Akwụkwọ nsọ
2 Niphaị 8


Isi 8

N’ụbọchị ikpe-azụ nile, Onye-nwe ga-akasi Zaịọn obi ma chịkọta Israel—Ndị agbapụtara ga-abịa na Zaịọn n’etiti nnukwu ọn̄ụ—Tulee Aịsaịa 51; 52:1–2. Ihe dịka n’afọ 559 ruo 545 tutu amụọ Kraịst.

1 N̄aa m ntị, unu ndị na-eso ụzọ ezi-omume. Lekwasị anya na nkume ahụ e siri wapụta unu, na n’oghere nke olulu e siri gwupụta unu.

2 Lekwasị Abraham anya, bụ nna unu, na n’ebe Sera nọ, ya bụ onye-mụtara unu; n’ihi na a kpọrọ m nanị ya, ma gọzie ya.

3 N’ihi na Onye-nwe ga-akasi Zaịọn obi, ọ ga-akasi mkpomkpo ebe ya nile obi; ma ọ ga-eme ka ọzara ya dị ka Iden, ma ọzara ya dị ka ubi nke Onye-nwe. Ọn̄ụ na obi ụtọ ka a ga-ahụ n’ime ya, inye-ekele na olu nke ụda abụ.

4 N̄aanụ m ntị, ndị m; ma gee m ntị, O mba nke m; n’ihi na iwu ga-esi n’ebe m nọ pụta, ma a ga m eme ikpe m ka ọ na-anọdụ dịka ìhè nye ndị mmadụ.

5 Ezi-omume m dị nso; nzọpụta m na-aga n’iru, ma ogwe-aka m ga-ekpe ndị mmadụ ikpe. Elu ala-mmiri nile ga-echere m, ma n’elu ogwe-aka m ka ha ga-atụkwasị obi.

6 Welitenu anya unu lee elu-igwe nile, ma lekwasị nụ ụwa dị n’okpuru; n’ihi na elu-igwe ga-apụ n’anya dịka anwụrụ ọkụ, ma ụwa ga-aka nka dịka uwe, ma ndị bi n’ime ya ga-anwụ n’otu ụdị ahụ. Ma na nzọpụta m ga-adịgide ruo mgbe nile, ma agaghị akwụsị ezi-omume m.

7 N̄aanụ m ntị, unu ndị matara ezi-omume, unu ndị n’ime obi unu ka m deworo iwu m, unu atụla egwụ n’iba mba nke mmadụ, ọbụghị ma unu ga-atụ egwụ mkparị ha nile.

8 N’ihi na akịka ga-erichapụ ha dịka uwe, ma okpo ga-eri ha dịka ajị anụ. Ma na ezi-omume m ga-adị ruo mgbe nile, ma nzọpụta m site n’ọgbọ ruo n’ọgbọ.

9 Teta, teta! Yikwasị ume, O ogwe-aka nke Onye-nwe; teta dịka n’ụbọchị ndị mgbe ochie. Ọ bụ na ọ bụghị gị bụ onye gburu Rehab mma, ma merụọ nnukwu anụ ahụ kpụ ọkụ n’ọnụ arụ?

10 Ọ bụ na ọ bụghị gị bụ onye mịtara osimiri, bụ mmiri nile nke nnukwu omimi nke meworo ebe omimi nile nke osimiri ka ọ ghọọ ụzọ nke ndị agbapụtaworo ga-esi gabiga?

11 Ya mere, ndị agbapụtaworo nke Onye-nwe ga-alọta, ma jiri ịbụ-abụ bịaruo Zaịọn; ma ọn̄ụ mgbe nile na-adigide na ịdị nsọ ga-adị n’isi ha nile; ma ha ga-enweta obi ụtọ na ọn̄ụ, mwute na iru uju ga-agbalaga.

12 A bụ m ya; e, a bụ m ya bụ onye na-akasi unu obi. Lee, onye ka i bụ, na ị ga na-atụ egwụ mmadụ, onye ga-anwụ-anwụ, na nke nwa nke mmadụ, onye a ga-eme ka ọ dị ka ahihịa?

13 Ma i chefuwo Onye-nwe onye meworo gị, onye setịpuworo elu-igwe nile, ma tụọ ntọ-ala nile nke ụwa, ma ị gawo n’iru na-atụ egwụ ụbọchị nile, n’ihi ọnụma nke onye mkpagbu ahụ, dịka aga-asị na ojikerewo ibibi? Ma olee ebe oke iwe nke onye-mkpagbu ahụ dị?

14 Onye-adọkpụrụ n’agha site n’obodo ya na-eme ngwa-ngwa, ka a tọpụ ya, na ka ọ ghara ịnwụ n’ime olulu ahụ, ma-ọbụ na achịcha ya agaghị ezu-ezu.

15 Ma na A bụ m Onye-nwe Chineke gị, onye mfegharị mmiri ya na-ebigbọ; Onye-nwe nke usuu nile nke ndị-agha bụ aha m.

16 Ma etinyewo m okwu m nile n’ọnụ gị, ma ekpuchiwo m gị na ndo nke aka m, ka m nwe ike kụọ elu-igwe nile ma tụọ ntọ-ala nile nke ụwa, ma gwa Zaịọn: Lee, unu bụ ndị m.

17 Teta, teta, guzoro ọtọ, O Jerusalem, i n̄ụwo n’aka nke Onye-nwe iko nke oke iwe Ya—I n̄ụwo ike-mmanya nke iko nke ịma jijiji a pịchapụtara.

18 Ma ọdịghị onye na-edu ya n’etiti ụmụ nwoke nile o kpọpụtaworo; ọbụghị ma o nwere nke ga-ejide ya n’aka, n’ime ụmụ nwoke nile ọ zụliteworo.

19 Ụmụ nwoke abụọ ndị a abịakwutewo gị, ndị ga-enwe mwute maka ọnọdụ gị—ịtọgbọrọ n’efu gị na mbibi, na ụnwụ ahụ na mma agha ahụ—ma site n’aka onye ka m ga-akasi gị obi?

20 Ụmụ nwoke gị, adawo mba, ma ewezuga abụọ ndị a; ha na-edịna n’isi ụzọ nile; dịka oke ehi a na-azughị-azụ nọ n’ime ụgbụ, ha jupụtara n’oke iwe nke Onye-nwe, ịba mba nke Chineke gị.

21 Ya mere, nụrụ ugbua nke a, gị onye nwere mkpagbu, na nn̄ụrụ-mmanya, ma ọbụghị nke mmanya:

22 Otu a ka Onye-nwe kwuru, Onye-nwe na Chineke gị na-arịọtara ndị nke ya; lee, anapụtawo m site n’aka gị iko nke ịma jijiji, ike mmanya nke iko oke-iwe m; ị gaghị an̄ụkwa ya ọzọ.

23 Mana a ga m etinye ya n’aka ndị na-akpagbu gị; ndị sịworo mkpụrụ-obi gị: Rudata isi ala, ka anyị gafee—ma ị tọgbọwo arụ gị dịka ala na dịka okporo-ụzọ nye ha bụ ndị gafewororịị.

24 Teta, teta, yịkwasị ume gị, O Zaịọn; yịkwasị ọmarịcha uwe nile gị, O Jerusalem, obodo-ukwu dị nsọ; n’ihi na site ugbua ọdịghị ndị ana-ebịghị-ụgwụ na ndị na-adịghị ọcha ga-abata n’ime gị ọzọ.

25 Hụchapụ onwe gị site n’uzuzu; bilie, nọdụ ala, O Jerusalem; tọpụ onwe gị site n’agbụ nile nke olu gị, O ada-a-dọkpụrụ-n’agha nke Zaịọn.