Akwụkwọ nsọ
2 Niphaị 28


Isi 28

Ọtụtụ nzukọ ụgha ka a ga ewulite n’ụbọchị ikpe azụ nile—Ha ga akụzi ozizi ụgha, na-abaghị-uru, na ozizi iberibe nile—Ngọnarị okwukwe ga-aba ụba n’ihi ndị nkuzi ụgha—Ekwensu ga akpali iwe ọkụ n’ime obi nke mmadụ—Ọ ga akụzi ụdi nkuzi okwukwe ụgha nile di iche iche. Ihe dịka n’afọ 559 ruo 545 tutu amụọ Kraịst.

1 Ma ugbua, lee, ụmụnne m nwoke, agwawo m unu okwu dịka Mụọ ahụ siri kwalite m; ya mere, a ma m na ha ga-emezurịrị.

2 Ma ihe ndị a ga-ede site n’ime aakwụkwọ ahụ ga-abụ ihe boke-ọnụ-ahịa nye ụmụ nke mmadụ, ma nke ka nke nye mkpụrụ-afọ nke anyị, nke bụ ndị fọdụrụ nke ụlọ nke Israel.

3 N’ihi na ọ ga-eru n’ụbọchị ahụ na anzukọ nile ewulitere, ma ha abụghị nke Onye-nwe, mgbe otu ga-asị ibe ya: Lee, mụ, a bụ m nke Onye-nwe; ma ndị ọzọ ga-asi: mụ, a bụ m nke Onye-nwe; ma otu a ka onye ọbụla ga-ekwu nke wuliteworo nzukọ, ma ọbụghị nke Onye-nwe—

4 Ma ha ga-adọ ndọrọ-ndọrọ otu na ibe ya; ma ndị nchụ-aja ha nile ga-adọ ndọrọ-ndọrọ otu na ibe ya, ma ha ga-akụzi site na ammụta nke ha, ma gọnarị Mụọ Nsọ, nke na-enye ọnụ okwu.

5 Ma ha aga-agọnarị bike nke Chineke, Onye-Nsọ nke Israel; ma ha ga-agwa ndị mmadụ: N̄aa anyị ntị, ma nụrụ ozizi anyị; n’ihi na lee cọdịghị Chineke nọ taa, n’ihi na Onye-nwe na Onye-mgbapụta arụwo ọrụ ya, ma o werewo ike ya nye mmadụ;

6 Lee, n̄aanụ ntị n’ozizi m; ọbụrụ na ha ga-asị na o nwere ọrụ ebube arụrụ site n’aka nke Onye-nwe, ekwekwala ya; n’ihi na ụbọchị taa ọ bụghị Chineke nke aọrụ ebube ndị a; ọ rụsịwo ọrụ ya.

7 E, ma a ga-enwe ọtụtụ ndị ga-asị: aRie, n̄ụọ, ma nwee obi ụtọ, n’ihi na echi anyị anwụọ; ma ọ ga-adịrị anyị mma.

8 Ma a ga-enwe kwa ọtụtụ ndị ga-asị: Rie, n̄ụọ, ma nwe obi ụtọ; otu o sila dị, tụọ egwu Chineke—ọ aga-enye ohere imetụ mmehie ntakiri; e, kwuo ntakịrị bokwu ụgha, meere onwe gị uru n’ihi okwu sitere n’ọnụ otu onye pụta; gwuoro onye-agbata-obi-gị colulu; ọdịghị ihe ọjọọ dị n’ime nke a; ma mee ihe ndị a nile, n’ihi na echi ya anyị ga-anwụ; ma ọbụna dị na ikpe mara anyị, Chineke ga apịa anyị ọnụ ụtarị ole na ole, ma emesịa a ga-azọpụta anyị n’ala-eze Chineke.

9 E, ma a ga-enwe ọtụtụ ndị ga-akụzi n’ụdị dị otu a, aozizi ụgha na abaghị-uru na ozizi biberibe nile, ma ha ga-afuli-elu n’ime obi ha nile, ma ha ga-achọ ebe dị omimi ha ga-ezonarị Onye-nwe ndụmọdụ ha nile; ma ọrụ ha nile ga-abụ n’ọchịchịrị.

10 Ma aọbara nke ndị nsọ nile ga-ebe akwa site n’ime ala megide ha.

11 E, ha nile esịwo an’ụzọ pụọ; ha abụwo ndị bruru inyi.

12 N’ihi ampako, na n’ihi ndị nkuzi ụgha nile, na ozizi okwukwe ụgha, nzukọ ha nile abụrụwo ihe ruru inyi, ma nzukọ ha nile abụrụwo ihe eweliri-elu; n’ihi mpako ha afụliwo onwe ha elu.

13 Ha ana-apụnara bndị ogbenye ihe ha nwere n’ihi ọmarịcha ebe nsọ ha nile; ha na-apụnara ndị ogbenye ihe ha nwere n’ihi ọmarịcha uwe ha na-eyi; ma ha na-esogbu ndị dị nwayo na ndị dị ogbenye n’obi, n’ihi n’ime cmpako ha, ha na afụli elu.

14 Ha na-eyiri aịkpọ-ekwe-nkụ na ibuli-isi-elu; e, ma n’ihi mpako, na ajọọ-omume, na ihe arụ nile, na akwụnakwụna nile, ha nile bejehiewo ma ọbụghị ole na ole, bụ ndị obi umeala na-eso ụzọ Kraịst; otu o sila dị, a na-edu ha edu, nke mere na ọtụtụ mgbe ha na-emehie n’ihi na a na-akụziri ha site n’ozizi nile nke mmadụ.

15 O ndị aamamihe, na ndị nwere mmụta, na ndị bara ụba, ndị nke na-afuli onwe ha elu n’ime bmpako nke obi ha nile, na ndị nile na-ekwusa ozizi ụgha nile, na ndị nile na-agba akwụnakwụna, ma na-ejehie ezigbo ụzọ nke Onye-nwe, cahụhụ, ahụhụ, ahụhụ dịrị ha, ka Onye-nwe Chineke Pụrụ Ime Ihe nile kwuru, n’ihi na a ga-enuda ha n’ala mụọ!

16 Ahụhụ na-adịrị ha bụ ndị ana-edebe n’akụkụ onye-ezi-omume n’ihi ihe efu ma na-akọcha nkọcha megide ihe di mma, ma sị na ọ baghị uru! N’ihi na ụbọchị ga-abia na Onye-nwe Chineke ga-abịa ngwa-ngwa ileta ndị nile bi n’ụwa; ma n’ụbọchị ahụ mgbe ha bga-achazuwo n’ajọọ-omume ha ga-ala-n’iyi.

17 Mana lee, ọbụrụ na ndị bi n’ụwa ga-echegharị site n’ajọọ-omume ha na ihe arụ nile, agaghị ebibi ha, ka Onye-nwe nke usuu nile nke ndị-agha kwuru.

18 Mana lee, nnukwu nzukọ nke ihe arụ ahụ, nke bụ aakwụnakwụna nke ụwa nile, bga-atụgharị daa n’ala, ma nnukwu ka ọdịda ya ahụ ga-adị.

19 N’ihi na ala-eze nke ekwensu aga-amarịrị jijiji, ma ndị bụ nke so na ya ọ ga-adịrịrị mkpa na a ga akpalite ha elu ruo na nchegharị, ma-ọbụ bekwensu ahụ ekedo ha cn’ụdọ igwe agịrịga mgbe nile na-adigide ya, ma ha abụrụ ndị akpasuru iwe, ma laa n’iyi;

20 N’ihi na lee, n’ụbọchị ahụ ka ọ ga akpalite aiwe ọkụ n’ime obi nile nke ụmụ nke mmadụ, ma palite ha n’iwe iwe ọkụ megide ihe ahụ nke dị mma.

21 Ma ndị ọzọ ka ọ ga-eme ka ha adajụọ, ma gụgụpụ ha mee ka ha nwe nchedo nke anụ arụ, na ha ga-asị: Ihe nile adịwo mma n’ime Zaịọn; e, Zaịọn na-eme nke ọma, ihe nile adịwo mma—ma otu a ka bekwensu si na-aghọgbu mkpụrụ-obi ha nile, ma jiri nwayọ na-eduga ha ịba n’ala mụọ.

22 Ma lee, ndị ọzọ ka ọ ga-ajafu, ma na-agwa ha na onweghị aala mụọ dị; ma ọ na-asị ha: a bụghị m ekwensu, n’ihi na ọ dịghị nke dị—ma otu a ka ọ na-agbanyere ha izuzu na nti ha nile, wee ruo mgbe ọ ga-ekedo ha bn’udọ igwe ya ahụ dị egwụ, site n’ebe nke ha na-enweghị nnapụta ọbụla.

23 E, a na-ekedo ha n’ọnwụ, n’ala mụọ; na ọnwụ, na n’ala mụọ, ma ekwensu ahụ na ndị nile o jideworo n’ime ya ga egụzọrịrị n’iru nke oche-eze Chineke, ma a aga-ekpe ha ikpe dịka ọrụ ha nile siri dị, n’ebe a ka ha ga-esi baa n’ime ebe ahụ a kwadobeere ha, ọbụna bọdọ ọkụ na nkume ọkụ, nke bụ ịta ahụhụ agwụgh-agwụ.

24 Ya mere, ahụhụ na-adịrị onye ahụ nke na-enwe obi ruru ala na Zaịọn!

25 Ahụhụ dịrị onye na-eti mkpu na-asị: Ihe nile adịwo mma!

26 E, ahụhụ dịrị ya bụ onye ahụ ana-an̄a-ntị n’ozizi nile nke ndị mmadụ, ma gọnarị ike nke Chineke, na onyinye nke Mụọ Nsọ!

27 E, ahụhụ dịrị ya bụ onye na-asị: Anyị anatawo, ma anyị aachọkwaghị ọzọ!

28 Ma na mkpirisi, ahụhụ na-adịrị ndị nile n’ama jijiji, ma aiwe na-ewe ha n’ihi ezi-okwu nke Chineke! N’ihi na lee, onye ọbụla nke ewuliteworo n’elu bnkume ahụ na-anata ya n’obi ụtọ; ma onye ọbụla nke ewuliteworo n’elu ntọ-ala aja na-ama jijiji ka ọ ghara ịda.

29 Ahụhụ dịrị ya bụ onye ga-asị: Anyị anatawo okwu Chineke, ma aanyị bachọkwaghị okwu Chineke ọzọ, n’ihi na anyị enwezuwo!

30 N’ihi na lee, otu a ka Onye-nwe Chineke kwuru: A ga m enye ụmụ nke mmadụ ahịrị n’elu ahịrị, aozizi n’elu ozizi, ntakịrị n’ebe a na ntakịrị ebe ahụ; ma ngọzi na-adịrị ndị na-an̄a ntị n’ozizi m nile, ma na-ege ntị na ndụmọdụ m, n’ihi na ha ga amụta bamamihe; n’ihi onye ahụ cna-anabata ka m ga-enye dkarịa; ma site n’aka ndị na-asị, Anyị enwetazuwo, site n’aka ha ka a ga-ewepụ ọbụnadị nke ha nwere enwe.

31 Onye abụrụ ọnụ ka ọ bụ bụ onye na-etinye antụkwasị obi ya n’ebe mmadụ nọ, ma-ọbụ na-eme anụ arụ ngwa-ọgụ ya, ma-ọbụ na-an̄a ntị n’ozizi nke ndị mmadụ, ma ọbụghị ma ozizi ha nile ga-abụ nke e nyere site n’ike nke Mụọ Nsọ.

32 aAhụhụ ga-adịrị ndị Jentaịlụ, ka Onye-nwe Chineke nke usuu nile nke ndị-agha kwuru! N’ihi na, na-agbanyeghị a ga m esetịpụ ogologo aka m n’ebe ha nọ site n’ụbọchị ruo n’ụbọchị, ha ga-agọnarị m; otu o sila dị, a ga m enwe obi ebere n’ebe ha nọ, ka Onye-nwe Chineke kwuru, ọ bụrụ na ha ga-echegharị ma bịakwute m; n’ihi na baka m esetịpụtawo ogologo ụbọchị nile, ka Onye-nwe Chineke nke usuu nile nke ndị-agha kwuru.