Akwụkwọ nsọ
Alma 2


Isi 2

Amlịsaị wee chọọ ịbụ eze ma a jụrụ ya site n’olu nke ndị ahụ—Ndị na-eso ya wee mee ya eze—Ndị Amlịsaị wee lụso ndị Nifaị ọgụ ma e meriri ha—Ndị Leman na ndị Amlịsaị wee jikọta ndị ọgụ ha nile ma e meriri ha—Alma wee gbuo Amlịsaị. Ihe dịka n’afọ 87 tutu amụọ Kraịst.

1 Ma o wee ruo n’ime afọ nke ise nke ọchịchị ha, a malitere inwe ndọrọ-ndọrọ n’etiti ndị ahụ; n’ihi na otu nwoke, a na-akpọ Amlịsaị, ebe ọ bụ onye oke aghụghọ, e, onye amamihe dịka na amamihe nke ụwa, ya ebe ọ dị n’usoro nke nwoke ahụ nke gburu aGịdiọn site na mma agha, onye nke e gburu dịka iwu ahụ siri dị—

2 Ugbua Amlịsaị a, site n’aghụghọ ya, dọkpụrụ ọtụtụ ndị mmadụ nye onwe ya; ọbụna dị oke ukwuu nke mere na ha malitere isi nnukwu ike; ma ha malitere ịgba mbọ ihiwe Amlịsaị ka ọbụrụ eze nye ndị ahụ.

3 Ugbua nke a bụ ihe dị egwu nye ndị nke nzukọ-nsọ ahụ, na kwa nye ndị nile a na adọkpụpụbeghị site n’ọtụtụ okwu ime ka mmadụ kwenye nke Amlịsaị; n’ihi na ha matara na dịka iwu ha siri dị na ụdị ihe ndị a ka a ga-ehiwerịrị site an’olu nke ndị ahụ.

4 Ya mere, ọbụrụ na ọ ga-ekwe mee na Amlịsaị ga-enweta olu nke ndị ahụ, ya, ebe ọ buworo onye ajọọ-omume, aga-anabi ha ihe nile ruru ha na ohere nile nke nzukọ-nsọ ahụ; n’ihi na ọ bụ uche obi ya ibibi nzukọ-nsọ nke Chineke ahụ.

5 Ma o wee ruo na ndị ahụ kpọkọtara onwe ha ọnụ nʼakụkụ ala ahụ nile, onye ọbụla dịka uche ya siri dị, ma ọ dịnyere ma-ọbụ o megidere Amlịsaị, n’otu dị iche iche, na-enwe nnukwu ịrụ ụka na andọrọ-ndọrọ dị ebube otu onye na ibe ya.

6 Ma otu a ha na-akpọkọta onwe ha ọnụ ịtụnye olu ha nile gbasara okwu ahụ; ma e debere ha n’iru ndị-ikpe ahụ.

7 Ma o wee ruo na olu nke ndị ahụ bịara megide Amlịsaị, mere na e meghị ya eze nke ndị ahụ.

8 Ugbua nke a wetara nnukwu ọn̄ụ n’obi nile nke ndị na-emegide ya; ma na Amlịsaị kpalitere ndị ahụ na akwado ya iwe oke iwe megide ndị na-anaghị akwado ya.

9 Ma o wee ruo na ha chịkọtara onwe ha ọnụ, ma doo Amlịsaị nsọ ka ọ bụrụ eze ha.

10 Ugbua mgbe e mere Amlịsaị eze nye ha o nyere ha iwu na ha ga-ewelite ngwa agha ha nile megide ụmụnne ha nwoke; ma nke a ka o mere ka o wee manye ha nye onwe ya.

11 Ugbua ndị nke Amlịsaị ka e gosịrị na ha dị iche site n’aha nke Amlịsaị, ebe a na-akpọ ha andị Amlịsaị; ma ndị fọdụrụ ka a kpọrọ bndị Nifaị, ma-ọbụ ndị nke Chineke.

12 Ya mere ndị nke Nifaị matara maka nzube nke ndị Amlịsaị, ma ya mere ha jikeere izute ha; e, ha jikeere onwe ha jiri mma agha nile, ma jiri mma agha rọrọ arọ, ma jiri ụta nile, ma jiri arọ nile, ma jiri okwute, ma jiri ébè nile, ma jiri ụdị angwa-ọgụ nile nke agha dị iche iche.

13 Ma otu a ha dị na njikere izute ndị Amlịsaị n’oge nke ha na-abịa. Ma e nyere ha ọkwa ndị ọchị-agha, na ndị ọchị-agha dị elu, na ndị-isi ọchị-agha, dịka ọnụ-ọgụgụ ha siri dị.

14 Ma o wee ruo na Amlịsaị nyere ndị ya ụdị ngwa-ọgụ nile nke agha dị iche iche n’ụdị ọbụla; ma ọ họpụtakwara ndị ọchịchị nile na ndị ndu nile nye ndị ya, idu ha gaa ọgụ megide ụmụnne ha nwoke.

15 Ma o wee ruo na ndị Amlịsaị bịara n’elu ugwu Amnaịhu, nke dị n’ọwụwa-anyanwụ nke aosimiri Saịdọn, nke gafere n’akụkụ bala nke Zarahemla, ma n’ebe ahụ ha malitere ịkpasu ọgụ ha na ndị Nifaị.

16 Ugbua Alma, ebe ọ bụ aonye-isi-ikpe na onye-ọchịchị ndị Nifaị, ya mere ọ galitere ya na ndị ya, e, ya na ndị ọchị-agha ya, na ndị-isi ọchị-agha, e, n’isi nke ndị-agha ya nile megide ndị Amlịsaị n’agha.

17 Ma ha malitere igbu ndị Amlịsaị n’elu ugwu owụwa-anyanwụ nke Saịdọn. Ma ndị Amlịsaị nwere ndọrọ-ndọrọ ha na ndị Nifaị na nnukwu ume, nke mere na ọtụtụ ndị Nifaị dara n’iru ndị Amlịsaị.

18 Otu o sila dị Onye-nwe nyere aka nke ndị Nifaị ume, nke mere na ha gburu ndị Amlịsaị n’oke ogbugbu, nke mere na ha malitere ịgbalaga n’iru ha.

19 Ma o wee ruo na ndị Nifaị chụrụ ndị Amlịsaị ọsọ ụbọchị ahụ nile, ma gbuo ha n’oke ogbugbu, nke mere na e agburu na ndị Amlịsaị puku iri na abụọ narị ise iri atọ na mkpụrụ-obi abụọ; ma e gburu na ndị Nifaị puku isii narị ise iri isii na mkpụrụ-obi abụọ.

20 Ma o wee ruo na mgbe Alma na-enweghị kwa ike ịchụ ndị Amlịsaị ọzọ o mere ka ndị ya rụnye ụlọ-ikwụu ha nile na andagwụrụgwụ nke Gịdiọn, ndagwụrụgwụ ahụ ebe a kpọrọ ya aha nke Gịdiọn ahụ onye e gburu site n’aka nke bNiho na mma agha; ma n’ime ndagwụrụgwụ a ndị Nifaị rụnyere ụlọ-ịkwuu ha nile maka abalị ahụ.

21 Ma Alma zigara ndị onyota-ọgba-ama ka ha soro ndị fọdụrụ na ndị Amlịsaị, ka o wee mata maka atụmatụ ha nile na usoro akụkọ ha nile, nke ga-eme ka o chee onwe ya nche maka ha, ka o wee chekwa ndị ya site na mbibi.

22 Ugbua ndị ahụ o zipụworo iche ebe izu-ike ndị-agha nke ndị Amlịsaị nche ka a kpọrọ Zirọm, na Amnọ, na Mantaị, na Lịmha; ndị a bụ ndị pụrụ ha na ndị nwoke ha iche ebe izu-ike ndị-agha nke ndị Amlịsaị nche.

23 Ma o wee ruo na n’echi ya ha laghachịrị n’ime ebe izu-ike nke ndị Nifaị na nnukwu ọsọ-ọsọ, ebe ha nwere nnukwu ihe ịtụ n’anya, ma jupụta n’egwu, na-asị:

24 Lee, anyị soro ebe izu-ike nke andị Amlịsaị, ma na nnukwu ịtụ n’anya nye anyị, n’ala Maịnọn, dị n’elu ala nke Zarahemla, n’ụzọ e si eje ala nke bNifaị, anyị hụrụ ọtụtụ igwe ndị nke Leman; ma lee, ndị Amlịsaị esorowo ha;

25 Ma ha nọkwasịrị ụmụnne anyị nwoke n’ala ahụ; ma ha na-agbalaga n’iru ha kpọrọ igwe anụ ha, na ndị nwunye ha, na ụmụ ha, chee iru n’obodo-ukwu anyị; ma ma ọbụghị ma anyị mere ngwa-ngwa ha ga-enweta onwunwe nke obodo-ukwu anyị, na ndị nna anyị, na ndị nwunye anyị, ma e gbuo ụmụ anyị.

26 Ma o wee ruo na ndị nke Nifaị weere ụlọ-ịkwuu ha nile, ma pụọ site na ndagwụrụgwụ nke Gịdiọn chee iru n’obodo-ukwu ha, nke bụ obodo-ukwu nke aZarahemla.

27 Ma lee, dịka ha na-agafee osimiri Saịdọn, ndị Leman na ndị Amlịsaị, ebe ha dị aọtụtụ n’ọnụ ọgụgụ fọdụ ntakịrị, dịka o siri dị, ka aja nile nke osimiri nta, bịakwasịrị ha ibibi ha.

28 Otu o sila dị, ndị Nifaị ebe ha nwetara aume site n’aka nke Onye-nwe, ebe ha kpesịworo ekpere ike nye ya ka o napụta ha site n’aka nile nke ndị iro ha nile, ya mere Onye-nwe nụrụ akwa ha nile, ma nye ha ume, ma ndị Leman na ndị Amlịsaị dara n’iru ha.

29 Ma o wee ruo na Alma lụsoro Amlịsaị ọgụ jiri mma agha, n’iru n’iru; ma ha dọsiri ndọrọ-ndọrọ ike, otu na ibe ya.

30 Ma o wee ruo na Alma, ebe ọ bụ onye nke Chineke, ebe a kpalitere ya site na nnukwu aokwukwe, tiri mkpu, na-asị: O Onye-nwe, mee ebere ma debe ndụ m, ka m wee bụrụ ngwa-ọrụ n’aka Gị abụọ, ịzọpụta ma chekwaa ndị a.

31 Ugbua mgbe Alma kwuworo okwu ndị a ọ lụrụ ọgụ ọzọ ya na Amlịsaị; ma e nyere ya ume, nke mere na o gburu Amlịsaị site na mma-agha.

32 Ma ọ lụsokwara eze nke ndị Leman ọgụ; ma na eze ndị Leman gbaghachịrị azụ site n’iru Alma ma ziga ndị nche ya ka ha na Alma lụọ ọgụ.

33 Mana Alma, ya na ndị nche ya, lụrụ ọgụ ya na ndị nche nile nke eze nke ndị Leman ahụ wee ruo mgbe o gburu ma chụghachị ha azụ.

34 Ma otu a o kpochasịrị ala ahụ, ma-ọbụ n’ụdị ọzọ akụkụ mmiri ahụ, nke dị n’ọdịda-anyanwụ nke osimiri Saịdọn, na-atụba arụ nile nke ndị Leman ndị e gbuworo n’ime mmiri nke Saịdọn, na site na nke a ndị ya ga-enwe ụzọ ịgafee ma lụọ ọgụ ha na ndị Leman na ndị Amlịsaị n’akụkụ ọdịda anyanwụ nke osimiri Saịdọn.

35 Ma o wee ruo na mgbe ha nile gafeworo osimiri Saịdọn ahụ na ndị Leman na ndị Amlịsaị malitere ịgbalaga site n’iru ha, na-agbanyeghị na ọnụ ọgụgụ ha dị imerime nke a na-enweghị ike ịgụta ha ọnụ.

36 Ma ha gbapụrụ nʼiru ndị Nifaị chee iru nʼọzara ahụ nke dị nʼọdịda-anyanwụ na nʼelu-elu, gafee gbada oke ala nile nke ala ahụ; ma ndị Nifaị chụrụ ha ọsọ jiri ike ha, ma gbuo ha.

37 E, e zutere ha n’akụkụ nile, ma gbuo ma chụghachị ha, wee ruo mgbe a chụsasịrị ha n’ọdịda-anyanwụ ahụ, na n’elu elu, wee ruo mgbe ha ruworo ọzara ahụ, nke a kpọrọ Hermounts; ma-ọbụ akụkụ ọzara ahụ nke jupụtara na anụ ọhịa na anụ ọhịa nile di egwụ.

38 Ma o wee ruo na ọtụtụ nwụrụ n’ime ọzara ahụ maka mmeru-arụ ha nile, ma anụ ọhịa ọjọ ndị ahụ erie ha na kwa udele nile nke ikuku; ma ọkpụkpụ ha nile ka a chọtaworo, ma akwakọtawo ha n’elu ala ahụ.