Isi 15
Otu Kraịst siri bụrụ Nna na Ọkpara—Ọ ga-arịọchịte arịrịọ ma buru njehie nile nke ndị ya—Ha na ndị-amụma nile dị nsọ bụ mkpụrụ afọ ya—Ọ na-eweta na mmezu Mbilite-n’ọnwụ ahụ—Ụmụntakịrị nwere ndụ ebighi-ebi. Ihe dịka n’afọ 148 tutu amụọ Kraịst.
1 Ma ugbua Abịnadaị sịrị ha: Ọ dị m ka unu ghọta na Chineke n’onwe ya ga-arịdata n’etiti ụmụ nke mmadụ, ma ọ ga-agbapụta ndị ya.
2 Ma n’ihi na ọ na-ebi n’anụ-arụ a ga-akpọ ya Ọkpara nke Chineke, ma ebe o debeworo anụ arụ ahụ n’okpuru nke ọchịchọ nke Nna ahụ, ebe ọ bụ Nna na Ọkpara ahụ—
3 Nna ahụ, n’ihi na a tụrụ ime ya site n’ike Chineke; na Ọkpara ahụ, n’ihi anụ-arụ; otu a wee ghọọ Nna ahụ na Ọkpara—
4 Ma ha bụ otu Chineke, e, Nna nke mgbe Ebighi-ebi ahụ n’ezie nke elu-igwe na nke ụwa.
5 Ma otu a anụ-arụ ebe ọ ghọrọ ihe dị n’okpuru Mụọ, ma-ọbụ Ọkpara ahụ nye Nna, ebe ọ bụ otu Chineke, tara ahụhụ ọnwụnwa, ma ọ dabaghị n’ọnwụnwa ahụ, kama ọ hapụrụ onwe ya ka akwa ya emu, ma pịa ya ụtarị, ma chụpụ ya, ma ndị ya ajụ ya.
6 Ma mgbe ihe nile ndị a gasịrị, mgbe ọ rụsịrị ọrụ-ebube nile n’etiti ụmụ nke mmadụ, a ga-eduru ya, e, ọbụna dịka Aịsaịa kwuru, dịka atụrụ n’iru onye na-akpụcha ya ajị dara ogbu, otu a ka ọ na-asagheghị ọnụ ya.
7 E, ọbụna otu a a ga-eduru ya, kpọgide ya n’obe, ma gbuo ya, anụ-arụ ahụ abụrụ ihe emere ka ọ dị n’okpuru ọbụna ruo ọnwụ, ọchịchọ nke Ọkpara ahụ abụrụ ihe elomiri n’ime ọchịchọ nke Nna ahụ.
8 Ma otu a Chineke wee dọbie agbụ nile nke ọnwụ, ebe o meriworo ọnwụ; wee nye Ọkpara ahụ ike ịrịọ arịrịọ maka ụmụ nke mmadụ—
9 Ebe ọ rigoroworo n’elu-igwe, ebe o nwere afọ nile nke ebere; ebe o jupụtara n’ọmiko n’ebe ụmụ nke mmadụ nọ; ebe ọ nọ n’etiti ha na ikpe-zịrị-ezi; ebe ọ dọbiworo agbụ nile nke ọnwụ, ebe o wereworo n’isi onwe ya ajọọ-omume ha na njehie ha nile, ebe ọ gbapụtaworo ha, ma metazuo ihe nile ikpe zịrị-ezi chọrọ.
10 Ma ugbua a sị m unu, onye ga-ekwupụta ọgbọ ya? Lee, a sị m unu, na mgbe e jiworo mkpụrụ-obi ya mee ihe-nchụ-aja nke mmehie ọ ga-ahụ mkpụrụ-afọ ya. Ma ugbua gịnị ka unu kwuru? Ma onye ga-abụ mkpụrụ-afọ ya?
11 Lee a sị m unu, na onye ọbụla nụworo okwu nile nke ndị-amụma nile, e, ndị-amụma nile dị nsọ ndị buworo amụma gbasara ọbịbịa nke Onye-nwe—A sị m unu, na ndị nile n̄aworo ntị n’okwu ha nile, ma kwere na Onye-nwe ga-agbapụta ndị ya, ma lekwasịwo anya n’ụbọchị ahụ maka nsachapụ nke mmehie ha nile, A sị m unu, na ndị a bụ mkpụrụ-afọ ya ma-ọbụ ndị nketa nke ala-eze Chineke.
12 N’ihi na ndị a bụ ndị ahụ o buruworo mmehie ha nile; ndị a bụ ndị ahụ ọ nwụworo n’ihi ha, ịgbapụta ha site na njehie ha nile. Ma ugbua, ha abụghị mkpụrụ-afọ ya?
13 E, ma ndị-amụma ha abụghị, onye ọbụla nke megheworo ọnụ ya ibu-amụma, nke na-adababeghị n’ime njehie, a na m ekwu maka ndị-amụma nile dị nsọ site na mgbe ụwa malitere? A sị m unu na ha bụ mkpụrụ-afọ ya.
14 Ma ndị a bụ ha ndị kwupụtaworo udo, ndị wetaworo ozi nile nke ihe ọma, ndị kwupụtaworo nzọpụta; ma sị Zaịọn: Chineke gị na-achị!
15 Ma O lee otu ịma-mma n’elu ugwu-ukwu nile ka ọba-ụkwụ ha dị!
16 Ma ọzọ lee otu ịma-mma n’elu ugwu-ukwu nile ka ọba ukwu nke ndị ahụ ka na-ekwupụta udo dị!
17 Ma ọzọ, lee otu ịma-mma n’elu ugwu-ukwu nile ka ọba ụkwụ nke ndị ga-ekwupụta udo ma emesịa dị, e, site n’oge a ga n’iru ruo na mgbe nile!
18 Ma lee, A sị m unu, nke a abụghị ihe nile. N’ihi na O lee ịma-mma n’elu ugwu-ukwu nile ka ọba-ụkwụ ya nile dị nke na-eweta ozi nile, nke bụ onye-nchọpụta nke udo, e, ọbụna Onye-nwe, onye gbapụtaworo ndị ya; e, ya onye nyeworo ndị ya nzọpụta;
19 N’ihi na asị na ọbụghị maka mgbapụta nke O meworo nye ndị ya, nke a kwadoro site na ntọ-ala nke ụwa, A sị m unu, asị na ọbụghị maka nke a, ụmụ mmadụ nile gaara alawọrịị n’iyi.
20 Ma lee, agbụ nile nke ọnwụ ka a ga-adọbi, ma Ọkpara ahụ na-achị, ma o nwere ike n’ebe ndị nwụrụ-anwụ nọ; ya mere, ọ na-eweta na mmezu mbilite n’ọnwụ nke ndị nwụrụ-anwụ.
21 Ma mbilite n’ọnwụ na-abịa, ọbụna mbilite n’ọnwụ nke mbụ; e, ọbụna mbilite n’ọnwụ nke ndị biworọrịị, na ndị bị, na ndị ga-ebi, ọbụna ruo na mbilite n’ọnwụ nke Kraịst—n’ihi na otu a ka a ga-akpọ ya.
22 Ma ugbua, mbilite n’ọnwụ nke ndị-amụma nile, na ndị nile nke kweworo n’okwu ha nile, ma-ọbụ ndị nile nke debeworo iwu-nsọ nile nke Chineke, ga-apụta na mbilite n’ọnwụ nke mbụ; ya mere, ha bụ mbilite n’ọnwụ nke mbụ.
23 A kpọlitere ha ibinyere Chineke onye gbapụtaworo ha; otu a ha nwere ndụ ebighi-ebi site na Kraịst, onye dọbiworo agbụ nile nke ọnwụ.
24 Ma ndị a bụ ndị ahụ ketara oke na mbilite n’ọnwụ nke mbụ; ma ndị a bụ ndị ahụ nke nwụworọrịị tutu Kraịst abịa, n’amaghị-ama ha, na-enwetaghị nzọpụta e kwupụtara nye ha. Ma otu a Onye-nwe na-eweta mweghachi nke ndị a; ma ha nwere oke na mbilite n’ọnwụ nke mbụ, ma-ọbụ nwere ndụ-ebighi-ebi, ebe Onye-nwe gbapụtara ha.
25 Ma ụmụtakịrị kwa nwere ndụ ebighi-ebi.
26 Ma lee, ma tụọ egwụ, ma ma-jijiji n’iru Chineke, n’ihi na unu kwesịrị ịma-jijiji; n’ihi na Onye-nwe adịghị agbapụta otu n’ime ndị na-enupu isi megide ya ma nwụọ n’ime mmehie ha nile; e, ọbụna ndị nile ahụ laworọrịị n’iyi n’ime mmehie ha nile site na mgbe ụwa malitere, ndị siteworo na mkpachara-anya nupu-isi megide Chineke, ndị mataworọrịị iwu-nsọ nile nke Chineke, ma ha anaghị edebe ha; ndị a bụ ndị na-enweghị-oke na mbilite n’ọnwụ nke mbụ.
27 Ya mere ọ bụ na unu ekwesịghị ịma-jijiji? N’ihi na nzọpụta anaghị abịara onye dị otu a; n’ihi na Onye-nwe agbapụtabeghị onye dị otu a; e, ọbụghị ma Onye-nwe o nwere ike ịgbapụta ndị di otu a; n’ihi na ọ gaghị agọnarị onwe ya; n’ihi na ọ gaghị agọnarị ikpe zịrị-ezi mgbe o na-emezu mkpebi ya.
28 Ma ugbua a sị m unu na oge ahụ ga-abịa na nzọpụta nke Onye-nwe ka a ga-ekwupụta nye mba, ebo, asụsụ, na mmadụ nile.
29 E, Onye-nwe, ndị-nche gị ga-ewelite olu ha; n’otu olu ka ha ga-abụkọta abụ ọnụ; n’ihi na ha ga-ahụ anya na anya, mgbe Onye-nwe ga-eweta Zaịọn ọzọ.
30 Tịpụ mkpu ọn̄ụ, bụkọtanụ abụ ọnụ, unu mkpomkpo ebe nile nke Jerusalem; n’ihi na Onye-nwe akasịwo ndị ya obi, ọ gbapụtawo Jerusalem.
31 Onye-nwe agbawo ogwe-aka nsọ ya ọtọ n’anya nile nke mba nile; ma nsọtụ nile nke ụwa ga-ahụ nzọpụta nke Chineke anyị.