 19, 1823, mgbe ọ dịrị n’afọ nke 26), Hyrum, mụ onwe m, Samuel Harrison, William, Don Carlos; na ụmụnne m ndị nwanyị, Sophronia, Catherine, na Lucy.

5 N’oge ụfọdụ n’afọ nke abụọ mgbe anyị gafesịrị na Manchester, e nwere n’ebe ahụ anyị biiri ụdị mkpalite uche na-ezighị-ezi n’isi okwu nke okpukpe-chi. O malitere n’aka ndị Methodist, mana mgbe nta ọ ghọrọ ihe zuru ọha n’etiti ndị ụka nile n’ogbe nke mba ukwu ahụ. N’ezie, ozuzu ogbe nke mba ukwu ahụ dịrị ka o metụtazuru ya, nnukwu igwe mmadụ nile kwa jikọtara onwe ha ọnụ n’ọgbakọ okpukpechi dị iche iche nke butere mkpali na-adịghị obere na nkewa n’etiti ndị mmadụ ahụ, ụfọdụ na-eti, “Hụrụ ebe a!” na ndị ọzọ “Hụrụ ebe ahụ!” Ụfọdụ na-adọ ndọrọ ndọrọ maka okwukwe ndị Methodist, ụfọdụ maka ndị Presbyterian, na ụfọdụ maka ndị Baptist.

6 N’ihi, na-agbanyeghị oke ịhụnanya nke ndị a gbanwere nye okwukwe ndị a dị iche iche zipụtara n’oge ahụ nke mgbanwe ha, na oke mmasị nke ndị ụkọchukwu ahụ dị iche iche na-egosipụta; ndị na-arụsi ọrụ ike na-ịkpalite na ibuli ihe ile-anya nke nnyocha okpukpechi nke a pụrụ iche n’ụsoro iji bụrụ na-agbanwere onye ọbụla dịka ọ masịrị ha ịkpọ ya, ka ha sonye otu ndị ụka nke masịrị ha; mana mgbe ndị ahụ a gbanwere malitere ịpụ, ụfọdụ abanye n’ofu òtù ma ụfọdụ abanye na nke ọzọ, a hụrụ na ihe yiri nnyocha ọma nile ahụ nke ndị nchụ-aja nile ahụ na nke ndị ahụ a gbanwere bụ karịa ime ka a ga-asị kama ịbụ ezie; n’ihi na ihe ilere anya nke oke ọgbaghara na ajọọ nnyocha sochiri—onye nchụ-aja na-adọ ndọrọ ndọrọ megide onye nchụ-aja, na onye agbanwere megide onye a gbanwere; nke mere na nnyocha ọma ha nile otu onye maka ibe ya, ma ọbụrụ na o nwere nke ha nweburu, furu kpam kpam na-esem-okwu nke okwu nile na ịzọ maka echiche nile.

7 A dịịrị m n’oge a n’afọ nke iri na ise m. Ezi na ụlọ nke nna m ka a tụghatara nye okwukwe Presbyterian, ma mmadụ anọ n’ime ha sonyere nzukọ-nsọ ahụ, ịkpọ ha aha, nne m, Lucy; ụmụnne m ndị nwoke Hyrum na Samuel Harrison, na nwanne m nwanyị Sophronia.

8 N’ime oge a nke oke mkpalite uche, a kwalitere uche m gaa na nlaghachi azụ dị mkpa nke uche na oke nsogbu echiche; mana ọbụnadị na nnyocha m nile miri-emi na ọtụtụ mgbe na-agbakasị agbakasị, e dobere m onwe m iche site n’òtù ndị a nile, ọbụnadị na a gara m ọtụtụ ọgbakọ ha kwa mgbe kwa mgbe dịka ohere kwenyere m. Na mgbe oge na-aga echiche m kwenyeere ndị otu Methodist, enwekwara m agụụ isonye ha; mana ukwuu ka ọgba-aghara na esem-okwu ahụ dịịrị n’etiti ndị ụka dị iche iche, na o kweghi omume na onye dị nta dịka m dị na-amabeghị ndị mmadụ na ihe nile, nke iji enwe mkpebi ọbụla banyere onye ziri-ezi na onye na ezighị-ezi.

9 A kpalitere uche m n’oge ụfọdụ nile nke ukwuu, iti mkpu ahụ na nnukwu ọgba aghara dịrị ukwuu na akwụsịgh akwụsị. Ndị Presbyterian kachasị inwe mkpebi megide ndị Baptist na ndị Methodist, ha jikwara ike nile nke uche na nke aghụghọ igosị njehie ha nile, ma-ọbụ ọ dịkarị nta, ime ka ndị mmadụ chee na ha nọ n’ime njehie. N’aka nke ọzọ, ndị Baptist na Methodist n’ọnọdụ nke ha nwekwara ọnụnụ ọkụ n’obi n’ịgba mbọ ihiwe ozizi nke ha nile gosịkwa na ndị ọzọ nile ezighị-ezi.

10 N’ime etiti agha nke a nke okwu nile na nnukwu ọgba aghara nke echiche nile, ọtụtụ mgbe ka m na-asị onwe m: Gịnị ka a ga-eme? Olee ndị ziri-ezi n’ime otu ndị a nile, ma-ọbụ na ha nile ezighị-ezi n’ozuzu? Ọbụrụ na onwere nke ọbụla n’ime ha ziri-ezi, olee nke ọ bụ, na o lee otu m ga-esi mara ya?

11 Mgbe m na-atụ uche banyere nnukwu nsogbu nke otu nile nke ndị okpukpechi ndị a kpatara, anọọrọ m otu ụbọchị na-agụ Akwụkwọ-ozi nke Jemes, isi nke mbụ na ama-okwu nke ise, nke na-agụpụta: Ọbụrụ na amamihe kọrọ onye ọbụla n’ime unu ya rịọ n’aka Chineke, onye na-enye mmadụ nile n’obi-ọma, na-abaghị kwa oke mba; na a ga-ewere ya nye ya.

12 Ọdịbeghị ihe ọgụgụ nke akwụkwọ-nsọ ọbụla jiri ike bịa n’obi nke mmadụ karịa ka nke a mere n’oge nke a nye obi m. Ọ dịịrị ka o jiri ike dị ukwuu banye n’ime nnyocha ọbụla nke obi m. Atụgharịrị m uche n’elu ya ugboro ugboro, n’ihi na amaara m na ọbụrụ na onye ọbụla chọrọ amamihe site n’aka Chineke, a chọrọ m; n’ihi na otu m ga-esi mee-amataghị m, na ma-ọbụghị na m ga-enweta amamihe karịa nke m nwere mgbe ahụ, a garaghi m ama; n’ihi na ndị nkụzi nke okpukpechi nke ọgbakọ ahụ dị iche iche ghọtara otu ihe ọgụgụ ahụ nke akwụkwọ-nsọ n’ụzọ dị iche iche nke mere na ha na-ebibi ntụkwasị obi dum n’idozi ajụjụ ahụ site na-ịchọpụta ya site na Bible.

13 Mgbe oge na-aga enwere m mkpebi na m garịrị anọgide n’ọchịchịrị na ọgba-aghara, ma-ọbụ kwa nụ na m garịrị eme dịka Jemes duziri ụzọ, nke bụ ịrịọ n’aka Chineke. Na mgbe oge na-aga ekpebiri m “ịrịọ n’aka Chineke” n’ihi n’ọbụrụ na o nyere ndị ahụ amamihe kọrọ amamihe, na ọ ga-enye ha n’obi-ọma, na na-abaghị nnukwu mba, enwere m ike ime otu ahụ.

14 N’ihi ya, n’usoro nke mkpebi nke m nke a ịrịo n’aka Chineke, m wee gaa n’ime ọhịa ịgba mbọ ahụ. Ọ bụụrụ n’ụtụtụ nke otu ụbọchị mara mma, pụtara ìhè, gboo na mmalite udummiri nke afọ narị iri na asatọ na iri abụọ. Ọ bụụrụ oge nke mbụ n’ime ndụ m na m gbaworo ụdị mbọ ahụ, n’ihi n’etiti nke mkpalite nile nke uche m o nwebeghị ruo ugbua mgbe m gbara mbọ kwuo okwu n’ekpere.

15 Mgbe m gasiworo n’ebe ahụ nke m họrọwọrorị n’atụmatụ m ịga, mgbe m lesiworo anya gburu gburu m, na-achọpụtakwa na nanị m nọ, esekpuuru m ala wee malitekwa inyelite ọchịchọ nile nke obi m n’aka Chineke. Emebedịghị m nke a eme, mgbe otu-ntabi-anya ahụ ụfọdụ ike jidere m nke meriri m kpam kpam, nwee kwa ụdị ike na-arụ ọrụ n’ime dị ịtụnanya n’arụ m dịka nke ike ire m agbụ ka m wee ghara inwe ike ikwu okwu. Agbidigbi ọchịchịrị gbara m gburu gburu, o wee dịkwa m nwa oge dịka a mawo m ikpe mbibi mberede akaraaka.

16 Mana, site n’iji ike m nile na-akpọku Chineke ka ọ napụta m site n’ike nke onye-iro nke a nke jideworo m, na n’oge ahụ kpọm kwem mgbe m jikeworo imikpu n’ime mkpasu iwe na hapụ onwe m nye mbibi—ọbụghị mbibi nke uche obi, mana nye ike nke ụfọdụ onye dị adị sịte n’ụwa nke na-anaghị ahụ anya, onye nwere ike dị ịtụnanya dị otu ahụ dịka m na-enwebeghị mmetụta nke ya mbụ na onye ọbụla dị adị-nanị n’oge nke a nke akara oke-egwu, m wee hụ otu ogidi nke ìhè kpọm kwem n’ofe isi m, karịrị mmụke nke anyanwụ, nke jiri nwayọ gbadata ruo mgbe ọ dakwasịrị m.

17 O teghị anya ọ pụtara na m chọtara onwe m na anapụtawo m site n’aka onye-iro nke jidere m n’agbụ. Mgbe ìhè ahụ nọdụrụ n’arụ m, m wee hụ Ndị abụọ, ndị mmụke ha na ebube ha karịrị nkọwa nile, na-eguzo n’elu m n’ime ikuku. Otu n’ime ha wee kwuworo m okwu, na-akpọ m aha sịkwa na-arụ nke ọzọ aka—Onye a bụ Ọkpara M. Hụrụ-na-anya Nụrụ Okwu Ya!

18 Ebum n’uche m n’ịga chọọ site n’aka Onye-nwe bụụrụ ịmara nke ọ bụ n’ime ọgbakọ nile ahụ nke bụ nke ziri ezi, ka m wee mara nke m ga-esonye. Ya mere, ozugbo m nwetara onwe m, ka m nwee ike ikwu okwu, na m jụrụ Ndị ahụ ndị na-eguzo n’elu m n’ime ìhè ahụ, nke ọ bụ na nzukọ nile ahụ bụ nke ziri-ezi (n’ihi n’oge a ọ batabeghị n’ime obi m na ha nile ezighị-ezi) na nke m ga-esonye.

19 E wee zaa m na m agaghị esonye nke ọbụla n’ime ha, n’ihi na ha nile ezighị-ezi; na Onye ahụ onye nke gwara m okwu sịkwara na ihe-okwukwe ha nile bụ ihe-arụ n’anya ya, na ndị nkwupụta okwukwe ha ahụ nile bụ ndị rere ure; na: “ha a bịaruwo m nso n’egbugbere-ọnụ ha nile, mana obi ha nile dị anya n’ebe m nọ, ha na-akụzi maka ozizi nile iwu-nsọ nile nke mmadụ, na-enwe ụdị nke iyi Chineke, mana ha na-agọnarị ike ya.”

20 O gbochikwara m ọzọ isonye nke ọbụla n’ime ha; ọtụtụ ihe ndị-ọzọ ka o kwukwara nye m, ndị nke m na-agaghị ede n’oge nke a. Mgbe m lọghachitakwara n’onwe m ọzọ, a chọtara m onwe m ebe m jiri azụ m na-edina, na-ele anya n’elu-igwe. Mgbe ìhè ahụ pụwororị, o nweghị ume fọdụụrụ m; mana mgbe nta m nwetasịrị onwe m n’ogo ụfọdụ, m wee laa n’ụlọ. Na dịka m na-adabere n’agịga ọkụ, nne jụrụ ajụjụ ka ọ mara maka ihe mere. M wee zaghachi, “Atụla uche, ihe nile dị mma—Adị m mma nke ọma.” Mgbe ahụ m wee sị nne m, “Amụtawo m maka onwe m na okpukpechi Presbyterian abụghị ezi-okwu.” Ọ dịka ma onye-iro ahụ matara nke ọma, na gboo oge nke ndụ m, na a kara m akara ịbụ onye nsogbu na onye na-akpasu iwe nke ala-eze ya; ma ọbụghị otu ahụ, mgbe ahụ olee kwa nụ ihe mere ike nile nke ọchịchịrị jiri jikọta ọnụ imegide m? Gịnị kpatara mmegide ahụ na mkpagbu nke bilitere imegide m, ntakịrị ka o bụrụ na nwanta m?

Ụfọdụ ndị nkwusa-ozi-ọma na ndị nkwupụta ndị-ọzọ nile nke okpukpechi na-ajụ inabata nkọwasị nke Ọhụ̀ Mbụ ahụ—Mkpagbu ka a kwakọtara n’elu Joseph Smith—Ọ na-agba ama maka ịbụ ezie nke ọ́hụ̀ ahụ. (Ama-okwu ndị 21–26.)

21 Ụfọdụ ụbọchị ole na ole mgbe m nwesịrị ọ́hụ̀ a, o wee bụrụ na mụ na otu onye na-ekwusa ozi-ọma nke Methodist na-anọkọ, onye naara arụsị ọrụ ike na-ime mkpalite nke okpukpe chi ahụ nke a kpọtụwororị ọnụ; na-akparịta kwa ụka n’isi okwu nke okpukpechi, eweere m ohere ahụ inye ya nkọwasị maka ọ́hụ̀ ahụ nke m nweworo. Ọgbagwọ juru m anya nke ukwuu n’agwa ya, o mesoro ihe m gwara ya ọ bụghị nanị dịka ihe dị mfe, mana jiri oke nleli na-asị na ha nile sitere n’ekwensu, na ọ dịghị ihe ndị dị otu ahụ dịka ọ́hụ̀ nile ma-ọbụ mkpughe nile n’ụbọchị ndị a; n’ihe nile dị otu ahụ akwụsịworị n’oge ndị-ozi, na ihe ndị dị otu ahụ agaghị adịkwa ọzọ.

22 Ngwa ngwa a chọpụtara m, na mụ ịkọ akụkọ ahụ akpalitewo nnukwu ịkpa-oke megide m n’etiti ndị nkwupụta nke okpukpechi, bụrụkwa ihe kpatara oke mkpagbu, nke gara n’iru na-abawanye; na-agbanyeghị kwa na m bụụrụ nwanta nwoke nke ndị mmadụ na-amataghị nke ọma, nanị n’agbata afọ ịrị-na-anọ na nke iri na ise, ọnọdụ m na ndụ bụ kwa nke ga-eme ka nwanta nwoke na-adịghị mkpa n’ime ụwa, ka ndị mmadụ ọnọdụ ha dị elu weere nleba-anya zuru ezu iji kpalite echiche ndị ọha megide m, na mee kwa ka mkpagbu dị ilu dịrị; nke a dịkarịrị n’etiti ndị otu ahụ nile—ha nile jikọtara aka imegide m.

23 Ọ kpataara m ịlaghachi azụ dị mkpa n’uche mgbe ahụ, na-akpatakwa ya ọtụtụ mgbe kwa mgbe ke mgbe ahụ, otu o si dịrị egwu na nwanta nwoke nke ndị mmadụ na-amataghị nke ọma, nke dị nta karịa afo iri na anọ na otu onye, kwa, nwere akàra aka nke mkpa inweta obere ihe oriri site n’ọrụ-ike ya kwa ụbọchị, na e kwesịrị iche na ọ bụ onye dị mkpa zuru oke ito ndị nnukwu mmadụ nke otu nzukọ ndị a kachasị mara amara nke ụbọchị ahụ akpịrị na n’ọnọdụ nke ikenye n’ime ha mụọ nke mkpagbu kachasị ịdị ilu na ikpọ-iyi. Mana ma ọ dị egwu ma-ọbụ na o dịghị, otu ahụ ka ọ dịịrị, ọ bụkwaara kwa mgbe kwa mgbe ihe kpatara oke mwute nile nye mụ onwe m.

24 Otu o sila dị, na-agbanyeghị ọ bụụrụ ezi-okwu na m hụrụ ọ́hụ̀. Echewo m rịị, na m nyochaworo onwe m dịka Pọl mgbe ọ na-eme mgbochi ya n’iru Eze Agripa nye kwa nkọwasị nke ọ́hụ̀ ahụ nke o nwere mgbe ọ hụrụ ìhè, nụ kwa otu olu-okwu; mana na-agbanyeghị ọbụ nanị mmadụ ole na ole kwere ya, ụfọdụ sịrị ọ naghị ekwu ezi-okwu, ndị ọzọ sịrị ara adịwo ya; emekwara ya ihe ọchị, kpọọ kwa ya iyi. Mana ihe ndị a nile ebibighị ịbụ ezi-okwu nke ọ́hụ̀ ya. Ọ hụworị ọ́hụ̀, ọ maara na ya hụrụ ọ́hụ̀, na mkpagbu nile dị n’okpuru elu-igwe apụghị ime ka ọ ghara ịbụ ezi-okwu; na ọbụnadị na ha kpagburu ya ruo n’ọnwụ, mana ọ maara, ga-amarakwa ruo n’iku ume nke ikpe-azụ ya, na ya ahụwo ma ìhè na nụwokwa olu na-ekwu okwu nye ya, na ụwa dum apụghị ime ya iche ma-ọbụ kwere n’ọbụghị otua.

25 Otu a ka ọ dịịrị nye m. Ahụwo m rị ìhè, na n’etiti ìhè ahụ ahụrụ m Ndị abụọ, ha kwukwaara m okwu n’ezie; ma na-agbanyeghị na a kpọrọ m asị kpagbuo kwa m maka ikwu na m ahụwọ ọ́hụ̀, mana ọ bụ ezi-okwu; na mgbe ha na-akpagbu m, na-akpọ m iyi, na-ekwu kwa ajọọ ihe nile dị iche iche megide m n’okwu-ụgha n’ihi ikwu nke a, o metụrụ m ka m kwuo n’ime obi m sị: Gịnị mere a na-akpagbu m n’ihi na m kwuru ezi-okwu? Ahụwo m ọ́hụ̀ n’ezie; onye ka m bụkwanụ na m ga-eguzogide Chineke, ma-ọbụ gịnị mere ụwa na-eche na ha ga-eme ka m gọnarị ihe nke m hụworo n’ezie? N’ihi na ahụwo m rị ọ́hụ̀; a maara m nke a, a maakwara m na Chineke maara ya, enwekwaraghị m ike ịgọnarị ya, nke m gaara anwa ime ya; ma-ọdịghị-ihe ọzọ a maara m na site n’ime otu a m ga-emehie Chineke, ma bịa n’okpuru amamikpe.

26 Enwewo m afọ-ojuju n’ime uche m ugbua na dịka ọ gbasara ndị otu ụka nile nke ụwa—n’ọbụghị ọrụ dịịrị m isonye nke ọbụla n’ime ha, mana ịnọrọ dịka m dịịrị ruo mgbe m ga-enwe ntụzi-aka ọzọ. A chọpụtawo m na ịgba-ama nke Jemes bụụrụ ezi-okwu—na nwoke ahụ nke amamihe kọrọ nwere ike ịrịo n’aka Chineke, ma nweta amamihe, na-enweghị mba a ga-abara ya.

Moronaị apụta ìhè nye Joseph Smith—Aha Joseph ka a ga-amara maka ihe ọma na ihe ọjọọ n’etiti mba nile—Moronaị agwa ya maka Akwụkwọ nke Mọmọn na maka ọbịbịa nke ikpe nile nke Onye-nwe n̄omie kwa ọtụtụ akwụkwọ-nsọ nile—Ebe e zoro epekele ọla-edo nile ka e kpughere—Moronaị gara n’iru na-akụziri Onye-amụma ahụ. (Ama-okwu 27–54.)

27 M wee gaa n’iru na-ịchụso ọrụ mụ na-arụ na ndụ m ruo n’iri ụbọchị abụọ na otu nke Septemba, otu puku afọ narị asatọ na iri abụọ na atọ, na-ata ahụhụ nke ajọọ mkpagbu n’oge ahụ nile n’aka nile, nke ogo ndị mmadụ di iche iche, ma ndị okpukpechi na ndị na-abụghị ndị okpukpechi, n’ihi na agara m n’iru ikwusi-ike na ahụwo m ọ́hụ̀.

28 N’oghere nke oge ahụ nke dị n’agbata oge ahụ m nwere óhù ahụ na afọ narị iri na asatọ na iri abụọ na atọ—ebe e gbochiri m isonye nke ọbụla n’ime otu okpukpechi nile nke ụbọchị ahụ, na ebe m ka dị obere n’afọ nile, bụrụ kwa onye ndị ahụ kwesịrị ịbụ ndị enyi m na ndị kwesịrị imeso m omume obi-ọma kpagburu, na ọbụrụ na ha chere na e duhiere m eduhie gaara agba mbọ n’ụzọ ziri-ezi na omume ịhụnanya inwetaghachi m—m wee bụrụ onye a hapụrụ nye ụdị ọnwụnwa nile dị iche iche; na-enwe mmekọta mụ na ndị mmadụ dị iche iche, m wee daba ọtụtụ mgbe n’ime ọtụtụ mmehie nzuzu, ma na-egosipụta adịghị ike nke okorọbịa, na irighiri amaghị-eme nile nke ụdị okike nke mmadụ; ndị nke, ọ na ewute m ịsị; dubara m n’ime ọnwụnwa dị iche iche, dị njo n’anya nke Chineke. Na-ime nkwupụta nke a, ka onye ọbụla ghara iche na m nwere, ikpe ọmụma nke oke mmehie ma-ọbụ ime oke ajọọ omume nile. Inwe mmasị nke ime ụdị ahụ a dịghi adị n’ime okike m. Mana enwere m amamikpe nke iji ihe na-abụghị ihe ọchị mee ihe ọchị, na oge nile ụfọdụ enwere m mmekorịta mụ na ndị na-ewere ihe nile dịka ihe dị mfe, na enwe an̄ụrị na ịchị ọchị, ndị nke na-ekwesịghị na omume nke onye nke Chineke kpọrọ kwesịrị ịdị na-eme dịka a kpọwọro m. Mana nke a gaghị adị n’ụdị na-amaraghị arụ nke ukwu nye onye ọbụla ga-echetagharị okorọbịa m, na onye matara ụdị iru ọcha na an̄ụrị nke omume m.

29 N’ihi ihe ndị a nile, ọtụtụ mgbe ka m nyochara onwe m n’amamikpe maka adịghị ike na etozughị-oke m nile; mgbe n’oge mgbede nke ụbọchị nke iri abụọ na otu nke Septemba dịka a kpọtụrụ aha n’elu elu, mgbe m labasịworo ụra n’elu àkwà m maka abalị, m wee were onwe m gaa n’ekpere na arịrịọ nye Chineke Pụrụ Ime Ihe nile maka mgbaghara nke mmehie m nile na nzuzu nile, na kwa maka ngosipụta nye m, ka m wee mara maka ọnọdụ m na ebe m kwụ n’iru ya; n’ihi na-enwere m ntụkwasị-obi n’uju inweta ngosipụta dị nsọ dịka m nwetawororịị otu na mbụ.

30 Mgbe m ka nọ na-akpọku Chineke, m wee chọpụta ìhè ka ọ na-enwubata n’ime ụlọ m, nke gara n’iru na-abawanye ruo mgbe ọnụ-ụlọ ahụ jupụtara n’ìhè karịa etiti ehihie, mgbe otu oge ahụ otu Onye pụtara ìhè n’akụkụ àkwà-ụra m, na-eguzọ n’ime ikuku, n’ihi na ụkwụ ya emetụghị ala-ụlọ.

31 O yi uwe mwụda na-ekesighị ike nke ịdị ọcha ya mabigara mma oke. Ọ bụ ịdị ọcha nke karịrị ihe ọbụla nke ụwa nke m hụworo mgbe ọbụla; ma-ọbụghịkwanụ na m ga-ekwere na-enwere ike ime ihe nke ụwa ọbụla ka ọ mabiga mma oke n’ịdị ọcha na-amụke amụke. Aka ya abụọ gba-ọtọ, na kwa ogwe-aka ya nile, ntakịrị ihe ruo n’elu nkwọ nkwọ aka ya; otu ahụ, kwa, ka ụkwụ ala ya gba-ọtọ, dịka ogwe ụkwụ ya nile, ntakịrị ihe ruo n’elu nkwọ nkwọ ụkwụ ya. Isi ya na olu ya gba kwa ọtọ. Enwere m ike ịchọpụta na o nweghị uwe ọzọ o yi ma-ọbụghị uwe mwụda nke a, n’ihi na o ghere oghe, otu m nwere ike ịhụ baa n’obi ya.

32 Ọbụghị nanị na uwe mwụda ya dị ọcha dịbiga ya oke, mana ozuzu onwe ya dị ebube karịa ihe e nwere ike ịkọwadaru ala, mbara-iru ya n’ezi-okwu dịka amụma mmiri. Ime-ụlọ ahụ nwubigara ìhè oke, mana ọ mụkeghị ebe ọ dị ukwu dịka nso nso gburu gburu onwe ya. Mgbe m legidere ya anya na mbụ atụrụ m egwu; mana egwu ahụ hapụrụ m ngwa-ngwa.

33 O wee kpọọ m aha m sịkwa m na ya onwe ya bụ onye-ozi e zitaara m site n’iru nke Chineke, na aha ya bụ Moronaị; na Chineke nwere ọrụ maka m nke m ga-arụ; nakwa aha m ka a ga-enwe maka ihe ọma na ihe ọjọọ, n’etiti mba nile, ebo nile, na asụsụ nile, ma-ọbụ na-aga ekwu ma ihe ọma na ihe ọjọọ gbasara ya n’etiti mmadụ nile.

34 O wee sị na o nwere akwụkwọ nke e debere maka nchekwa, e dere n’elu epekele ọla-edo, na-enye nkọwasị maka ndị bibuuru na kọntinenti nke a, na ebe ha siri bịa. Ọ sịkwara na uju nke Ozi-ọma mgbe nile na-adigide dị n’ime ya, dịka Onye-nzọpụta nyefere n’aka ndị ahụ biiri na ya mgbe ochie;

35 Nakwa, na-enweere okwute abụọ dị na ụta ọla-ọcha—na okwute ndị a, nke e kedoro n’epekele nchekwa-obi, mejupụtara ihe a kpọrọ Urim na Tumim—e debere maka nchekwa ya na epekele ndị ahụ; na na-inwe na iji okwute ndị a rụọ ọrụ bụ ihe mejupụtara“ndị ọhụ-ụzọ” na mgbe ochie ma-ọbụ oge nile gara-aga; na Chineke kwadobe kwara ha maka ịtụgharị asụsụ nke akwụkwọ ahụ.

36 Mgbe ọ gwasịrị m ihe ndị a nile, o wee malite in̄omi amụma nile nke Testament Ochie. Nke mbụ o n̄omiri mpaghara isi nke atọ nke Malakaị; o n̄omikwara nke anọ ma-ọbụ isi nke ikpe-azụ nke otu amụma ahụ, mana o nwere obere ndị-iche site n’ụzọ esi agụta ya na Bible anyị nile. Kama in̄omi ama-okwu nke mbụ ahụ dịka esi agụta ya n’akwụkwọ anyị nile otu a ka o siri n̄omie ya.

37 N’ihi lee, ụbọchị ahụ na-abịa nke ga-ere ọkụ dịka ite-ọkụ, na ndị mpako nile, e, ka ha ra bụ ndị na-eme ọjọọ-omume ga-ere ọkụ dịka ahịhịa-ọka; n’ihi na ndị ahụ nke na-abịa ga-erechapụ ha, ka Onye-nwe nke Usuu nile nke ndị agha sịrị, na ọ gaghị a hapụrụ ha ọbụghị mgbọrọgwụ ma-ọbụ alaka.

38 Ọzọ kwa, o n̄omiri ama-okwu nke ise otu a: Lee, aga m ekpughere unu Ọkwa Nchụ-aja ahụ, site n’aka nke Elaija onye-amụma, tutu ọbịbịa nke nnukwu ụbọchị ahụ dị egwu nke Onye-nwe.

39 O n̄omikwara ama-okwu nke na-eso n’ụzọ dị iche: Ọ ga-akụnye kwa n’ime obi nile nke ndị bụ ụmụ nkwa nile ahụ e kwere ndị bụ nna ha, na obi nile nke ndị bụ ụmụ ga-atụgharị kwute ndị bụ nna ha. Asị ma-ọbụghị ọtụ ahụ, ụwa nile ka a ga-ala n’iyi kpam kpam n’ọbịbịa ya.

40 Na-itinye kwara ndị a, o n̄omiri isi nke iri na otu nke Aịsaịa, na-asị na ọ na-agaje imezu ngwa ngwa. O n̄omikwara isi nke atọ nke Ọlụ ndi-ozi, ama-okwu nke iri abụọ na abụọ na nke iri abụọ na atọ, kpọm kwem dịka otu ha dị n’ime Testament Ọhụrụ anyị. Ọ sịrị na onye-amụma ahụ bụụrụ Kraịst; mana ụbọchị ahụ a ka-abịaghị mgbe “ndị ahụ na-agaghị anụ olu-okwu ya a ga-ebepụ ha site n’etiti ndị mmadụ ahụ,” mana ọ ga-abịa ọsọ ọsọ.

41 O n̄omikwara Joel isi nke abụọ, site na ama-okwu nke iri abụọ na asatọ ruo na nke ikpe-azụ. O kwukwara sị na a ka mezubeghị nke a, mana a ga-emezu ya na nso a. O wee kwuo kwa na uju nke ndị Jentaịlụ gaje ịbata ọsọ ọsọ. O n̄omikwara ọtụtụ ihe ọgụgụ ndị ọzọ nke akwụkwọ-nsọ, na nye ọtụtụ nkọwa nile ndị na-enweghị ike ịkpọtụ ọnụ ebe a.

42 Ọzọ, ọ gwara m, na mgbe m nwetara epekele nile ndị ahụ nke o kwuworo maka ha—n’ihi na oge ahụ nke a ga-eji nweta ha ezubeghị—Ekwesịghị m ịgosi ha mmadụ ọbụla, ọbụghị epekele-nchekwa obi ahụ tinyere Urim na Tumim; nanị ndị ahụ a ga-enye m iwu igosi ha; ọbụrụ na m e mee ya na a ga ebibi m. Mgbe mụ na ya na-akparịta ụka banyere epekele nile ahụ, ọ́hụ̀ ahụ ka e kpughere nye uche m na e nwere m ike ịhụ ebe ahụ nke e debere epekele nile ahụ maka nchekwa, na hụ ha nke ọma na ido-anya nke na m matara ebe ahụ ọzọ mgbe m gara leta ya.

43 Mgbe mụ na ya kwuchara m wee hụ ìhè ahụ dị n’ime ụlọ ahụ ka ọ malitere ịchịkọta ọnụ nso nso gburugburu onye ahụ nke nọrọ na-agwa m okwu, ọ gakwara n’iru ime otu a ruo mgbe ime ụlọ ahụ a hapụkwara ya n’ọchịchịrị, ewezuga nanị gburu gburu ya, mgbe otu ntabi anya m wee hụ, ihe dịka oghere ka o meghere baa n’ime elu-igwe, o wee rigoro ruo mgbe na-ahụghị kwa ya anya, ma a hapụrụ ime ụlọ ahụ dịka ọ dịbuuru tutu ìhè nke elu-igwe a.

44 Edinara m ala n’elu àkwà-ụra na-eche banyere otu ihe ọhụhụ ahụ, na-enwe oke ịtụ-n’anya n’ihe nke a gwaworo m site n’ọnụ nke ọnye-ozi a pụrụ iche; mgbe n’ime etiti ntụgharị uche m, achọpụtara m na mberede na ime-ụlọ m malitere ọzọ inweta ìhè, ma na nwa oge kwa, dịka ọ dị onye-ozi nke elu-igwe ahụ nọkwa ọzọ n’akụkụ àkwà-ụra m.

45 O malitere, ma kọọ kwa ọzọ ọtụ ihe ndị ahụ nile nke o mewororị na nleta ya nke mbụ, na-enweghị mgbanwe dịkarịsịrị nta; nke mgbe o mesịrị, o mere ka m mara maka nnukwu ikpe nile ndị nke ga-abịakwasị ụwa, na-eji ịtọgbọ n’efu sitere n’ụnwụ, mma-agha, na ajọọ ọrịa; na ikpe ndị a dị mwute ga-abịa n’elu ụwa n’ọgbọ nke a. Mgbe ọ kọchasịrị ihe ndị a nile, o rigoro kwa ọzọ dịka o mewororị na mbụ.

46 N’oge nke a, ihe ndị a adịwo oke omimi n’uche m na ụra gbafuwororị site n’anya m, na m dinara ka onye e gwerirị egweri n’ime ịtụnanya n’ihe m hụworo na nụwọ kwa. Mana olee ịdị ukwuu nke mgbagwọju anya m dị mgbe m hụrụ otu onye-ozi ahụ ọzọ n’akụkụ àkwà-ụra m, nụkwa ya ka ọ na-akọgharị ma-ọbụ kwugharịa ọzọ nye m otu ihe ndị ahụ dịka ndị nke mbụ; tinye kwa otu ịdọ-aka na ntị nye m; na-agwa m na Setan ga-agba mbọ ịnwa m ọnwụnwa (n’ihi ọnọdụ ịdị ogbenye nke ezi na ụlọ nke nna m), inweta epekele nile ahụ n’ihi iji nweta akụ na ụba. Nke a ka o gbochiri m ime, na-asị na m garịrị aghara inwe ihe nlekwasị anya ọzọ na-inweta epekele nile ahụ kama iji nye Chineke otuto, na m agaghị ekwe ka ebum n’uche ọbụla ọzọ si n’ime m rụọ ọrụ karịa kwa nke ahụ bụ nke iwu ala-eze ya; ewezuga nke a enweghị m ike inweta ha.

47 Mgbe nleta nke atọ nke a gasịrị, ọ rịgoro kwa n’elu-igwe dịka na mbụ, ma a hapụkwara m ọzọ ịtụgharị uche n’elu o pụrụ iche nke ihe m ka mụtara site n’ihe mere; mgbe na-etụfughị oge onye-ozi nke elu-igwe ahụ rigosiworo site n’ebe m nọ nke ugboro atọ, oke ọkụkọ wee bee akwa, m wee chọpụta na chi ọbụbọ adịwo nso, ya bụ na mkparịta ụka anyị ewereworị abalị ahụ nile.

48 E mesịa nwa mgbe nta m wee bilie site n’àkwà-ụra m, na dịka m si na-eme a gara m ịrụ-ọrụ nile ndị dị mkpa nke ụbọchị ahụ; mana na-agba mbọ ịrụ-ọrụ dịka n’oge ndị ọzọ, achọpụtara m n’ume m gwụsịrị nke mere na m enweghị ike ịrụ ọrụ kpam kpam. Nna m, onye mụ na ya na-arụkọ ọrụ, chọpụtara n’onwere ihe na-esogbu m, o wee gwa kwa m ka m laa n’ụlọ. M wee malite ịla na-enwe nzube ị gawa n’ụlọ; mana mgbe m na-agba mbọ igafe ogige esi apụta n’ime ubi ebe anyị nọ, ume m wee gwusịa kpam kpam, m wee daa kwa n’ala na-enweghị enyem-aka, na nwa oge a nọdụrụ m na-amataghị maka ihe ọbụla.

49 Ihe mbụ nke m nwere ike icheta bụ otu olu na-ekwu okwu nye m, na-akpọ m aha. M wee lelie anya elu, hụ kwa otu onye-ozi ahụ ka ọ na-eguzo n’ofe isi m, ebe ìhè gbara ya gburu gburu dịka na mbụ. Mgbe ahụ ọ kọgharị kwaara m ihe nile ahụ nke ọ kọwororị m n’abalị nke gara aga, nye kwa iwu ka m gakwuru nna m gwa kwa ya maka ọ́hụ̀ ahụ na iwu-nsọ nile nke m nataworo.

50 Erubere m isi; m wee laghachikwuru nna m n’ubi, kọwaakwara ya ihe nile ahụ. Ọ zaghachiri m na ihe a sitere na Chineke, wee gwakwa m ka m gaa mee dịka e nyeworo m iwu site n’ake onye-ozi ahụ. Ahapụrụ m ubi ahụ, wee gaa kwa n’ebe onye-ozi ahụ gwara m na epekele nile ahụ dị e debere ha, na n’ihi mpụta ìhè nke ọma nke ọ́hụ̀ ahụ nke m hụworo banyere ya, amatara m ebe ahụ ozugbo m rutere ebe ahụ.

51 Nso nso ruo ọnụmara Manchester, na ógbè Ontario, New York, ka otu ugwu nke butụrụ ibu na-eguzo, bụ kwa nke kachasị ịdị elu karịa nke ọbụla na agbata-obi ahụ. Na mpaghara ọdịda anyanwụ nke ugwu a, n’ebe na-adịghị anya site n’elu ya, n’okpuru otu okwute nke buturu ibu ka epekele nile ahụ dina, e debere ha n’otu igbe okwute. Okwute a dị agbidigbi dịkwa okirikiri n’etiti nke akuku elu ya, na gịrịgịrị karịa na ebe nile nke nkọ ọnụ ya nke mere na mpaghara etiti ya ka a na-ahụ anya n’elu ala, mana nkọ ya gburu gburu ka e jiri aja kpochie.

52 Mgbe m wepụsịworo aja ala ahụ, m wee weta osisi mgba nke m fanyere n’okpuru nkọ nke okwute ahụ na site n’itinye ya obere ume wee bulite ya elu. M wee leba anya n’ime ya, n’ebe ahụ n’ezie a hụrụ m epekele ahụ nile, Urim na Tumim ahụ, na epekele nchekwa-obi, dịka onye-ozi ahụ kwuru. Igbe ahụ nke ha dị n’ime ka a kpụrụ site n’inyibe kọta okwute ọnụ n’ime ihe dịka simenti eji nyakọta ha ọnụ. N’íkè ime igbe ahụ ka e nyibere okwute abụọ akufere akụfe, n’elu otu okwute ndị a ka e nyibere epekele nile ahụ, na ihe ndị ọzọ nile so kọ ha.

53 A gbara m mbọ ka m wepụta ha, mana e gbochiri m site n’aka onye-ozi ahụ, ọ gwakwara m ọzọ n’oge maka iwepụta ha ìhè e rubeghị, ọ gaghị kwa eru, ruo afọ anọ site n’oge ahụ; kama ọ gwara m na m ga na-abịa ebe ahụ kpọm kwem n’otu afọ site n’oge ahụ, na ya ga kwa na-ezute m ebe ahụ, na m ga-aga n’iru na-eme otu ahụ ruo mgbe oge ahụ ga-abịa maka inweta epekele nile ahụ.

54 N’ikwekọrịta, dịka e nyeworo m n’iwu, agara m n’ọgwụgwụ nke afọ ọbụla, n’oge ọbụla kwa a hụrụ m otu onye-ozi ahụ ebe ahụ, natakwa nkụzi na akọn’uche site n’aka ya na mkparịta-ụka ọbụla anyị nwere, gbasara ihe Onye-nwe na-aga ime, na otu na usoro a ga-esi duzie ala-eze ya n’ụbọchị ndị ikpe-azụ.

Joseph Smith a lụọ Emma Hale—Ya anata epekele ọla-edo nile ahụ site n’aka Moronaị tụgharị kwa asụsụ ụfọdụ n’ime mkpụrụ akwụkwọ ahụ—Martin Harris egosi Professor Anthon mkpụrụ akwụkwọ nile ahụ, onye sịrị, “E nweghị m ike ịgụ akwụkwọ a rachiri arachi.” (Ama-okwu nile nke 55–65.)

55 N’ihi na ọnọdụ ihe mnweta nke ụwa nke nna m dịịrị nta nke ukwuu, anyị nwere mkpa iji aka anyị na-arụsi ọrụ-ike, na-eje ọrụ-ngo n’ụbọchị na ụdị ọzọ kwa, dịka anyị nwere ike inwe ohere. Oge ụfọdụ anyị nọdụrụ n’ụlọ, oge ụfọdụ anyị pụrụ apụ, na site n’ije ọrụ n’esepụghị aka anyị nwere ike nweta ezigbo nriju-afọ.

56 N’afọ 1823 ezi na ụlọ nna m zutere oke mkpagbu site n’onwu nke nwanne m nwoke nke kachasị okenye, Alvin. N’ọnwa nke Ọktoba, 1825, otu agadi nwoke nke aha ya bụ Josiah Stoal goro m ọrụ, onye biiri na ógbè Chenango, Steeti nke New York. Ọ nụworị ihe gbasara otu olulu a na-egwuta ọla-ọcha nke ndị Spain meghere na Harmony, ógbè Susquehanna, Steeti nke Pennsylvania; na tutu ya egoo m ọrụ, ọ na-egwu ala, n’usoro ma ọ ga-ekwe omume, ịchọpụta olulu ahụ e si egwuta ọla-ọcha. Mgbe m gasịrị soro ya biri, ọ kpọọrọ mụ na ndị ọrụ ya ndị ọzọ, ka anyị gwuo ala maka olulu ọla-ọcha ahụ, nke m gara n’iru ịrụ ọrụ ya ruo ntakịrị ka ọbụrụ otu ọnwa, na-enwetaghị ihe a chọrọ n’ọrụ anyị nile, n’ikpe-azụ e mere m ka agadi nwoke ahụ kweta ịkwụsị igwu maka ya. N’ebe a ka akụkọ ahụ a maara nke ọma na m bụ onye na-egwu ala na-achọ ego malitere.

57 N’oge ahụ nke m na-arụ ọrụ a, e mere ka mụ na Maazi Isaac Hale onye ebe ahụ biri, maka nlekọta anya m; ọ bụụrụ ebe ahụ ka m hụrụ nwunye m anya nke mbụ (nwa ya nwanyị), Emma Hale. Na 18 Jenuarị, 1827, ka anyị lụrụ alụlụ, mgbe m ka nọ n’ọrụ nke Maazi Stoal.

58 N’ihi ịga n’iru m na-ekwu na-ahụwo m óhù, mkpagbu gara n’iru na-eso m, ezi na ụlọ nke nna nwunye m megide kwara alụlụ anyị ebe ọ dị ukwuu. Ya mere, anọọrọ m na mkpa nke ịkpọrọ ya gaa ebe ọzọ; n’ihi ya anyị gara lụọ alụlụ ahụ n’ụlọ nke Squire Tarbill dị na South Bainbridge, ógbè Chenango, New York. Ngwa ngwa alụlụ m gasịrị, a hapụrụ m nke Maazi Stoal, gaa kwa na nke nna m soro ya rụọ ọrụ ubi n’oge ọrụ ubi ahụ.

59 N’ikpe-azụ oge rutere maka inweta epekele nile ahụ, Urim na Tumim ahụ, na epekele nchekwa obi ahụ. N’ụbọchị nke iri abụọ na abụọ nke ọnwa Septemba, n’afọ otu puku narị asatọ na iri abụọ-na asaa, mgbe m gara dịka m na-eme n’ọgwụgwụ nke afọ nke ọzọ n’ebe ahụ e debere ha maka nchekwa, otu onye—ozi nke elu-igwe ahụ kwa nyefelitere ha n’aka m jiri inye iwu nke a: na ha ga-abụ ihe dịịrị m ilekọta; na ọ bụrụ na m ga-ahapụ ha na-enweghị ịkpachapụrụ ha anya, ma-ọbụ site na nleghara-anya nke m, na-aga ebepụ m; kama na m ga-eji ịgbasi mbọ nile ike chekwaa ha, ruo mgbe ya, onye-ozi ahụ, ga-akpọ maka ha, e kwesịrị ka e chekwaa ha.

60 Achọpụtara m n’oge na-eteghị anya ihe mere m jiri nata iwu ndị ahụ sịrị ike idebe ha na nchekwa, na ihe mere na onye—ozi ahụ kwuru sị na mgbe m mere ihe a tụrụ anya n’aka m, na ya ga-akpọ maka ha. N’ihi na-oteghị anya a matara na m ji ha ka e tinyere nnukwu ume n’ọrụ ịnapụ ha n’aka m. Ụdị aghụghọ ọbụla nke e nwere ike ịchọpụta ka e tinyere n’ọrụ maka ebum n’uche ahụ. Mkpagbu ahụ wee dị ilu karịa ma taa akpụ karịa n’oge mbụ, ìgwè ndị mmadụ nọdụkwara na nche akwụsịghi akwụsị inweta ha site n’aka m ma ọbụrụ na ọ ga-ekwe mee. Mana site n’amamihe nke Chineke, ha nogidere na nchekwa n’aka m, ruo mgbe m rụsịrị site na ha ihe ahụ a chọrọ n’aka m. Mgbe, dịka nkwekọrịta nile siri dị, onye—ozi ahụ kpọrọ maka ha, e nyefelitere m ya ha; o ji kwa ha na nchekwa nke ya ruo ụbọchị nke abụọ nke Mee, otu puku afọ narịasatọ na iri atọ na asatọ.

61 Mkpalite ahụ, otu-o-sila-dị, gakwara n’iru, asịrị na otu puku ire ya nile kwa ka e tinyere n’ọrụ oge nile na mgbasa okwu-ụgha nile gbasara ezi na ụlọ nna m, na gbasara mụ onwe m. Ọ bụrụ na asị ka m kọgharịa ótù mpaghara n’ime otu puku ha, ọ ga ejupụta ibu akwụkwọ dị ọtụtụ. Mkpagbu ahụ, otu-o-sila-dị, ghọziri nke na-enweghị odidi nke na m nwere mkpa nke ịhapụ Manchester, na mụ na nwunye m agawa na ógbè Susquehanna, dị n’ime Steeti nke Pennsylvania. Mgbe anyị na-akwado imalite—ebe anyị di ogbenye nke ukwu, mkpagbu ahụ a dịkwa arọ nke ukwu n’isi anyị nke na-enweghị ikekwe mgbe anyị ga-adị n’ụdị ọzọ—n’ime etiti mkpagbu anyị nile anyị chọtara otu enyị n’ime otu nwoke dị nwayọọ n’aha nke Martin Harris, onye bịakwutere anyị nye kwa m iri dọla ise iji nyere anyị aka na njem anyị. Maazi Harris bụụrụ onye bi n’obodo mepere emepe nke Palmyra, ógbè Wayne, n’ime Steeti nke New York, na onye ọrụ-ubi nke nwere nsọpụrụ.

62 Site n’enyem-aka nke a bịara n’oge kwesịrị ekwesị a gbaram ume irute n’ebe m na-aga na Pennsylvania; na ozugbo m rutesịrị ebe ahụ a malitere m idefe mkpụrụ akwụkwọ nile ahụ site n’elu epekele nile ahụ. Edefere m onu-ọgụgụ ha ebe ọ dị ukwuu, site kwa n’usoro nke Urim na Tumim ahụ a tụgharịrị m ụfọdụ n’ime ha, nke m mere n’agbata oge ahụ m rutere n’ụlọ nke nna nwunye m, n’ọnwa Disemba, na nke Februarị na-eso.

63 Otu oge n’ime ọnwa a nke Februarị, onye ahụ akpọtụrụ aha bụ Maazi Martin Harris bịara n’ebe anyị, were mkpụrụ akwụkwọ ndị ahụ nke m seworo site n’epekele nile ahụ, gawa kwa n’ime nnukwu obodo nke New York. Maka ihe mere gbasara ya na mkpụrụ akwụkwọ ndị ahụ, a na m atụnyere nkọwasị nke ya maka ọnọdụ nile, dịka o kọgharịrị ha nye m mgbe ọ lọtasịrị, nke bụ dịka nke na-eso:

64 “A gara m na nnukwu obodo nke New York, gosi kwa Professor Charles Anthon, otu nwoke dị nwayọọ onye a maara nke ọma maka ogo mmụta ya nile, mkpụrụ akwụkwọ ahụ nke a tugharịworo asụsụ ha na ntụgharị asụsụ ya kwa. Professor Anthon kwuru na ntụgharị asụsụ ahụ ziri ezi, karịa kwa nke ọbụla ọ hụworo mbụ a tụgharịrị site na nke ndị Ijipt. Mgbe ahụ m wee gosi ya ndị ahụ nke na-atụgharibeghị asụsụ ha, o wee sị na ha bụụrụ nke Ijipt, nke Kaldaik, nke Asirịa, na nke Arab; ọ sịkwara na ha bụ mkpụrụ akwụkwọ n’ezie. O nyere m asambodo, imesi-ike nye ndị Palmyra na ha bụ mkpụrụ akwụkwọ n’ezie, na kwa ntụgharị asụsụ nke ha ndị atụgharịworo ziri-ezi. M wee were asambodo ahụ tinye n’ime akpa uwe m, na ana m asị ka m pụọ site n’ụlọ ahụ, mgbe Maazi Anthon kpọghachiri m azụ, jụọ kwa m otu nwa okorọbịa ahụ siri mara na e nwere epekele-ọla-edo nile n’ebe ọ chọtara ha. Azara m na mụọ-ozi nke Chineke kpughere ya nye ya.

65 “Mgbe ahụ o wee sị m, ’ka m hụ asambodo ahụ’. M wepụta ya site n’akpa m nye ya dịka kwa o kwuru, mgbe o weere ya dọkasịkwa ya irighiri na-asị n’onweghị ihe dị otu ahụ dịka nkwusa nke ndị mụọ-ozi, na ọ bụrụ na m ga-eweta epekele nile ahụ nye ya na ya ga-atụgharị asụsụ ha. M wee gwa ya na a rachiri mpaghara epekele ahụ nile arachi, na egbochikwara m i were ha bịa. O wee zaghachi, ’Enweghị m ike ịgụ akwụkwọ a rachiri arachi.’ Ahapụrụ m ya gakwuru Dr. Mitchell, onye mesiri ihe Professor Anthon kwuworo ike gbasara mkpụrụ akwụkwọ nile ahụ na ntụgharị asụsụ ha.”

· · · · · · ·

Oliver Cowdery e jee-ozi dịka ode-akwụkwọ na-ịtụgharị asụsụ Akwụkwọ nke Mọmọn—Joseph na Oliver anata Ọkwa Nchụ-aja nke Erọn site n’aka Jọn O Me Baptism—Ha emee baptism, e chie ha echichi, ha anatakwa mụọ nke ibu amụma. (Ama-okwu nile 66–75.)

66 N’ụbọchị nke 5 nke Epril, 1829, Oliver Cowdery bịara n’ụlọ m, ruo n’oge nke ahụ a hụbeghị m ya rịị anya. O wee gwa m na n’ihi na ọ na-akụzi n’ụlọ-akwụkwọ n’agbata-obi ebe ahụ nna m bị, n’ihi na nna m kwa bụ otu onye n’ime ndị na-ezita ụmụ ha na ụlọ-akwụkwọ ahụ, na ya gara ibiri maka oge nta n’ụlọ ya maka nlekọta anya, na mgbe ya nọ n’ebe ahụ, ezi na ụlọ ahụ kọọrọ ya ọnọdụ nile nke m jiri nata epekele nile ahụ, n’ihi ya kwa ka ọ bịaworo ịjụ ajụjụ n’aka m.

67 Ụbọchị abụọ mgbe Maazị Cowdery rutesịrị (nke bụ 7 Epril) a malitere m ịtụgharị-asụsụ Akwụkwọ nke Mọmọn, ọ malitekwara idere m ihe.

· · · · · · ·

68 Anyị gara n’iru n’ọrụ nke ntụgharị-asụsụ, mgbe, n’ime ọnwa nke na-eso (Mee, 1829), anyị n’otu ụbọchị gara n’ime ọhịa ikpe ekpere na ịjụ ajụjụ site n’aka Onye-nwe gbasara baptism maka nsachapụ nke mmehie nile, nke anyị chọtara a kpọtụrụ ọnụ na ntụgharị asụsụ nke epekele nile ahụ. Mgbe anyị ka nọ n’ọrụ nke, ikpe ekpere na ịkpọku Onye-nwe, otu onye-ozi sitere n’elu-igwe rịdatara n’ime ìgwè-ojii nke ìhè, na mgbe o bikwasịrị aka ya abụọ n’elu isi anyị, o chiri anyị echichi, na-asị:

69 N’elu unu ndị odibo ibe m, site n’aha nke Mesaịa, ka m na-enyefe Ọkwa Nchụ-aja nke Erọn, nke ji ọtụghe-ụzọ nile nke nkwusa ozi-ọma nke ndị mụọ-ozi na nke ozi-ọma nke nchegharị, na nke ime-baptism site na-imikpu n’ime mmiri maka nsachapụ nke mmehie nile; na nke a enweghị mgbe a ga-ewepụ ya ọzọ site n’ụwa, rue mgbe ụmụ ndịkom nke Livaị ga-enye Onye-nwe onyinye ọzọ n’ezi-omume.

70 O wee sị n’Ọkwa Onye Nchụ-aja nke a enweghị ike nke ibikwasị aka n’isi maka onyinye nke Mụọ Nsọ, kama na a ga-enyefe nke a n’elu anyị ma emesịa; o wee nyekwa anyị iwu ka anyị gaa mee baptism, nye kwa anyị ntụzi-aka na m ga-eme Oliver Cowdery baptism, na kwa emesịa ọ ga-eme m baptism.

71 Dịka nke a anyị gara mee kwa baptism. Emere m ya baptism mbụ, emesịa kwa ya emee m baptism—mgbe emesịrị nke a ebịakwasịrị m ya aka n’isi chie kwa ya echichi nye Ọkwa Nchụ-aja nke Erọn, na emesịa ya ebịakwasị aka ya abụọ n’isi m chie kwa m echichi nye otu Ọkwa Nchụ-aja ahụ—n’ihi n’otu a ka e nyere anyị iwu.*

72 Onye-ozi ahụ nke letara anyị n’oge a nyefekwara Ọkwa Nchụ-aja nke a n’elu anyị, kwuru na aha ya bụụrụ Jọn, onye ahụ kwa nke akpọrọ Jọn O Me Baptism n’ime Testament Ọhụrụ, na o mere omume n’okpuru ntụzi-aka nke Pịta, Jemes na Jọn, ndị ji ọtụghe-ụzọ nile nke Ọkwa Nchụ-aja nke Melkizedek, nke bụ Ọkwa Nchụ-aja, nke o kwuru, na a ga-enyefe n’elu anyị n’oge nke kwesịrị, na-aga akpọ kwa m Okenye nke mbụ nke Nzukọ-nsọ, na ya (Oliver Cowdery) Okenye nke abụọ. Ọ bụụrụ n’ụbọchị nke iri na ise nke Mee, 1829, na e chiri anyị echichi n’okpuru aka nke onye-ozi a, mee kwa baptism.

73 Ngwa ngwa na nrịgopụta anyị site n’ime mmiri mgbe anyị mesịrị baptism, anyị nwetara nnukwu na ngọzi nile dị otuto site n’aka Nna anyị nke Elu-igwe. Oteghị anya m mesịrị Oliver Cowdery baptism, na Mụọ Nsọ dakwasịrị ya, o wee guzo ọtọ buo kwa amụma ọtụtụ ihe nke na-ahaghị ịbịa na mmezu nso nso a. Na ọzọ ngwa ngwa o mesịrị m baptism, enwekwara m mụọ nke ibu-amụma, mgbe m na-eguzo ọtọ, mbilite nke Nzukọ-nsọ a, na ọtụtụ ihe ndị ọzọ nile ha na Nzukọ-nsọ jikọtara, na ọgbọ nke a nke ụmụ nke mmadụ. Anyị jupụtara na Mụọ Nsọ, na n̄ụrịrị ọn̄ụ n’ime Chineke nke nzọpụta anyị.

74 N’ihi na a gbawo ama nye uche anyị nile, anyị malitere inwe akwụkwọ-nsọ nile ka e ghebere ha oghe nye nghọta anyị nile, na ezi mpụtara ha na ebum n’obi nke ebe ọgụgụ ha nile ka n’ihe omimi nile ka e kpughere nye anyị n’ụdị nke anyị na-agaraghị erute ogo ya na mbụ ma-ọbụ chewo na mbụ maka ya. N’oge a anyị nwere nkwagide idebe na nzuzo ọnọdụ nile nke ịnata Ọkwa Nchụ-aja na baptism nke anyị meworo n’ihi mụọ nke mkpagbu nke na-egosipụtaworị onwe ya n’ime agbata-obi ahụ.

75 E jiworị ịgba aghara yie anyị egwu, site n’oge ruo n’oge, na nke a kwa site n’aka ndị nkwupụta nile nke okpukpechi. Nzube nile ha nke imeso anyị ọgba-aghara bụ nanị ike na-esi n’ime arụ ọrụ nke ezi na ụlọ nna nwunye m megidere ha (n’okpuru inye-aka nke Chineke) ndị na-aghọwo ndị ezigbo enyi nye m, na ndị megidere ịgba aghara, dịkwaara na njikere na e kwesịrị ikwe ka m gaa n’iru n’ọrụ nke ntụgharị asụsụ na-enweghi nkwubido, ya mekwara ha nyere na kwe anyị nkwa nchekwa site na mmegide nile na-enweghị nkwado nke iwu ruo ka ha nwere ike.

  • Oliver Cowdery na-akọwa ihe nile ndị a mere eme otu a: “Ndị a bụ ụbọchị ndị na-enweghị nchefu-inọrọ-ala n’okpuru ụda nke olu-okwu a kpọpụtara site na nkwalite nke elu-igwe, kpọteworo afọ ojuju nke kachasị nke obi nke a! Kwa ụbọchị kwa ụbọchị agara m n’iru, na-enweghị nkwubido, ide site n’ọnụ ya, dịka ọ na-atụgharị asụsụ jiri Urim na Tumim, ma-ọbụ dịka ndị Nifaị gaara ekwu, ’Ndị Nsụgharị asụsụ,’ akụkọ ahụ ma-ọbụ akụkọ ndekọta ahụ a kpọrọ Akwụkwọ nke Mọmọn.

    “Ịkpọtụ ọbụna na mkpụrụ okwu ole na ole, nkọwasị dị mmasị nke Mọmọn na nwa ya nwoke kwesịrị ntụkwasị-obi, Moronaị nyere, banyere otu ndị mmadụ ndị n’otu mgbe elu-igwe hụrụ n’anya na nwekwara iru-ọma n’ebe ha nọ ga-akarị ihe m chọrọ ime n’oge nke a; ya-mere, aga m ebugharị nke a ruo oge dị n’iru, na dịka m kwuru n’ime ime-ka-a-mara, gaa n’iru n’ide kpọm kwem ụfọdụ ihe mere eme ole na ole ya na mbilite nke Nzukọ-nsọ a jikọrọ ọnụ nso nso, ndị nwere ike ikwe nnabata n’obi nye ụfọdụ puku ndị na-azọpụwo ije n’iru, n’etiti mgbarụ iru nke ndị na-arọ otu na ndị na-ebo ebubo asị nke ndị iru-abụọ, ma makuo Ozi-ọma nke Kraịst ahụ.

    “Ọdịghị mmadụ ọbụla, nọ n’uche ha zuru oke, nwere ike ịtụgharị asụsụ na ide ntụzi-aka nile e nyere ndị Nifaị site n’ọnụ nke Onye-nzọpụta, nke usoro kpọm kwem ndị mmadụ ga esi wulite Nzukọ-nsọ Ya, nke ka kwa nke mgbe inwe obi ọjọọ gbasaworo enweghị olile-anya n’ofe udị nile na usoro nile a na-eme n’etiti ndị mmadụ, na-anaghị achọ ohere nke igosi ịdị na njikere nke obi site na-ịbụ ndị e liri n’ime ili nke mmiri, iji za aziza nke ezi mụọ site na mbilite n’ọnwụ nke Jisus Kraịst.’

    “Mgbe e desịrị nkọwasị e nyere banyere ije-ozị nke Onye-nzọpụta nye ndị fọdụrụ na mkpụrụ-afọ nke Jekọb, n’elu kọntinenti nke a, ọ dịịrị anyị mfe ịhụ, dịka onye amụma kwuru na o gaara adị, na ọchịchịrị kpuchiri ụwa na oke ọchịchịrị kpuchiri uche nile nke ndị mmadụ ahụ. N’ịlaghachi azụ n’uche ọzọ ọ diiri mfe anyị ịhụ na n’etiti oke esem-okwu ahụ na mkpọtụ gbasara okpukpechi, ọdịghị onye ọbụla jidere ikike sitere na Chineke ilekọta emume-nsọ nile nke Ozi-ọma. N’ihi na e nwere ike ijụ ajụjụ ahụ, ndị mmadụ ha ji ikike ahụ n’aha nke Kraịst, ndị na-agọnarị mkpughe nile, mgbe Igba-ama nke ya na-adịghị nta karịa mụọ nke ibu-amụma, okpukpechi Ya kwa dabeere, e wukwara ya, na kwado kwa ya site na mkpughe iru n’iru, na ọgbọ nile nke ụwa mgbe ọbụla o nweworo ndị mmadụ n’elu ụwa? Ọ bụrụ na ezi-okwu ndị a ka e liri, jiri kwa mkpachapụ-anya nke mmadụ zoo ha ndị ọrụ ha gaara anọ na nsogbu nke ịchọpụta ya ma ọbụrụ na ekwere ka ihe ahụ chaa n’iru nile nke ndị mmadụ, ha e zoghị kwa ezo ọzọ nye anyị, anyị cheere nanị ka enye iwu-nsọ ahụ ’Bilie ka e mee kwa unu baptism.’

    “Nke a eteghị anya anyị chọrọ ya tutu e mezuo ya. Onye-nwe onye bara ụba n’ebere, dịkwa na njikere mgbe ọbụla ịza ekpere ịnọgide sị ike nke onye dị umeala, mgbe anyị kpọkuwosịrị ya ike, n’ebe dị iche site n’ebe ndị mmadụ bi, ọ nakweere ime ka uche-obi ya pụta ìhè nye anyị. Na mberede dịka site n’etiti nke ebighi-ebi, olu-okwu nke Onye-mgbapụta kwuru udo nye anyị, ebe ihe mkpuchi dọwara ma mụọ-ozi nke Chineke gbadatara yiri uwe nke ebube, ma nyefee ozi ahụ nke anyị ji mkpalite nke uche na-ele anya ya, na ọtụghe-ụzọ nile nke Ozi-ọma nke nchegharị. Olee ọn̄ụ! Olee ihe iju-anya! Olee oke ihe ịtụnanya! Mgbe ụwa nọ n’oke ntaram ahụhụ na na-iwepụ uche ya—mgbe ọtụtụ nde mmadụ na-achọ ahụ ụlọ dịka ndị ìsì, na mgbe ndị mmadụ nile na-adabere n’elu amaghị nke a ga-eme, dịka otu ìgwè nke ọha, anya anyị nile ahụwo, nti anyị nile anụwo, dịka na mmụke ìhè nke ehihie; e, mụkee-karia mmụke ìhè nke anyanwụ nke ọnwa Mee, nke tufuru mmuke ya mgbe ahụ n’ofe iru nke ọnọdụ udị okike. Mgbe ahụ olu-okwu ya, ọbụna n’ọdị nwayọọ, dupuru ruo n’etiti, okwu ya nile kwa, ’Abụ m onye odibo ibe unu, chụpụrụ égwù ọbụla. Anyị gere nti, anyị legidere anya, anyị lere anya n’afọ ojuju! Ọ bụ olu-okwu nke onye mụọ-ozi sitere n’ebube, ọ bụ ozi sitere n’Onye kachasị Elu! Na mgbe anyị nụrụ ya anyị n̄ụrịrị ọn̄ụ, ebe ịhụnanya ya nwukwaara ọkụ n’ime mkpụrụ obi anyị, e wee fụchie kwa anyị n’ime ọ́hụ̀ nke Onye Pụrụ Ime Ihe nile! Olee ebe e nwere ohere maka ịsụ ngọngọ? Ọ dịghị ebe ọbụla; amaghị nke a ga-eme agbafuwo, ịsụ ngọ ngọ e mikpuwo ma-gaghị ebili ọzọ, ebe akụkọ na e meghị eme na nduhie agbafuwo ruo mgbe nile!

    “Kama, nwanne m nwoke nke m hụrụ n’anya, chee echiche, chemie echiche maka nwa mgbe nta, ụdị ọn̄ụ jupụtara obi anyị nile, na ụdị ịtụnanya anyị jirịrị hulata ala, (n’ihi olee onye na-agaraghị egbu ikpere n’ala maka ụdị ngọzi nke ahu?) mgbe anyị natara n’okpuru aka ya Ọkwa Nchụ-aja ahụ Dị Nsọ dịka o kwuru, ’N’elu unu ndị odibo ibe m, site ’aha nke Mesaịa, ka m na-enyefe Ọkwa Nchụ-aja nke a na ikike nke a, nke ga afọdụ n’elu ụwa, ka ụmụ ndịkom nke Livaị nwe ike kwa nye Onye-nwe onyinye n’ezi-omume!’

    “A gaghị m anwa ịkoro gị akụkọ mmetụta nile nke obi nke a, ma-ọbụ kwa nụ ụdị ịdị mma eze nke na ebube nke gbara anyị gburu gburu n’oge nke a; mana ị ga-ekwere m mgbe m na-asị, n’ụwa, ma-ọbụ ndị mmadụ jiri nkwuwa-okwu nke oge, e nweghị ike ịmalite iyiwe asụsụ uwe n’ụzọ dị mmasị dị elu dịka Onye a dị nsọ. E, e; ma ọbụghị na ụwa o nwere ike inye ọn̄ụ, iji nyefee udo ahụ, ma-ọbụ ghọta amamihe ahụ nke dị n’ime ahịrị okwu ọbụla dịka e nyefere ha site n’ike nke Mụọ Nsọ! Mmadụ nwere ike iduhie mmadụ-ibe ya, nduhie nwere ike isochi nduhie, na ụmụ nke onye ọjọọ ahụ nwere ike nwee ike ịrafu onye nzuzu na onye na-akụzirighị—ihe ruo mgbe na-ọdịghị ihe ọbụla ma ọbụghị akụkọ na-emeghị eme juru ha afọ ọtụtụ ha, ma mkpụrụ nke okwu-ụgha eburu ndị nzuzu na agarube ruo n’ili, mana otu mmetụ aka nke mkpịsị-aka nke ịhụnanya ya, e, otu mmụke nke ebube sitere n’ụwa nke ka dị elu ma-ọbụ otu okwu sitere n’ọnụ nke Onye-nzọpụta, site n’obi nke ebighi-ebi, na-akụri ha nile ịbụ ihe na-apụtaghị kwa ìhè, hichapụ kwa ya site n’uche ruo mgbe nile. Nchekwube ahụ na anyị nọọrọ n’iru nke onye mụọ-ozi, ezi-okwu ahụ n’anyị nụrụ olu-okwu nke Jisus, na ezi-okwu ahụ na-emetọghị emetọ dịka ọ na asọpụta site n’onye na-enweghị ntụpọ, ekwupụtara site n’uche obi nke Chineke, bụ ihe gafere nkọwa nke ọma nye m na aga m elekwasị anya mgbe nile na nkọwa nke a nke ịdị mma nke Onye-nzọpụta jiri oke iju-anya na inye-ekele mgbe nile e kwere m ka m dị ndụ; na n’ime ebe obibi ndị ahụ nile ebe izu-oke na-ebi na ebe mmehie na-anaghị abịa, ka m nwere olileanya ife ofufe n’ụbọchị ahụ nke na-agaghị akwụsị.” —Messenger and Advocate, vol. 1 (October 1834), pp. 14–16.